Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru

Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru

Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru

NWOKE ahụ ebiela n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ nke Atens ruo afọ 12. Kwa ụbọchị, ọ na-esi n’otu ụzọ ala ọrụ. Ya emesịa kwaga n’ógbè ọzọ dịpụrụ adịpụ. Otu ụbọchị, mgbe a gbasara ọrụ, ọ lawara. Ọ bụ nanị mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ógbè ahụ o bibu na ya ka ọ matara na ya agahiela ụzọ. Ọ bụ n’ihi omume maara ya ahụ ka o jiri kwọrọ ụgbọala ya gawa n’ebe o bibu!

Ka a sịkwa ihe mere, mgbe ụfọdụ, e ji akpọ omume maara mmadụ ahụ ihe e bu pụta ụwa, ikike na-emetụta ndụ anyị n’ụzọ ndị dị ike. N’echiche a, a pụrụ iji omume tụnyere ọkụ. Ọkụ pụrụ inye ìhè n’ọchịchịrị, ọ pụkwara ime ka ahụ kpoo anyị ọkụ, meekwa ka nri anyị dị ọkụ. Ma, ọkụ pụkwara ịbụ onye iro dị obi ọjọọ nke na-ala ndụ na ihe onwunwe n’iyi. Otú ahụ ka omume dị. Ọ bụrụ na a zụlite ha nke ọma, ha na-aba uru dị ukwuu. Ma ha pụkwara imebi ihe.

N’ihe banyere nwoke ahụ e kwuru maka ya ná mmalite, omume ahụ maara ya ahụ furu ya nanị oge o ji nọrọ n’ọnọdụ agaghị ihu ma ọ bụ azụ nke ụgbọala n’ime obodo ukwu. Mgbe a bịara n’ihe ndị ka mkpa, omume pụrụ ime ka anyị nwee ihe ịga nke ọma ma ọ bụ kpatara anyị ọdachi. Tụlee ihe atụ ole na ole mere eme dị na Bible, ndị na-egosi otú omume pụrụ isi nye aka ma ọ bụ mebie ihe n’ozi anyị na-ejere Chineke nakwa ná mmekọrịta anyị na ya.

Ihe Atụ Bible nke Omume Ọma na nke Ọjọọ

E ji iso Chineke nwee mmekọrịta chiri anya gọzie Noa, Job, na Daniel. Bible na-aja ha mma n’ihi “ezi omume ha.” (Ezikiel 14:14) N’ụzọ dị ịrịba ama, ụzọ ndụ nke ndị ikom atọ ahụ gosiri na ha zụlitere omume ọma.

A gwara Noa ka o wuo ụgbọ, nke dị ogologo karịa ọgbọ egwuregwu bọl ụkwụ na nke ịdị elu ya karịrị ụlọ dị okpukpu ise. Nnukwu ọrụ dị otú ahụ ga-akarịwo onye ọ bụla na-ewu ụgbọ n’oge ochie ịrụ. Noa na mmadụ asaa so n’ezinụlọ ya wuru ụgbọ ahụ n’ejighị ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ mee ihe. Tụkwasị na nke ahụ, Noa nọgidere na-eme nkwusa nye ndị ọgbọ ya. Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ nọkwa na-egbo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ezinụlọ ya. (2 Pita 2:5) Iji mezuo ihe a nile, ọ ghaghị ịbụwo na Noa nwere omume dị mma nke ịrụ ọrụ. Ọzọkwa, e debara aha Noa n’akụkọ Bible dị ka onye ya “na Chineke yịkọrọ na-ejegharị. . . . Noa wee mee dị ka iwu nile si dị nke Jehova nyere ya.” (Jenesis 6:9, 22; 7:5) Ebe ọ bụ na a kpọrọ ya “onye zuru okè” na Bible, ọ ghaghị ịbụ na ọ nọgidere soro Chineke na-ejegharị mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị na ọbụna mgbe nnupụisi ahụ e nupụụrụ Jehova malitere na Bebel. N’ezie, Noa nọgidere soro Chineke na-ejegharị ruo mgbe ọ nwụrụ ka ọ dị afọ 950.—Jenesis 9:29.

