Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ekele Maka Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa M Na-echeta!

Inwe Ekele Maka Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa M Na-echeta!

Akụkọ Ndụ

Inwe Ekele Maka Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa M Na-echeta!

DỊ KA DRUSILLA CAINE SI KỌỌ

Ọ bụ n’afọ 1933, m ka lụkwara Zanoah Caine, onye bụ́ colporteur—onye na-ezisa ozi ọma oge nile—dị ka m bụ. N’ịbụ onye nwere nnọọ obi ụtọ, emere m atụmatụ isonyere di m n’ọrụ e kenyere ya, ma iji mee nke ahụ, ịnyịnya ígwè—ihe okomoko nke m na-enwebeghị ike ịzụta n’ihi na ihe siri ike n’oge oké ndakpọ ahụ—dị m mkpa. Gịnị ka m ga-eme?

MGBE ụmụnne di m ndị nwoke nụrụ banyere nsogbu m, ha gara n’ebe ndị a na-ekpofu ihe n’ógbè ahụ, na-achọgharị akụkụ ịnyịnya ígwè ndị a tụfuru atụfu iji rụtara m ịnyịnya ígwè. Otú ahụ ka ha mere, okwu ebiekwa! Ozugbo m mụtara ịgba ígwè, mụ na Zanoah malitere ọrụ, jiri obi ụtọ na-agba ígwè aga n’ógbè Worcester na Hereford dị n’England, na-agbara ndị nile anyị zutere àmà.

Amaghị m na okwukwe a m malitere nnọọ inwe ga-eme ka m bie ndụ ga-eme ka m na-echeta ọtụtụ ihe bara uru. Otú ọ dị, ọ bụ nne na nna m m hụrụ n’anya tọọrọ ndụ m ntọala ime mmụọ.

Afọ Ndị Tara Akpụ n’Oge Agha Ukwu Ahụ

A mụrụ m na December 1909. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mama m nwetara akwụkwọ bụ́ The Divine Plan of the Ages, na 1914 kwa, ndị mụrụ m kpọọrọ m gaa kirie “Photo-Drama of Creation,” n’Oldham, Lancashire. (Ọ bụ ndị a maara ugbu a dị ka Ndịàmà Jehova mepụtara ha abụọ.) N’agbanyeghị na m bụ obere nwa n’oge ahụ, ana m echeta nke ọma ka m ji ọṅụ maliri elu na-ala n’ebe obibi anyị, n’ihi ihe m hụworo! N’oge ahụ, Frank Heeley malitere ìgwè ọmụmụ Bible na Rochdale, bụ́ ebe anyị bi. Ịga ya nyeere anyị aka dị ka ezinụlọ iwulite nghọta anyị banyere Akwụkwọ Nsọ.

Ntiwapụ nke Agha Ukwu ahụ—Agha Ụwa Mbụ, dị ka anyị na-akpọ ya ugbu a—tisasịrị ndụ ntụsara ahụ anyị nọ na-ebi. E debara aha papa m n’usuu ndị agha ma ọ nọpụrụ iche. A kọwara ya n’ụlọikpe dị ka “nwoke nwere nnọọ àgwà ọma,” “ụmụ amadị bụ́ ndị na-ekwu na ha kweere na o ji ezi obi jụ ibuli ngwá agha” zitekwara ọtụtụ akwụkwọ ozi, ka akwụkwọ akụkọ e bipụtara n’ógbè ahụ kọrọ.

Otú ọ dị, kama ịhapụ papa m kpam kpam, e debara aha ya dị ka onye a gụpụrụ “nanị n’Ịlụ Agha.” Ọ ghọrọ onye e ji eme ihe ọchị ozugbo, dị ka mụ na mama m ghọkwara. N’ikpeazụ, a tụleghachiri ọrụ ya, e kenyekwara ya ịrụ ọrụ ugbo, ma ụfọdụ ndị ọrụ ugbo rigburu ya, na-akwụ ya obere ego ma ọ bụ gharadị ịkwụ ya akwụ. Iji na-elekọta ezinụlọ anyị, mama m rụrụ ọrụ—maka ego dị nnọọ ala—na-arụ ọrụ ike n’ụlọ ọrụ a na-asa ákwà na ya bụ́ nke otu onye nwe. Ma, ugbu a, ana m ahụ otú iji oge uto m nagide ọnọdụ ndị ahụ tara akpụ si mee ka m sikwuo ike; o nyeere m aka inwe ekele maka ihe ime mmụọ bụ́ ndị ka mkpa.

