Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Abraham—onye Nlereanya nke Okwukwe

Abraham—onye Nlereanya nke Okwukwe

Abraham—onye Nlereanya nke Okwukwe

“[Abraham bụ] nna nke ndị nile nwere okwukwe.”—NDỊ ROM 4:11, NW.

1, 2. (a) Olee otú ezi ndị Kraịst taa si echeta Abraham? (b) N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Abraham “nna nke ndị nile nwere okwukwe”?

Ọ BỤ nna nna nke otu mba dị ike, onye amụma, onye ọchụ nta ego, onye ndú. Ma, n’etiti ndị Kraịst taa, ihe e ji echeta ya karịsịa bụ àgwà ahụ kpaliri Jehova Chineke iwere ya dị ka enyi ya—okwukwe ya na-adịghị ada ada. (Aịsaịa 41:8; Jemes 2:23) Aha ya bụ Abraham, Bible na-akpọkwa ya “nna nke ndị nile nwere okwukwe.”—Ndị Rom 4:11.

2 Ọ̀ bụ na ndị ikom bu Abraham ụzọ, dị ka Ebel, Inọk, na Noa, egosipụtaghị okwukwe? Ee, ha gosipụtara, kama ọ bụ Abraham ka e so gbaa ndụ ịgọzi mba nile nke ụwa. (Jenesis 22:18) N’ụzọ dị otú ahụ, ọ ghọrọ nna ihe atụ nke ndị nile ga-enwe okwukwe ná Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. (Ndị Galetia 3:8, 9) Ruo n’ókè ụfọdụ, anyị pụrụ iwere Abraham dị ka nna anyị, n’ihi na okwukwe ya bụụrụ anyị ihe nlereanya iṅomi. A pụrụ ile ndụ ya dum anya dị ka nke e gosipụtara okwukwe na ya, n’ihi na o jupụtara n’ọtụtụ ule na ọnwụnwa. N’ezie, ogologo oge tupu Abraham enweta ihe a pụrụ ịkpọ ule nke okwukwe kasịnụ o chetụworo ihu—iwu nke ịchụ nwa ya bụ́ Aịsak n’àjà—Abraham gosipụtara n’ọnwụnwa ndị ka nta na ya nwere okwukwe. (Jenesis 22:1, 2) Ka anyị nyochazie ụfọdụ n’ime ndị mbụ n’ule nke okwukwe ndị ahụ ma hụ ihe ha pụrụ ịkụziri anyị taa.

Iwu nke Isi Ua Pụọ

3. Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere ebe a zụlitere Abram?

3 Ebe mbụ Bible mere ka anyị mara banyere Abram (nke e mesịrị mara dị ka Abraham) bụ na Jenesis 11:26, nke na-asị: “Tira dị ndụ [afọ iri asaa], mụọ Abram, na Nehoa, na Heran.” Abram sitere n’eriri Shem nke na-atụ egwu Chineke. (Jenesis 11:10-24) Dị ka Jenesis 11:31 si kwuo, Abram na ezinụlọ ya biri na ‘Ua nke ndị Kaldea,’ bụ́ obodo bara ọgaranya nke dịbu n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Yufretis. * N’ihi ya, a zụliteghị ya dị ka onye nkwagharị nke bi n’ụlọikwuu kama dị ka onye bi n’obodo ndị oké ozu. A pụrụ ịzụta ngwá ahịa ndị e si mba ọzọ tụbata, n’ahịa Ua. Nnukwu ụlọ ndị nwere ọnụ ụlọ 14, bụ́ ndị e tinyezuru paịpụ mmiri ndị na-adị n’ime ụlọ, kwụrụ n’ahịrị n’okporo ámá ndị dị na ya.

4. (a) Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka Ua na-ewetara ndị na-efe ezi Chineke ahụ? (b) Olee otú Abram si bịa nwewa okwukwe n’ebe Jehova nọ?

