Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè N’obodo Nke Ìhè

Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè N’obodo Nke Ìhè

Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè N’obodo Nke Ìhè

Fluctuat nec mergitur, ma ọ bụ “Ebili mmiri na-akwagharị ya ma ọ dịghị ekpu,” bụ ụkpụrụ nduzi nke obodo Paris.

DỊ KA ụgbọ mmiri, ruo ihe karịrị afọ 2,000 gara aga, Paris anagidewo oké ifufe nke ndị si ala ọzọ, na nnupụisi nke ndị bi n’ime ya, ma nọgide na-ese n’elu mmiri. Ugbu a, dị ka otu n’ime obodo ndị kasị maa mma n’ụwa, ndị mmadụ nwere mmasị n’ebe Paris dị n’ihi ọmarịcha ihe owuwu ndị dị na ya, okporo ụzọ ya ndị osisi kwụcha n’ahịrị n’akụkụ ha abụọ, na ebe ndebe ihe oge ochie ya ndị a ma ama n’ụwa nile. Ụfọdụ na-ewere ya dị ka ebe ndị na-ede uri, ndị na-ese ihe osise, na ndị ọkà ihe ọmụma na-agakarị. Ndị ọzọ na-enwe mmasị dị ukwuu ná nri ya ndị na-atọ ụtọ nakwa n’ákwà ndị bụ́ ịgba a na-akwa n’ebe ahụ.

Kemgbe ụwa, Paris abụwo ebe okpukpe Katọlik hiwere isi. Afọ 200 gara aga, n’ihi òkè dị mkpa Paris keere n’otu òtù ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ na Europe bụ́ nke a maara dị ka Ìhè, a malitere ịkpọ ya Obodo nke Ìhè. Taa, ma ndị Paris ha ma ma ọ bụ na ha amaghị, nkà ihe ọmụma nke dịwara eri oge ahụ na-enwe mmetụta n’ebe ihe ka ọtụtụ n’ime ha nọ karịa ka okpukpe na-enwe.

Otú ọ dị, amamihe nke mmadụ amụkwasịbeghị ìhè ná ndụ ụmụ mmadụ dị ka a tụrụ anya ya. Ọtụtụ ndị taa na-achọ ìhè site n’ebe ọzọ. Ruo ihe dị ka afọ 90 ugbu a, Ndịàmà Jehova anọwo ‘na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè’ na Paris. (Ndị Filipaị 2:15) Dị ka ndị bụ́ ọkà n’ịkwọ ụgbọ mmiri, ha aghaghị ịnọgide na-eme mgbanwe n’ikwekọ n’ebe ebili mmiri chere ihu ma ọ bụ n’ihe ndị na-emenụ, iji nwee ike iburu “ihe a na-achọsi ike nke mba nile” n’ụgbọ.—Hagaị 2:7.

Obodo nke Nwere Ihe Ịma Aka

Laa azụ na 1850, Paris bụ obodo nke mmadụ 600,000 bi na ya. Ọnụ ọgụgụ nke ndị bi na ya ugbu a, tinyere ndị bi n’ógbè ya ndị dịpụrụ adịpụ, akarịwo nde itolu. Uto dị otú ahụ emewo ka Paris bụrụ obodo dị na France nke a kasị nwee ọnụ ọgụgụ mmadụ gwara ọgwa na ya. Ọ bụ ebe agụmakwụkwọ ka elu hiwere isi n’ụwa, nwee otu n’ime mahadum ndị kasị ochie n’ụwa, bụrụkwa ebe ihe dị ka ụmụ akwụkwọ 250,000 bi. Ụfọdụ ógbè dịpụrụ adịpụ nke Paris, bụ́ ndị nwere ọtụtụ ụlọ ndị nwere ọtụtụ okpukpu, na ndị e ji ime isi ike na enweghị ọrụ mara, na-egosipụta akụkụ dị njọ nke Paris. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ chọrọ Ndịàmà Jehova nkà na ime mgbanwe n’aka iji nwee ike ikwusara ụdị mmadụ nile ozi ọma ahụ n’ụzọ na-adọrọ mmasị.—1 Timoti 4:10.