Mmalite Dị Nta

N’oge na-adịghị anya, anyị matara Daniel Hughes, bụ́ onye mmụta Bible na-anụ ọkụ n’obi. Ọ bụ onye na-egwupụta coal na Ruabon, bụ́ obodo nta nke dị ihe dị ka kilomita 20 site n’Oswestry, bụ́ ebe anyị kwagarala. Deede Dan, dị ka m na-akpọ ya, nọgidere na-eleta ezinụlọ anyị, mgbe ọ bụla ọ bịakwara ịhụ anyị, mkparịta ụka ya na-adaberekarị n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ dịtụghị akọ akụkọ na-enweghị isi. A malitere ìgwè ọmụmụ Bible n’Oswestry na 1920, Deede Dan nyekwara m akwụkwọ bụ́ The Harp of God na 1921. Ejighị m ya egwuri egwu n’ihi na o mere ka ozizi Bible dịkwuoro m mfe nghọta.

Ọzọkwa, anyị matara Pryce Hughes, * bụ́ onye mesịrị bụrụ onye nlekọta nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na London. Ya na ezinụlọ ya bi na Bronygarth dị nso, bụ́ nke dị n’ókèala Wales, nwanne ya nwanyị, bụ́ Cissie, ghọkwara ezigbo enyi mama m.

Ana m echeta obi ụtọ anyị nwere na 1922 bụ́ mgbe a gbara ume ‘ịkpọsa Eze ahụ na alaeze ya.’ N’afọ ndị sochirinụ, n’agbanyeghị na m ka na-aga akwụkwọ, eji m ịnụ ọkụ n’obi sonye n’ikesa traktị ndị ahụ pụrụ iche, karịsịa Ecclesiastics Indicted na 1924. Mgbe m leghachiri anya azụ n’iri afọ ahụ, lee ihe ùgwù ọ bụụrụ m iso imerime ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi kpakọọ—ndị Maud Clark * na onye ya na ya rụkọrọ ọrụ bụ́ Mary Grant, * Edgar Clay, * Robert Hadlington, Katy Roberts, Edwin Skinner, * so na ha, tinyere Percy Chapman na Jack Nathan, * bụ́ ndị gara Canada iji nye aka n’ọrụ a na-arụ n’ebe ahụ.

Okwu ihu ọha dabeere na Bible bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị” ghọrọ àmà a gbara n’ezi oge ná nnukwu ókèala anyị. Na May 14, 1922, Stanley Rogers, bụ́ onye ikwu Pryce Hughes, si Liverpool bịa kwuo okwu a na Chirk, bụ́ obodo nta nke dị nnọọ n’ebe ugwu obodo anyị, mgbe e mesịkwara n’uhuruchi ahụ, o kwuru ya n’Ụlọ Egwuregwu dị n’Oswestry. Aka m ji otu n’ime mpempe akwụkwọ ndị e biri maka ihe omume ahụ kpọmkwem. N’oge a nile, nleta mmadụ atọ bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị—ndị pilgrim dị ka anyị na-akpọbu ha—Herbert Senior, Albert Lloyd, na John Blaney, letara obere ìgwè ọmụmụ ihe anyị mere ka ọ nọgide na-akwụsi ike.

Oge Ime Mkpebi

Na 1929, ekpebiri m ka e mee m baptism. Adị m afọ 19, n’oge ahụkwa, ezutere m ọnwụnwa mbụ m tara akpụ. Ezutere m nwa okorobịa nke nna ya bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị hụrịtara onwe anyị n’anya, ya ekweekwa nkwa ịlụ m. N’afọ bu ụzọ, e wepụtara akwụkwọ bụ́ Government, ya mere, enyere m ya otu. Ma n’oge na-adịghị anya, ọ bịara doo anya na o nweghị mmasị n’ọchịchị eluigwe, nke bụ́ isiokwu nke akwụkwọ a. Amaara m site n’ihe ọmụmụ m na e nyere ụmụ Israel oge ochie iwu ka ha ghara iso ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọ alụmdi na nwunye nakwa na ụkpụrụ a metụtara ndị Kraịst. Ya mere, ọ bụ ezie na o siri ike omume, ekweghị m ka ọ lụọ m.—Deuterọnọmi 7:3; 2 Ndị Kọrint 6:14.