4 E wezụga uru ihe onwunwe nile dị na ya, Ua na-eweta ihe ịma aka nye onye ọ bụla chọrọ ijere ezi Chineke ahụ ozi. Ọ bụ obodo nke mikpuru onwe ya n’ikpere arụsị na nkwenkwe ụgha. N’ezie, ihe owuwu kasị ukwuu dị n’obodo ahụ bụ akatamkpo ụlọ nsọ e wuuru chi ọnwa bụ́ Nanna. Obi abụọ adịghị ya na a rụgidesiri Abram ike ikere òkè n’ofufe a jọgburu onwe ya, ikekwe na-agụnye nrụgide sitere n’aka ụfọdụ ndị ikwu ya. Dị ka ọdịnala ụfọdụ nke ndị Juu si kwuo, nna Abram, bụ́ Tira, bụ onye na-akpụ arụsị n’onwe ya. (Joshua 24:2, 14, 15) Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, Abram abụghị onye na-efe ofufe ụgha rụrụ arụ. Nna nna ya meworo agadi bụ́ Shem ka nọ ndụ, obi abụọ adịghịkwa ya na ọ gwara ya ihe ọ maara banyere ezi Chineke ahụ. N’ihi ya, Abram nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, ọ bụghị n’ebe Nanna nọ!—Ndị Galetia 3:6.

Otu Ule nke Okwukwe

5. Iwu dị aṅaa ka Chineke nyere Abram mgbe ọ ka nọ na Ua, nkwa dịkwa aṅaa ka o kwere ya?

5 A gaje ile okwukwe Abram ule. Chineke mere ka ọ hụ ya anya ma nye ya iwu, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya: M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, M ga-agọzikwa gị, mee ka aha gị dị ukwuu; gị bụrụkwa ngọzi: M ga-agọzikwa ndị na-agọzi gị, ọ bụkwa onye na-akọcha gị ka M ga-abụ ọnụ: a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.”—Jenesis 12:1-3; Ọrụ 7:2, 3.

6. Gịnị mere o ji chọọ Abram okwukwe siri ike n’aka iji hapụ Ua?

6 Abram emeela agadi, ọ mụtaghịkwa nwa. À pụrụ isi aṅaa mee ka ọ ghọọ “mba ukwu”? Ebeekwa kpọmkwem ka ala a e nyere ya iwu ịga dị? Chineke agwabeghị ya n’oge ahụ. Ya mere, ọ chọrọ Abram okwukwe siri ike n’aka iji hapụ Ua bara ọgaranya na ndụ okomoko ya nile. Akwụkwọ bụ́ Family, Love and the Bible na-ekwu banyere oge ochie, sị: “Ntaramahụhụ kasịnụ a pụrụ inye onye òtù ezinụlọ mere mpụ jọgburu onwe ya bụ ịchụpụ ya, ime ka ọ gharazie ịbụ ‘onye òtù’ ezinụlọ ahụ. . . . Ọ bụ ya mere nhapụ Abraham hapụrụ ọ bụghị nanị mba ya, kamakwa ndị ikwu ya mgbe Chineke nyere ya iwu ime otú ahụ ji bụrụ ngosipụta na-enweghị atụ nke nrubeisi na ntụkwasị obi obi abụọ na-adịghị na ya o nwere n’ebe Chineke nọ.”

7. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi guzogide ule ndị dị ka ndị ahụ Abram nwetara?

7 Ndị Kraịst taa pụrụ iche ule ndị yiri nke ahụ ihu. Dị ka Abram, ọ pụrụ ịdị anyị ka a na-arụgide anyị ime ka ihe onwunwe butere ihe ọchịchị Chineke ụzọ. (1 Jọn 2:16) Anyị pụrụ inweta mmegide site n’aka ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe, gụnyere ndị ikwu a chụpụrụ n’ọgbakọ, bụ́ ndị pụrụ ịnwa ịraba anyị ná mkpakọrịta na-adịghị mma. (Matiu 10:34-36; 1 Ndị Kọrint 5:11-13; 15:33) Ya mere, Abram setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya. O mere ka ọbụbụenyi ya na Jehova butere ihe nile ụzọ—ọbụna nkekọ ezinụlọ ya. Ọ maghị kpọmkwem otú nkwa Chineke ga-esi emezu, mgbe ọ ga-emezu, ma ọ bụkwanụ ebe ọ ga-anọ mezuo. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị njikere ime ka ndụ ya dabere ná nkwa ndị ahụ. Lee ka nke a si bụụrụ anyị ezi ihe agbamume ibute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị taa!—Matiu 6:33.

