Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebee ka Daniel nọ mgbe e lere ndị Hibru atọ ahụ ule n’ihu nnukwu ihe oyiyi ahụ Nebukadneza guzobere na ndagwurugwu Dura?

Bible ekwughị, n’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ ikwu taa ebe Daniel nọ n’oge ule ahụ.

Ụfọdụ atụwo aro na ọkwá Daniel ma ọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche Nebukadneza nyere ya karịrị nke Shedrak, Mishak, na Abednego, n’ihi ya kwa, na iwu ejighị Daniel ịga na ndagwurugwu Dura. Daniel 2:49 na-egosi na ọ dị mgbe o nwere ọkwá karịrị nke ndị enyi ya atọ. Ma anyị apụghị inye ihe àmà na-egosi na nke a gụpụrụ ya isoro ndị ọzọ gbakọta n’ihu ihe oyiyi ahụ.

N’ịnwa ịkọwa ihe mere Daniel anọghị ya, ndị ọzọ ekwuwo na ọ pụrụ ịbụ na e zigara ya ọrụ n’obodo ọzọ ma ọ bụkwanụ na o jighị ahụ, n’ihi ya kwa, o nweghị ike ịga. Otú ọ dị, Bible ekwughị otú ahụ. Otú o sina dị, ọ ghaghị ịbụwo na ihe Daniel mere abụghị nke a pụrụ ịkatọ akatọ, n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ọchịchị Babilọn na-enwere ya anya ụfụ gaara ejiwo ya boo ya ebubo. (Daniel 3:8) Ma tupu ihe omume a ma mgbe ọ gasịrị, Daniel gosipụtara onwe ya ịbụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke n’agbanyeghị ihe ịma aka ọ bụla o chere ihu. (Daniel 1:8; 5:17; 6:4, 10, 11) Ya mere, ọ bụ ezie na Bible ekwughị ihe mere Daniel anọghị na ndagwurugwu Dura, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ dịghị mgbe o mebiri ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova Chineke.—Ezikiel 14:14; Ndị Hibru 11:33.