Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ihe I Kweere?

N’ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ihe I Kweere?

N’ihi Gịnị Ka I Ji Kwere Ihe I Kweere?

A kọwawo ikwere ihe dị ka “ịnakwere ihe dị ka eziokwu, ihe bụ́ ezigbo ya, ma ọ bụ ihe dị adị n’ezie.” Akwụkwọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Universal Declaration of Human Rights (Nkwupụta Ụwa Nile Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ) na-agbachitere “nnwere onwe nke echiche, akọ na uche na okpukpe [bụ́ nke] ruuru” onye ọ bụla. Ihe a ruuru mmadụ na-agụnye nnwere onwe “ịgbanwe okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya,” ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime otú ahụ.

OTÚ ọ dị, n’ihi gịnị ka mmadụ ọ bụla ga-eji chọọ ịgbanwe okpukpe ma ọ bụ nkwenkwe ya? “Enwere m nkwenkwe nke m, ha dịkwa m mma,” bụ echiche a na-ekwupụtakarị. Ọtụtụ ndị na-eche na ọbụna nkwenkwe ndị hiere ụzọ adịchaghị emerụ mmadụ ahụ. Dị ka ihe atụ, o yighị ka onye kweere na ụwa dị larịị ọ ga-emerụ onwe ya ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ahụ. “Ka anyị were ya nnọọ na anyị nwere echiche dịrịtara iche ma hapụ ịrụ ụka,” ka ụfọdụ na-ekwu. Amamihe ọ̀ dị na nke ahụ mgbe nile? Dọkịta ọ̀ ga-ewere ya nnọọ na echiche nke ya dị iche ma hapụ ịrụ ụka ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị dọkịta ibe ya anọgide na-ekwere na ya pụrụ isi n’ebe ya metụchara ozu aka gawa ozugbo ile onye ọrịa ahụ n’ụlọ ọgwụ?

A bịa n’okpukpe, nkwenkwe hiere ụzọ emebiwo ihe dị ukwuu dị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi. Cheedị banyere ọbara a kwafuru mgbe ndị ndú okpukpe “kpaliri ndị Kraịst na-anụbiga ọkụ n’obi ókè iji obi ọjọọ mee ihe ike” n’oge a lụrụ agha ahụ a sị na ọ bụ Agha Ntụte Dị Nsọ nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya. Ma ọ bụ cheedị banyere “ndị Kraịst” nke oge a kwara mgbọ n’otu agha obodo a lụrụ na nso nso a bụ́ ndị “mapawara foto Nwanyị ahụ Na-amaghị Nwoke n’isi égbè ha, dị nnọọ ka ndị dike nke oge ụwa na-emepechabeghị anya mere bụ́ ndị dekwasịrị aha ndị senti n’isi mma agha ha.” Ndị a nile na-anụbiga ọkụ n’obi ókè kweere na ihe ha mere ziri ezi. Ma, o doro anya na ọ dị ihe na-ezitụghị nnọọ ezi n’esemokwu na n’ọgụ okpukpe ndị a na ndị ọzọ.

N’ihi gịnị ka e ji nwee oké ọgba aghara na esemokwu? Azịza Bible na-enye bụ na Setan bụ́ Ekwensu “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 2 Ndị Kọrint 4:4; 11:3) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na, n’ụzọ dị mwute, a ga-eme ka ọtụtụ ndị okpukpe “laa n’iyi” n’ihi na Setan, bụ́ onye ‘ga-arụ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama ndị o chepụtara iji duhie mmadụ,’ ga-aghọgbu ha. Pọl kwuru na ndị dị otú ahụ ‘ga-emechi uche ha n’ebe ịhụnanya nke eziokwu ahụ dị bụ́ nke gaara azọpụta ha,’ ha ga-esikwa otú ahụ bụrụ ndị ‘a ghọgburu ikwere ihe bụ́ ụgha.’ (2 Ndị Tesalọnaịka 2:9-12, The New Testament, nke William Barclay dere) Olee otú ị pụrụ isi mee ka ọ ghara ikwecha gị omume ikwere ụgha? N’ezie, n’ihi gịnị ka i ji ekwere ihe otú i si ekwere?

À Zụlitere Gị Ikwere Ya?