8. Mmetụta dị aṅaa ka okwukwe Abram nwere n’ebe ndị òtù ezinụlọ ya nọ, gịnịkwa ka ndị Kraịst pụrụ ịmụta site na nke a?

8 Gịnị banyere ndị òtù ezinụlọ Abram? Ihe àmà na-egosi na okwukwe na nkwenye siri ike nke Abram nwere mmetụta dị ịrịba ama n’ebe ha nọ, n’ihi na a kpaliri ma nwunye ya, bụ́ Seraị, ma nwa nwanne ya bụ́ nwa mgbei nke aha ya bụ Lọt, irube isi n’iwu Chineke ma si na Ua pụọ. Nwanne Abram bụ́ Nehoa na ụfọdụ n’ime ụmụ ya mesiri si Ua pụọ ma jee biri na Heran, bụ́ ebe ha fere Jehova ofufe. (Jenesis 24:1-4, 10, 31; 27:43; 29:4, 5) Leenụ, ọbụna nna Abram, bụ́ Tira, kwetara iso nwa ya nwoke pụọ! N’ihi ya, Bible kwuru na ọ bụ ya, dị ka onyeisi ezinụlọ, ka nkwaga ahụ ha kwagara Kenean si n’aka. (Jenesis 11:31) Ọ̀ bụ na anyị onwe anyị apụghị inweta ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ejiri akọ na-agbara ndị ikwu anyị àmà?

9. Nkwadebe ndị dị aṅaa ka Abram na-aghaghị ime maka njem ya, n’ihi gịnịkwa ka nke ahụ pụrụ ijiwo gụnye ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà?

9 Tupu Abram amalite njem ya, o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eme. Ọ ghaghị ire ala na ngwongwo ya ma zụta ụlọikwuu, camel, nri, na ngwá ọrụ ndị dị mkpa. Abram pụrụ inwetawo ọghọm n’ụzọ ego n’ime nkwadebe ọkụ ọkụ otú ahụ, ma obi dị ya ụtọ irubere Jehova isi. Lee ụbọchị dị ịrịba ama ọ na-aghaghị ịbụwo mgbe Abram kwadosịrị ihe nile, ìgwè camel na ndị njem ya eguzoro n’azụ mgbidi obodo Ua, dịrị njikere ịzọli njem! N’isoro otú Osimiri Yufretis si gbagọọ na-aga, ìgwè ndị njem ahụ gawara n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ. Mgbe ha gagidere ruo ọtụtụ izu, na-aga ihe dị ka 1,000 kilomita, ha rutere n’otu obodo dị n’ebe ugwu Mesọpotemia a na-akpọ Heran, bụ́ ebe bụ́ isi ìgwè ndị njem na-akwụsịtụ.

10, 11. (a) Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ya mere Abram ji nọtụ na Heran? (b) Agbamume dị aṅaa ka a pụrụ inye ndị Kraịst bụ́ ndị na-elekọta nne na nna ha mere agadi?

10 Abram bịara biri na Heran, ikekwe o mere otú ahụ n’ihi ọnọdụ nna ya merela agadi, bụ́ Tira. (Levitikọs 19:32) N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị Kraịst taa nwere ihe ùgwù nke ilekọta nne na nna ha mere agadi ma ọ bụ na-arịa ọrịa, ọbụna ụfọdụ na-eme mgbanwe ụfọdụ iji mee otú ahụ. Mgbe nke ahụ dị mkpa, a pụrụ imesi ndị dị otú ahụ obi ike na àjà ndị ha ji ịhụnanya na-achụ bụ “ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke.”—1 Timoti 5:4.

11 Oge gafere. “Ụbọchị nile nke Tira wee bụrụ [narị afọ abụọ na ise]: Tira wee nwụọ n’ime Heran.” N’ezie, ọnwụ a wutere Abram, ma mgbe oge iru újú ahụ gafere, ọ pụrụ ozugbo. “Abram gbara [afọ iri asaa na ise] mgbe o siri na Heran pụọ. Abram wee chịrị Seraị, bụ́ nwunye ya, na Lọt, bụ́ nwa nwanne ya, na akụ̀ ha nile nke ha kpatararịị, na mmadụ ndị ha nwetararịị n’ime Heran; ha wee pụọ ije ala Kenean.”—Jenesis 11:32; 12:4, 5.

