Osisi Ndị Na-adịru Ogologo Oge
Osisi Ndị Na-adịru Ogologo Oge
Elu nkume nwere ike ọ gaghị eyi ebe kwesịrị ekwesị iwu ebe obibi gị, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị yiri ọghọm dị na ya, osisi ụfọdụ ndị na-eto n’elu ugwu na-arapagidesi ike n’elu nkume ndị dị otú ahụ, na-anagide oké ịjụ oyi nke oge oyi, na-anagidekwa ụkọ mmiri nke oge okpomọkụ.
ỌTỤTỤ mgbe, osisi ndị a siri ike adịghị ebu ibu dị ka ụmụnne ha ndị na-eto n’ala nkịtị. Ogwe ha pụrụ ịgba akpụ akpụ ma hịa ahịa, gharakwa ito ogologo. Ọdịdị ihu igwe siri ike na ebe ahụ e nwere ntakịrị ájá ha na-etolite na-akpụzi ha.
Ebe ha na-anọgide n’ógbè ndị kasị sie ike ịnọ n’ụwa, ị pụrụ iwere ya na osisi ndị dị otú a agaghị na-adịte ndụ aka. Ma ọ bụghị eziokwu. Ụfọdụ na-azọrọ na Methuselah, bristlecone pine, nke na-eto n’elu ebe dị mita 3,000 n’Ugwu Ọcha nke California, dị afọ 4,700. Akwụkwọ bụ́ The Guinness Book of Records 1997 hotara osisi a dị ka osisi kasị ochie nke dị ndụ n’elu ụwa. Edmund Schulman, bụ́ onye mere nnyocha banyere osisi ochie ndị a kọwara, sị: “Osisi bristlecone pine ahụ . . . yiri ka ọ na-adị ndụ n’ọnọdụ siri ike. A hụrụ ndị nile [osisi pine] ka mee ochie nọ n’Ugwu Ọcha ahụ n’elu ebe dị ihe dị ka mita 3,000 n’ala ọzara kpọrọ nkụ nke jupụtara na nkume.” Schulman chọpụtakwara na ụdị osisi pine ndị ọzọ kasị ochie tolitekwara n’ọnọdụ ndị dị njọ.
Ọ bụ ezie na ha aghaghị ịnagide ọnọdụ ndị siri ike, osisi abụọ ndị a na-eguzogide ihe na-eji ihe abụọ ha nwere eme ihe n’ụzọ kasị mma ha pụrụ iji ha mee ihe. Ebe dịpụrụ adipụ ha nọ, bụ́ ebe ahịhịa na-adịkebeghị, na-echebe ha pụọ n’ọkụ ọgbụgba nke oké ọhịa, otu n’ime ihe ndị kachasị eyi osisi ndị toworo eto egwu. Mkpọrọgwụ ha na-ejigidesikwa ha ike n’elu nkume nke na ọ bụ nanị ala ọma jijiji pụrụ iwezụga ha.
N’ime Bible, e ji ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi tụnyere osisi. (Abụ Ọma 1:1-3; Jeremaịa 17:7, 8) Ha pụkwara iche ihe isi ike ihu n’ihi ọnọdụ ndị ha hụrụ onwe ha na ha. Mkpagbu, enweghị ezi ahụ ike, ma ọ bụ ajọ ịda ogbenye pụrụ ile okwukwe ha ule n’ụzọ siri ike, karịsịa mgbe ọnwụnwa ndị ahụ dịgidere site n’afọ ruo n’afọ. Otú o sina dị, Onye Okike ha, onye kekwara osisi ndị ahụ bụ́ ndị na-anagide ọnọdụ siri ike nke ọma, na-emesi ndị na-efe ya ofufe obi ike na ya ga-enyere ha aka. Bible na-ekwe ndị na-anọgidesi ike nkwa, sị: “[Ọ ga-emekwa] ka unu guzosie ike, meekwa ka unu dị ike.”—1 Pita 5:9, 10.
‘Ịkwụrụ chịm, iguzosi ike, ma ọ bụ ịnọgidesi ike’ bụ echiche dị na ngwaa Grik ahụ a na-asụgharịkarị n’ime Bible ịbụ “tachie obi.” Dị ka osisi ndị ahụ na-eto n’elu ugwu, ịgbanyesi mkpọrọgwụ ike bụ isi ihe dị mkpa iji tachie obi. N’ihe banyere ndị Kraịst, ọ dị ha mkpa ịgbanyesi mkpọrọgwụ ike na Jisọs Kraịst iji guzosie ike. “Dị ka unu naara Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị,” ka Pọl dere, “na-ejegharịnụ n’ime Ya, bụrụkwa ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Ya, ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya, ndị a na-ewerekwa okwukwe unu mee ka unu guzosie ike, dị ka e ziri unu, na-ekelebiga ókè.”—Ndị Kọlọsi 2:6, 7.
Pọl ghọtara mkpa ọ dị inwe mkpọrọgwụ ime mmụọ siri ike. Ya onwe ya gbasoro “ogwu n’anụ ahụ” mgba, ọ tachikwara obi ná mkpagbu dị ilu n’ije ozi ya. (2 Ndị Kọrint 11:23-27; 12:7) Ma ọ chọpụtara na ya pụrụ ịnọgide na-aga n’ihu site n’ike Chineke. O kwuru, sị: “Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:13.
Dị ka ihe nlereanya Pọl na-egosi, ezigbo ntachi obi ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma adịghị adabere n’ọnọdụ ndị dị mma. Dị ka osisi ndị ahụ na-eto n’elu ugwu ndị na-anagide ihu igwe mgbe ọ dị njọ, ruo ọtụtụ afọ, anyị pụrụ iguzosi ike ma ọ bụrụ na anyị agbanye mkpọrọgwụ na Kraịst ma na-adabere n’ike Chineke na-enye. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị atachie obi ruo ọgwụgwụ, anyị nwere atụmanya nke ịhụ n’onwe anyị mmezu nke nkwa ọzọ sitere n’aka Chineke: “Dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị.”—Aịsaịa 65:22; Matiu 24:13.