Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Asambodo Ọkasị Mma

Asambodo Ọkasị Mma

Asambodo Ọkasị Mma

NKE ahụ bụ ihe Òtù Ndị Congo na Ndị Africa Na-ede Akụkọ Maka Mmepe (AJOCAD), nke dị na Democratic Republic of Congo, nyere iji “kelee ndị ma ọ bụ òtù ọrụ ebere dị iche iche bụ́ ndị mere ihe kwesịrị ịja mma n’ihi ụtụ ha tụnyere maka mmepeanya na [Congo].”

Na November 17, 2000, e nyere Ndịàmà Jehova Asambodo Ọkasị Mma ahụ maka “ụtụ ha tụnyere ná mmepeanya nke ndị Congo [site] n’ihe ọmụma na ozizi ndị dị n’akwụkwọ ha.”

N’ikwu banyere ihe nrite ahụ, akwụkwọ akụkọ Kinshasha bụ́ Le Phare kwuru, sị: “O siri ike ịhụ onye Congo na-agụbeghị magazin Ụlọ Nche na Teta! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Magazin ndị a [na-atụle] akụkụ nile nke ndụ.” Isiokwu ahụ kwukwara na akwụkwọ ndị ahụ na-egosi “ụzọ a pụrụ isi na-anagide nsogbu nke ụbọchị taa” ma na-arụ aka “n’ihe ihe ndị na-eme ugbu a pụtara.” Mbipụta Teta! nke ọ bụla “[adịghị] etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ dịghịkwa ebuli otu agbụrụ elu karịa ibe ya.” Tụkwasị na nke ahụ, mbipụta ndị ahụ na-ewulite “ntụkwasị obi ná nkwa nke Onye Okike maka ụwa ọhụrụ nke udo na ntụkwasị obi nke na-aga ịnọchi anya ajọ usoro ihe dị ugbu a nke na-emebi iwu n’isi nso.”

Dị ka AJOCAD si kwuo, akwụkwọ Ndịàmà Jehova abaworo ọtụtụ ndị Congo uru. N’ịbụ ndị dị n’ọtụtụ narị asụsụ, ozi na-akpali olileanya bụ́ ndị dị n’ime ha pụkwara ịbara gị uru.

Biko gụọ ihe e dere n’okpuru iji hụ otú ị pụrụ isi rite uru na ha.