12. Gịnị ka Abram mere mgbe o bi na Heran?

12 Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịmara na mgbe Abram nọ na Heran, ọ ‘kpatara akụ̀.’ Ọ bụ ezie na Abram chụrụ ihe onwunwe n’àjà iji si Ua pụọ, ọ bụ ọgaranya mgbe o si Heran pụọ. N’ụzọ doro anya, nke a bụ n’ihi ngọzi Chineke. (Eklisiastis 5:19) Ọ bụ ezie na Chineke adịghị ekwe ndị ya nile nkwa ihe onwunwe taa, ọ na-emezu nkwa ya igbo mkpa nke ndị ‘hapụrụ ụlọ, ụmụnne nwoke, ma ọ bụ ụmụnne nwanyị,’ n’ihi Alaeze ahụ. (Mak 10:29, 30) Abram ‘nwetakwara mmadụ,’ ya bụ, ọtụtụ ndị ohu. Targum nke Jerusalem na Paraphrase nke Kaldea na-ekwu na Abram ‘tọghatara ndị mmadụ.’ (Jenesis 18:19) Okwukwe gị ọ̀ na-akpali gị ịgwa ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị okwu? Kama ibiwezi na Heran ma chezọọ iwu Chineke, Abram ji oge ọ nọrọ ebe ahụ mee ihe n’ụzọ bara uru. Ma ugbu a, ọ nọzuola oge ọ ga-anọ ebe ahụ. “Abram wee jee, dị ka Jehova gwara ya okwu.”—Jenesis 12:4.

N’ofe Yufretis

13. Olee mgbe Abram gafere Osimiri Yufretis, gịnịkwa ka ihe omume ahụ pụtara?

13 Abram aghaghị ime njem ọzọ. Ka ya na ìgwè ndị njem ya si Heran pụọ, ha tinyere isi n’ebe ọdịda anyanwụ, na-eme njem ihe dị ka kilomita 90. Ọ pụrụ ịbụ na Abram kwụsịtụrụ n’ofe Yufretis site n’ógbè azụmahịa oge ochie bụ́ Kakemish. Nke a bụ ebe bụ́ isi ìgwè ndị njem si gafee. * Olee ụbọchị ìgwè ndị njem Abram gafere osimiri ahụ? Bible na-egosi na o weere ọnọdụ afọ 430 tupu Ọpụpụ ndị Juu site n’Ijipt na Nisan 14, 1513 T.O.A. Ọpụpụ 12:41 na-ekwu, sị: “O ruo, n’ọgwụgwụ [narị afọ anọ na iri atọ] ahụ, ọ bụkwa n’otu ụbọchị ahụ ka o ruru, na usuu nile nke ndị agha Jehova siri n’ala Ijipt pụọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na ọgbụgba ndụ Abraham malitere ịdị irè na Nisan 14, 1943 T.O.A., bụ́ mgbe Abram ji nrubeisi gafee Yufretis.

14. (a) Gịnị ka Abram pụrụ iji anya nke okwukwe ya hụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị Chineke taa bụ ndị a gọziri agọzi karịa Abram?

14 Abram ahapụla obodo bara ọgaranya. Ma, ugbu a ọ pụrụ iji anya nke uche hụ “obodo ahụ nke nwere ntọala,” ọchịchị ezi omume nke ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 11:10) Ee, n’ịbụ onye nwere nanị obere ihe ọmụma, Abram amalitelarị ịghọta akụkụ ụfọdụ bụ́ isi nke nzube Chineke ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-anwụ anwụ. Taa, anyị bụ ndị a gọziri agọzi n’inwe nghọta ka nnọọ saa mbara banyere nzube Chineke karịa ka Abram nwere. (Ilu 4:18) “Obodo,” ma ọ bụ ọchịchị Alaeze ahụ nke Abram lere anya ya dị adị ugbu a—e guzobere ya n’eluigwe kemgbe 1914. Ya mere, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịbụ ndị a kpaliri ime ihe ndị na-egosi na anyị nwere okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ?

Obibi O Biri Nwa Mgbe n’Ala Nkwa ahụ Amalite

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka Abram iwuru Jehova ebe ịchụàjà ji chọọ obi ike? (b) Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi na-enwe obi ike dị ka Abram?

