Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-anagide Ihe n’Ezie?

Ị̀ Na-anagide Ihe n’Ezie?

Ị̀ Na-anagide Ihe n’Ezie?

OKÉ iwe ò wetụla gị n’ihi àgwà na-ezighị ezi mmadụ kpara? Ị̀ na-adị ngwa n’ime ihe mgbe mmetụta ndị na-emerụ emerụ na-abata n’etiti ezi ndị enyi gị?

Mgbe ụfọdụ ọ na-adị mkpa iji nkwụsi ike mee ihe ngwa ngwa iji kwụsị mmụba nke mmehie dị oké njọ. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Israel na narị afọ nke 15 T.O.A. chọrọ iji omume jọgburu onwe ya merụọ onwe ha, nwa nwa Erọn bụ́ Fineas mere ihe ozugbo iji wepụ ihe ọjọọ. Jehova Chineke nabatara ihe o mere, na-asị: “Fineas . . . emewo ka ọnụma m si n’ahụ ụmụ Israel laghachi, n’iwere ekworo m kwoo ekworo n’etiti ha.”—Ọnụ Ọgụgụ 25:1-11.

Fineas mere ihe kwesịrị ekwesị iji kwụsị mmụba nke mmetọ ahụ. Ma gịnị banyere iwe a na-achịkwaghị achịkwa n’ebe mmejọ nkịtị nke ndị ọzọ dị? Ọ bụrụ na anyị emee ihe ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’enweghị ezi ihe kpatara anyị ji mee otú ahụ, anyị ga-aghọ ọ bụghị ndị na-akwado ezi omume kama ndị na-adịghị anagide ihe—ndị na-adịghị enye ohere maka ezughị okè ndị ọzọ. Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere ọnyà a?

‘Jehova Na-agbaghara Gị Ajọ Omume Gị Nile’

Jehova bụ “Chineke nke na-ekwo ekworo (na-anụ ọkụ n’obi); Chineke nke na-adịghị anabata ịma aka.” (Ọpụpụ 20:5, ihe odide ala ala peeji nke NW) Ebe ọ bụ Onye Okike, ọ bụ ihe ruuru ya ịchọ ka anyị na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Mkpughe 4:11) Ma, Jehova na-anagide adịghị ike ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ banyere ya, sị: “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Ọ bụghị ruo mgbe nile ka Ọ [ga-anọgide na-ahụchata emezighị emezi, NW] . . . Ọ bụghị dị ka mmehie nile anyị si dị ka O meworo anyị, ọ bụghịkwa dị ka ajọ omume nile anyị si dị ka O mesoworo anyị.” Ee, ọ bụrụ na anyị enwee nchegharị, Chineke ‘na-agbaghara anyị ajọ omume anyị nile.’—Abụ Ọma 103:3, 8-10.

Ebe ọ bụ na Jehova na-aghọta ọdịdị mmehie nke ụmụ mmadụ, ọ dịghị ‘anọgide na-ahụchata emezighị emezi’ nke ndị mmehie nwere nchegharị. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) N’ezie, ọ bụ nzube ya iwepụ mmehie na ezughị okè. Ruo mgbe a ga-emezu nke ahụ n’ụzọ zuru ezu, kama imeso anyị “dị ka ajọ omume nile anyị si dị,” Chineke na-eji amara agbaghara anyị mmehie anyị ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị a pụrụ ikwu na o ruru eru ịlanarị ma ọ bụrụ na Jehova emeghị ebere mgbe o kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 130:3) Lee ekele anyị pụrụ inwe na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye, n’ụzọ ziri ezi, na-achọ ofufe a na-ekewaghị ekewa, bụ Chineke na-eme ebere!

Nguzozi Dị Mkpa

Ebe ọ bụ na Eze Onyenwe eluigwe na ala na-egosipụta àgwà nke ịnagide ihe n’imeso ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ? A kọwawo ịnagide ihe dị ka “àgwà nke inwe ndidi n’ebe echiche ma ọ bụ omume nke ndị ọzọ dị.” Ànyị nwere àgwà dị otú ahụ n’onwe anyị—ọchịchọ nke inwe ndidi na ntachi obi mgbe ndị ọzọ na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe ndị na-abụchaghị mmehie ma ikekwe bụrụ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị ikwu ma ọ bụ ime?

N’ezie, ọ dị anyị mkpa izere ịdị na-anagide ihe nile. Dị ka ihe atụ, a na-ebibi ihe dị ukwuu mgbe ndị isi okpukpe na-agbachi ndị ụkọchukwu na-emetọ mmadụ nkịtị bụ́ ndị na-anọgide na-emetọ ụmụntakịrị nwoke na ụmụntakịrị nwanyị. “N’ile mmeso e mesoro ụmụaka ahụ anya dị ka mmehie nkịtị,” ka otu onye nta akụkọ nọ na Ireland kwuru, “nanị ihe ndị isi chọọchị na-eme bụ iziga onye ụkọchukwu ahụ mehierenụ [n’ebe ọzọ].”

