Mmetụta Na-adịgide Adịgide
Mmetụta Na-adịgide Adịgide
KWA afọ, Ndịàmà Jehova nọ ná mba ha dị iche iche na-ezukọta ọnụ ná mgbakọ dị iche iche nke ndị Kraịst. Ha na-eme nke a iji nweta ntụziaka na mkpakọrịta na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ. Ma akụkụ ndị ọzọ nke mgbakọta ha pụkwara inwe mmetụta na-adịgide adịgide n’ebe ndị ọbịa nọ.
Dị ka ihe atụ, na July 1999, ọtụtụ puku Ndịàmà nọ na Mozambique gbakọtara ruo ụbọchị atọ magburu onwe ha ná Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma Chineke.” Nke ahụ bụ nke mbụ ọtụtụ n’ime ndị bịaranụ gatụrụla mgbakọ. Ha nwere mmasị ọ bụghị nanị n’okwu ndị ha nụrụ n’ikpo okwu kamakwa n’ihe ha hụrụ gburugburu ha.
Otu okwu e kwuru n’Ụlọ Mgbakọ dị na Maputo bụ: “Ahụtụbeghị m ebe mara mma ka ebe a ná ndụ m nile! Ncha na enyo dịcha n’ebe ndị a na-asa ahụ, ọbụna ha na-esikwa ísì ọma. Udo dị n’ebe ahụ, a nụghị mkpọtụ nke ụmụaka na-alụ ọgụ. Ọ dịghịkwa onye na-akwa ibe ya aka! Ahụrụ m ndị na-eto eto obi dị ụtọ ka ha na-enwe mkparịta ụka ndị na-agba ume. Otú onye ọ bụla si jie nnọọ ejiji dị mma masịkwara m. N’oge ọzọ, aga m akpọ ụmụ m bịa ma mee ka di m kwere na anyị aghaghị ịga mgbakọ a.”
Ee, ndị mmadụ na-arịba ime ihe n’eziokwu, iguzosi ike n’ezi ihe, na ịdị ọcha anụ ahụ nke Ndịàmà Jehova ama. Gịnị mere Ndịàmà ji dị iche? Ọ bụ n’ihi na ha na-agbalị n’ezie itinye ihe ha na-amụta na Bible n’ọrụ. Gịnị ma i soro ha gbakọta n’afọ a ná mgbakọ ndị ha ga-enwe ná mba gị ma ọ bụ ná nzukọ ndị ha na-enwe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị iji jiri anya gị hụ?
[Foto dị na peeji nke 32]
ZAMBIA
[Foto dị na peeji nke 32]
KENYA
[Foto dị na peeji nke 32]
MOZAMBIQUE