Omume ọma Job nyeere ya aka ịbụ nwoke “zuru okè, ziekwa ezie.” (Job 1:1, 8; 2:3) Omume e ji mara ya ma ọ bụ nke maara ya ahu bụ ije ozi dị ka onye nchụàjà ezinụlọ ya n’ịchụ ájá n’isi ụmụ ya mgbe ha nwesịrị nke ọ bụla n’ime oriri ha, a dịghị ama ama ọ bụrụ na ha “emehiewo, gbakụtakwa Chineke azụ n’obi ha. Otú a ka Job na-eme ụbọchị nile.” (Job 1:5, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Obi abụọ adịghị ya na omenala ndị hiwere isi n’ofufe Jehova bụ ihe a na-eme mgbe dum n’ezinụlọ Job.

Daniel jeere Jehova ozi “mgbe nile” n’ogologo ndụ ya. (Daniel 6:16, 20) Ezi omume ime mmụọ dị aṅaa ka Daniel nwere? Otu bụ na o kpekuchiri Jehova ekpere anya. N’agbanyeghị iwu eze tiri megide omume a, “ugbo atọ n’ụbọchị ka [Daniel] na-egbu ikpere ya n’ala na-ekpe ekpere na-ekele ekele n’ihu Chineke ya, n’ihi na otú a ka ọ na-emerị site na mgbe gara aga.” (Daniel 6:10, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ pụghị ịkwụsị omume ya nke ikpeku Chineke ekpere, ọbụna mgbe nke ahụ bụ ihe na-eyi ndụ egwu. Obi abụọ adịghị ya na omume a mere ka Daniel sikwuo ike n’ụzọ ndụ ya nke iguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’ụzọ na-enweghị atụ. Ihe àmà na-egosi na Daniel nwekwara omume ọma nke ịmụ ihe na ịtụgharị uche n’ụzọ miri emi ná nkwa ndị na-akpali akpali Chineke kwere. (Jeremaịa 25:11, 12; Daniel 9:2) N’ezie, omume ọma ndị a nyeere ya aka ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, jiri ikwesị ntụkwasị obi gbaa ọsọ ndụ ahụ ruo kpọmkwem ebe ọ gwụrụ.

N’ụzọ dị iche, ihe agazitụghịrị Daịna n’ihi omume ọjọọ. Ọ “[na-adị apụ, NW] ịhụ ụmụ ndị inyom ala ahụ,” bụ́ ndị na-adịghị efe Jehova. (Jenesis 34:1) Omume a yiri nke na-adịghị emerụ ahụ kpatara ọdachi. Nke mbụ, Shekem, bụ́ nwa okorobịa e weere dị ka onye “[nwere] nsọpụrụ karịa ụlọ nile nke nna ya,” kwasoro ya iko. E mesịa, omume mmegwara nke ụmụnne ya ndị nwoke abụọ dugara ha n’igbu ndị ikom nile nọ n’obodo ahụ dum. Lee ihe dị mwute si na ya pụta!—Jenesis 34:19, 25-29.

Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na omume anyị ga-abara anyị uru kama imeru anyị ahụ?

Ime Omume Maara Mmadụ Ahụ

“Omume bụ akara aka,” ka otu ọkà ihe ọmụma dere. Ma, ha ekwesịghị ịdị otú ahụ. Bible na-egosi n’ụzọ doro nnọọ anya na anyị pụrụ ịhọrọ ịgbanwe omume ọjọọ anyị ma zụlite omume ọma.

Ọ bụrụ na anyị nwere omume ọma, anyị ga na-arụpụtakwu ihe n’ụzọ ndụ ndị Kraịst, ọ ga-adịkwara anyị mfe karị ịgbaso ya. Alex, bụ́ onye Kraịst si Gris, na-ekwu, sị: “Omume ịgbasochi usoro ịrụ ọrụ dịgasị iche iche anya na-eme ka m na-echekwa oge bara uru.” Theophilus, bụ́ onye Kraịst bụ́ okenye, na-ezo aka n’ime atụmatụ dị ka omume na-enyere ya aka ịdị irè. Ọ na-ekwu, sị: “Ekwenyesiri m ike na agaghị m enwe ike ịrụ ọrụ m dị ka onye Kraịst n’ụzọ na-aga nke ọma n’enweghị omume ime atụmatụ dị mma.”