Nanị iziga nwoke dị otú ahụ n’ebe ọzọ ọ̀ bụ ihe atụ nke ịnagide ihe n’ụzọ ziri ezi? Ọ dịghị ma ọlị! Were ya na òtù ndị isi ọrụ ahụ ike hapụrụ onye dọkịta na-awa ahụ nke na-adịghị eji ihe akpọrọ ihe ka ọ nọgide na-awa ahụ, ha ana-ezipụ ya site n’otu ụlọ ọgwụ gaa n’ọzọ, n’agbanyeghị na ọ na-egbu ma ọ bụ na-akwarụ ndị ọrịa ya. Inwe echiche hiere ụzọ banyere nguzosi ike n’ihe n’etiti ndị ọkachamara pụrụ ime ka e nwee ụdị ‘nnagide ihe’ dị otú ahụ. Ma gịnị banyere ndị e gburu ma ọ bụ ndị a kpara ndụ ha aka ọjọọ n’ihi ejighị ihe kpọrọ ihe ma ọ bụ ọbụna n’ihi mpụ?

E nwekwara ihe ize ndụ nke anagidechaghị ihe. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ndị Juu ụfọdụ bụ́ ndị a maara dị ka ndị Zealot ji ụzọ na-ezighị ezi chọọ iji ihe atụ Fineas mee ihe ná mgbalị ha iji mee ka omume ha yie ihe ziri ezi. Otu omume gabigara ókè nke ndị Zealot ụfọdụ bụ “ịbanye n’etiti ìgwè ndị mmadụ nọ na Jerusalem n’oge ememe nakwa n’oge ndị yiri ya ma were mma nwa ntì maa onye iro ha mgbe ọ na-amaghị ihe na-aganụ.”

Dị ka ndị Kraịst, anyị agaghị eme ihe ruo n’ókè ahụ ndị Zealot mere n’ịwakpo n’ụzọ anụ ahụ ndị na-emeghị ihe na-atọ anyị ụtọ. Ma ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke anagideghị ihe ọ̀ na-eduga anyị n’iji ụzọ ndị ọzọ na-awakpo ndị ihe ha na-adịghị amasị anyị—ikekwe site n’ikwutọ ha? Ọ bụrụ n’ezie na anyị na-anagide ihe, anyị agaghị eji ajọ okwu dị otú ahụ na-eme ihe.

Ndị Farisii narị afọ mbụ bụ òtù ọzọ na-adịghị anagide ihe. Ha nọ na-akatọ ndị ọzọ mgbe nile, ha enyeghịkwa ohere maka ezughị okè mmadụ. Ndị Farisii ahụ dị mpako lelịrị ndị nkịtị anya, na-ekwujọ ha dị ka “ndị a na-abụ ọnụ.” (Jọn 7:49) E nwere ezi ihe mere Jisọs ji katọọ ndị ikom dị otú ahụ bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpa akwụkwọ na-esi ísì ụtọ na anise na cummin, unu ahapụwokwa ihe ka arọ n’iwu, bụ́ ikpe, na ebere, na okwukwe: ma ọ dị mkpa ka unu mee ihe ndị a, ka unu gharakwa ịhapụ ihe ahụ.”—Matiu 23:23.

Mgbe Jisọs na-ekwu okwu a, ọ dịghị ebelata uru idebe Iwu Mosis bara. Nanị ihe ọ nọ na-eme bụ igosi na akụkụ “ka arọ,” ma ọ bụ akụkụ ka mkpa nke Iwu ahụ chọrọ iji ezi uche na ebere na-etinye ya n’ọrụ. Lee ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya si pụọ iche n’ebe ndị Farisii na ndị Zealot ahụ na-adịghị anagide ihe nọ!

Ma Jehova Chineke ma Jisọs Kraịst adịghị nke na-anabata ihe ọjọọ. N’oge na-adịghị anya, ‘a ga-abọ ọbọ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma ahụ.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) Otú ọ dị, n’ịnụ ọkụ n’obi Jisọs maka ezi omume, ọ laghị azụ ma ọlị n’igosipụta ndidi, mmetụta ebere na nke ịhụnanya nke Nna ya nke eluigwe n’ebe ndị nile chọrọ ime ihe ziri ezi nọ. (Aịsaịa 42:1-3; Matiu 11:28-30; 12:18-21) Lee ezi ihe nlereanya Jisọs setịpụụrụ anyị!