Ihe karịrị nde mmadụ 20 na-aga njem nleta na Paris kwa afọ. Ha pụrụ iji obi ụtọ rịgoro n’elu Ụlọ Elu Eiffel, kpagharịa n’akụkụ osimiri Seine, ma ọ bụ gaa n’ụlọ kọfị nakwa n’ụlọ oriri ndị dị n’akụkụ ụzọ ndị e ji ụkwụ aga na ha, na-elegharị anya na gburugburu ebe ndị mara mma. Ma, ndị Paris na-eji nnọọ ọrụ n’aka kwa ụbọchị. “Ọ na-adị ndị mmadụ ngwa ngwa mgbe nile,” ka Christian, bụ́ onye ozi oge nile, na-akọwa. “Ike na-agwụcha ha mgbe ha lọtara ọrụ.” Ịgwa ndị a na-ejikarị ọrụ n’aka okwu anaghị adị mfe.

Otú ọ dị, otu n’ime nsogbu ndị kasị ukwuu Ndịàmà Jehova na-enwe na Paris bụ ijekwuru ndị mmadụ n’ụlọ ha. E tinyere ígwè e ji agwa onye nọ n’ime ụlọ okwu n’ahụ ájá nke ụlọ ụfọdụ. Otú ọ dị, n’ihi ịrị elu nke mpụ, a na-arụnyekarị ihe e ji eche nche bụ́ ndị ji ike eletrik eme ihe, n’ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ dị iche iche, nke a na-emekwa ka ọ ghara ikwe omume ịbanye na ha. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a so mee ka e nwee nkezi nke nanị otu Onyeàmà maka mmadụ 1,400, n’ebe ụfọdụ. N’ihi ya, usoro a na-eji agbakarị àmà bụ telifon na àmà mberede. Ndịàmà Jehova hà enwewo ike ime ka ‘ìhè ha na-enwu’ n’ụzọ ndị ọzọ?—Matiu 5:16.

Ohere ndị e ji agba àmà mberede na ebe ndị a na-agba ha, hiri nne. Martine hụrụ otu nwanyị yiri ka ahụ erughị ya ala ka o guzo n’ebe bọs na-akwụsị. Nanị otu nwa nwanyị nke nwanyị ahụ mụrụ ka nwụnahụrụ ya. Martine nyere ya broshuọ nke bu olileanya mbilite n’ọnwụ na-akasi obi nke dị na Bible. Mgbe e mesịrị, ọ hụghịkwa nwanyị ahụ ruo ọnwa ole na ole. Mgbe Martine hụrụ nwanyị ahụ ọzọ, ọ malitere ịmụrụ ya Bible. N’agbanyeghị mmegide sitere n’aka di ya, nwanyị ahụ ghọrọ Onyeàmà.

Àmà Mberede nke Na-arụpụta Ihe

Usoro ọha na eze ji eme njem na Paris bụ otu n’ime ndị kasị mma n’ụwa. Mmadụ 5,000,000 na-eji ụgbọ okporo ígwè na-ewu ewu bụ́ Metro nke na-agba n’okpuru ala, eme njem kwa ụbọchị. E kwuru na ọdụ ụgbọ okporo ígwè Paris nke dị n’okpuru ala, bụ́ Châtelet-Les-Halles, bụ nke kasị ibu na nke kasị ekwo ekwo n’ụwa. Ohere e nwere izute ndị mmadụ ebe ahụ dị ọtụtụ. Alexandra na-eji ụgbọ okporo ígwè ahụ bụ́ Metro eje ọrụ kwa ụbọchị. Otu ụbọchị, o sooro otu nwa okorobịa nke na-arịa ọrịa leukemia na-egbu egbu kwurịta okwu. Alexandra nyere ya traktị na-ekwu banyere olileanya nke Paradaịs. Ha nwere nkwurịta okwu dabeere na Bible n’otu oge ahụ nakwa n’otu ebe ahụ kwa ụbọchị ruo izu isii. E mesịa, otu ụbọchị, nwoke ahụ kwụsịrị ịbịa. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, nwunye ya kpọrọ Alexandra na telifon ma gwa ya ka ọ bịa n’ụlọ ọgwụ na di ya nọ n’ọnụ ọnwụ. N’ụzọ dị mwute, Alexandra erughị n’oge. Mgbe di ya nwụsịrị, nwanyị ahụ kwagara Bordeaux, nke dị na ndịda ọdịda anyanwụ France, bụ́ ebe Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ bịara leta ya. Lee ozi magburu onwe ya ọ bụụrụ Alexandra ịnụ mgbe otu afọ gasịrị, na nwanyị ahụ di ya nwụrụ aghọwo onye Kraịst bụ́ Onyeàmà Jehova e mere baptism, na-enwe olileanya nke ịhụ ka a kpọlitere di ya n’ọnwụ!—Jọn 5:28, 29.

Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst meworo agadi, gwara Renata okwu n’ụgbọ okporo ígwè si Paris aga Limoges, bụ́ nke dị n’etiti France. Renata amụwo nkà mmụta okpukpe, asụsụ Hibru, na nke Grik n’obodo ya bụ́ Poland, ma o kweghịzi n’ihe o kweburu. Ọnwa atọ tupu mgbe ahụ, o kpekuwo Chineke ekpere. Ọ bụ ezie na Renata enwechaghị mmasị n’ihe nwanna nwanyị ahụ meworo agadi nwere ikwu, n’echeghịkwa na ya ga-anụ olu ya ọzọ, o nyere ya nọmba telifon ya. Otú ọ dị, nwanna nwanyị ahụ nọgidere na-akpọtụrụ ya ma hụ na e letara Renata n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà bịara ịhụ Renata, o chere, sị, ‘Gịnị ka ha na-aga ịkụziri m?’ N’agbanyeghị ọzụzụ e nyere Renata na seminarị, o ji obi umeala nakwere eziokwu Bible. “Aghọtara m ozugbo na ọ bụ eziokwu ahụ,” ka ọ na-akọwa. Ugbu a, obi dị ya ụtọ iso ndị ọzọ na-ekerịta ozi Bible.

Michèle na-amụ ka e si akwọ ụgbọala. Ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ ya na ha so na-amụ ịkwọ ụgbọala malitere ikwu banyere inwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye. Michèle gwara ha na ihe ha na-ekwu amasịghị ya. Otu izu ka e mesịrị, onye na-akụziri ha ka e si akwọ ụgbọala, bụ́ Sylvie, jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Echiche Michèle nke dabere na Bible kpaliri mmasị Sylvie. A malitere ịmụrụ Sylvie Bible, mgbe otu afọ gasịkwara, e mere ya baptism.

Ọtụtụ ogige ntụrụndụ na ogige mkpụrụ osisi ndị dị na Paris na-enyekwa ohere mara mma maka iso ndị mmadụ akparịta ụka. N’iji oge nkwụsịtụ ha mee ihe n’ụzọ dị mma, Josette gara n’ogige ntụrụndụ, bụ́ ebe otu agadi nwanyị bụ́ Aline nọ na-eme mkpagharị. Josette kọwaara ya nkwa ndị magburu onwe ha dị na Bible. E mere ndokwa maka ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya, Aline nwere ọganihu ruo n’ịbụ onye e mere baptism. Ugbu a, bụ́ mgbe ọ dị afọ 74, Aline bụ onye ọsụ ụzọ oge nile nke na-arụpụta ihe dị ukwuu, na-enwe obi ụtọ iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu ndị Kraịst.

Ìhè nke Dịịrị Mba Nile

Ọ dịghị Ndịàmà nọ na Paris mkpa ịga ala ndị dị anya iji hụ ọmarịcha ọdịbendị dịgasị iche iche. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 20 nke ndị bi na ya bụ ndị mba ọzọ. E nwere ìgwè na ọgbakọ ndị Kraịst bụ́ ndị e ji ihe dị ka asụsụ 25 eme ihe na ha.

Iji nkà eme ihe na ichepụta ihe na-esokarị eme ka a na-arụpụta ezigbo ihe n’ọrụ mgbasa ozi ọma a pụrụ iche. Otu Onyeàmà bụ́ onye Philippines ji aka ya kepụtara onwe ya ókèala pụrụ iche. O nwewo ike ịmalite ọtụtụ ọmụmụ Bible ka ọ na-azụ ihe, site n’iso ndị Philippines ndị ọzọ amalite nkwurịta okwu n’ụlọ ahịa.

Ibute ụzọ n’ime nkwusa na-arụpụta ihe. Na December 1996, mgbe Ndịàmà nọ n’otu ọgbakọ na-asụ asụsụ mba ọzọ nụrụ na ndị a ma ama n’ime ihe nkiri circus n’ụwa na-abịa n’obodo ha, ha kpebiri ịgbalị ịkpọtụrụ ha. Otu uhuruchi mgbe ihe nkiri ahụ gasịrị, ha gwara ndị ahụ na-eme ihe nkiri bụ́ ndị na-alọghachi na họtel ha bi okwu. Ibute ụzọ n’ụzọ dị otú a mere ka ha nyefee Bible 28, akwụkwọ ndị Kraịst 59, broshuọ 131, na magazin 290. Ná ngwụsị nke ọnụnọ ha were izu atọ, otu n’ime ndị ahụ na-eme ihe nkiri jụrụ, sị: “Olee otú m pụrụ isi ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova?” Onye ọzọ kwupụtara, sị: “M ga na-eme nkwusa ná mba m!”

