Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mụọ Bible?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mụọ Bible?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mụọ Bible?

BILL bụ nwa okorobịa gbasiri ike, gụọ akwụkwọ nke ọma, ma nwee ego. Ma, o nweghị afọ ojuju. Ndụ ya enweghị nzube, nke ahụ nyekwara ya nsogbu n’obi nke ukwuu. Ka ọ na-agbalị ime ka ndụ ya nwee nzube, o nyochara okpukpe dịgasị iche iche, ma ọ chọtaghị ihe ọ na-achọ. Na 1991, o zutere otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ́ onye nyere ya otu akwụkwọ nke tụlere ihe Bible na-ekwu banyere nzube nke ndụ. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible ka Bill wee nwee ike ilebara isiokwu a nakwa ndị ọzọ anya.

Bill na-echeta, sị: “Anyị nwere ọmụmụ ihe mbụ anyị, ebe ọ bụkwa na anyị zoro nnọọ aka na Bible ọtụtụ mgbe, amatara m na nke a bụ ihe m nọworo na-achọ. Azịza ndị dị na Bible na-akpali nnọọ akpali. Mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, anyaara m gwongworo m gaa n’ugwu, si n’ime ya rituo, ma tie mkpu ọṅụ. Enwere m obi ụtọ na m mesịrị na-amata ihe bụ́ azịza nye ajụjụ m dị iche iche.”

N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla chọtara eziokwu Bible na-eti mkpu ọṅụ n’ụzọ nkịtị. Ma, ịmata azịza nye ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ na-abụrụ ọtụtụ ndị ahụmahụ na-enye ọṅụ. Ha na-enwe mmetụta yiri nke nwoke ahụ nọ n’ilu Jisọs bụ́ onye chọtara akụ̀ e zoro n’ubi. Jisọs kwuru, sị: “N’ọṅụ ya o wee laa, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ubi ahụ.”—Matiu 13:44.

Isi Ihe Na-akpata Ibi Ndụ Nwere Nzube

Bill echebaworo otu ajụjụ bụ́ isi echiche, Gịnị bụ nzube nke ndụ? Ndị ọkà ihe ọmụma, ndị ọkà mmụta okpukpe, na ndị ọkà mmụta sayensị agbalịwo ịza ajụjụ ahụ eri ọtụtụ puku afọ. Mmadụ ndị na-anwa ịza ajụjụ a edewo akwụkwọ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Mgbalị ha enwebeghị isi, ọtụtụ n’ime ha ekwubiwokwa na a pụghị ịza ajụjụ ahụ aza. Ma, azịza ya dị. Ọ bụ ezie na o siri ike nghọta, ọ dịghị mgbagwoju anya. A kọwara ya n’ime Bible. Isi ihe na-akpata ibi ndụ obi ụtọ na nke nwere nzube bụ nke a: Anyị aghaghị iso Jehova, bụ́ Onye Okike anyị na Nna anyị nke eluigwe, na-enwe mmekọrịta dị mma. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

E nwere ụzọ ihe abụọ metụtara ịbịaru Chineke nso bụ́ ndị yiri ka hà na-emegiderịta onwe ha. Ndị na-abịaru Chineke nso na-atụ egwu ya ma na-ahụ ya n’anya. Ka anyị tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ abụọ na-akwado okwu ndị ahụ. Ogologo oge gara aga, Eze Solomọn maara ihe ji nlezianya nyochaa ihe banyere ihe a kpọrọ mmadụ ma dekọọ ihe ndị ọ chọpụtara n’akwụkwọ Bible bụ́ Eklisiastis. N’ịchịkọta ihe ndị ọ chọpụtara, o dere, sị: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile.” (Eklisiastis 12:13, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, mgbe a jụrụ Jisọs ihe bụ́ iwu kasịnụ n’Iwu ahụ e nyere Mosis, ọ zara, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ò yiri gị ihe na-adabaghị adaba na anyị ga-atụ egwu Chineke, hụkwa ya n’anya? Ka anyị nyochaa mkpa egwu na ịhụnanya dị na otú ha si arụkọ ọrụ n’ime ka e soro Chineke na-enwe mmekọrịta na-eju afọ.

Ihe Egwu Chineke Pụtara

Egwu nkwanye ùgwù dị oké mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-efe Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Bible na-ekwu, sị: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (Abụ Ọma 111:10) Pọl onyeozi dere, sị: “Ka anyị nwee amara, ka anyị wee site na ya were egwu Chineke na ụjọ kpee ekpere n’ụzọ nke ga-atọ Chineke ụtọ.” (Ndị Hibru 12:28) N’ụzọ yiri nke ahụ, otu mmụọ ozi Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ n’etiti eluigwe ji okwu ndị a malite mkpọsa ozi ọma ya: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto.”—Mkpughe 14:6, 7.

