Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• N’ihi gịnị ka ajụjụ ndị ahụ a jụrụ na Job isi 38 ji kwesị ka a tụlee ha ọbụna taa?

Ọbụna ndị ọkà mmụta sayensị nke oge a apụghị ịghọta, n’ụzọ zuru ezu, ọtụtụ n’ime oké ọrụ ndị Chineke dọọrọ uche gaa na ha. Ndị a na-agụnye otú ike ndọda si eme ka ụwa na-aga gburugburu, kpọmkwem ihe ìhè bụ, ihe mere e ji nwee imerime mpekere snow dịgasị iche iche, otú mkpụrụ mmiri si amalite ịkpụkọ, na ọrụ ike na-arụ n’égbè eluigwe.—4/15, peeji nke 4-11.

Ihe atụ ndị dị aṅaa dị na Bible pụrụ inyere anyị aka ịnagide mmetụta ndị na-ezighị ezi?

Esaf, Beruk, na Naomi, nwechara oge ha nwere nkụda mmụọ ma ọ bụ mmetụta ndị ọzọ na-ezighị ezi, ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ banyere otú ha si nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụkwara inyere anyị aka.—4/15, peeji nke 22-24.

Olee ụzọ ụfọdụ dị irè a pụrụ isi nyere ndị Kraịst di ha nwụrụ aka?

Ndị enyi ha pụrụ iji obiọma na ụzọ doro anya gwa ha ka ha nyere ha aka. Ndị òtù ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike inyere ha aka n’ụzọ ego ma ọ bụ n’ụzọ ihe onwunwe, n’ebe e nwere mkpa n’ezie. Ndị Kraịst ibe ha pụkwara inyere ha aka site n’iji ịhụnanya meta ha enyi, na-enye ha nkwado na nkasi obi ime mmụọ.—5/1, peeji nke 5-7.

N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị,” dị ka 1 Ndị Kọrint 7:39 na-adụ n’ọdụ?

Ịlụ ndị na-ekweghị ekwe arụpụtawo ihe dị njọ mgbe mgbe. Ọzọkwa, ịgbaso ndụmọdụ a sitere n’aka Chineke bụ okwu metụtara iguzosi ike n’ihe nye Jehova Chineke. Mgbe anyị na-eme ihe kwekọrọ n’Okwu Chineke, obi anyị anaghị ama anyị ikpe. (1 Jọn 3:21, 22)—5/15, peeji nke 20-21.

Ebe Jehova bụ onye nwere ike ịgbaghara mmehie, gịnị mere ndị Kraịst ji ekwupụtara ndị okenye ọgbakọ mmehie ndị dị oké njọ?

Ee, ihe onye Kraịst kwesịrị ịchọ bụ ka Jehova gbaghara ya mmehie ndị dị oké njọ o mere. (2 Samuel 12:13) Ma, dị nnọọ ka Netan onye amụma nyeere Devid aka, ndị okenye tozuru okè nọ n’ọgbakọ pụrụ inyere ndị mmehie nwere nchegharị aka. Ịgakwuru ndị okenye kwekọrọ ná ntụziaka e nyere na Jemes 5:14, 15.—6/1, peeji nke 31.

Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na anyị kwesịrị ilekọta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa?

Akụkọ ihe mere eme na-egosi na nlekọta dị otú ahụ ka e ji mara ezi ofufe ma n’etiti ndị Hibru oge ochie ma n’etiti ndị Kraịst oge mbụ. (Ọpụpụ 22:22, 23; Ndị Galetia 2:9, 10; Jemes 1:27) Pọl onyeozi nyekwara ntụziaka doro anya n’Akwụkwọ Nsọ ka ndị Kraịst na-elekọta ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa. (1 Timoti 5:3-16)—6/15, peeji nke 9-11.

Gịnị bụ isi ihe na-eme ka e bie ndụ obi ụtọ na nke nwere nzube?

Anyị aghaghị ịzụlite mmekọrịta kwesịrị ekwesị nke anyị na Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, ma nọgidesie ike na ya. Ịmụ Bible bụ ihe enyemaka dị mkpa n’ime nke ahụ kpọmkwem.—7/1, peeji nke 4-5.

Mmadụ ọ bụla ò nwere mmụọ na-adịghị anwụ anwụ nke na-apụ mgbe a nwụrụ?

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị kweere na mmụọ—ọ bụghị mkpụrụ obi—adịghị anwụ anwụ, Bible adịghị akwado echiche a. Ọ na-egosi na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ na-alaghachi n’ájá ma kwụsị ịdị adị. Ma, ọ bụ Chineke nwere ikike nke ime ka ọ dịghachi ndụ, n’ihi ya, olileanya ọ bụla onye ahụ nwere ịdị ndụ n’ọdịnihu, site ná mbilite n’ọnwụ, dị Chineke n’aka. (Eklisiastis 12:7)—7/15, peeji nke 3-6.

Ebee ka Daniel nọ mgbe e lere ndị Hibru atọ ahụ ule na ndagwurugwu Dura?

Bible ekwughị. Ọ pụrụ ịbụ na iwu ejighị Daniel ịnọ n’ebe ahụ n’ihi ọkwá ya, ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ịbụ na e zigara ya ọrụ ná mba ọzọ. Ma, anyị pụrụ inwe obi ike na o mebighị ikwesị ntụkwasị obi ya nye Jehova.—8/1, peeji nke 31.