Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Ntorobịa Gị

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Ntorobịa Gị

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Ntorobịa Gị

A GWARA ndị bi n’otu mba dị na Europe ka ha họrọ otu n’ime ihe atọ a: ịma mma, ịba ọgaranya, ma ọ bụ ịbụ ntorobịa. Ihe a kasị họrọ bụ ịbụ ntorobịa. Ee, ndị nọ n’ọgbọ nile na-ewere afọ iri na ụma na mmalite afọ 20 na ụma dị ka oge pụrụ iche ná ndụ. Onye ọ bụla chọkwara ka ndị ntorobịa nwee ihe ịga nke ọma n’ito site n’ịbụ ụmụaka gaa n’ịbụ ndị meworo okenye. Ma, ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?

Bible ọ̀ pụrụ inye aka? Azịza ya kpọmkwem bụ ee. Ka anyị nyochaa akụkụ abụọ Okwu Chineke pụrụ inyere ndị na-eto eto aka na ha n’ụzọ pụrụ iche, ikekwe na-enyere ndị na-eto eto aka karịa ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla ọzọ.

Iso Ndị Ọzọ Na-emekọ Ihe

Akwụkwọ bụ́ Jugend 2000 kọrọ banyere nnyocha sara mbara e mere banyere àgwà, ụkpụrụ, na akparamàgwà nke ihe karịrị ndị na-eto eto 5,000 nọ na Germany. Nnyocha ahụ na-ekpughe na mgbe ndị ntorobịa na-enwe ntụrụndụ—dị ka ige egwú, ikere òkè n’egwuregwu, ma ọ bụ nnọọ ime mkpagharị—ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na ndị ọzọ na-anọ mgbe nile. Ikekwe ndị na-eto eto na-achọ ka ha na ndị ọgbọ ha na-anọ karịa ka ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla ọzọ si achọ. N’ezie, ọ bụ ya mere na otu n’ime isi ihe ndị na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma n’oge ntorobịa bụ iso ndị ọzọ na-emekọ ihe.

Ma ọ naghị adị mfe mgbe nile iso ndị ọzọ na-emekọ ihe. N’ezie, ọ bụ ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya ka ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-ekweta na ha na-enwekarị nsogbu. N’ebe a, Bible pụrụ ịbụ ezigbo ihe enyemaka. Okwu Chineke nwere nduzi bụ́ isi maka ndị na-eto eto n’iwulite mmekọrịta kwesịrị ekwesị. Gịnị ka Bible na-ekwu?

Otu n’ime ụkpụrụ ndị kasị mkpa ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ nke a na-akpọ Ụkpụrụ Ọma: “Na-emeso ndị ọzọ ihe mgbe nile otú ị ga-achọ ka ha si na-emeso gị ihe.” Iji nkwanye ùgwù na obiọma emeso ndị ọzọ ihe na-akpali ha imesokwa gị otú ahụ. Àgwà obiọma pụrụ ibelata esemokwu na nchekasị. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ji àgwà nke ichebara ndị ọzọ echiche mara gị, o yiri ka ha ga na-enwe mmasị n’ebe ị nọ ma na-anabata gị. Ọ̀ bụ na ọ dịghị enye gị obi ụtọ ịbụ onye ndị ọzọ na-anabata?—Matiu 7:12, Revised English Bible.

Bible na-adụ gị ọdụ ‘ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’ Ọ dị gị mkpa ịhụ onwe gị n’anya n’echiche nke ilekọta onwe gị na inwe ùgwù onwe onye kwesịrị ekwesị, ọ bụghị nke gabigara ókè, ọ bụghịkwa nke dịbigara ntakịrị ókè. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji enye aka? Ọ bụrụ na onwe gị adịghị amasị gị, ị pụrụ ịdị na-akatọkarị ndị ọzọ, bụ́ nke na-egbochi ezi mmekọrịta. Ma ùgwù onwe onye kwesịrị ekwesị bụ ntọala ị pụrụ iwukwasị ọbụbụenyi siri ike na ya.—Matiu 22:39.