Enwetara m ike n’okwu Pọl onyeozi bụ́: “Ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” (Ndị Galetia 6:9) Deede Dan m hụrụ n’anya nyekwaara m aka mgbe o dere, sị: “N’ọnwụnwa ukwu na nke nta, tinye Ndị Rom isi 8, amaokwu 28 n’ọrụ,” bụ́ nke na-asị: “Ma anyị matara na ihe nile na-arụkọ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe, bụ́ ndị a kpọrọ dị ka ihe Ọ na-ezube si dị.” Ọ dịghịrị m mfe ma amaara m na m mere mkpebi ziri ezi. N’afọ ahụ, edebara m aha m dị ka onye colporteur.

Imeri Ihe Ịma Aka Ahụ

Na 1931, anyị nwetara aha ọhụrụ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, n’afọ ahụkwa, anyị mere mkpọsa kpụ ọkụ n’ọnụ na-eji akwụkwọ nta bụ́ The Kingdom, the Hope of the World mee ihe. E nyere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ụkọchukwu, na ndị ọchụ ntá ego nile otu otu. Ókèala m si Oswestry ruo Wrexham, nke dị ihe dị ka kilomita 25 n’ebe ugwu. Ịrụcha ya bụ ihe ịma aka.

Ná mgbakọ e nwere na Birmingham n’afọ sochirinụ, a kpọrọ òkù maka ndị ọrụ afọ ofufo 24. Anyị mmadụ 24 ji ịnụ ọkụ n’obi debanye aha anyị maka ije ụdị ozi ọhụrụ, nke anyị na-amaghị ihe ọ gaje ịbụ. Cheedị banyere ihe ijuanya anyị nwere mgbe e kere anyị abụọ abụọ ma nye anyị ọrụ ikesa kpọmkwem akwụkwọ nta ahụ, bụ́ The Kingdom, the Hope of the World, ka anyị na-anya kaadị mkpọsa dị arọ nke anyị ji na-akpọsa Alaeze ahụ.

Ka m na-arụ n’ógbè Katidral, ihere mere m nke ukwuu, ma akasiri m onwe m obi na ọ dịghị onye maara m n’obodo ahụ. Ma, onye mbụ bịakwutere m bụ onye bụbu enyi m n’ụlọ akwụkwọ, bụ́ onye legidere m nnọọ anya ma kwuo, sị: “Gịnịdị ka ị na-eme i ji nyara ihe a?” Ahụmahụ ahụ chụrụ egwu mmadụ ọ bụla m pụrụ inwewo!

Ịgakwu n’Ihu n’Ubi

Na 1933, alụrụ m Zanoah, bụ́ nwoke nwunye ya nwụrụ nke ji afọ 25 tọọ m. Nwunye mbụ ya bụ Onye Mmụta Bible nụrụ ọkụ n’obi, Zanoah jikwa ikwesị ntụkwasị obi nọgide n’ọrụ ya mgbe nwunye ya nwụsịrị. N’oge na-adịghị anya, anyị si England kwaga n’ókèala ọhụrụ anyị na North Wales, ihe dị ka kilomita 150 site n’ebe anyị nọ. N’ụzọ dị ize ndụ, anyị bukwasịrị katọn, igbe na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa anyị nwere n’aka ịnyịnya ígwè anyị, bụkwasị ụfọdụ n’elu okporo ígwè na-ejikọta olu ya na ebe ịnọ ọdụ ya, bukwasị ụfọdụ n’ebe a na-ebukwasị ibu, ma anyị garuru n’enweghị nsogbu! N’ọrụ ahụ, ọ dịghị ebe anyị na-aga n’ejighị ịnyịnya ígwè anyị—anyị ji ha gaa ebe nile, ọbụna na nso elu elu Cader Idris, bụ́ ugwu dị na Wales nke dị ihe dị ka mita 900 n’ịdị elu. Ọ bụ ihe na-akwụghachi nnọọ ụgwọ ịhụ ndị ọ na-agụ agụụ ịnụ “ozi ọma nke a nke alaeze.”—Matiu 24:14.