Dị ka ndị Kraịst, a na-agba anyị ume ka anyị “nọgide na-eje ije n’usoro n’otu ụkpụrụ a.” (Ndị Filipaị 3:16, NW) Ịgbaso ụkpụrụ na-agụnye ‘iji usoro a tụpụtara na-eme ihe mgbe nile.’ Omume ọma dị otú ahụ na-abara anyị uru n’ihi na ọ dịghị anyị mkpa igbu oge n’ịtụlewe nzọụkwụ nke ọ bụla anyị chọrọ iwere—anyị atụpụtalarị ụkpụrụ dị mma anyị na-agbaso n’ihi na ọ bụ omume maara anyị ahụ. Omume gbanyere mkpọrọgwụ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ nke a na-eme n’echetụghị ya echetụ. Dị nnọọ ka omume ịkwọ ụgbọala nke ọma pụrụ isi mee ka ọkwọ ụgbọala mee mkpebi ozugbo, bụ́ nke ga-azọpụta ndụ, mgbe o chere ihe ize ndụ ihu n’okporo ụzọ, omume ọma pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị kwesịrị ekwesị ngwa ngwa ka anyị na-aga n’ụzọ ndị Kraịst anyị.

Dị ka onye edemede bụ́ onye England bụ́ Jeremy Taylor si kwuo: “Ime ihe mgbe nile na-eme ka ihe mara mmadụ ahụ.” Ọ bụrụ na omume anyị dị mma, anyị pụrụ ime ihe ndị dị mma n’enwechaghị ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị ozi, anyị nwere omume ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ma na-amasịkwu anyị ịga ozi ubi. Anyị na-agụ banyere ndị ozi na “kwa ụbọchị, n’ụlọukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha, ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42; 17:2, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị na-ekere òkè n’ozi nanị mgbe ọ masịrị anyị, anyị pụrụ inwe nchegbu, ọ pụkwara iwe oge ka ukwuu iji mee ka ọ mara anyị ahụ tupu obi esiwe anyị ike n’ọrụ ndị Kraịst a dị mkpa.

Otú ahụ ka ọ dịkwa akụkụ ndị ọzọ nke ihe omume ndị Kraịst anyị. Omume ọma pụrụ inyere anyị aka ‘n’ịgụchi Okwu Chineke anya ehihie na abalị.’ (Joshua 1:8; Abụ Ọma 1:2) Otu onye Kraịst nwere omume ịgụru Bible minit 20 ruo 30 tupu ọ lakpuo ụra n’abalị. Ọbụna mgbe ike gwụrụ ya nke ukwuu, ọ na-achọpụta na ọ bụrụ na ya alakpuo ụra n’agụghị ya, na ya apụghị ihi ụra nke ọma. Ọ ghaghị ibili ma gboo mkpa ime mmụọ ahụ. Omume ọma a enyewokwara ya aka ịgụchapụ Bible otu ugbo n’afọ ruo ọtụtụ afọ.

Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs Kraịst, nwere omume ịga nzukọ ndị a tụlere Bible na ha. “O wee baa n’ụlọ nzukọ ha n’ụbọchị izu ike, dị ka Ọ na-eme mgbe dum, O wee bilie ịgụ akwụkwọ.” (Luk 4:16) Nye Joe, bụ́ okenye nke nwere ezinụlọ buru ibu bụ́ onye na-arụ ọrụ ruo ọtụtụ awa, omume enyewo aka mee ka o nwee mkpali na ọchịchọ ịgachi nzukọ anya. Ọ na-ekwu, sị: “Omume a na-eme ka m na-aga n’ihu, na-enyekwa m ume ime mmụọ dị m mkpa ka m wee nwee ike inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ihe ịma aka na nsogbu dị iche iche.”—Ndị Hibru 10:24, 25.

