Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Oruru O Ruuru Gị Ikwere Ihe

Oruru O Ruuru Gị Ikwere Ihe

Oruru O Ruuru Gị Ikwere Ihe

Ikekwe i ji oruru o ruuru gị ikwere ihe ọ bụla ị chọrọ ikwere kpọrọ ihe. Otú ahụ ka ọ dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla ọzọ. Site n’iji ihe a ruuru ha na-eme ihe, n’ụzọ dị ịtụnanya, ijeri mmadụ isii bi n’ụwa enweela nkwenkwe dị iche iche. Dị ka ọdịiche ndị dị n’àgwà, ọdịdị, ụtọ, ísì, na ụda bụ́ ndị anyị na-ahụ n’ihe okike, nkwenkwe dị iche iche na-eme mgbe mgbe ka e nwekwuo mmasị, mkpali, na obi ụtọ ná ndụ. N’ezie, ọdịiche dị otú ahụ pụrụ ime ka ndụ dị ụtọ.—Abụ Ọma 104:24.

MA, Ọ dị mkpa ịkpachara anya. Ọ bụghị nanị na ụfọdụ nkwenkwe dị iche kamakwa ha dị ize ndụ. Dị ka ihe atụ, ná mmalite narị afọ nke 20, ụfọdụ mmadụ bịara kwere na ndị Juu na ndị Freemason mere atụmatụ “ịkpasasị ọdịnala ndị Kraịst ma guzobe ọchịchị ga-ezu ụwa ọnụ bụ́ nke ha ga-agbakọ aka chịa.” Otu ebe nkwenkwe a si malite bụ otu traktị e dere iji mee ka a kpọọ ndị Juu asị, nke aha ya bụ Protocols of the Learned Elders of Zion. (Atụmatụ nke Ndị Okenye Gụrụ Akwụkwọ nke Zaịọn) Traktị ahụ boro ebubo na atụmatụ ndị ahụ gụnyere ịkwado ịtụ ụtụ isi gabigara ókè, ịkwalite mkpụpụta ngwá agha, ịkwado ka nanị otu ụlọ ọrụ weghara usoro azụmahịa ka ‘e wee nwee ike ibibi akụ̀ ndị Jentaịl n’otu ntabi anya.’ Ihe e boro ha gụnyekwara iji aghụghọ achịkwa usoro agụmakwụkwọ iji mee ka ‘ndị Jentaịl ghọọ ụmụ anụmanụ na-adịghị eche echiche,’ na ọbụna ịrụ ụzọ ụgbọ okporo ígwè n’okpuru ala iji jikọta isi obodo dị iche iche ka ndị okenye ndị Juu wee nwee ike ‘imeri ndị mmegide ọ bụla site n’igbu ha.’

N’ezie, ihe ndị a bụ ụgha—ndị e chepụtara iji kpalie ndị mmadụ ịkpọ ndị Juu asị. ‘Akụkọ a ezi uche na-adịghị na ya e chepụtara echepụta,’ ka Mark Jones nke na-arụ n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie Britain na-ekwu, ‘gbasara ruo mba ofesi site na Russia,’ bụ́ ebe mbụ e bipụtara ya n’akwụkwọ akụkọ na 1903. Ọ gbara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Times nke London na May 8, 1920. Ihe karịrị otu afọ mgbe e mesịrị, The Times kpughere ihe odide ahụ dị ka nke adịgboroja. Ka ọ dịgodị, ihe emebiwo. ‘Ụgha ndị dị ka ndị a,’ ka Jones na-ekwu, ‘na-ara ahụ nkwụsị.’ Ozugbo ndị mmadụ kweere ha, ha na-eme nnọọ ka ha nwee nkwenkwe ndị na-akpata ibu iro, ndị na-egbu egbu, nakwa ndị dị ize ndụ—nke a na-akpatakarị ihe ndị dị mwute, dị ka akụkọ ihe mere eme nke narị afọ nke 20 gosiworo.—Ilu 6:16-19.

Nkwenkwe Megide Eziokwu

N’ezie, ọ bụghị iwu na a ga-ama ụma ghaara mmadụ ụgha tupu ya enwewa nkwenkwe ndị hiere ụzọ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-aghọtahie nnọọ ihe. Mmadụ ole nwụchurula ọnwụ ka ha na-eme ihe ha kweere na o ziri ezi? Ọzọkwa, anyị na-ekwere ihe mgbe mgbe nanị n’ihi na anyị chọrọ ikwere ya. Otu prọfesọ na-ekwu na ọbụna ndị ọkà mmụta sayensị “na-enwe oké mmasị mgbe mgbe n’ihe ha chepụtara.” Ihe ha kweere adịghị ekwe ka ha jiri ezi uche mee mkpebi. Mgbe ahụ, ha pụrụ iji oge ndụ ha nile na-anwa, n’ụzọ na-enweghị isi, ịkwado nkwenkwe ha ndị hiere ụzọ.—Jeremaịa 17:9.

E nweela ihe ndị yiri nke ahụ n’ebe nkwenkwe okpukpe dị—ebe e nwere ọtụtụ ihe ndị na-emegiderịta onwe ha. (1 Timoti 4:1; 2 Timoti 4:3, 4) Otu onye nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ. Onye ọzọ ekwuo na ihe onye ahụ nwere bụ nanị “okwukwe na-enweghị ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ.” Otu onye na-ekwusi ike na i nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Onye ọzọ ekwere na mgbe ị nwụrụ na ị na-akwụsị ịdị adị, kpam kpam. N’ụzọ doro anya, nkwenkwe ndị na-emegiderịta onwe ha dị ka ndị a apụghị ịbụcha eziokwu. N’ihi ya, ọ́ bụghị ihe amamihe dị na ya ijide n’aka na ihe i kweere bụ eziokwu n’ezie na ọ bụghị nanị na ọ bụ ihe ị chọrọ ikwere? (Ilu 1:5) Olee otú ị pụrụ isi mee ya? Isiokwu na-esonụ ga-atụle okwu a.

[Foto dị na peeji nke 3]

Isiokwu e bipụtara na 1921 bụ́ nke na-ekpughe ihe e dere na traktị bụ́ “Protocols of the Learned Elders of Zion”