N’oge na-adịghị anya anyị bịara ebe ahụ, ndị mmadụ gwara anyị na otu nwoke aha ya bụ Tom Pryce anọwo na-ekwusara ha ozi ọma, dị nnọọ ka anyị na-eme. Anyị mesịrị nweta Tom ebe o bi n’Ugwu Long, nke dị nso na Welshpool—leekwa ihe ịtụnanya ọ bụụrụ anyị! N’oge m ka malitere ịgba àmà ọhụrụ, enyefere m ya akwụkwọ ahụ na-enye aka ịmụ Bible bụ́ Reconciliation. Ọ mụrụ ya n’onwe ya, degara alaka ụlọ ọrụ dị na London akwụkwọ izitekwuru ya akwụkwọ, ọ nọwokwa na-eji ịnụ ọkụ n’obi agwa ndị ọzọ banyere ihe o kweere ọhụrụ kemgbe ahụ. Anyị nwere mkparịta ụka dị ụtọ ruo ọtụtụ awa, anyị atọ mụkọkwara ihe ọnụ mgbe mgbe iji gbarịta ibe anyị ume.

Ọdachi Eweta Ngọzi

Na 1934, a kpọrọ ndị colporteur nile nọ nso na North Wales ịga n’obodo Wrexham iji nye aka n’ikesa akwụkwọ nta bụ́ Righteous Ruler. E nwere ọdachi ná mba ahụ n’ụbọchị bu ụzọ tupu anyị amalite mkpọsa a pụrụ iche. Otu ihe nke gbawara n’ebe a na-egwupụta coal na Gresford, nke dị kilomita atọ n’ebe ugwu Wrexham, gburu mmadụ 266 na-egwupụta coal. Ihe karịrị ụmụaka 200 ghọrọ ndị na-enweghịzi nna, ndị inyom 160 ghọkwara ndị di ha nwụrụ.

Ọrụ anyị bụ idepụta aha ndị mmadụ nwụnahụrụ, leta ha n’onwe anyị, ma nyefee ha akwụkwọ nta. Otu n’ime aha ndị e nyere m bụ nke Odozi Akụ Chadwick bụ́ onye nwa ya nwoke dị afọ 19 nwụnahụrụ. Mgbe m gara na nke ya, nwa ya nwoke nke ka okenye, bụ́ Jack, letara ya iji kasie ya obi. Nwa okorobịa a matara m ma o kwughị ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ gụrụ akwụkwọ nta ahụ ma chọwazie The Final War, bụ́ akwụkwọ nta ọzọ m nyefere ya afọ ụfọdụ tupu mgbe ahụ.

Jack na nwunye ya, bụ́ May, chọtara ebe m bi ma bịa inwetakwu akwụkwọ. Na 1936, ha kwetara ka a nọrọ n’ebe obibi ha dị na Wrexham na-enwe nzukọ. Mgbe Albert Lloyd letasịrị anyị ọnwa isii mgbe e mesịrị, e guzobere ọgbakọ nke Jack Chadwick bụ onyeisi oche ndị nlekọta ya. Ugbu a, e nwere ọgbakọ atọ na Wrexham.

Ibi Ndụ n’Ụlọ Gypsy Ụgbọala Na-adọkpụ

Ruo oge ahụ, anyị na-ebi n’ụlọ ọ bụla anyị pụrụ ịchọta ka anyị na-esi otu ebe aga ebe ọzọ, ma Zanoah kpebiri na oge eruola ka anyị nwee ụlọ nke anyị, nke anyị pụrụ isi otu ebe dọkpụrụ gaa ebe ọzọ. Di m bụ kapịnta nwere nkà nke si n’agbụrụ ndị Gypsy, ọ rụkwaara anyị ụlọ Gypsy ụgbọala na-adọkpụ. Anyị kpọrọ ya Elizabeth, bụ́ aha dị na Bible nke pụtara “Chineke nke Ihi Nne.”