15 Jenesis 12:5, 6 na-agwa anyị, sị: “Ha wee baa n’ala Kenean. Abram wee gabiga n’ala ahụ ruo ebe Shekem, ruo osisi terebinth nke More.” Shekem dị kilomita 50 n’ebe ugwu Jerusalem ma dịrị na ndagwurugwu na-eme nri bụ́ nke a kọwaworo dị ka “paradaịs nke ala nsọ ahụ.” Ya bụrụgodị otú ahụ, “ndị Kenean nọ n’ala ahụ mgbe ahụ.” Ebe ọ bụ na omume ndị Kenean jọgburu onwe ya, Abram aghaghị ịkpachapụ anya iji chebe ezinụlọ ya pụọ ná mmetụta ha na-emerụ emerụ.—Ọpụpụ 34:11-16.

16 Na nke ugbo abụọ ya, “Jehova wee mee ka Abram hụ Ya anya, Ọ sị, Mkpụrụ gị ka M ga-ewere ala nke a nye.” Lee ihe na-akpali akpali ọ bụ! N’ezie, ọ chọrọ Abram okwukwe n’aka iji ṅụrịwa ọṅụ n’ihe ọ bụ nanị ụmụ ọ ga-enwe n’ọdịnihu ga-enweta. N’agbanyeghị nke ahụ, Abram meghachiri omume site ‘n’iwuru Jehova, bụ́ Onye ahụ Nke mere ka ọ hụ Ya anya, ebe ịchụàjà n’ebe ahụ.’ (Jenesis 12:7) Otu ọkà mmụta Bible na-atụ aro, sị: “Iwu ebe ịchụàjà n’ala ahụ bụ n’ezie ụzọ isi nweta ya ná ndabere nke na ọ bụ ihe ruuru ya n’ihi okwukwe o gosipụtara.” Iwu ebe ịchụàjà dị otú ahụ bụkwa ọrụ chọrọ obi ike. Obi abụọ adịghị ya na ebe ịchụàjà a bụ ụdị ahụ e mesịrị kwuo banyere ya n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, bụ́ nke e ji nkume a na-awaghị awa mee. (Ọpụpụ 20:24, 25) Ọdịdị ya ga-adị nnọọ iche n’ebe ebe ịchụàjà ndị ahụ ndị Kenean ji mee ihe dị. N’ụzọ dị otú a, Abram ji obi ike were nguzo ya n’ihu ọha dị ka onye na-efe ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, na-ekpughepụ onwe ya nye iwe na, ma eleghị anya, ihe ize ndụ n’ụzọ anụ ahụ. Gịnị banyere anyị taa? Ụfọdụ n’ime anyị—karịsịa ndị na-eto eto—hà na-ala azụ n’ime ka ndị agbata obi ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha mara na ha na-efe Jehova? Ka ihe nlereanya Abram setịpụrụ n’inwe obi ike gbaa anyị nile ume iji ọbụbụ anyị bụ ndị ohu Jehova na-anya isi!

17. Olee otú Abram si gosi na ya bụ onye na-ekwusa aha Chineke, gịnịkwa ka nke a na-echetara ndị Kraịst taa?

17 Ebe ọ bụla Abram gara, ọ na-ebute ofufe Jehova ụzọ mgbe nile. “O wee si n’ebe ahụ kwapụ jee ugwu ahụ dị n’Ihu anyanwụ Betel, ọ maa ụlọikwuu ya, Betel dị n’Ọdịda anyanwụ, Ai dị n’Ihu anyanwụ: o wuoro Jehova ebe ịchụàjà n’ebe ahụ, kpọkuo aha Jehova.” (Jenesis 12:8) Nkebi ahịrịokwu Hibru ahụ bụ́ “kpọkuo aha” pụtakwara “kpọsaa (kwusaa) aha.” Obi abụọ adịghị ya na Abram ji obi ike kpọsaa aha Jehova n’etiti ndị agbata obi ya bụ́ ndị Kenean. (Jenesis 14:22-24) Nke a na-echetara anyị ọrụ anyị nke ikere òkè dị ka o kwere mee ‘n’ikwupụta aha Ya’ taa.—Ndị Hibru 13:15; Ndị Rom 10:10.

