Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Na-adịghị Amasị Ihe Ka Ọtụtụ ná Ndị Na-eto Eto

Akwụkwọ Na-adịghị Amasị Ihe Ka Ọtụtụ ná Ndị Na-eto Eto

Akwụkwọ Na-adịghị Amasị Ihe Ka Ọtụtụ ná Ndị Na-eto Eto

“OLEE otú m ga-esi mara ma Bible ọ̀ bụ Okwu Chineke n’ezie? Dị ka akwụkwọ ọgụgụ, ọ dịghị amasị m,” ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Beate kwuru.

Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto nọ na Germany, bụ́ ebe Beate bi, nwere echiche yiri nke ya; n’ihi ya, ha adịchaghị eji ịgụ Bible akpọrọ ihe. Otu nnyocha e mere n’ebe ahụ na nso nso a kpughere na ihe dị ka 1 pasent nke ndị na-eto eto na-agụchi nnọọ Bible anya, pasent 2 na-agụchitụ ya anya, pasent 19 na-agụ ya mgbe ọ dapụtara, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ pasent 80 anaghị agụ ya ma ọlị. Eleghị anya ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ iyi ndị e nwere n’ala ndị ọzọ, ikekwe ma n’ebe i bi. N’ụzọ doro anya, Bible bụ akwụkwọ na-adịghị amasị ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto.

Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị na-eto eto amaghị Bible! Ná mmalite afọ 2000, akwụkwọ akụkọ bụ́ Lausitzer Rundschau kọrọ banyere nnyocha nke kpughere mmadụ ole maara Iwu Iri ahụ nke ọma ma jiri ya na-eme ihe dị ka ụkpụrụ na-eduzi ha ná ndụ. A bịa ná ndị gafeworo afọ 60, pasent 67 maara iwu ndị ahụ ma bụrụ ndị ha na-eduzi; a bịa ná ndị na-erubeghị afọ 30, ọnụ ọgụgụ ha bụ nanị pasent 28. Ee, nye ọtụtụ ndị na-eto eto, Okwu Chineke bụ ókèala a na-amaghị ama.

Ụfọdụ Nwere Echiche Dị Iche

N’aka nke ọzọ, n’ụwa nile, e nwere ọtụtụ nde ndị na-eto eto bụ́ ndị chọpụtaworo na Okwu Chineke bara uru dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, Alexander dị afọ 19, ọ na-agụkwa Bible kwa ụtụtụ tupu ya agawa ọrụ. “Apụghị m ichetụ n’echiche ụzọ ka mma isi malite ụbọchị,” ka ọ na-ekwu. Sandra nwere àgwà nke ịgụ otu akụkụ Bible kwa mgbede. “Ọ ghọwo akụkụ nke ihe ndị m na-eme kwa ụbọchị,” ka ọ na-akọwa. Julia kwa, bụ́ onye dị afọ 13, enweelarị usoro nke ịgụ ma ọ dịkarịa ala otu isiakwụkwọ Bible tupu ya alakpuo ụra n’abalị. “Ọ na-atọ m ụtọ n’ezie, achọkwara m ịnọgide na-eme nke ahụ n’ọdịnihu.”

Olee echiche nke ziri ezi na nke amamihe dị na ya? Ò kwesịrị ka a na-agụ Bible n’ezie? Ọ̀ baara ndị na-eto eto uru ma dị ha mkpa? Gịnị ka i chere?