‘Ngọzi Nile Na-adịrị Onye Ezi Omume’
‘Ngọzi Nile Na-adịrị Onye Ezi Omume’
“NWATA ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri,” ka ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kwuru mgbe o mere agadi. (Abụ Ọma 37:25) Jehova Chineke hụrụ ndị ezi omume n’anya ma na-elekọta ha nke ọma. Ọ na-agba ndị na-efe ezi ofufe ume n’Okwu ya bụ́ Bible ka ha chọọ ezi omume.—Zefanaịa 2:3.
Ezi omume bụ ọnọdụ nke izi ezi n’anya Chineke site n’ime ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nke ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ịgba anyị ume ime ihe kwekọrọ n’uche Chineke, isi nke 10 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-ezo aka ná ngọzi ndị na-abịara ndị na-eme otú ahụ. Ụba nri ime mmụọ na-edozi ahụ, ọrụ na-akwụghachi ụgwọ ma na-eju afọ, na iso Chineke na mmadụ na-enwe mmekọrịta dị mma, socha ná ngọzi ndị a. Ya mere, ka anyị tụgharịa uche n’Ilu 10:1-14.
Ezigbo Ihe Mkpali
Okwu mmalite nke isiakwụkwọ ahụ kọwara n’ụzọ doro anya onye dere nkebi na-esonụ n’akwụkwọ Ilu. Ha na-agụ, sị: “Ilu dị iche iche nke Solomọn.” N’ime ka a mata ezigbo ihe na-akpali mmadụ ime ezi ihe, Eze Solomọn nke Israel oge ochie na-ekwu, sị: “Nwa nke maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa: ma nwa dị nzuzu bụ iru újú nke nne ya.”—Ilu 10:1.
Lee ka o si ewute ndị nne na nna mgbe ụmụ ha hapụrụ ofufe nke ezi Chineke ahụ dị ndụ! Eze ahụ maara ihe họọrọ iru újú nke nne, ikekwe iji gosi na ọ na-ewute nne n’ụzọ dị ukwuu karị. Otú ahụ ka ọ dị Doris. * Ọ na-akọ, sị: “Obi gbawara mụ na di m, bụ́ Frank, mgbe nwa anyị nwoke dị afọ 21 hapụrụ eziokwu ahụ. Enwere m oké ihe mgbu nke uche karịa ka Frank nwere. Ihe mgbu m na-enwe akwụsịbeghị ka afọ 12 gafecharala.”
Ụmụaka pụrụ ime ihe ga-ewute nna ha ma kpatara nne ha obi mgbu. Ka anyị gosipụta na anyị nwere amamihe ma wetara ndị mụrụ anyị ọṅụ. Nke kakwa mkpa, ka anyị mee ka obi Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, ṅụrịa.
‘Afọ Ga-eju Mkpụrụ Obi Onye Ezi Omume’
“Akụ̀ nke mmebi iwu adịghị aba uru,” ka eze ahụ na-ekwu, “ma ezi omume na-anapụta n’ọnwụ.” (Ilu 10:2) Okwu ndị a dị oké mkpa n’ezie nye ezi ndị Kraịst na-ebi n’ime ime mgbe ọgwụgwụ. (Daniel 12:4) Mbibi nke ụwa na-adịghị asọpụrụ Chineke dị nso. Ọ dịghị ihe nchebe sitere n’aka mmadụ—ihe onwunwe, ego, ma ọ bụ ngwá agha—nke ga-echebe mmadụ ‘n’oké mkpagbu’ nke na-abịanụ. (Mkpughe 7:9, 10, 13, 14) Ọ bụ nanị “ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya.” (Ilu 2:21) N’ihi ya, ka anyị nọgide ‘na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’—Matiu 6:33.
Ọ dịghị ndị ohu Jehova mkpa ichere ruo mgbe ụwa ọhụrụ ahụ e kwere ná nkwa bịara tupu ha amalite inweta ngọzi Chineke. “Jehova agaghị ekwe ka agụụ gụgbuo mkpụrụ obi onye ezi omume: ma ọchịchọ nke ndị na-emebi iwu na-achọsi ike ka Ọ na-akwapụ.” (Ilu 10:3) Jehova enyewo anyị nri ime mmụọ n’ụba site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) N’ezie, onye ezi omume nwere ihe ndị mere ọ ga-eji ‘tie mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.’ (Aịsaịa 65:14) Ihe ọmụma na-atọ mkpụrụ obi ya ụtọ. Ọ na-amasị ya ịchọ akụ̀ ime mmụọ. Onye ajọ omume adịghị enwe ihe ụtọ ndị dị otú ahụ.