Ikekwe a zụlitewo gị ikwere ihe ezinụlọ gị kweere. Nke ahụ pụrụ nnọọ ịbụ ihe dị mma. Chineke chọrọ ka ndị nne na nna zie ụmụ ha ihe. (Deuterọnọmi 6:4-9; 11:18-21) Dị ka ihe atụ, nwa okorobịa ahụ bụ́ Timoti ritere uru dị ukwuu site n’ige nne ya na nne ya ochie ntị. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Akwụkwọ Nsọ na-agba ume ịkwanyere ihe nne na nna kweere ùgwù. (Ilu 1:8; Ndị Efesọs 6:1) Ma, ihe Onye Okike gị bu n’uche ọ̀ bụ ka i kwere ihe nanị n’ihi na ndị mụrụ gị kweere ya? Mmadụ ajụghị ase gbasoo ihe ọgbọ bu ya ụzọ kweere ma mee pụrụ ịdị ize ndụ n’ezie.—Abụ Ọma 78:8; Emọs 2:4.

A zụlitere otu nwanyị Sameria, bụ́ onye zutere Jisọs Kraịst, ikwere n’okpukpe ndị Sameria ọ na-ekpe. (Jọn 4:20) Jisọs kwanyeere nnwere onwe ya ịhọrọ ihe ọ chọrọ ikwere ùgwù, ma ọ gwakwara ya, sị: “Unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị.” N’ezie, ọtụtụ n’ime nkwenkwe okpukpe ya hiere ụzọ, ọ gwakwara ya na ọ ga-emerịrị mgbanwe n’ihe ndị o kweere ma ọ bụrụ na ọ gaje ife Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma—“n’ime mmụọ na eziokwu.” Kama ịrapagidesi ike n’ihe obi abụọ na-adịghị ya na ha bụ nkwenkwe ndị e ji kpọrọ ihe, ka oge na-aga, ya na ndị ọzọ dị ka ya aghaghị ‘ịṅa ntị n’okwukwe ahụ’ e si n’aka Jisọs Kraịst kpughee.—Jọn 4:21-24, 39-41; Ọrụ 6:7.

À Kụziiri Gị Ikwere Ya?

Ọtụtụ ndị nkụzi na ndị ọkachamara n’ihe ọmụmụ ndị pụrụ iche kwesịrị ka a na-akwanyere ha ùgwù dị ukwuu. Ma, ihe atụ nke ndị nkụzi a na-asọpụrụ bụ́ ndị kụziri ihe na-abụtụghị eziokwu, jupụtara n’akụkọ ihe mere eme. Dị ka ihe atụ, banyere akwụkwọ abụọ ọkà ihe ọmụma bụ́ onye Gris bụ́ Aristotle dere banyere nkà mmụta sayensị, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Bertrand Russell kwuru na “o siri ike ịnakwere otu ahịrịokwu dị na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ abụọ ahụ dị ka eziokwu, na-adabere na nkà mmụta sayensị nke oge a.” Ọbụna ndị ọkachamara nke oge a na-akụ afọ n’ala mgbe mgbe n’ụzọ dị egwu. “O kweghị omume ịrụpụta ihe na-efe efe nke ga-adị arọ karịa ikuku,” bụ ihe ọkà mmụta sayensị bụ́ onye Britain bụ́ Lord Kelvin ji obi ike kwuo na 1895. Ya mere, onye maara ihe adịghị ekwere na ihe bụ eziokwu n’ajụghị ajụjụ nanị n’ihi na ụfọdụ ndị nkụzi bụ́ ọkachamara kwuru na ọ bụ.—Abụ Ọma 146:3.

Ọ dị mkpa ịkpachapụ anya otú ahụ ma a bịa ná nkụzi okpukpe. Ndị nkụzi okpukpe nke Pọl onyeozi kụziiri ya ihe nke ọma, ‘obi ya nụbigakwaara ozizi ahụ ọkụ ókè karị, bụ́ nke nna ya hà nyere ya n’aka idebe.’ Otú ọ dị, ịnụ ọkụ n’obi o nwere na nkwenkwe ndị nna nna ya, kpataara ya nsogbu n’ezie. O dugara ya ‘n’isogbu nzukọ Chineke nke ukwuu hie nne, mebiekwa ya.’ (Ndị Galetia 1:13, 14; Jọn 16:2, 3) Nke ka njọ, ruo ogologo oge, Pọl nọgidere ‘na-agba ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ,’ na-eguzogide mmetụta ndị kwesịrị ịkpaliwo ya ikwere na Jisọs Kraịst. Jisọs n’onwe ya aghaghị ime ihe dị egwu iji kpalie Pọl ịgbanwe nkwenkwe ya.—Ọrụ 9:1-6; 26:14.

Usoro Mgbasa Ozi Ò Metụtara Ya?

