Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bụrụnụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-enwe Ọṅụ!

Bụrụnụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-enwe Ọṅụ!

Bụrụnụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-enwe Ọṅụ!

“Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.”—MATIU 9:37, 38.

1. Gịnị na-enyere anyị aka ịnọgide na-eme uche Chineke?

MGBE anyị chetara ụbọchị e mere anyị baptism dị ka otu n’ime ndị ohu Jehova, ma ọ bụ afọ ole na ole gara aga ma ọ bụ ọtụtụ afọ gara aga ka e mere anyị ya, ọ pụrụ iyi ka ọ bụ ụnyaahụ. Ito Jehova ghọrọ ihe bụ́ isi ná ndụ anyị raara nye ya. Ka anyị zụchapụtara oge kwesịrị ekwesị iji nyere ndị ọzọ aka ịnụ nakwa, ma eleghị anya, ịnakwere ozi Alaeze ahụ, nchegbu anyị bụ́ isi bụ ijere Jehova ozi na-enye ọṅụ. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ruo taa, anyị na-achọpụta na oge na-agba nnọọ ọsọ mgbe anyị ji ọrụ n’aka, “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Ọ bụ ezie na anyị na-enweta nsogbu, ọṅụ anyị na-enweta n’ime uche Jehova na-akpali anyị ịnọgide na-aga n’ihu.—Nehemaịa 8:10.

2. Gịnị na-atụnye ụtụ n’ọṅụ anyị na-enwe n’ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ ahụ?

2 Dị ka ndị Kraịst, anyị na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ. Jisọs Kraịst ji ịchịkọta ndị mmadụ maka ndụ ebighị ebi tụnyere owuwe ihe ubi. (Jọn 4:35-38) Ebe ọ bụ na anyị na-ekere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi dị otú ahụ, ọ ga-abụ ihe na-agba ume ịtụle ọṅụ ndị Kraịst bụ́ ndị ọrụ owuwe ihe ubi n’oge mbụ, nwetara. Anyị ga-enyocha ụzọ ihe atọ so eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’ọrụ owuwe ihe ubi nke oge a. Ha bụ (1) ozi olileanya anyị na-ezi, (2) ihe ịga nke ọma anyị na-enwe n’ihe anyị na-achọ, nakwa (3) àgwà ime udo anyị dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi.

Ndị E Zipụrụ Dị Ka Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi

3. Gịnị nyere ụmụazụ Jisọs n’oge mbụ ọṅụ?

3 Lee nnọọ ka ndụ ndị ọrụ owuwe ihe ubi oge mbụ—karịsịa ndị ozi 11 kwesịrị ntụkwasị obi nke Jisọs—si gbanwee n’ụbọchị ahụ na 33 O.A., bụ́ mgbe ha jere n’otu ugwu dị na Galili izute Kraịst ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie! (Matiu 28:16) “Ndị [karịrị narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna” pụrụ ịnọwo ya n’ihe omume ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:6) Ha nọgidere na-echeta ọrụ Jisọs nyere ha. Ọ gwara ha, sị: “Gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) N’agbanyeghị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ, ha nwere ọṅụ dị ukwuu n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ ka ha hụrụ ka a na-eguzobe ọgbakọ nke ụmụazụ Kraịst n’ebe dị iche iche. Ka oge na-aga, ‘a nọ na-ekwusa ozi ọma ahụ n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.’—Ndị Kọlọsi 1:23; Ọrụ 1:8; 16:5.

4. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka e zipụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

4 Ná mmalite ije ozi ya na Galili, Jisọs kpọrọ ndị ozi 12 ahụ ma zipụ ha, karịsịa, ịkpọsa, sị: “Alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 10:1-7) Ya onwe ya “na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile [dị na Galili], na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịanrịa nile dị iche iche.” Jisọs nwere ọmịiko n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ “n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:35, 36) Mgbe ahụ, n’ịbụ onye a kpaliri n’ụzọ dị ukwuu, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ [Jehova Chineke], ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Matiu 9:37, 38) Nchọpụta a Jisọs mere banyere mkpa e nwere maka ndị ọrụ owuwe ihe ubi na nke o mere na Judia mgbe ozi elu ala ya fọdụrụ nanị ọnwa isii, bụ otu ihe. (Luk 10:2) Na nke ọ bụla n’ime oge ndị ahụ, o zipụrụ ụmụazụ ya dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi.—Matiu 10:5; Luk 10:3.