Akụ̀ Ndị Zoro Ezo A Ga-achọpụta

Ebe ọ bụla ndị ọbịa bịara Paris lere anya, ha ga-ahụ ọmarịcha ụlọ ndị e wuru n’oge ndị gara aga. Otú ọ dị, a ka-ahụbeghị ihe ndị dị oké ọnụ ahịa karị. Aniza na deede ya, bụ́ onye nnọchite anya mba ya, bịara France. Ọ na-agụchi Bible anya n’ebe obibi ya. Otu ụbọchị, ka ọ na-eme ọsọ ọsọ ịpụ n’ụlọ ha, otu onye ọsụ ụzọ nyere ya traktị bụ́ Ihe Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi. Ha yiri agba ịnọkọ n’izu na-esonụ, a malitekwara ịmụrụ ya Bible. Aniza nwetara mmegide dị ukwuu site n’aka ezinụlọ ya. O nwere ọganihu n’ihe ọmụmụ ya ruo n’ogo nke ịbụ onye e mere baptism. Olee otú o si were ihe ùgwù o nwere iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu ahụ? “Na mbụ, ọrụ nkwusa siiri m ike n’ihi na abụ m onye ihere. Ma, mgbe ọ bụla m gụrụ Bible, ọ na-akpali m. Ahụ enweghị ike iru m ala ma m nọrọ nkịtị.” Àgwà ahụ ka e ji mara ọtụtụ Ndịàmà nọ na Paris, bụ́ ndị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.”—1 Ndị Kọrint 15:58.

Eziokwu Bible na-enwubanyekwa n’ógbè ebe ndị e wuru ụlọ obibi ọha na eze ná mpụga Paris, na-ekpughe ‘akụ̀ ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa.’ Bruce gara na nke enyi ya, bụ́ onye ka ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ịgbaziri kaseti ụfọdụ. Mgbe Bruce hụrụ enyi ya ka ya na ụfọdụ ndị ọ maara na-enwe nkwurịta okwu dabeere na Bible, o gere ntị ná nkwurịta okwu ahụ. O kwetara ịmụ Bible ma o nwere nsogbu ụfọdụ. “A maara m nke ọma n’ógbè anyị. Nwanne m nwoke nke kasị okenye lụgburu onwe ya n’ọgụ, ana m emekwa ndokwa maka nnọkọ ite egwú oké mkpọtụ. Olee otú ndị ọzọ ga-esi kwere na m na-aghọ Onyeàmà?” N’agbanyeghị arịrịọ a nọgidere na-arịọ Bruce ka o mee ndokwa maka nnọkọ ite egwú, ọ kwụsịrị ihe omume ahụ. Ka otu ọnwa gasịrị, ọ malitere ime nkwusa: “Mmadụ nile nọ n’ógbè anyị chọrọ ịma ihe mere m jiri ghọọ Onyeàmà.” N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, e mere ya baptism. Ka oge na-aga, o nwetara ihe ùgwù nke ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi.

Ịchọ akụ̀ ndị dị oké ọnụ ahịa pụrụ iwe mgbalị dị ukwuu. Otú ọ dị, lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ mgbe ọrụ ahụ rụpụtara ihe! Jacky, Bruno, na Damien na-eme achịcha na Paris. “Ọ naghị ekwe omume inweta anyị n’ụlọ n’ihi na anyị na-arụ ọrụ oge nile, anyị adịghịkwa anọ n’ụlọ ma ọlị,” ka Jacky na-akọwa. Patrick, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge nile, hụrụ na o nwere ntakịrị ọnụ ụlọ abụọ dị n’elu otu ụlọ, o kwubikwara na ma ọ dịghị ihe ọzọ, mmadụ bi n’otu n’ime ha. Mgbalị ọ nọgidere na-eme iji ruo ndị bi n’ụlọ ahụ rụpụtara ihe ndị dị mma mgbe, n’otu ehihie, o mesịrị nweta Jacky bụ́ onye ga-ebi ebe ahụ nwa mgbe. Gịnị si na ya pụta? Ndị enyi atọ ahụ ghọrọ Ndịàmà ma nweekwa ike ịchọta ọrụ ọzọ nyere ha ohere ikere okè zuru ezu karị n’ọrụ ọchịchị Chineke.