Ozugbo gị na mmadụ ghọrọ enyi, ọ chọrọ mgbalị n’aka unu abụọ iji mee ka o sie ike. Iwepụta oge ka gị na enyi gị na-anọkọ kwesịrị ime ka ị na-enwe obi ụtọ, ebe ọ bụ na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.” Otu ụdị nke inye ihe bụ ịgbaghara mmadụ, bụ́ nke na-agụnye ileghara ntakịrị ihie ụzọ anya na ịghara ịtụ anya izu okè n’aka ndị ọzọ. Bible na-agwa anyị, sị: “Meenụ ka mmadụ nile mara obiọma unu.” N’ezie, “ka ihe nke dịịrị unu onwe unu ha, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” Gịnị ma ọ bụrụ na enyi gị agwa gị ebe ị na-adịghị emezi emezi? Olee otú i si emeghachi omume? Tụlee ndụmọdụ a bara uru nke sitere na Bible: “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị,” ebe ọ bụ na “ọkpọ enyi na-akụ enyi ya bụ maka ọdịmma ya.” Ọ́ bụghị eziokwu na ndị enyi gị na-enwe mmetụta n’echiche, okwu ọnụ, na akparamàgwà gị? N’ihi ya, Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” N’aka nke ọzọ, ‘onye na-ejeso ndị maara ihe ga-ama ihe.’—Ọrụ 20:35, NW; Ndị Filipaị 4:5; Ndị Rom 12:17, 18; Eklisiastis 7:9; Ilu 13:20; 27:6, REB; 1 Ndị Kọrint 15:33.

Marco na-ekwuchitere ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa mgbe ọ na-ekwu, sị: “Ụkpụrụ Bible bụ ihe enyemaka dị ukwuu n’isoro ndị ọzọ na-emekọ ihe. Ụfọdụ ndị m maara na-eche nnọọ nanị banyere onwe ha na ihe ha pụrụ inweta ná ndụ. Bible na-akụziri anyị, ọ bụghị iche banyere onwe anyị karịa ka o kwesịrị, kama iche banyere ndị ọzọ. Ruo ókè m pụrụ ịhụ, nke ahụ bụ ihe kasị eme ka mmadụ na ibe ya nwee ezi mmekọrịta.”

Ihe ndị na-eto eto dị ka Marco mụtara na Bible na-enyere ha aka, ọ bụghị nanị n’oge ntorobịa ha, kama ruo ọtụtụ afọ n’ihu. Banyekwara ọdịnihu, anyị na-ahụkwa ụzọ ọzọ Bible pụrụ isi nyere ndị na-eto eto aka n’ụzọ pụrụ iche.

Nchegbu Banyere Ọdịnihu

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-achọkarị ịmara ihe na-eme. Ikekwe ha na-achọ ịmara ihe na-emenụ na ihe mere o ji na-eme karịa ka ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla ọzọ si achọ ịmara. Karịakwa akwụkwọ ọ bụla ọzọ, Bible na-akọwa ihe ndị kpatara ọnọdụ ndị dị n’ụwa ma na-agwa anyị ihe anyị ga-atụ anya ya n’ọdịnihu. Nke a bụ ihe ndị na-eto eto na-achọ ịmara. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide nke a n’aka?

Ọ bụ ezie na e kweere n’ọtụtụ ebe na ndị ntorobịa na-ebi ndụ nanị maka taa, ụfọdụ nnyocha e mere na-ekpughe echiche dịtụ iche. Ha na-egosi na ndị na-eto eto na-ejikarị nlezianya arịba ihe ndị na-eme gburugburu ha ama, mgbe ahụkwa, ha na-ekwubi n’onwe ha otú o yiri ha ka ndụ ọ ga-adị n’ọdịnihu. Ihe àmà na-egosi nke a bụ na mmadụ 3 n’ime ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa 4 na-eche “mgbe mgbe” ma ọ bụ “ọtụtụ mgbe” banyere ọdịnihu. Ọ bụ ezie na ndị ntorobịa na-enwekarị nchekwube, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eto eto na-enwetụ nchegbu banyere ọdịnihu.

N’ihi gịnị ka ha ji enwe nchegbu? Ọtụtụ n’ime ndị na-eto eto taa enweelarị nsogbu n’ihi ime mpụ, ime ihe ike, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ. Ndị ntorobịa na-enwe nchegbu banyere inweta ọrụ na-adịgide adịgide n’ọha mmadụ ebe e nwere asọmpi dị ukwuu. Ọ na-adị ha ka ha bụ ndị a na-arụgide inweta akara mmụta dị mma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ịrụpụta ihe dị ukwuu n’ebe ọrụ. Otu onye dị afọ 17 kwara arịrị, sị: “Anyị na-ebi n’etiti ọha mmadụ ebe onye ọ bụla na-egbu onye ọ hụrụ ọ ga-egbuli. Onye ọ bụla na-achọ ime ihe masịrị ya. Ị ghaghị ịdị na-egosipụta mgbe nile ihe ị pụrụ ime, nke ahụ na-emekwa m obi ọjọọ.” Onye ọzọ na-eto eto dị afọ 22, kwuru, sị: “Ndị nwere ihe ha rụzuru na-enwe ihe ịga nke ọma ná ndụ, ha pụkwara ibi ndụ ntụsara ahụ. Ndị nwere chi ọjọọ, bụ́ ndị na-apụghị ime ihe ibe ha na-eme n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, na-abụ nnọọ ndị a gbahapụrụ n’azụ.” N’ihi gịnị ka ndụ ji bụrụ nnọọ ike keta o rie? Ndụ ọ̀ ga na-adị otú a mgbe nile?

Nkọwa Bụ́ Ezie

Mgbe ndị na-eto eto ji mgbagwoju anya ma ọ bụ oké nchegbu ele ọha mmadụ anya, ha na-ekwere—n’ịma ama ma ọ bụ n’amaghị ama—n’ihe Bible na-ekwu. Okwu Chineke na-egosi na ‘ọha mmadụ nke oge a ebe onye ọ bụla na-egbu onye ọ hụrụ ọ ga-egbuli,’ bụ ihe ịrịba ama nke oge ndị a. Pọl onyeozi dere banyere oge anyị n’akwụkwọ ozi o degaara otu nwa okorobịa aha ya bụ́ Timoti, sị: “Oge pụrụ iche nke siri ike obibi gaje ịdị.” N’ihi gịnị ka ọ ga-eji pụọ iche, n’ihi gịnịkwa ka ọ ga-eji sie ike obibi? Ọ bụ n’ihi na, dị ka Pọl gara n’ihu ide, ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, . . . ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe, . . . ndị na-eme ihe ike.” Nke ahụ ọ́ bụghị nkọwa ziri ezi nke otú ọtụtụ mmadụ si akpa àgwà taa?—2 Timoti 3:1-3, NW.

Bible na-ekwu na oge a pụrụ iche gaje ịdị “n’ụbọchị ikpeazụ,” tupu e weta mgbanwe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ọha mmadụ n’ozuzu ya. Mgbanwe ndị a ga-emetụta mmadụ nile, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi. Mgbanwe ndị dị aṅaa? Ọchịchị eluigwe ga-eweghara ịchịisi nke mmadụ n’oge na-adịghị anya, “ịba ụba nke udo” ga-atọkwa ndị ọ ga-achị nọ n’ebe nile ụtọ. “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Nchekasị na oké nchegbu ga-aghọ ihe mgbe ochie.—Abụ Ọma 37:11, 29.

Ọ bụ nanị Bible na-eme ka a ghọta ọdịnihu n’ụzọ a pụrụ ịdabere na ya. Mgbe onye na-eto eto maara ihe ga-eme n’afọ ole na ole dị n’ihu, ọ pụrụ ịkwadebe maka ha ma nwee obi iru ala, nweekwa ike ịchịkwa ndụ ya nke ọma karị. Mmetụta a na-ebelata nrụgide na nchegbu. N’ụzọ dị otú a, a tụlere mkpa pụrụ iche nke ndị na-eto eto—ịghọta ọha mmadụ na ịmata ihe ọdịnihu ga-eweta—n’ime Bible.