Jirinụ Ndidi Na-anagiderịta Ibe Unu

Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịdị na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu maka ezi ihe, ka anyị na-etinye ndụmọdụ Pọl onyeozi n’ọrụ, nke bụ́: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsi 3:13; Matiu 6:14, 15) Ịnagide ihe chọrọ ịnagiderịta emezighị emezi na mmejọ nke ibe anyị n’ụwa a na-ezughị okè. Ọ dị anyị mkpa igosipụta ezi uche banyere ihe anyị na-atụ anya ya n’aka ndị ọzọ.—Ndị Filipaị 4:5.

Ịnagide ihe apụtaghị n’ụzọ ọ bụla ịnabata ihe ọjọọ ma ọ bụ ileghara njehie anya. Akụkụ ụfọdụ nke echiche ma ọ bụ àgwà nke onye kwere ekwe ibe anyị nwere ike ghara ikwekọ n’ụkpụrụ Jehova n’ụzọ ụfọdụ. N’agbanyeghị na ihie ụzọ ahụ nwere ike ghara ịdị oké njọ ruo n’ókè nke onye ahụ ịbụ onye Chineke jụrụ, ọ pụrụ inye mgbaàmà ịdọ aka ná ntị nke na-egosi na ọ dị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ. (Jenesis 4:6, 7) Lee ka o si bụrụ ihe ịhụnanya mgbe ndị nwere iru eru ime mmụọ na-agbalị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na-agbazi onye ahụ na-ejehie ejehie! (Ndị Galetia 6:1) Otú ọ dị, iji nwee ihe ịga nke ọma ná mgbalị a, ọ dị mkpa iji nchebara echiche mee ihe kama iji mmụọ nke nkatọ.

“Jirinụ Obi Dị Nwayọọ na Nkwanye Ùgwù Miri Emi”

Gịnị banyere inwe ndidi n’ebe ndị echiche okpukpe ha dị iche na nke anyị, nọ? Otu “Ihe Mmụta Dịịrị Ọha” nke a mapawara n’Ụlọ Akwụkwọ Gọọmenti Etiti nile e guzobere na Ireland na 1831 na-agụ, sị: “Jisọs Kraịst ebughị n’uche ka e jiri ime ihe ike manye ndị mmadụ ikpe okpukpe ya. . . . Isesa ndị agbata obi anyị okwu na ikwutọ ha abụghị ụzọ isi mee ka ha kwenye na ihe anyị kwuru ziri ezi nakwa na nke ha ezighị ezi. O yikarịsịrị ka ọ̀ ga-eme ka ha kwenye na anyị enweghị àgwà ndị Kraịst.”

Jisọs ziri ihe ma mee omume n’ụzọ dọtara ndị mmadụ n’Okwu Chineke, anyị kwesịkwara ime otú ahụ. (Mak 6:34; Luk 4:22, 32; 1 Pita 2:21) Ebe ọ bụ nwoke zuru okè nke nwere nghọta pụrụ iche Chineke nyere ya, ọ pụrụ ịmata ihe dị ndị mmadụ n’obi. Ya mere, mgbe ọ dị mkpa, Jisọs gwara ndị iro Jehova okwu nkatọ na-agbakasị ahụ. (Matiu 23:13-33) Ihe o mere abụghị anagideghị ihe.

N’adịghị ka Jisọs, anyị enweghị ikike nke ịma ihe mmadụ bu n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ Pita onyeozi, bụ́: “Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma [jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù miri emi, NW] gọpụ.” (1 Pita 3:15) Dị ka ndị ohu Jehova, anyị kwesịrị ịgọpụrụ ihe anyị kweere n’ihi na ọ dabesiiri ike n’Okwu Chineke. Ma ọ dị anyị mkpa ime nke a n’ụzọ na-egosi nkwanye ùgwù n’ebe ndị ọzọ nọ nakwa n’ebe nkwenkwe ndị ha ji ezi obi nwee dị. Pọl dere, sị: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs kwuru, sị: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” (Matiu 7:12) Ya mere, ka anyị jirizie ndidi na-anagiderịta ibe anyị ma na-egosi nkwanye ùgwù n’ebe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma nọ. Site n’ime ka ịnụ ọkụ n’obi anyị nwere maka ezi omume na nnagide ihe nke dabeere na Bible nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, anyị ga-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ ma bụrụ ndị na-anagide ihe n’ezie.

[Foto dị na peeji nke 23]

Zere omume anagideghị ihe nke ndị Farisii nwere

[Foto dị na peeji nke 23]

Jisọs gosipụtara mmụọ nke ịnagide ihe nke Nna ya nwere. Ị̀ na-eme otú ahụ?