Akasị m echeta otu ebe anyị nọrọ—ọ bụ n’ubi mkpụrụ osisi nke dịdewere iyi. Ọ dị m nnọọ ka Paradaịs! Ọ dịghị ihe mebiri obi ụtọ anyị nwere n’afọ ndị ahụ anyị nọkọrọ ọnụ n’ụlọ ahụ ụgbọala na-adọkpụ, ọ bụ ezie na o doro anya na ụlọ ahụ ebughị ibu. N’oge oyi, ákwà ihe ndina na-araparakarị n’ahụ ụlọ ahụ n’ihi ịjụ oyi, anyị na-enwekwa nsogbu nke mmiri ide ụlọ ahụ n’esepụghị aka. Anyị aghaghịkwa ịga kute mmiri, mgbe ụfọdụ, n’ebe dịtụ anya, ma anyị gbakọrọ aka merie ihe isi ike ndị a.

N’otu oge oyi, ahụ adịghị m, nri anyị nwere pere mpe, anyị enweghịkwa ego ọ bụla. Zanoah nọdụrụ ala n’ihe ndina, jide m n’aka, ma gụọrọ m Abụ Ọma 37:25: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” O lere m anya ma kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ihe emeghị ngwa ngwa, anyị ga-arịọwa arịrịọ, apụghịkwa m ịhụ otú Chineke ga-esi kwere ka nke ahụ mee!” Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịga gbaara ndị agbata obi anyị àmà.

Mgbe Zanoah lọghachiri n’ehihie imere m ihe ọṅụṅụ, otu envelopu nọ na-eche ya. Ihe dị n’ime ya bụ £50 nke si n’aka papa ya. Afọ ụfọdụ tupu mgbe ahụ, e boro Zanoah ebubo ụgha na o riri ego, ma a chọpụtawo nnọọ na aka ya dị ọcha. Onyinye a bụ iji sị ya gbaghara. Lee ka o si bịa n’ezi oge!

Ihe Mmụta Bara Uru

Mgbe ụfọdụ anyị na-amụta ihe mgbe ọtụtụ afọ gasịrịla. Iji maa atụ: Tupu m kwụsị ịga akwụkwọ na 1927, agbaara m ụmụ klas m na ndị nkụzi m nile àmà—ma e wezụga otu onye, bụ́ Lavinia Fairclough. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye nwere mmasị n’ihe m mere atụmatụ ime ná ndụ, ebe ọ bụkwa na, e kwuwerị, ihe adịchaghị adabara mụ na Nwaada Fairclough, ekpebiri m na m gaghị agwa ya. Cheedị banyere ihe ịtụnanya—na obi ụtọ—ọ bụụrụ m ihe dị ka afọ 20 nke a gasịrị bụ́ mgbe mama m gwara m na onye nkụzi a lọghachiri ileta ndị enyi na ụmụ akwụkwọ ochie ya nile iji gwa ha na ya bụzi otu n’ime Ndịàmà Jehova!

Mgbe anyị zutere, akọwaara m ya ihe mere na agwaghị m ya banyere okpukpe m tupu mgbe ahụ na ọrụ m mere atụmatụ ịrụ. O gere m nnọọ ntị ma kwuzie, sị: “Anọwo m na-achọ eziokwu ahụ. Ọ bụwo ihe m na-achọ ná ndụ m!” Ahụmahụ a kụziiri m ihe bara uru—ịghara ịla azụ mgbe ọ bụla n’ịgbara ndị nile m na-ezute àmà nakwa ịghara mgbe ọ bụla inwe ajọ mbunobi n’ebe mmadụ ọ bụla nọ.

Agha Ọzọ—Na Mgbe O Bisịrị

Agha chọrọ ịda ọzọ ka afọ ndị 1930 na-akpụdewe nso. A gụpụrụ nwanne m nwoke m ji afọ iri tọọ, bụ́ Dennis, n’ọrụ agha n’ọnọdụ na ọ ga-anọgide na-arụ ọrụ ego ya. Ọ dịtụbeghị mgbe o gosiri mmasị dị ukwuu n’eziokwu ahụ, n’ihi ya mụ na di m rịọrọ ndị ọsụ ụzọ nọ n’ógbè ahụ bụ́ Rupert Bradbury na nwanne ya nwoke bụ́ David ka ha gaa leta ya. Ha gara ma mụọrọ ya Bible. E mere Dennis baptism na 1942, ọ malitere ozi ọsụ ụzọ mgbe e mesịrị, a họpụtakwara ya dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na 1957.

