Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwe Mmeri n’Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba

Inwe Mmeri n’Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba

Inwe Mmeri n’Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba

NDỊÀMÀ JEHOVA nọ na Germany nwere mmeri dị ịrịba ama n’Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba nke dị na Karlsruhe. Ha si otú a were nzọụkwụ dị mkpa n’ime ka a mata ha.

Ndịàmà Jehova anọwo na-arụsi ọrụ ike na Germany ruo ihe karịrị 100 afọ. Ha lanarịrị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka ọchịchị aka ike abụọ e nwere na narị afọ nke 20—Ọchịchị Ndị Nazi na ọchịchị Kọmunist. Kemgbe 1990, Ndịàmà achọwo inweta nkwado iwu dị ka òtù ga na-erite uru n’iwu metụtara òtù ọrụ ebere. Mgbe ikpe lasịịrị ha n’okwu ikpe abụọ, e kpegbuokwa ha n’otu, Ndịàmà ahụ gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba, bụ́ nke kwupụtara mkpebi ikpe ya na December 19, 2000.

Mkpebi A Gbakọrọ Aka Mee Maka Ndịàmà Jehova

Ndị ọkàikpe asaa nile nke ụlọikpe ahụ kpelaara Ndịàmà. Ndị ọkàikpe ahụ kagburu ikpe Ụlọikpe Etiti Na-ahụ Maka Ọchịchị kpere na 1997 ma nye ụlọikpe ahụ ntụziaka ka o lebagharịa anya n’akwụkwọ ahụ Ndịàmà gbara.

Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Metụtara Iwu Na-achị Mba ji oge a kwuo okwu banyere mmekọrịta bụ́ isi nke dị n’etiti Ọchịchị na òtù okpukpe dị iche iche. N’ụzọ bụ́ isi, ihe e ji ‘ekpebi ọnọdụ nke okpukpe abụghị nkwenkwe ya, kama ọ bụ akparamàgwà ya.’

Ụlọikpe ahụ kwukwara na mgbe Ndịàmà na-egosipụta “nnọpụiche ndị Kraịst,” ha “adịghị emegide ụkpụrụ ọchịchị onye kwuo uche ya” ha “adịghịkwa achọ iji ụdị ọchịchị ọzọ dochie anya ọchịchị onye kwuo uche ya.” N’ihi ya, e kwesịghị iwere ekereghị òkè ná ntụli aka ọchịchị dị ka ihe a ga-eji na-emegide Ndịàmà ná nzọrọ ha na-azọrọ ịbụ òtù iwu kwadoro.—Jọn 18:36; Ndị Rom 13:1.

Ụlọikpe ahụ kwukwara na onye kwere ekwe—ma ọ bụ Onyeàmà ma ọ bụ onye okpukpe ọzọ—pụrụ ịchọta onwe ya mgbe ụfọdụ n’ọnọdụ ebe ihe Ọchịchị chọrọ na-emegide okwukwe ya. Ọ bụrụ na onye ahụ agbasoo akọ na uche ya site “n’irubere nkwenkwe okpukpe ya isi karịa iwu mba ahụ,” Ọchịchị pụrụ ile nke a anya dị ka ihe ziri ezi na ihe na-agabigabeghị nnwere onwe okpukpe ya.—Ọrụ 5:29.

Ihe ụlọikpe ahụ kpebiri gbara n’isi akụkọ. O siri ike ịhụ akwụkwọ akụkọ dị na Germany nke na-ebughị akụkọ banyere okwu ikpe ahụ. Ụlọ ọrụ telivishọn na redio nile bụ́ isi kọrọ banyere ya ma ọ bụ banyere ajụjụ ọnụ ndị a gbara. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla ọzọ a kpọsara aha ahụ bụ́ Jehova n’ụzọ sara mbara otú ahụ na Germany.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 8]

AP Photo/Daniel Maurer