O “Weere Ntachi Obi Nọgide Ruo Ọgwụgwụ”
O “Weere Ntachi Obi Nọgide Ruo Ọgwụgwụ”
N’IHE nkiri vidio e gosiri ndị bịara ọhụrụ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na 1993, Lyman Alexander Swingle kwupụtara mmetụta o nwere banyere ijere Jehova ozi, sị: “Yiri buutu gị n’ụkwụ nwụọ!” *
Nwanna Swingle nke dị afọ 90 mere kpọmkwem ihe ọ gbara ndị ọzọ ume ime. O “weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ.” (Matiu 24:13) Ọ bụ ezie na ahụ adịghị ya, na Wednesday, March 7, ọ gara nzukọ nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke o so na ya. Na Tuesday nke izu na-esonụ, ọnọdụ ya kawanyere njọ, na March 14 kwa, n’elekere 4:26 nke ụtụtụ, dọkịta ya kwuru na ọ nwụọla.
Lyman Swingle malitere ozi ya n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, n’April 5, 1930. O jere ozi n’ebe ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 71. Ebe mbụ e kenyere Lyman ọrụ bụ n’ebe a na-amachi akwụkwọ, e mesịa, e kenyere ya ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ, o nyekwara aka mepụta ink. N’ezie, Nwanna Swingle rụrụ ọrụ n’ebe a na-emepụta ink ruo ihe dị ka afọ 25. O jekwara ozi ruo ihe dị ka afọ 20 ná ngalaba ide ihe. N’afọ 17 ndị ikpeazụ nke ndụ ya, ọ rụrụ ọrụ n’Ọfịs Ochekwa Ego.
Lyman bụ onye ji obi ike akpọsa Alaeze Chineke. N’afọ ndị mbụ ọ nọrọ na Brooklyn, ya na onye ya na ya bi, bụ́ Arthur Worsley, na-eji otu n’ime ụgbọ epeepe nke Ndịàmà agbago Osimiri Hudson. N’iji ígwè okwu eme ihe, ha ji ọtụtụ ngwụsị izu akpọsa ozi Alaeze ahụ n’ógbè ndị dị n’ụsọ osimiri ahụ.
A mụrụ Nwanna Swingle na November 6, 1910, na Lincoln, Nebraska, ma n’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, ezinụlọ ya kwagara Salt Lake City, Utah. N’ebe ahụ, na 1913, ndị mụrụ ya ghọrọ Ndị Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. N’afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ ndị ọkà okwu si n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà dị na Brooklyn na-anọ n’ebe obibi nke ezinụlọ Swingle, ndị ikom a nwekwara mmetụta dị mma n’ebe Lyman nọ. Na 1923, mgbe ọ dị afọ 12, e mere ya baptism ná ngosipụta nke nrara ọ raara onwe ya nye Chineke.
Mgbe o jesịrị ozi na Brooklyn ruo ihe karịrị afọ 26 dị ka okokporo, ndụ Lyman bịara ka mma n’ụzọ na-enweghị atụ mgbe ọ lụrụ Crystal Zircher na June 8, 1956. Ha adịghị aha ibe ha aka, na-ejekọ ozi ọnụ ruo mgbe Crystal nwụrụ na 1998. Ihe dị ka afọ atọ tupu mgbe ahụ, Crystal dara ọrịa strok bụ́ nke kwarụrụ ya ahụ n’ụzọ dị ukwuu. Otú Lyman si tinye onwe ya n’ilekọta ya kwa ụbọchị bụ ihe atụ nke nraranye bụ́ nke na-emetụ onye ọ bụla n’ahụ, nke ka nke ndị hụrụ Lyman ka o ji ịhụnanya na-akwagharị ya n’oche nkwagharị n’ebe ndị mmadụ si aga n’agbata obi ha, ka Crystal na-enyefe ndị na-agafe agafe Ụlọ Nche na Teta!
Nwanna Swingle bụ nwoke na-adịghị ezo ọnụ, ma na-enwe mmetụta bụ́ onye ndị maara ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Dị ka nne ya na nna ya, o nwere olileanya ahụ dabeere na Bible bụ́ iso Jisọs Kraịst biri n’Alaeze eluigwe, bụ́ olileanya obi siri anyị ike na o nwetala.—1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-18; Mkpughe 14:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 2 Nke a pụtara mmadụ ịnwụ mgbe ọ ka na-arụsi ọrụ ya ike.
[Foto dị na peeji nke 31]
Nwanna Swingle jere ozi n’ebe a na-emepụta ink ruo ihe dị ka afọ 25
[Foto dị na peeji nke 31]
Lyman na Crystal adịghị aha ibe ha aka