Omume dị otú ahụ dị oké mkpa n’ọsọ ndụ ndị Kraịst na-agba. Otu akụkọ si n’otu mba a kpagbuworo ndị Jehova na ya kwuru, sị: “Ndị nwere omume ime mmụọ dị mma na ekele miri emi maka eziokwu ahụ enweghị nsogbu n’iguzosi ike mgbe ule bịara, ma ndị ahụ ọ na-abụ ‘n’oge ihe dị mma’ ha ahapụ ije nzukọ, ghara ịgachi ozi ubi anya ma na-ada n’ihe ndị dị nta, na-adakarị mgbe ha dabara n’ule ‘kpụ ọkụ n’ọnụ.’”—2 Timoti 4:2.

Zere Omume Ọjọọ, Na-eme nke Ọma

E kwuwo na ‘mmadụ kwesịrị ịzụlite nanị omume ndị ahụ ọ dị njikere ikwe ka ha mara ya ahụ.’ N’ezie, omume ọjọọ na-esi ike nkwụsị. Ma, a pụrụ ịkwụsị ya.

Ruo oge ụfọdụ, Stella bụ onye ikiri TV riri isi. Ọ na-ekweta, sị: “A bịa n’omume ọjọọ nile m dabatụrụla na ha, a na-enwekarị ‘ezigbo ihe’ dubara m na ya.” Otú a ka ọ dị n’omume ya nke ikiribiga TV ókè. Ọ gwara onwe ya na ya ga na-ekiri ya nanị iji “zurutụ ike” ma ọ bụ iji “gbanwee ihe omume.” Ma, ọ chịkwalighị omume ya, na-eme ka ọ na-ekiri telivishọn ruo ọtụtụ awa. “Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, omume ọjọọ a belatara ọganihu ime mmụọ m,” ka ọ na-ekwu. Site n’itinye mgbalị siri ike, o mesịrị belata oge o ji ekiri TV ma na-emezi nhọrọ karị. “Ana m agbalị mgbe nile icheta ihe mere m ji chọọ ịkwụsị omume a,” ka Stella na-ekwu, “ana m adaberekwa n’ebe Jehova nọ iji nọgidesie ike ná mkpebi m.”

Onye Kraịst aha ya bụ Charalambos na-ekwu banyere omume ọjọọ nke gbochiri ya inwe ọganihu ime mmụọ—iyigharị ihe. “Mgbe m matara na omume iyigharị ihe bụ ihe na-emebi ihe, amalitere m ịrụ ọrụ iji gbanwee ndụ m. Mgbe m na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ, ana m eme atụmatụ a kapịrị ọnụ banyere oge m ga-amalite na otú m ga-esi malite ịrụ ọrụ banyere ha. Ịgbasochi mkpebi na atụmatụ m anya bụ ihe ngwọta ya, ọ nọgidekwara na-abụ omume ọma ruo ugbu a.” N’ezie, omume ọma bụ ihe kasị mma iji dochie omume ọjọọ.

Ndị enyi anyị pụkwara ime ka anyị zụlite omume, nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ. Omume ọma na-efe efe, dị nnọọ ka nke ọjọọ na-eme. Ọbụna dị ka “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma,” ndị enyi ọma pụrụ isetịpụrụ anyị ihe nlereanya nke omume ọma ndị anyị ga-agbaso. (1 Ndị Kọrint 15:33) Nke kasị mkpa, omume pụrụ ime ka mmekọrịta anyị na Chineke sikwuo ike ma ọ bụ mebie ya. Stella na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na omume anyị dị mma, ha na-eme ka mgbalị anyị ijere Jehova ozi dịkwuo mfe. Ọ bụrụ na ha na-emebi ihe, ha na-eme ka mgbalị anyị ghara ịdị irè.”

Zụlite omume ọma, ma kwee ka ọ na-eduzi gị. Ọ ga-abụ ihe dị ike, nke bara uru ná ndụ gị.

[Foto dị na peeji nke 19]

Dị ka ọkụ, omume pụrụ ịba uru ma ọ bụ bibie ihe

[Foto dị na peeji nke 21]

Omume e ji mara Jisọs bụ ịnọ n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izu Ike maka ịgụ Okwu Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Omume ime mmụọ dị mma na-eme ka mmekọrịta anyị na Chineke sikwuo ike