‘Ịdị Nkọ Na-eme Mmadụ Ọgaranya’
A na-agọzikwa onye ezi omume n’ụzọ ọzọ. “Ogbenye ka onye ji ọbụ aka umengwụ arụ ọrụ Ilu 10:4, 5.
ga-abụ: ma aka ndị dị nkọ na-eme ọgaranya. Onye na-ekpokọta na mgbe okpomọkụ bụ nwa na-enwe uche: ma onye na-arahụ ụra n’owuwe ihe ubi bụ nwa na-eweta ihere.”—Okwu eze ahụ kasị abara ndị na-arụ ọrụ n’oge owuwe ihe ubi uru. Oge iwe ihe ubi abụghị oge ịrahụ ụra. Ọ bụ oge ịdị uchu na ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa. N’ezie, ọ bụ oge ime ihe ngwa ngwa.
N’iburu owuwe ihe ubi nke mmadụ, ọ bụghị nke ọka n’uche, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ [Jehova Chineke], ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Matiu 9:35-38) N’afọ 2000, ihe karịrị nde mmadụ 14 gara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs—ihe karịrị okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ, ònye pụrụ ikwu na ‘ubi ahụ achabeghị acha ka e were ihe dị n’ime ya’? (Jọn 4:35) Ndị na-efe ezi ofufe na-arịọ Onye Nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o zipụkwuo ndị ọrụ, ka ha na-arụsị ọrụ ike n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ n’ikwekọ n’ekpere ha. (Matiu 28:19, 20) Leekwa otú Jehova siworo gọzie mgbalị ha n’ụba! N’afọ ije ozi 2000, e mere ihe karịrị ndị ọhụrụ 280,000 baptism. Ndị a na-agbalịsikwa ike ịghọ ndị na-ezi Okwu Chineke. Ka anyị nweta ọṅụ na afọ ojuju n’oge owuwe ihe ubi a site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ.
‘Ngọzi Nile Na-adịrị Isi Ya’
“Ngọzi nile na-adịrị isi onye ezi omume,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu, “ma [ọnụ ndị na-emebi iwu na-ekpuchi ihe ike, NW].”—Ilu 10:6.
Onye obi ya dị ọcha ma zie ezie na-enye ihe àmà zuru ezu nke ezi omume ya. Ọ na-ekwu okwu na-eru n’obi na nke na-ewuli elu, ọ na-eme omume dị mma ma na-emesapụ aka. Ndị ọzọ na-anabata ya nke ọma. Ha na-akwanyere onye dị otú ahụ ùgwù—ha na-agọzi ya—n’ụdị na ha na-ekwu okwu ọma banyere ya.
N’aka nke ọzọ, onye ajọ omume na-akpọ asị ma ọ bụ na-enwe obi ilu, ebumnobi ya bụ́ isi bụkwa imerụ ndị ọzọ ahụ. Ọ pụrụ inwe ire ụtọ, ọ pụkwara ‘ikpuchi ihe ike’ nke dị ya n’obi, ma n’ikpeazụ, ọ na-eji ọkpụkpụ aka na ọnụ awakpo mmadụ. (Matiu 12:34, 35) Ma ọ bụkwanụ, “ihe ike na-ekpuchi [ma ọ bụ mechie] ọnụ ndị na-emebi iwu.” (Ilu 10:6) Nke a na-egosi na ndị mmadụ na-emesokarị onye ajọ omume ihe otú o si emeso ndị ọzọ, nke bụ́ ibuso ya iro. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, nke a na-ekpuchi, ma ọ bụ na-emechi, ọnụ ya ma mee ka ọ ghara ikwu okwu. Olee otú onye dị otú ahụ ga-esi atụ anya inweta ngọzi n’aka ndị ọzọ?
“Ncheta a na-echeta onye ezi omume bụ ihe ngọzi,” ka eze Israel na-ede, “ma aha ndị na-emebi iwu ga-ere ure.” (Ilu 10:7) Ndị ọzọ, karịsịa Jehova Chineke, na-echeta onye ezi omume n’ihi ihe ọma ya. N’ihi na Jisọs kwesịrị ntụkwasị obi ya ruo ọnwụ, o ‘ketara aha mara mma’ karịa nke ndị mmụọ ozi. (Ndị Hibru 1:3, 4) Taa, ezi ndị Kraịst na-echeta ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst dị ka ndị setịpụrụ ihe nlereanya kwesịrị nṅomi. (Ndị ) Lee otú nke a si dị iche n’ebe aha ndị ajọ omume dị, bụ́ nke na-aghọ ihe a na-asọ oyi na ihe rere ure! Ee, “ihe a na-ahọpụta ka ezi aha bụ karịa ọtụtụ akụ̀, amara dịkwa mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.” ( Hibru 12:1, 2Ilu 22:1) Ka anyị meere onwe anyị ezi aha n’ebe Jehova na mmadụ ibe anyị nọ.