Ozi Olileanya Anyị Na-ezi

5. Ozi dị aṅaa ka anyị na-ezi?

5 Dị ka ndị ohu Jehova n’oge a, anyị na-eji ọṅụ aza òkù ahụ a na-akpọ maka ndị ọrụ owuwe ihe ubi. Otu ihe so eme ka anyị na-enwe ọṅụ bụ na anyị na-ewegara ndị nwere nkụda mmụọ na ndị dara mbà n’obi ozi olileanya. Dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ, lee ihe ùgwù anyị nwere ikwusara ndị ‘a na-esogbu, na-achụsakwa, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha,’ ozi ọma—ezigbo ozi olileanya!

6. Ọrụ dị aṅaa ka ndị ozi rụrụ na narị afọ mbụ?

6 Ka ọ na-erule etiti narị afọ mbụ, Pọl onyeozi nọ na-arụsi ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ ike. Ọrụ owuwe ihe ubi ya dịkwa irè n’ezie, n’ihi na mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọrint akwụkwọ n’ihe dị ka 55 O.A., o kwuru, sị: “Emee m ka unu mara, ụmụnna m, ozi ọma ahụ nke m ziri unu, nke unu natakwara, nke unu na-eguzokwa n’ime ya.” (1 Ndị Kọrint 15:1) Ndị ozi na ndị ọzọ bụ́ ndị Kraịst n’oge mbụ bụ ndị ọrụ owuwe ihe ubi na-arụsi ọrụ ike. Ọ bụ ezie na Bible agwaghị anyị ndị ozi ole biri ndụ gabiga ihe omume ndị ahụ dị oké mkpa bụ́ ndị jedebere mgbe e bibiri Jerusalem na 70 O.A., anyị maara na Jọn onyeozi ka nọ na-eme nkwusa ihe dị ka afọ 25 mgbe nke ahụ gasịrị.—Mkpughe 1:9.

7, 8. Olee ozi olileanya ndị ohu Jehova ji ịdị ngwa na-akpọsa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ?

7 E mesịa, a bịara nwee ọtụtụ narị afọ mgbe ndị ụkọchukwu Krisendọm, bụ́ “onye ahụ na-emebi iwu” nke si n’ezi ofufe dapụ, chịkwara ihe. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3) Otú ọ dị, ka ọ na-erule ọgwụgwụ narị afọ nke 19, ndị chọrọ ime ka ndụ ha kwekọọ n’Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ malitere izi ozi olileanya ahụ, na-akpọsa Alaeze ahụ. N’ezie, kemgbe e bipụtara magazin a na nke mbụ ya (July 1879), aha ya agụnyewo okwu ndị dị ka “Ikwupụta Ọnụnọ Kraịst,” “Ikwupụta Alaeze Kraịst,” ma ọ bụ “Ikwupụta Alaeze Jehova.”

8 E guzobere Alaeze eluigwe nke Chineke n’aka Jisọs Kraịst na 1914, anyị jikwa ịdị ngwa akpọsa ozi olileanya ahụ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọgwụgwụ dị ezi nso nke ajọ usoro ihe dị ugbu a so ná ngọzi ndị ịchịisi Alaeze ahụ ga-eweta. (Daniel 2:44) È nwere ozi pụrụ ịka nke a mma? È nwekwara ihe ọzọ pụrụ inye anyị ọṅụ karịa ikere òkè n’ikwupụta Alaeze ahụ tupu “mkpagbu ukwu” ahụ etiwapụ?—Matiu 24:21; Mak 13:10.

Ịchọ Ihe Bụ́ nke Na-aga nke Ọma

9. Ntụziaka dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa otú ndị mmadụ si meghachi omume n’ebe ozi Alaeze ahụ dị?