Ikekwe usoro mgbasa ozi emetụtawo nkwenkwe gị n’ụzọ dị ukwuu. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-enwe aṅụrị na e nwere nnwere onwe ikwu okwu n’usoro mgbasa ozi, na-eme ka ha na-enweta ihe ọmụma ndị pụrụ ịba uru. Otú ọ dị, e nwere ikike ndị dị ike bụ́ ndị pụrụ ma na-eji aghụghọ achịkwa usoro mgbasa ozi n’esepụghị aka. Ihe ọmụma ha na-enyekarị bụ nke na-akwụghị ọtọ bụ́ nke pụrụ imetụta echiche gị.

Tụkwasị na nke ahụ, iji dọta ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ, usoro mgbasa ozi na-achọkarị ịgbasa ihe ọmụma ndị na-akpali akpali na ndị a na-adịghị anụkebe. Ihe ndị sigburu onwe ha n’ike ikwu ma ọ bụ ibipụtara ọha mmadụ nanị n’afọ ole na ole gara aga, aghọọla ihe zuru ebe nile taa. N’ezie, e ji nwayọọ nwayọọ awakpo ma na-ebibi ụkpụrụ akparamàgwà ndị ọha mmadụ nakweere. E ji nke nta nke nta na-emerụ echiche ndị mmadụ. Ha na-amalite ikwere na ‘ihe ọjọọ bụ ezi ihe nakwa na ezi ihe bụ ihe ọjọọ.’—Aịsaịa 5:20; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10.

Ịchọta Ihe Ndabere Siri Ike Maka Nkwenkwe

Ime ka nkwenkwe dabere n’echiche na nkà ihe ọmụma nke mmadụ dị ka iwukwasị ụlọ n’elu ájá. (Matiu 7:26; 1 Ndị Kọrint 1:19, 20) Na gịnịzi ka ị pụrụ iji obi ike mee ka nkwenkwe gị dabere? Ebe ọ bụ na Chineke enyewo gị ọgụgụ isi iji na-enyocha ụwa gbara gị gburugburu na iji na-ajụ ajụjụ banyere ihe ime mmụọ, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-ezikwa gị ụzọ isi nweta azịza ziri ezi nye ajụjụ ndị ị na-ajụ? (1 Jọn 5:20) Eenụ, ọ ga-eme otú ahụ! Otú ọ dị, olee otú ị pụrụ isi chọpụta ihe bụ́ eziokwu, ihe bụ́ ezigbo ya, ma ọ bụ ihe dị adị n’ezie n’ihe metụtara ofufe? Anyị agaghị egbu oge ikwu na ọ bụ nanị Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-enye ihe ndabere maka ime nke a.—Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17.

“Cheregodị,” ka mmadụ ga-asị, “ọ́ bụghị kpọmkwem ndị nwere Bible bụ ndị kpataworo ihe ka ọtụtụ n’esemokwu na ọgba aghara ndị a na-enwe n’ụwa?” Ọ bụ eziokwu na ndị ndú okpukpe bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-agbaso Bible echepụtawo ọtụtụ echiche ndị dị mgbagwoju anya ma na-emegiderịta onwe ha. Nke a bụ n’ihi na ha emebeghị n’ezie ka ozizi ha dabere na Bible. Pita onyeozi na-akọwa ha dị ka “ndị amụma ụgha” na “ndị ozizi ụgha” bụ́ ndị ga-ewepụta “ịrọ òtù dị iche iche nke ịla n’iyi.” Dị ka ihe ga-esi n’ọrụ ha pụta, ka Pita na-ekwu, “a ga-ekwulu ụzọ nke eziokwu.” (2 Pita 2:1, 2) Ma, ka Pita na-ede, “e mekwara ka okwu amụma ahụ guzosiere anyị ike karị; nke unu na-eme nke ọma n’ịṅa ntị ya, dị ka oriọna mgbe ọ na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.”—2 Pita 1:19; Abụ Ọma 119:105.

Bible na-agba anyị ume iji ihe ọ na-akụzi na-atụle nkwenkwe anyị. (1 Jọn 4:1) Ọtụtụ nde ndị na-agụ magazin a pụrụ ịgba akaebe na ime otú ahụ emewo ka ndụ ha nwekwuo nzube ma kwụsikwuo ike. Ya mere, dịrị ka ndị Beria ahụ nwere obi sara mbara. ‘Jiri nlezianya na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị’ tupu i kpebie ihe ị ga-ekwere. (Ọrụ 17:11) Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka ime nke a. N’ezie, ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị chọrọ ikwere. Otú ọ dị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ijide n’aka na nkwenkwe gị abụghị nke amamihe na ọchịchọ mmadụ na-akpụzi, kama, nke Okwu nke eziokwu nke Chineke kpughere, na-akpụzi.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 5:21.

[Foto ndị dị na peeji nke 6]

Ị pụrụ iji obi ike mee ka nkwenkwe gị dabere na Bible