Ime Ka Oké Ifufe Dajụọ

N’oge na-adịbeghị anya, usoro mgbasa ozi ụfọdụ dị na France kọwara Ndịàmà Jehova dị ka òtù okpukpe dị ize ndụ. Na 1996, Ndịàmà ji obi ha dum kere òkè n’ikesa ihe karịrị nde itolu nke traktị ahụ bu ihe ọmụma pụrụ iche, nke isiokwu ya bụ́ Jehovah’s Witnesses—What You Need to Know (Ndịàmà Jehova—Ihe Ọ Dị Gị Mkpa Ịmara). Ọ rụpụtara ihe ndị magburu onwe ha.

E mere mgbalị pụrụ iche ime ka o ruo mmadụ nile aka. Ọtụtụ ndị ọchịchị gosipụtara obi ekele ha nwere n’ebe Ndịàmà nọ. Otu onyeisi oche nke ọchịchị ime obodo dere, sị: “Ndịàmà Jehova emewo nke ọma n’ikesa traktị a. Ọ gbaziri echiche na-ezighị ezi e nwere banyere ha.” Otu dọkịta kwuru, sị: “O teela m tụwara anya nke a!” Otu nwoke si n’ógbè Paris dere, sị: “Agụrụ m Jehovah’s Witnesses—What You Need to Know ná ndabara. Aga m achọ inwetakwu ihe ọmụma ma nakwere ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.” Onye ọzọ dere, sị: “Unu emeela maka ime ihe n’eziokwu unu.” Otu nwaada bụ́ onye Katọlik gwara Ndịàmà, sị: “Ehee, unu emesịala mee ihe banyere okwu ụgha ahụ!”

Ihe nyere ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto nọ n’ógbè Paris ọṅụ pụrụ iche bụ ọrụ nkwusa e mere ndokwa ya maka Ụbọchị Ndị Ntorobịa Ụwa nke Katọlik na 1997. Ọ bụ ezie na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dị ihe karịrị 35 degree Celsius, ihe dị ka Ndịàmà 2,500 keere òkè. Nanị n’ime ụbọchị ole na ole, ha nyefere ndị na-eto eto si akụkụ nile nke ụwa mkpụrụ 18,000 nke broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile. Tụkwasị n’ịgba ezi àmà nye aha Jehova na ịkụ mkpụrụ nke eziokwu ahụ, mkpọsa ahụ kpaliri Ndịàmà ahụ na-eto eto inwe ịnụ ọkụ n’obi. Otu nwanna nwanyị na-eto eto, bụ́ onye gbubiri oge ezumike ya iji kere òkè zuru ezu n’ọrụ a pụrụ iche dere, sị: “Jehova nwere ndị nwere obi ụtọ n’ụwa bụ́ ndị na-eji ike ha eto aha ya. Ụbọchị abụọ a jupụtara n’ihe omume ma na-enye ụgwọ ọrụ ruru n’ezie oge ezumike nile m ga-enwe ná ndụ m! (Abụ Ọma 84:10)”

February 28, 1998 bụ ụbọchị ememe mgbaafọ nke 65 nke iwu ahụ Hitler nyere e ji machibido Ndịàmà Jehova iwu na Germany. Ndịàmà nọ na France ji ụbọchị ahụ gosi ọha mmadụ, n’ụlọ ezumezu a gbazitere agbazite, vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault, bụ́ nke kọwara n’ụzọ zuru ezu, mkpagbu ndị Jehova nwetara. E kesara ihe karịrị nde akwụkwọ ịkpọ òkù asaa. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị nọburu n’ogige ịta ahụhụ gbara akaebe ndị na-akpali akpali. N’ógbè Paris, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 5,000 bịara, gụnyere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị na-abụghị Ndịàmà.

Ọtụtụ ndị nọ na Paris nwere ekele dị ukwuu maka ìhè ime mmụọ, ha nwekwara ọṅụ na ndị nkwusa Alaeze na-enwusi ike dị ka ndị na-enye ìhè. Ọ bụ dị ka Jisọs kwuru, sị: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” (Matiu 9:37) Mmụọ ịnọgidesi ike nke Ndịàmà Jehova ji na-emeri ihe ịma aka ndị metụtara ime nkwusa na Paris emewo ka ọ bụrụ Obodo nke Ìhè n’ụzọ pụrụ iche, na-ewetara Jehova otuto.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ụlọ Ezumezu Obodo

[Foto dị na peeji nke 9]

Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie dị na Louvre

[Foto dị na peeji nke 9]

Opera Garnier

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Iso ndị na-ejikarị ọrụ n’aka na-ekerịta ozi Bible n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha