Origen—Olee Otú Ozizi Ya Si Metụta Chọọchị?
Origen—Olee Otú Ozizi Ya Si Metụta Chọọchị?
“Onye ndú kasịnụ nke Chọọchị mgbe Ndị Ozi nwụsịrị.” Otú a ka Jerome, bụ́ onye sụgharịrị Bible Vulgate nke Latin, si too ọkà mmụta okpukpe ahụ dịrị ndụ na narị afọ nke atọ, bụ́ Origen. Ma, ọ bụghị mmadụ nile na-akwanyere Origen ùgwù otú ahụ. Ụfọdụ weere ya dị ka ajọ mkpọrọgwụ ebe ịjụ okwukwe si pulite. N’ikwu ya otú onye edemede nke narị afọ nke 17 si kwuo ya, ndị na-akatọ Origen kwuru, sị: “Ozizi ya n’ozuzu ya bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya na ihe na-emerụ ahụ, elù Agwọ, nke ọ gbụpụtara n’ime ụwa.” N’ezie, ihe dị ka narị afọ atọ mgbe ọ nwụsịrị, e kwupụtara hoo haa na Origen bụ onye jụrụ okwukwe.
GỊNỊ mere Origen ji bụrụ ma onye a na-asọpụrụ ma onye a kpọrọ asị? Mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’iwulite ozizi chọọchị?
Onye Nụụrụ Chọọchị Ọkụ n’Obi
A mụrụ Origen n’ihe dị ka na 185 O.A. n’obodo Ijipt bụ́ Aleksandria. O nwetara ọzụzụ bụ́ ịgba n’ihe odide ndị Gris, ma nna ya, bụ́ Leonides, rụgidere ya itinyekwa mgbalị ha otú ahụ n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe Origen dị afọ 17, eze ukwu Rom tiri iwu nke mere ka mmadụ ịgbanwe okpukpe ya bụrụ mpụ. A tụrụ nna Origen mkpọrọ n’ihi na ọ ghọwo onye Kraịst. N’ịbụ onye ịnụ ọkụ n’obi okorobịa riri isi, Origen kpebisiri ike isonyere ya n’ụlọ mkpọrọ nakwa ịnwụ n’ihi okwukwe ya. Mgbe nne Origen hụrụ nke a, o zoro uwe ya iji gbochie ya isi n’ụlọ pụọ. Origen ji akwụkwọ ozi rịọ nna ya, sị: “Lezie anya ka ị ghara ịgbanwe obi gị n’ihi anyị.” Leonides kwụgidesiri ike, e gbukwara ya, mee ka ezinụlọ ya nọrọ n’ụkọ. Ma Origen enweelarị nnọọ ọganihu n’ihe ọmụmụ ya ruo n’ókè nke inwe ike ịkwado nne ya na ụmụnne ya ndị ikom isii ọ tọrọ site n’ịkụzi ihe odide ndị Gris.
Ihe eze ukwu ahụ zubere bụ ime ka Iso Ụzọ Kraịst ghara ịgbasa. Ebe ọ bụ na ọ bụghị nanị ụmụ akwụkwọ ka iwu ya lekwasịrị anya kamakwa ndị nkụzi, ndị nkụzi nile nke okpukpe ndị Kraịst si Aleksandria gbapụ. Mgbe ndị na-abụghị ndị Kraịst bụ́ ndị chọrọ ka a kụziere ha Akwụkwọ Nsọ rịọrọ Origen na-eto eto ka o nyere ha aka, ọ nakweere ọrụ a ozugbo dị ka ọrụ si n’aka Chineke. E gburu ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ya n’ihi okwukwe ha, e gburu ụfọdụ ọbụna tupu ha amụchaa ihe ọmụmụ ha. N’itinye ndụ ya n’oké ihe ize ndụ, Origen na-agba ụmụ akwụkwọ ya ume n’ihu ọha, ma hà nọ n’ihu ọkàikpe, n’ụlọ mkpọrọ, ma ọ bụ bụrụ ndị a na-aga igbu egbu. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke anọ bụ́ Eusebius na-akọ na mgbe a na-akpọga ha n’ebe a ga-egbu ha, Origen, “na-eji obi ike dị ukwuu jiri nsusu ọnụ kelee ha.”
Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Kraịst, ndị sịrị na ọ bụ Origen kpatara ntọghata na ọnwụ nke ndị
enyi ha, wesoro ya iwe. Ọtụtụ mgbe, ọ fọrọ nke nta ka aka ìgwè ndị na-eme ihe ike ma ọ bụ ndị chọrọ igbu ya n’ike kpara ya. Ọ bụ ezie na a manyere ya ịdị na-agbagharị site n’otu ebe gaa n’ọzọ iji gbanahụ ndị na-achụ ya, Origen akwụsịghị ihe ọ na-akụzi. Atụghị egwu na nraranye dị otú ahụ masịrị Demetrius, bụ́ bishọp Aleksandria. N’ihi ya, mgbe Origen dị nanị afọ 18, Demetrius mere ya onyeisi ụlọ akwụkwọ maka nkụzi okpukpe n’Aleksandria.Mgbe e mesịrị, Origen ghọrọ ọkà mmụta a ma ama na onye dere ọtụtụ akwụkwọ. Ụfọdụ kwuru na o dere akwụkwọ 6,000, ọ bụ ezie na o yiri ka nke a ọ̀ bụ ikwubiga okwu ókè. A kasị mara ya amara n’ihi Hexapla ya, bụ́ nnukwute mbipụta nke Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ́ nke dị mpịakọta 50. Origen haziri Hexapla ahụ na kọlụm isii dịdewere ibe ha bụ́ ndị nwere: (1) akụkụ ihe odide Hibru na Aramaic, (2) ndepụtagharị nke akụkụ ihe odide ahụ n’asụsụ Grik, (3) nsụgharị Grik nke Aquila, (4) nsụgharị Grik nke Symmachus, (5) Septuagint nke Grik, bụ́ nke Origen dezigharịrị iji kwekọkwuo nke ọma n’ihe odide Hibru, nakwa (6) nsụgharị Grik nke Theodotion. “Site ná njikọta a o jikọtara akụkụ ihe odide dị iche iche,” ka ọkà mmụta Bible bụ́ John Hort dere, “Origen tụrụ anya ịkọwakwu ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-agbagwoju onye na-agụ ya n’asụsụ Grik anya ma ọ bụ duhie ya ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị Septuagint ka o ji.”
‘Ịgabiga Ihe E Dere n’Akwụkwọ’
Otú o sina dị, ọnọdụ okpukpe dị mgbagwoju anya e nwere na narị afọ nke atọ metụtara n’ụzọ dị ukwuu otú Origen si kụzie Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ ezie na Krisendọm ka na-amalite amalite, e jirilarị nkwenkwe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị merụọ ya, chọọchị ya ndị gbasasịrị ebe nile nọkwa na-ezi ozizi dịgasị iche iche.
Origen nakweere ụfọdụ n’ime ozizi ndị a Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, na-akpọ ha ozizi ndị ozi. Ma o chere na ya nweere onwe ya ịkọ nkọ n’okwu ndị ọzọ. Okwu ndị metụtara nkà ihe ọmụma nke oge ha nọ na-esiri ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ya ike ịghọta n’oge ahụ. Ná mgbalị inyere ha aka, Origen ji nlezianya nyochaa echiche nkà ihe ọmụma dị iche iche bụ́ ndị nọ na-akpụzi uche ụmụ akwụkwọ ya na-eto eto. Ọ malitere ịza ụmụ akwụkwọ ya ajụjụ nkà ihe ọmụma ha n’ụzọ nyere ha afọ ojuju.
Ná mgbalị ya ime ka Bible na nkà ihe ọmụma kwekọọ, Origen dabeere nke ukwuu n’ịkọwa Akwụkwọ Nsọ dị ka nke nwere ihe ọzọ ọ pụtara. O weere ya na Akwụkwọ Nsọ na-enwe nkọwa ime mmụọ mgbe nile ma ọ dịchaghị enwe nke nkịtị. Dị ka otu ọkà mmụta si kwuo, nke a nyere Origen “ohere nke inye Bible nkọwa ọ bụla na-adabereghị na Bible bụ́ ndị kwekọrọ n’usoro nkà mmụta okpukpe nke ya, ebe ọ na-azọrọ na ya, (obi abụọ adịghịkwa ya na o ji ezi obi na-eche na ya) bụ kpọmkwem onye ji ịnụ ọkụ n’obi na ikwesị ntụkwasị obi akọwa echiche Bible.”