9 Ihe ọzọ so enye anyị ọṅụ dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi bụ ihe ịga nke ọma anyị na-enwe n’ịchọpụta ndị ga-aghọ ndị na-eso ụzọ ma sonyere anyị n’ọrụ owuwe ihe ubi a. Laa azụ na 31-32 O.A., Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka, sị: “Obodo ọ bụla ma ọ bụ obodo nta ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, chọpụtanụ onye kwesịrị n’ime ya.” (Matiu 10:11) Ọ bụghị mmadụ nile kwesịrị ekwesị, dị ka mmeghachi omume ha n’ebe ozi Alaeze ahụ dị, gosiri. Otú o sina dị, ndị na-eso ụzọ Jisọs ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ahụ n’ebe ọ bụla ndị mmadụ nọ.

10. Olee otú Pọl si gaa n’ihu n’ịchọ ndị kwesịrị ekwesị?

10 Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, e ji ịnụ ọkụ n’obi gaa n’ihu n’ịchọ ndị kwesịrị ekwesị. Pọl sooro ndị Juu nọ n’ụlọ nzukọ ha na mmadụ ndị nọ n’ọmà ahịa n’Atens, tụgharịa uche. Mgbe ọ gbara àmà n’Areọpagọs nke dị n’obodo ahụ dị na Gris, “ndị ikom ụfọdụ rapaara n’ahụ ya, wee kwere na Jisọs: n’etiti ha Daịọnisiọs onye Areọpagọs dịkwa, na otu nwanyị, aha ya bụ Damaris, ha na ndị ọzọ.” Ebe ọ bụla Pọl gara, o setịpụkwara ihe nlereanya n’ime nkwusa “n’ihu ọha mmadụ, n’ụlọ nke aka [ha] kwa n’otu n’otu.”—Ọrụ 17:17, 34; 20:20.

11. Ụzọ ndị dị aṅaa ka e si jee ozi ahụ n’ọtụtụ afọ gara aga?

11 N’iri afọ ndị ikpeazụ nke narị afọ nke 19, ndị Kraịst e tere mmanụ ji nkwuwa okwu tinye isi n’ịchọ ndị kwesịrị ekwesị. N’isiokwu bụ́ “Ndị E Tere Mmanụ Ime Nkwusa,” Zion’s Watch Tower nke July/August 1881 kwuru, sị: “Nkwusa nke ozi ọma ahụ . . . na-aga n’ihu ‘n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ’—ndị dị njikere ma nwee ike ịnụ, iji si na ha nweta ahụ nke Kraịst, ndị ha na Ya ga-eketakọ ihe.” Ndị ọrụ owuwe ihe ubi Chineke na-ezutekarị ndị mmadụ ka ha si chọọchị alọta ma na-enye ha traktị ndị bu ozi sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị e dere iji kpalie mmeghachi omume dị mma n’ebe ndị kwesịrị ekwesị nọ. Mgbe Ụlọ Nche (Bekee) nke May 15, 1903, jisịrị nlezianya tụleghachi otú ụzọ a e si agba àmà si dị irè, ọ gbara ndị ọrụ owuwe ihe ubi ume ikesawa traktị “site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’ụtụtụ Sunday.”

12. Olee otú anyị siworo mee ka ọrụ nkwusa anyị dịkwuo irè? Nye ihe atụ.

12 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, anyị emeela ka ozi anyị sakwuo mbara site n’ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe na-abụghị ebe obibi ha. Nke a abụrụwo nnọọ ihe dị irè n’ala ebe ọnọdụ akụ̀ na ụba na nchụso ihe ụtọ na-eme ka ndị mmadụ ghara ịdị na-anọ n’ụlọ mgbe anyị jikarị aga na nke ha. Mgbe otu Onyeàmà nọ n’England na enyi ya hụrụ ndị ọbịa ka ha na-eji bọs ala mgbe nile mgbe ha kporichara ndụ n’ụsọ oké osimiri, ha ji obi ike banyewa bọs ndị ahụ ma na-enyefe ndị nọ na ha Ụlọ Nche na Teta! N’otu ọnwa, ha kesara mkpụrụ 229. Ha na-akọ, sị: “Anyị adịghị atụ egwu ịgba àmà n’ụsọ oké osimiri, n’ógbè azụmahịa, ma ọ bụ ihe ịma aka ọ bụla ọzọ anyị pụrụ izute n’ihi na anyị maara na Jehova nọnyeere anyị mgbe nile.” Ha guzobere ụzọ magazin, malite ọmụmụ Bible, ha abụọ ekerewokwa òkè n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka.