Anyị mụrụ nwa anyị nwanyị, bụ́ Elizabeth, na 1938, ijikwa gboo mkpa ezinụlọ anyị, Zanoah gbatịkwuru ụlọ anyị ụgbọala na-adọkpụ. Mgbe anyị mụrụ nwa anyị nwanyị nke abụọ, bụ́ Eunice, na 1942, o yiri ihe amamihe dị na ya ịchọ ezigbo ụlọ. N’ihi nke a, Zanoah kwụsịrị ịsụ ụzọ ruo afọ ole na ole, anyị kwagakwara n’otu ụlọ nta dị nso na Wrexham. Mgbe e mesịrị, anyị kwagara Middlewich nke dị n’ógbè Cheshire dị nso. Di m m hụrụ n’anya nwụrụ n’ebe ahụ na 1956.

Ụmụ anyị ghọrọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile, ha abụọ anọwokwa na-enwe obi ụtọ na di ha lụrụ. Eunice na di ya, bụ́ okenye, ka na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na London. Di Elizabeth bụkwa okenye ọgbakọ, ọ bụkwaara m ihe ọṅụ na ha, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ m anọ, bidewere m nso na Preston, Lancashire.

Ana m enwe ekele na apụrụ m isi n’ọnụ ụzọ dị n’ihu ụlọ m jere ruo n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke dị n’akụkụ nke ọzọ nke okporo ụzọ. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, esowo m ìgwè na-asụ asụsụ Gujarati, bụ́ ndị na-ezukọtakwa ebe ahụ, na-akpakọ. Ịmụta asụsụ ahụ adịghịrị m mfe n’ihi na adịghịzi m anụcha ihe nke ọma. Ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ịghọta ọtụtụ n’ime okwu ndị yiri ibe ha, dị ka ndị m tọrọ pụrụ ime. Ma, ọ bụ ihe ịma aka na-akpali mmasị.

Aka m nwere ike ime nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ ma na-eduzi ọmụmụ Bible n’ebe obibi m. Mgbe ndị enyi m bịara ileta m, ọ na-atọ m ụtọ mgbe nile ịkọrọ ha ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị m nwetaworo n’oge gara aga. Ana m enwe nnọọ ekele icheta ngọzi ndị m nwetaworo ka m so ndị Jehova na-akpakọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 90.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 “Iso Nzukọ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Na-aga Ụkwụ na Ụkwụ,” akụkọ ndụ Pryce Hughes, pụtara n’Ụlọ Nche (Bekee), nke April 1, 1963.

^ par. 14 Akụkọ ndụ nke ndị ohu Jehova ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi apụtala n’isiokwu ndị bu ụzọ n’Ụlọ Nche.

^ par. 14 Akụkọ ndụ nke ndị ohu Jehova ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi apụtala n’isiokwu ndị bu ụzọ n’Ụlọ Nche.

^ par. 14 Akụkọ ndụ nke ndị ohu Jehova ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi apụtala n’isiokwu ndị bu ụzọ n’Ụlọ Nche.

^ par. 14 Akụkọ ndụ nke ndị ohu Jehova ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi apụtala n’isiokwu ndị bu ụzọ n’Ụlọ Nche.

^ par. 14 Akụkọ ndụ nke ndị ohu Jehova ndị a na-ekwesị ntụkwasị obi apụtala n’isiokwu ndị bu ụzọ n’Ụlọ Nche.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mpempe akwụkwọ e ji maa ọkwà okwu ihu ọha dabeere na Bible bụ́ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị,” bụ́ nke m gere na May 14, 1922

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na Zanoah n’oge na-adịghị anya mgbe anyị gbasịrị akwụkwọ na 1933

[Foto dị na peeji nke 26]

Eguzo m n’akụkụ “Elizabeth,” bụ́ ụlọ anyị ụgbọala na-adọkpụ nke di m rụrụ