Egwu Chineke a, nke dị oké mkpa iji na-ebi ndụ nwere nzube, na ụjọ nkịtị abụghị otu ihe. Ụjọ pụrụ ịtụ anyị ma ọ bụrụ na onye omekome dị obi ọjọọ ma dị ize ndụ eyie anyị egwu. Ma egwu Chineke bụ ụjọ na nsọpụrụ miri emi n’ebe Onye Okike nọ. Ọ na-agụnyekwa egwu kwesịrị ekwesị nke ịghara ịkpasu Chineke iwe n’ihi na ọ bụ Onyeikpe Kasị Elu na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ onye nwere ike, bụrụkwa onye o ruuru ịta ndị na-enupụ isi ahụhụ.

Egwu na Ịhụnanya Na-arụkọ Ọrụ

Otú o sina dị, Jehova adịghị achọ ka ndị mmadụ jewere ya ozi nanị n’ihi na ha na-atụ ya ụjọ. N’ụzọ pụtara ìhè, Jehova bụ Chineke ịhụnanya. A kpaliri Jọn onyeozi ide, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova Chineke ejiriwo nnọọ ịhụnanya mesoo ihe a kpọrọ mmadụ ihe, ọ na-achọkwa ka ndị mmadụ meghachi omume site n’ịhụ ya onwe ya n’anya. Otú ọ dị, olee otú ịhụnanya dị otú ahụ na egwu Chineke si kwekọọ? N’ezie, ha abụọ nwere njikọ chiri anya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Izu nzuzo Jehova dịịrị ndị na-atụ egwu Ya.”—Abụ Ọma 25:14.

Cheedị echiche banyere nkwanye ùgwù na ụjọ nke nwatakịrị na-enwe n’ebe nna ya dị ike ma nwee amamihe nọ. N’otu mgbe ahụ, nwa dị otú ahụ ga-emeghachi omume nye ịhụnanya nna ya na-egosi ya. Nwa ahụ ga-atụkwasị nna ya obi ma legara ya anya maka nduzi, na-enwe obi ike na nduzi a ga-abara ya uru. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma na-atụ egwu ya, anyị ga-erube isi ná nduzi ya, nke a ga-abakwara anyị uru. Rịba ama ihe Jehova kwuru banyere ụmụ Israel: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na mkpụrụ obi ha dị ha otú a, ịtụ egwu m, na idebe ihe nile M nyere n’iwu ụbọchị nile, ka o wee dịrị ha mma, dịkwara ụmụ ha, ruo mgbe ebighị ebi!”—Deuterọnọmi 5:29.

Ee, egwu Chineke na-eduga ọ bụghị n’agbụ kama ná nnwere onwe, ọ bụghị ná mwute kama n’ọṅụ. Aịsaịa buru amụma banyere Jisọs, sị: “Ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova.” (Aịsaịa 11:3) Ọbụ abụ ahụ dekwara, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka nwoke ahụ bụ nke na-atụ egwu Jehova, nke ihe nile O nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu.”—Abụ Ọma 112:1.

N’ụzọ doro anya, anyị apụghị ịtụ egwu Chineke ma ọ bụ hụ ya n’anya ma ọ bụrụ na anyị amaghị ya. Ọ bụ ya mere ịmụ Bible ji dị nnọọ mkpa. Ọmụmụ ihe dị otú ahụ na-enyere anyị aka ịghọta àgwà Chineke na amamihe dị n’ịgbaso nduzi ya. Ka anyị na-abịarukwu Chineke nso, anyị na-achọ ime uche ya, a na-akwalikwa anyị idebe ihe nile o nyere n’iwu, na-amara na ha ga-abara anyị uru.—1 Jọn 5:3.

Mmadụ ịmara na ya nọ n’ụzọ ziri ezi ná ndụ bụ ihe na-enye ọṅụ. Otú a ka ọ dị Bill, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite. O kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Mmekọrịta mụ na Jehova echiwo anya n’ime afọ itoolu gafeworonụ kemgbe m nwere ọmụmụ Bible mbụ m. Oké ọṅụ mbụ ahụ m nwere aghọọla ụzọ ndụ na-enye ọṅụ n’ezie. Anọgidewo m na-enwe echiche dị mma banyere ndụ. Ana m eji ụbọchị m dum eme ihe omume bara uru, ọ bụghị iji ya na-achọ ihe ụtọ n’ụzọ na-enweghị isi. Jehova aghọworo m onye dị adị n’ezie, amakwaara m na o nwere ezi mmasị n’ọdịmma m.”

N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụlekwu otú inwe ihe ọmụma banyere Jehova si ewetara ndị na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ ha ọṅụ na abamuru.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ịbịaru Chineke nso pụtara na anyị ga-ahụ ya n’anya ma na-atụ egwu ya

[Foto dị na peeji nke 6]

Egwu Jehova mere ka Jisọs nwee ọṅụ