13. Mgbanwe dị aṅaa ka ọ dị mkpa ime n’ozi anyị ugbu a n’ebe ụfọdụ?

13 Ka anyị na-anọgide na-achọ ndị kwesịrị ekwesị, ọ pụrụ ịdị mkpa iji nlezianya tụleghachi ozi anyị n’ebe ụfọdụ. Ọ bụ ezie na ọtụtụ Ndịàmà na-emekarị nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ụtụtụ Sunday, n’ebe ụfọdụ, ha na-achọpụta na ịga n’ebe obibi ndị mmadụ n’ụtụtụ anaghị adịcha irè n’ihi na ndị bi na ha nwere ike na-ehi ụra. Site n’ịgbanwe usoro ihe omume ha, ọtụtụ Ndịàmà na-achọzi ndị mmadụ n’ehihie, ikekwe mgbe ha mechisịrị nzukọ ndị Kraịst. N’ezie, ịchọ ihe a amịpụtawokwa mkpụrụ. N’afọ gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze n’ụwa nile ji pasent 2.3 rịa elu. Nke a na-ewetara Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ nsọpụrụ, na-emekwa ka obi anyị ṅụrịa.

Nọgidenụ Na-enwe Udo n’Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ

14. Àgwà dị aṅaa ka anyị ji ezi ozi anyị, n’ihi gịnịkwa?

14 Ihe ọzọ mere anyị ji enwe ọṅụ metụtara àgwà udo anyị na-egosipụta n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. “Mgbe unu na-aba n’ụlọ ahụ,” ka Jisọs kwuru, “keleenụ ya. Ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị, ka udo unu bịakwasị ya.” (Matiu 10:12, 13) Ekele ndị Hibru ahụ na okwu ya na ya kwekọrọ na Grik e ji dee Bible na-enyecha echiche bụ́ ‘Ya gaziere gị.’ Echiche a na-eduzi otú anyị si emeso ndị mmadụ ihe mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ. Olileanya anyị bụ na ha ga-anabata ozi Alaeze ahụ. Ndị mere otú ahụ nwere atụmanya nke iso Chineke dịghachi ná mma ka ha na-echegharị site ná mmehie ha, chigharịa, ma mee uche ya. N’aka nke ya, iso Chineke dị n’udo na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Jọn 17:3; Ọrụ 3:19; 13:38, 48; 2 Ndị Kọrint 5:18-20.

15. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe àgwà udo mgbe anyị na-ahụ mmeghachi omume na-adịghị mma n’ọrụ nkwusa anyị?

15 Ànyị pụrụ isi aṅaa nọgide na-enwe udo mgbe anyị na-enweta mmeghachi omume na-adịghị mma? Jisọs tụziri, sị: “Ọ bụrụ na [ụlọ ahụ ekwesịghị], ka udo unu laghachikwute unu ọzọ.” (Matiu 10:13) Ihe ndekọ Luk banyere nzipụ e zipụrụ ndị na-eso ụzọ 70 na-agụnye okwu Jisọs, bụ́: “Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-anọkwasị ya: ma ọ bụrụ na onye udo anọghị ya, udo unu ga-alaghachiri unu ọzọ.” (Luk 10:6) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, mgbe anyị ji ozi ọma ahụ na-agakwuru ndị mmadụ, anyị na-eji ụzọ dị mma, dịkwa n’udo eme ya. Nanị ihe enweghị mmasị, mkpesa, ma ọ bụ okwu ọjọọ nke onye nwe ụlọ na-eme bụ ime ka ozi udo anyị ‘laghachikwute anyị.’ Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a na-anapụ anyị udo, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Jehova.—Ndị Galetia 5:22, 23.