Otu akwụkwọ ozi Origen degaara otu n’ime ụmụ akwụkwọ ya na-eme ka a ghọta echiche ya. Origen kọwapụtara na ụmụ Israel ji ọlaedo ndị Ijipt mee arịa dị iche iche maka ụlọ nsọ Jehova. Na nke a, ọ chọtara ihe nkwado nke bụ́ ihe atụ maka ojiji o ji nkà ihe ọmụma ndị Gris na-akụzi Iso Ụzọ Kraịst. O dere, sị: “Lee ka ihe ndị e si n’Ijipt weta si baara ụmụ Israel uru, bụ́ nke ndị Ijipt na-ejighị mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ma bụrụ nke ndị Hibru, site n’ịbụ ndị amamihe Chineke duziri, ji mee ihe n’ozi Chineke.” Origen si otú a gbaa ụmụ akwụkwọ ya ume ‘isi na nkà ihe ọmụma ndị Gris na-ewere ihe a pụrụ iji mee ihe dị ka ihe ọmụmụ ma ọ bụ nkwadebe maka Iso Ụzọ Kraịst.’
Usoro a a na-achịkwaghị achịkwa nke isi kọwaa Bible mere ka o sie ike ịmata ọdịiche dị n’etiti ozizi ndị Kraịst na nkà ihe ọmụma ndị Gris. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ ya bụ́ On First Principles, Origen kọwara Jisọs dị ka ‘Ọkpara a mụrụ nanị ya, bụ́ onye a mụrụ amụ, ma bụrụ onye na-enweghị mmalite.’ Ọ gbakwụnyekwara, sị: ‘Ọgbọ ya na-adịru ebighị ebi. Ọ bụghị site n’inweta ume ndụ ka o ji bụrụ Ọkpara, ọ bụghị site n’ihe omume a na-ahụ anya, kama ọ bụ site n’ọdịdị nke Chineke n’onwe ya.’
Origen ahụghị echiche a n’ime Bible, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-akụzi na Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ihe nile e kere eke” na “Isi nke ihe nile Chineke kere.” (Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14) Dị ka ọkọ akụkọ banyere okpukpe bụ́ Augustus Neander si kwuo, Origen nwetara echiche nke “enweghị mmalite” site ‘n’ọzụzụ nkà ihe ọmụma o nwetara banyere ozizi Plato.’ N’ụzọ dị otú a, Origen mebiri ụkpụrụ a bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ, bụ́: “Unu agabigala ihe e deworo n’akwụkwọ.”—1 Ndị Kọrint 4:6.
A Mara Ya Ikpe Dị Ka Onye Jụrụ Okwukwe
N’afọ ndị mbụ ya dị ka onye nkụzi, Nzukọ Ndị Isi Chọọchị e nwere n’Aleksandria napụrụ Origen ọkwá ụkọchukwu ya. Ikekwe ihe a mere n’ihi na Bishọp Demetrius na-enwe anyaụfụ n’ihi otú Origen si na-aghọwanye onye a ma ama. Origen kwagara Palestine, bụ́ ebe a nọgidere na-akwanyere ya ùgwù dị ka onye a ma ama n’ịgbachitere ozizi ndị Kraịst, ọ gakwara n’ihu dị ka ụkọchukwu n’ebe ahụ. N’ezie, mgbe “ịjụ okwukwe” malitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ, a chọrọ enyemaka ya iji mee ka ndị bishọp na-ehie ụzọ kwenye ịlaghachi n’usoro okpukpe ọkpụtọrọkpụ. Mgbe Origen nwụsịrị na 254 O.A., ọ bịara nwee nnọọ aha ọjọọ. N’ihi gịnị?
