“Chineke Ọ̀ Na-akpọ Ndị Mmadụ Ọkụ Na Hel n’Ezie?”
“Chineke Ọ̀ Na-akpọ Ndị Mmadụ Ọkụ Na Hel n’Ezie?”
“Ùnu na-amụ banyere nkà mmụta okpukpe?”
Ajụjụ a bịara Joel na Carl na mberede. Ụmụ okorobịa abụọ ahụ—ndị ọrụ afọ ofufo na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York—na-enyocha akwụkwọ n’otu ụlọ ahịa a na-ere akwụkwọ bụ́ nke dị nso. Ka Joel na-enyochagasị akwụkwọ ndepụta okwu Bible dị iche iche, Carl kọọrọ ya mkparịta ụka o nwere n’ozi. Mgbe otu nwoke nọ nso nụpeere mkparịta ụka a, a kpaliri ya ijekwuru ha.
Otú ọ dị, nwoke ahụ nwere ihe na-echegbu ya karịa ịmata ma ụmụ okorobịa abụọ ahụ ha na-amụ banyere nkà mmụta okpukpe. Ọ kọwara, sị: “Abụ m onye Juu, ụfọdụ ndị enyi m bụ́ ndị Kraịst agwawo m na a ga-akpọ m ọkụ na hel n’ihi na ndị Juu jụrụ Jisọs. Nke a na-enye m nnọọ nsogbu. O yighị ka o ziri ezi ntaramahụhụ dị otú ahụ isi n’aka Chineke na-ahụ n’anya. Chineke ọ̀ na-akpọ ndị mmadụ ọkụ na hel n’ezie?”
Joel na Carl gwara nwoke a nwere obi eziokwu na ha bụ ndị ji ịdị uchu na-amụ Bible. Ha gosiri ya site n’Akwụkwọ Nsọ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla nakwa na ha nọ nanị n’ụra ọnwụ, na-echere mbilite n’ọnwụ. N’ihi ya, ha adịghị enwe mmekpa ahụ ọ bụla ma ọ bụ na-ata ahụhụ na hel na-ere ọkụ. (Abụ Ọma 146:3, 4; Eklisiastis 9:5, 10; Daniel 12:13; Jọn 11:11-14, 23-26) Mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka ahụ were minit 45, nwoke ahụ nyere Joel na Carl adres ya ma rịọ ha ka ha wetakwuoro ya ihe ọmụma n’isiokwu ahụ.
Ọ bụrụ na hel bụ ebe mmekpa ahụ na-ere ọkụ, ọ̀ dị onye ga-anwa anwa rịọ ka e ziga ya ebe ahụ? Ma, nna ochie bụ́ Job, mgbe ọ na-achọ inwere onwe ya pụọ n’ọnọdụ ọjọọ ya, rịọrọ arịrịọ a, sị: “Ònye ga-emere m ihe a, ka i chebe m na hel, zobekwa m ruo mgbe iwe gị ga-agabiga?” (Job 14:13, Douay Version) N’ụzọ doro anya, Job ekweghị na hel bụ ebe mmekpa ahụ. Kama nke ahụ, ọ chọrọ ka e chebe ya n’ebe ahụ. Ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị adị, hel nke Bible kwuru banyere ya bụkwa ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ na olileanya pụrụ ịdị mgbe nke a gasịrị, e ji obi ụtọ na-agba gị ume ime ihe a na-esonụ.