Ihe Mgbaru Ọsọ Dị Mma nke Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi

16, 17. (a) Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ anyị mgbe anyị na-eme nletaghachi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere ajụjụ ndị dabeere na Bible aka?

16 Dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi, obi dị anyị ụtọ ikere òkè n’ịchịkọta ndị mmadụ maka ndụ ebighị ebi. Leekwa ọṅụ anyị na-enwe mgbe onye anyị meere nkwusa nabatara ya, chọọ ịmụtakwu ihe, ma gosi na ọ bụ “onye udo”! Ikekwe ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ dabeere na Bible, o kweghịkwa anyị omume ịza ha nile n’otu nnọkọ. Ebe ọ pụrụ ịbụ na o kwesịghị ekwesị ka anyị nọtee aka n’ụbọchị mbụ anyị na ya nọrịtara, gịnị ka anyị pụrụ ime? Anyị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ yiri nke a a tụrụ aro ya ihe dị ka afọ 60 gara aga.

17 “Ndị nile bụ́ ndịàmà Jehova kwesịrị ịdị njikere iduzi ọmụmụ ihe nlereanya dabeere na Bible.” E kwuru okwu ahụ na nke atọ n’ime usoro nke akwụkwọ nta ndị e ji zie ihe, ndị aha ha bụ Model Study (Ọmụmụ Ihe Nlereanya), bụ́ ndị e bipụtara site na 1937 ruo 1941. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ndị nile bụ́ ndị nkwusa [Alaeze] kwesịrị ịdị uchu n’inyere ndị ihe ha dị Chineke ezi mma bụ́ ndị na-egosipụta mmasị n’ozi Alaeze ahụ aka n’ụzọ nile o kwere mee. E kwesịrị ime mkpọghachi azụ [nletaghachi] n’ebe ndị a nọ, na-aza ajụjụ dị iche iche . . . , ma malitezie ọmụmụ ihe nlereanya . . . ngwa ngwa o kwere mee.” Ee, ihe mgbaru ọsọ anyị n’ime nletaghachi bụ ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi ma na-eduzi ya mgbe nile. * Inwe àgwà enyi na nchegbu ịhụnanya n’ebe onye ahụ nwere mmasị nọ na-akpali anyị ịkwadebe nke ọma ma duzie ọmụmụ ihe ahụ n’ụzọ dị irè.

18. Ànyị pụrụ isi aṅaa nyere ndị ọhụrụ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst?

18 Site n’iji akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na broshuọ ndị dị ka Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? mee ihe, anyị pụrụ iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi dị irè, anyị pụkwara isi otú ahụ kere òkè n’inyere ndị ọhụrụ nwere mmasị aka ịghọ ndị na-eso ụzọ. Ka anyị na-achọ iṅomi Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, o yiri ka ndị dị otú ahụ a na-amụrụ Bible hà ga-amụtakwa ihe site n’àgwà udo na nke ọṅụ anyị, ezi obi anyị, na ùgwù anyị na-akwanyere ụkpụrụ na ntụziaka dị iche iche nke Jehova. Mgbe anyị nyeere ndị ọhụrụ aka ịmara azịza nye ajụjụ ndị ha na-ajụ, ka anyị meekwa ihe anyị pụrụ ime iji kụziere ha otú ha pụrụ isi na-azaghachi ndị na-ajụ ha ajụjụ. (2 Timoti 2:1, 2; 1 Pita 2:21) Dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ, n’ezie anyị pụrụ inwe ọṅụ na e duziri nkezi nke ọmụmụ Bible ebe obibi dị 4,766,631 n’ụwa nile n’afọ ije ozi gara aga. Anyị ga-enwe ọṅụ karịsịa ma ọ bụrụ na anyị so ná ndị ọrụ owuwe ihe ubi ahụ keere òkè n’ọrụ iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi.

Nọgidenụ Na-enwe Ọṅụ n’Owuwe Ihe Ubi Ahụ

19. N’ihi gịnị ka e ji nwee ezi ihe ndị mere e ji nwee ọṅụ n’owuwe ihe ubi ahụ n’oge Jisọs jere ozi nakwa n’oge na-adịghị anya ọ gasịrị?