Mgbe ihe a bụ Iso Ụzọ Kraịst nanị n’aha ghọsịrị okpukpe a ma ama, a bịara kapịkwuo ihe chọọchị nakweere dị ka ozizi ọnụ. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta okpukpe e nwere mgbe nke ahụ gasịrị anakwereghị ọtụtụ n’ime echiche nkà ihe ọmụma ịkọ nkọ nke Origen, ndị na-abụkwa ndị a na-akapịghị ọnụ mgbe ụfọdụ. Ya mere, ozizi ya kpaliri esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ n’ime chọọchị. Ná mgbalị iji dozie esemokwu ndị a ma chebe ịdị n’otu ya, chọọchị mara Origen ikpe ịjụ okwukwe.
Ọ bụghị nanị Origen mehieworo ihe otú ahụ. N’ezie, Bible ebuwo amụma na n’ọha, a ga-agbahapụ ozizi dị ọcha nke Kraịst. Ndapụ n’ezi ofufe a malitere inwe ihe ịga nke ọma ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke narị afọ mbụ, mgbe ndị ozi Jisọs nwụsịrị. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:6, 7) N’ikpeazụ, ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst mere onwe ha “okpukpe ọkpụtọrọkpụ,” na-ekwu na ndị ọzọ nile bụ ndị “jụrụ okwukwe.” Ma n’ezie, Krisendọm si n’ezi Iso Ụzọ Kraịst kpafuo nke ukwuu.
“Ihe ahụ A Na-akpọ Ihe Ọmụma n’Ụzọ Ụgha”
N’agbanyeghị ọtụtụ ịkọ nkọ nke Origen, akwụkwọ ya nwere ihe ndị bara uru na ha. Dị ka ihe atụ, Hexapla hapụrụ aha Chineke ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ mbụ ahụ e ji dee ya, bụ́ nke a na-akpọ Tetragrammaton. Nke a bụ ihe àmà dị mkpa na-egosi na ndị Kraịst oge mbụ maara ma jiri aha aka Chineke—Jehova—mee ihe. Otú o sina dị, otu onyeisi chọọchị na narị afọ nke ise aha ya bụ Theophilus dọrọ aka ná ntị n’otu oge, sị: “Akwụkwọ Origen dị ka ala ahịhịa nke nwere ụdị okooko osisi ọ bụla. Ọ bụrụ na mụ ahụ okooko osisi ọ bụla mara mma na ya, akụrụ m ya; ma ọ bụrụ na ọ dị ihe yiri m ka ọ bụ ogwu, ezere m ya dị ka m ga-esi zere ihe na-agba agba.”
Site n’ịgwakọta ozizi Bible na nkà ihe ọmụma ndị Gris, nkà mmụta okpukpe Origen bịara jupụta n’ihie ụzọ, ọ rụpụtakwaara Krisendọm ọdachi. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na e mesịrị jụ ihe ka ọtụtụ n’ịkọ nkọ na-enweghị isi nke Origen, echiche ya banyere “enweghị mmalite” nke Kraịst so tọọ ntọala maka ozizi ahụ na-esiteghị na Bible bụ́ Atọ n’Ime Otu. Akwụkwọ bụ́ The Church of the First Three Centuries na-ekwu, sị: “Agụụ maka nkà ihe ọmụma [nke Origen guzobere] ga-adịte aka.” Gịnị si na ya pụta? “E merụrụ ịdị mfe nke okpukpe ndị Kraịst, ọtụtụ mmehie ihe batakwara n’ime Chọọchị.”
N’akụkụ nke ya, Origen gaara aṅaworị ntị na ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ma zere ịtụnye ụtụ ná ndapụ n’ezi ofufe a site ‘n’izere okwu efu nile nke e merụrụ emerụ nke ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile.’ Kama nke ahụ, site n’ime ka ihe ka ọtụtụ n’ozizi ya dabere ‘n’ihe ọmụma’ dị otú ahụ, Origen ‘hiere ụzọ n’ihe banyere okwukwe anyị.’—1 Timoti 6:20, 21; Ndị Kọlọsi 2:8.
[Foto dị na peeji nke 31]
“Hexapla” nke Origen na-egosi na e ji aha Chineke mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst
[Ebe E Si Nweta Foto]
E bipụtara ya site n’ikike nke Ndị Nnọchianya nke Ọ́bá Akwụkwọ Mahadum Cambridge, T-S 12.182
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Culver Pictures