18. Mmekọrịta dị aṅaa ka Abram na ndị bi na Kenean nwere?

18 Abram anọteghị aka na nke ọ bụla n’ebe ndị ahụ ọ kwụsịtụrụ. “Abram wee bulie ije, na-eje na-ebulikwa ije n’ụzọ Negeb”—ógbè a na-enwe ntakịrị mmiri ozuzo nke dị n’ebe ndịda nke ugwu Juda. (Jenesis 12:9) Site n’ịnọgide na-aga ma na-egosipụta, n’ebe ọhụrụ ọ bụla ọ gara, na ya na-efe Jehova ofufe, Abram na ezinụlọ ya “[kwupụtara] na ha bụ ndị ọbịa na ndị nọ dị ka ọbịa [n’ala ahụ].” (Ndị Hibru 11:13) N’oge nile ahụ, ha zeere iso ndị agbata obi ha na-ekpere arụsị kpachie anya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst taa aghaghị ịnọgide na-abụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa.’ (Jọn 17:16) Ọ bụ ezie na anyị na-egosi ndị agbata obi anyị na ndị ọrụ ibe anyị obiọma na nkwanye ùgwù, anyị na-akpachara anya ịghara itinye aka n’akparamàgwà ndị na-egosipụta mmụọ nke ụwa nke e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ.—Ndị Efesọs 2:2, 3.

19. (a) N’ihi gịnị ka ndụ nkwagharị ga-ejiwo bụụrụ Abram na Seraị ihe ịma aka? (b) Olee ihe ịma aka ndị ọzọ na-eche Abram?

19 Ka anyị ghara ichefu na ime mgbanwe iji kwekọọ ná ndụ nkwagharị bụ́ nke tara akpụ apụghị ịdịworo ma Abram ma Seraị mfe. Ha riri ihe si n’ìgwè anụ ụlọ ha kama iri nri a zụtara n’otu n’ime nnukwu ahịa ndị dị na Ua; ha bi n’ụlọikwuu kama ibi n’ụlọ e wuru nke ọma. (Ndị Hibru 11:9) Abram na-eji ọrụ n’aka n’ụbọchị ya nile; o nwere ọtụtụ ihe ọ ga-eme n’ilekọta ìgwè anụ ụlọ ya na ndị ohu ya. Obi abụọ adịghị ya na Seraị rụrụ ọrụ ndị dịịrị ndị inyom nke oge ahụ: ịgwọ ntụ ọka, ime achịcha, ịtụ ogho, ịdụ ákwà. (Jenesis 18:6, 7; 2 Ndị Eze 23:7; Ilu 31:19; Ezikiel 13:18) Ma, ọnwụnwa ndị ọhụrụ ka na-abịa. N’oge na-adịghị anya, Abram na ezinụlọ ya ga-ezute ọnọdụ nke ga-etinye ndụ ha n’ize ndụ! Okwukwe Abram ọ̀ ga-eguzogideli ihe ịma aka ahụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụ ezie na Yufretis dị ugbu a n’ihe dị ka kilomita 16 n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ebe Ua dịbu, ihe àmà na-egosi na n’oge ochie, osimiri ahụ dị nnọọ n’ebe ọdịda anyanwụ obodo ahụ. Ọ bụ ya mere e ji nwee ike ikwu mgbe e mesịrị na Abram si “n’ofe Osimiri [Yufretis].”—Joshua 24:3.

^ par. 13 Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Eze Ashurnasirpal nke Abụọ nke Asiria ji ibé osisi ndị a kụkọtara akụkọta gafee Yufretis na nso Kakemish. Bible ekwughị ma Abram o mere otú ahụ n’onwe ya ka ya na ndị njem ya hà ji ụkwụ gafee mmiri ahụ.

Ị̀ Rịbara Ama?

• N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Abram “nna nke ndị nile nwere okwukwe”?

• N’ihi gịnị ka Abram isi na Ua nke ndị Kaldea pụọ ji chọọ okwukwe?

• Olee otú Abram si gosi na ya butere ofufe Jehova ụzọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Map dị na peeji 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

NJEM ABRAM

Ua

Heran

Kakemish

KENEAN

Osimiri Ukwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Dabere na map nke Pictorial Archive (Near Eastern History) Est. na Survey of Israel ji ike mbipụtaghachi ya nile

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ chọrọ Abram okwukwe n’aka iji hapụ ndụ ntụsara ahụ o biri na Ua

[Foto dị na peeji nke 18]

Site n’ibi n’ụlọikwuu, Abram na ezinụlọ ya ‘kwupụtara na ha bụ ndị ọbịa n’ala ahụ’