‘Onye Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe Ga-eje Ije ná Ntụkwasị Obi’
N’igosi ọdịiche dị n’etiti onye maara ihe na onye nzuzu, Solomọn na-ekwu, sị: “Ndị obi ha maara ihe ga-anata ihe e nyere n’iwu: ma onye gbagọrọ agbagọ n’egbugbere ọnụ ya abụọ ka a ga-akwatu.” (Ilu 10:8) Onye maara ihe maara nke ọma na “ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Ọ na-aghọta mkpa ọ dị ịchọ nduzi n’aka Jehova ma na-anakwere ihe Chineke nyere n’iwu ngwa ngwa. N’aka nke ọzọ, onye gbagọrọ agbagọ n’egbugbere ọnụ ya adịghị aghọta eziokwu a bụ́ isi. Okwu iberibe ọ na-ekwu na-ewetara ya mbibi.
Onye ezi omume na-enwetakwa ụdị nchebe onye ajọ omume na-adịghị enweta. “Onye [ji iguzosi ike n’ezi ihe na-eje ije, NW] na-eje ná ntụkwasị obi: ma onye na-eme ka ụzọ ya nile gbagọọ agbagọọ, a ga-amara ya. Onye na-egbu iku anya na-enye ihe mwute: ma onye gbagọrọ agbagọ n’egbugbere ọnụ ya abụọ ka a ga-akwatu.”—Ilu 10:9, 10.
Onye na-eguzosi ike n’ezi ihe na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla ọ na-eme. Ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù ma na-atụkwasị ya obi. Onye were onye na-akwụwa aka ọtọ n’ọrụ ji ya akpọrọ ihe, na-enyekwa ya ibu ọrụ ka ukwuu. Ọmụma a maara ya dị ka onye na-akwụwa aka ọtọ ga-eme ka ọ nọgide na-arụ ọrụ ọbụna mgbe ọrụ dị ụkọ. Ọzọkwa, ịkwụwa aka ọtọ ya so eme ka ọ na-enwe udo na ọnọdụ dị mma n’ebe obibi ya. (Abụ Ọma 34:13, 14) Ahụ na-eru ya ala ná mmekọrịta nke ya na ndị òtù ezinụlọ ya. N’ezie, ịnọ ná nchebe bụ mkpụrụ iguzosi ike n’ezi ihe na-amịpụta.
Nke ahụ dị iche n’ebe onye na-adịghị akwụwa aka ọtọ n’ihi uru ọdịmma onwe onye nanị kpaliri, nọ. Onye aghụghọ pụrụ ịnwa iji okwu gbagọrọ agbagọ ma ọ bụ mmegharị ahụ kpuchie emeghị ihe n’eziokwu ya. (Ilu 6:12-14) Iku anya o ji ebumnobi ọjọọ na aghụghọ na-egbu pụrụ ịkpatara ndị ọ ghọgburu oké ihe mgbu nke uche. Ma n’oge na-adịghị anya, a na-amata aghụghọ nke onye dị otú ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Mmehie mmadụ ụfọdụ na-apụta ìhè, n’ihi na ha buru ha ụzọ na-aga ikpe; ma mmehie mmadụ ụfọdụ na-esokwa ha n’azụ. Otú ahụ, ọrụ nile nke dị mma na-apụtakwa ìhè; a pụghịkwa izobe ọrụ nke dị iche.” (1 Timoti 5:24, 25) N’agbanyeghị onye o metụtara—ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna, enyi, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụkwanụ onye mmadụ maara—a na-emesị kpughee akwụwaghị aka ọtọ ahụ. Ònye pụrụ ịtụkwasị onye a ma ama dị ka onye na-adịghị akwụwa aka ọtọ, obi?
‘Ọnụ Ya Bụ Isi Iyi nke Ndụ’
“Isi iyi nke ndụ ka ọnụ onye ezi omume bụ,” ka Solomọn na-ekwu, “ma ime ihe ike na-ekpuchi ọnụ ndị na-emebi iwu.” (Ilu 10:11) Okwu ọnụ pụrụ ịgwọ mmadụ ma ọ bụ imerụ mmadụ ahụ. Ọ pụrụ ime ka mmadụ nwee ume ọhụrụ ma bụrụ onye e wuliri elu, ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ịkụda onye ahụ mmụọ.
Ilu 10:12) Ịkpọasị na-akpata iseokwu n’obodo, na-akpalikwa ịlụ ọgụ. Ndị hụrụ Jehova n’anya aghaghị iwezụga ịkpọasị ná ndụ ha. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji ịhụnanya dochie ya. “Ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) Ịhụnanya “na-anagide ihe nile,” ya bụ “ọ na-ekpuchi ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7; Kingdom Interlinear) Ịhụnanya kwekọrọ na nke Chineke adịghị atụ anya izu okè n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Kama ịdị na-akọsagharị njehie nke ndị ọzọ, ịhụnanya dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ileghara njehie ha anya, ọ gwụla ma ha bụ mmehie dị oké njọ. Ọbụna ịhụnanya na-enyere anyị aka idi mmeso ọjọọ a na-emeso anyị n’ozi ubi, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ.
N’ịkọwa ihe na-akpata okwu ụfọdụ a na-ekwu, eze Israel ahụ na-ekwu, sị: “Ịkpọasị na-akpọte iseokwu dị iche iche: ma njehie nile ka ịhụnanya na-ekpuchi.” (Eze ahụ maara ihe na-aga n’ihu, sị: “N’egbugbere ọnụ nke onye na-aghọta ihe ka a na-achọta amamihe: ma mkpanaka dịịrị azụ onye obi amamihe kọrọ.” (Ilu 10:13) Amamihe nke onye nwere nghọta na-eduzi nzọụkwụ ya. Okwu ndị na-ewuli elu ọ na-ekwu na-enyere ndị ọzọ aka ije ije n’ụzọ nke ezi omume. A gaghị eduru ya na ndị na-ege ya ntị gaa n’ụzọ ziri ezi n’ike—mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị.
“Na-akpakọba Ihe Ọmụma”
Gịnị na-enye aka eme ka okwu anyị bụrụ ‘iyi na-eru eru nke amamihe’ kama ịbụ nke okwu na-abaghị n’ihe? (Ilu 18:4) Solomọn na-aza, sị: “Ndị maara ihe na-akpakọba ihe ọmụma: ma ọnụ onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya bụ mbibi dị nso.”—Ilu 10:14.
Ihe mbụ a chọrọ n’aka anyị bụ ime ka ihe ọmụma na-ewuli elu nke Chineke jupụta n’uche anyị. E nwere nanị otu ebe e si enweta ihe ọmụma ahụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Anyị aghaghị ịdị na-akpakọba ihe ọmụma ma na-egwuba n’ime Okwu Chineke dị ka a ga-asị na anyị na-achọ akụ̀ zoro ezo. Lee otú ịchọ ihe dị otú ahụ si bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ ọrụ!
Ka e wee chọta amamihe n’egbugbere ọnụ anyị, ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ aghaghị iru anyị n’obi. Jisọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ezi mmadu site n’ezi akụ̀ nke obi ya na-ewepụta ezi ihe; ajọ mmadụ sitekwa n’ajọ akụ̀ nke obi ya na-ewepụta ajọ ihe: n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè.” (Luk 6:45) N’ihi ya, anyị aghaghị ịdị na-atụgharị uche mgbe nile n’ihe anyị na-amụta. N’eziokwu, ọmụmụ ihe na ntụgharị uche chọrọ mgbalị, ma lee otú ọmụmụ ihe dị otú ahụ si bụrụ ihe na-aba uru n’ụzọ ime mmụọ! Ọ dịghị ihe mere mmadụ ga-eji gbasoo ụzọ ndụ ịla n’iyi nke onye ekwurekwu nke na-ekwu okwu n’echeghị echiche.
Ee, onye maara ihe na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke ma na-enwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị ọzọ. Ọ na-enweta nri ime mmụọ n’ụba ma na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè bụ́ nke na-akwụghachi ụgwọ. (1 Ndị Kọrint 15:58) N’ihi ịbụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, ọ na-eje ije ná ntụkwasị obi ma nwee nnwapụta Chineke. N’ezie, ngọzi onye ezi omume na-enweta dị ọtụtụ. Ka anyị chọọ ezi omume site n’ime ka ndụ anyị kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke banyere ezi ihe na ihe ọjọọ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 A gbanwewo aha ahụ.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịkwụwa aka ọtọ so akpata obi ụtọ ezinụlọ
[Foto dị na peeji nke 26]
‘Ndị maara ihe na-akpakọba ihe ọmụma’