19 E nwere ezi ihe ndị mere e ji nwee ọṅụ n’owuwe ihe ubi ahụ n’oge Jisọs jere ozi nakwa n’oge na-adịghị anya ọ gasịrị. Ọtụtụ ndị n’oge ahụ nabatara ozi ọma ahụ. E nwere ọṅụ dị ukwuu karịsịa na Pentikọst 33 O.A., n’ihi na n’oge ahụ, ihe dị ka mmadụ 3,000 nakweere ntụziaka Pita, nata mmụọ nsọ Jehova, ma sonye ná mba Chineke nke Israel ime mmụọ mejupụtara. N’ezie, ọnụ ọgụgụ ha nọgidere na-amụba, ha nwekwara ọṅụ dị ukwuu ka ‘Onyenwe anyị na-atụkwasịrị ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.’—Ọrụ 2:37-41, 46, 47; Ndị Galetia 6:16; 1 Pita 2:9.

20. Gịnị na-enye anyị ọṅụ dị ukwuu n’ọrụ owuwe ihe ubi anyị?

20 N’oge ahụ, amụma Aịsaịa nọ na-emezu: “I [Jehova] mewo ka mba ahụ baa ụba, I mewo ka ọṅụ dịịrị ya ukwuu: ha aṅụrịwo n’ihu Gị dị ka ọṅụ nke dị n’owuwe ihe ubi, dị ka mmadụ si etegharị egwú ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara n’agha.” (Aịsaịa 9:3) Ọ bụ ezie na anyị na-ahụzi ‘mba ahụ bara ụba’ nke ndị e tere mmanụ ka ọ fọrọ nke nta ka ha zuo, ọṅụ anyị na-aba ụba ka anyị na-ahụ ọnụ ọgụgụ nke ndị ọzọ na-arụ ọrụ owuwe ihe ubi ka ha na-amụba kwa afọ.—Abụ Ọma 4:7; Zekaraịa 8:23; Jọn 10:16.

21. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

21 N’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nọgide na-aṅụrị ọṅụ n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ. Ozi olileanya anyị na-ezi, ọchịchọ anyị na-achọ ndị kwesịrị ekwesị, na àgwà ime udo anyị—ihe a nile na-enye anyị ọṅụ dị ka ndị ọrụ owuwe ihe ubi. Ma, ha na-akpasu ọtụtụ ndị iwe. Jọn onyeozi hụrụ nke a. A tụrụ ya mkpọrọ n’àgwàetiti Patmọs, “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) Oleezi otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ọṅụ mgbe anyị chere mkpagbu na mmegide ihu? Gịnị ga-enyere anyị aka ịnagide àgwà obi ọjọọ nke ọtụtụ ndị anyị na-ekwusara ozi ọma ugbu a? Isiokwu anyị na-esonụ nwere enyemaka dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ịza ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Na mbụ, a haziri ọmụmụ ihe n’ebe ìgwè ndị nwere mmasị pụrụ ịgbakọta. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, e sooro ndị mmadụ n’otu n’otu nakwa ezinụlọ dị iche iche na-enwe ọmụmụ ihe.—Lee Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, peeji nke 574, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ ọrụ owuwe ihe ubi ihe atụ ahụ?

• Ụdị ozi dị aṅaa ka anyị na-akpọsa?

• Gịnị mere anyị ji enwe ihe ịga nke ọma n’ịchọpụta ndị na-eso ụzọ?

• Olee otú anyị si anọgide na-enwe udo n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ?

• Gịnị mere anyị ji anọgide na-aṅụrị ọṅụ n’owuwe ihe ubi ahụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]

Ime nkwusa na narị afọ nke 1 nakwa na nke 20

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Dị ka Pọl, ndị ọrụ owuwe ihe ubi nke oge a na-agbalị ijekwuru ndị mmadụ n’ebe nile

[Foto dị na peeji nke 13]

Jiri mmụọ dị mma na-akpọsa ozi ọma ahụ