Inwe Ihe Ịga nke Ọma n’Oge Ntorobịa

Gịnị ka e ji atụ ihe ịga nke ọma n’oge ntorobịa n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀? Ọ̀ bụ agụmakwụkwọ dị elu, ihe onwunwe, na ọtụtụ ndị enyi? Ọtụtụ pụrụ iche otú ahụ. Afọ ndị iri na ụma na mmalite afọ 20 na ụma kwesịrị ịbụ oge mmadụ ga-eji malite ndụ ọ ga-ebi n’ọdịnihu, n’ụzọ dị mma. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe ịga nke ọma mmadụ nwere n’oge ntorobịa pụrụ ịbụ ihe ga-egosi otú ndụ ya ga-adị n’ọdịnihu.

Dị ka anyị hụworo, Bible pụrụ inyere onye na-eto eto aka inwe ihe ịga nke ọma n’oge ọ bụ nwata. Ọtụtụ ndị ntorobịa achọpụtaworị na nke a emewo ná ndụ ha. Ha na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-etinye ihe ha na-amụta n’ọrụ. (Lee “Aro Bara Uru nke Ohu Jehova Na-eto Eto Tụrụ,” na peeji nke 6.) N’ezie, Bible bụ kpọmkwem akwụkwọ dịịrị ndị na-eto eto taa n’ihi na ọ pụrụ inyere ha aka ịbụ ndị ‘zuru okè, ndị e meworo ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’—2 Timoti 3:16, 17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Otu n’ime isi ihe ndị na-eme ka e nwee ihe ịga nke ọma n’oge ntorobịa bụ iso ndị ọzọ na-emekọ ihe

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ikekwe ndị ntorobịa na-achọ ịmara ihe ndị na-emenụ na ihe mere ha ji na-eme karịa ka ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla ọzọ si achọ ịmara

[Igbe dị na peeji nke 6, 7]

Aro Bara Uru nke Ohu Jehova Na-eto Eto Tụrụ

Alexander dị afọ 19. A zụlitere ya n’ezinụlọ Ndịàmà Jehova, ọ na-amasịkwa ya nke ukwuu iji obi ya dum na-ekpe okpukpe ya. Ma ọ dịghị ekwecha ya omume. Alexander na-akọwa, sị:

“Ọ pụrụ iju gị anya na eso m Ndịàmà Jehova kpakọọ dị ka nwa okorobịa na-emeghị baptism ruo ihe karịrị afọ asaa. N’oge ahụ, ejighị m obi m dum na-efe ofufe, m na-eme ya nanị iji mezuo iwu. M na-eche na obi esighi m nnọọ ike inyocha onwe m nke ọma.”

Mgbe e mesịrị, àgwà Alexander gbanwere. Ọ gara n’ihu ịsị:

“Ndị mụrụ m na ndị enyi m n’ọgbakọ nọgidere na-agba m ume ịdị na-agụ Bible kwa ụbọchị, na ịmatakwu Jehova nke ọma. N’ikpeazụ, ekpebiri m ịnwale ya. Ya mere, ebelatara m oge m na-etinye n’ikiri telivishọn ma tinye ọgụgụ Bible n’ihe ndị m na-eme n’isi ụtụtụ nile. N’ikpeazụ, amalitere m ịghọta ihe Bible na-ekwu n’ezie. Abịara m hụ otú ọ pụrụ isi nyere m aka. Ma—nke kasị mkpa—aghọtara m na Jehova chọrọ ka m mara onye ọ bụ. Ozugbo m buuru nke ahụ n’uche, mmekọrịta onwe onye nke mụ na ya malitere ichi anya, ọbụbụenyi nke mụ na ndị nọ n’ọgbakọ bịakwara sikwuo ike. Lee mgbanwe Bible wetaworo ná ndụ m! Ana m atụ aro ka ndị ohu Jehova nile na-eto eto na-agụ Bible kwa ụbọchị.”

E nwere ọtụtụ nde ndị na-eto eto n’ụwa nile bụ́ ndị na-eso Ndịàmà Jehova akpakọrịta. Ì so n’otu n’ime ha? Ọ̀ ga-amasị gị irite uru site n’ịgụchi Bible anya? Gịnị ma ị gbasoo ihe nlereanya nke Alexander? Belata ihe omume gị ndị na-adịchaghị mkpa ma mee ọgụgụ Bible otu n’ime ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị. N’ezie, ị ga-erite uru site na ya.