Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ìhè Ime Mmụọ Enwuo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa

Ìhè Ime Mmụọ Enwuo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa

Akụkọ Ndụ

Ìhè Ime Mmụọ Enwuo n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa

DỊ KA NAJIB SALEM SI KỌỌ

Na narị afọ mbụ O.A., ìhè nke Okwu Chineke si n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nwusaa ruo n’ebe ndị dị anya n’ụwa. N’ime narị afọ nke 20, ìhè ahụ nwughachiri n’akụkụ ụwa ahụ ọzọ. Ka m kọọrọ gị otú nke ahụ si mee.

A MỤRỤ m na 1913 n’obodo Amioun, nke dị n’ebe ugwu Lebanọn. Nke ahụ bụ afọ ikpeazụ e nwetụrụ ọnọdụ kwụsiri ike na nke dị jụụ n’ụwa, n’ihi na Agha Ụwa Mbụ tiwapụrụ n’afọ sochirinụ. Mgbe agha ahụ biri na 1918, ahụ afọghịzi Lebanọn, bụ́ ebe a maara n’oge ahụ dị ka pearl nke Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ma n’ọnọdụ akụ̀ na ụba ma na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Na 1920, bụ́ mgbe ụlọ ọrụ post ọfis maliteghachiri ọrụ na Lebanọn, e si na post ọfịs nwetawa ozi si n’aka ndị Lebanọn bi mba ofesi. Deede m Abdullah na George Ghantous so ná ndị e nwetara ozi ha. Ha detaara nna ha, Habib Ghantous, bụ́ nna m ochie akwụkwọ, na-agwa ya banyere Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Nanị ịkọrọ ndị obodo ha ihe ụmụ ya dere n’akwụkwọ ozi ahụ mere ka a kwawa nna m ochie emo. Ndị obodo gbasara asịrị na ụmụ Habib na-agba nna ha ume ire ala ya, zụta ịnyịnya ibu, ma mewe nkwusa.

Nnwusa Mbụ nke Ìhè

N’afọ sochirinụ, bụ́ 1921, Michel Aboud, onye nọworo na-ebi na Brooklyn, New York, U.S.A., lọghachiri Tripoli, Lebanọn. Ọ ghọọla Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị ikwu na ibe Nwanna Aboud anabataghị ozi Bible, mmadụ abụọ a ma ama nabatara ya, otu prọfesọ, bụ́ Ibrahim Atiyeh, na otu dọkịta ezé, bụ́ Hanna Shammas. N’ezie, Dr. Shammas, wepụtara ụlọ ya na ụlọ ahụ ike ya maka nzukọ ndị Kraịst.

Aka m bụ nwata mgbe Nwanna Aboud na Nwanna Shammas bịara Amioun, bụ́ ebe anyị bi. Nleta ha nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ m, amalitekwara m iso Nwanna Aboud rụwa ọrụ nkwusa. Ruo afọ 40, anyị abụọ jekọchiri ozi anya ruo mgbe Nwanna Aboud nwụrụ na 1963.

N’agbata 1922 na 1925, ìhè nke eziokwu Bible nwusara nnọọ n’ọtụtụ obodo nta dị n’ebe ugwu Lebanọn. Ihe dị ka mmadụ 20 ruo 30 na-ezukọ n’ebe obibi ndị mmadụ, dị ka na nke anyị dị n’Amioun, iji tụlee Bible. Ndị ụkọchukwu na-ezipụ ụmụaka ka ha na-akụ ihe na kom kom ma na-eti mkpu iji kpasasịa nzukọ anyị, n’ihi ya, anyị na-ezukọ n’ọhịa osisi pine mgbe ụfọdụ.

Mgbe m dị obere, ịnụ ọkụ n’obi m n’ozi—nakwa n’ịga nzukọ nile nke ndị Kraịst—mere ka a kpọwa m Timoti. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị nyere m iwu ịkwụsị ịga ihe ọ kpọrọ “nzukọ ndị ahụ.” Mgbe m jụrụ ime otú ahụ, a chụpụrụ m n’ụlọ akwụkwọ.

Ịgba Àmà n’Ala Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Bible

N’oge na-adịghị anya e mesịrị m baptism na 1933, amalitere m ọrụ ọsụ ụzọ, dị ka Ndịàmà Jehova na-akpọ ozi oge nile. N’agbanyeghị na anyị dị ole na ole n’oge ahụ, ọ bụghị nanị na anyị mere nkwusa n’ihe ka ọtụtụ n’obodo nta ndị dị n’ebe ugwu Lebanọn, kama anyị rukwara Beirut na obodo ya ndị dịpụrụ adịpụ, sikwa ebe ahụ ruo ebe ndịda Lebanọn. N’afọ ndị mbụ ahụ, anyị na-ejikarị ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ibu eme njem, dị ka Jisọs Kraịst na ụmụazụ ya nke narị afọ mbụ mere.

Na 1936, Yousef Rahhal, Onyeàmà bụ́ onye Lebanọn nke birila ọtụtụ afọ na United States, lọghachiri Lebanọn ime nleta. O welatara ígwè okwu na ígwè phonograph ụfọdụ. Anyị kekwasịrị ígwè okwu ahụ n’elu ụgbọala Ford nke 1931 ma gagharịa na Lebanọn nakwa Siria nile, jiri ozi Alaeze ahụ garuo n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ. A pụrụ ịnọ n’ebe dị ihe karịrị kilomita iri nụ olu ígwè okwu ahụ. Ndị mmadụ na-arịgo n’elu ụlọ ha iji nụrụ ihe ha kọwara dị ka olu si n’eluigwe abịa. Ndị nọ n’ubi na-ahapụ ọrụ ha ma bịarukwuo nso iji gee ntị.

Otu n’ime njem ndị ikpeazụ m so Yousef Rahhal mee bụ mgbe anyị gara Aleppo, Siria, n’oge oyi nke 1937. Anyị gakwara Palestine tupu ya alaghachi United States. N’ebe ahụ, anyị gara obodo Haifa nakwa Jerusalem, tinyekwara obodo nta ndị dị ná mba ahụ. Otu n’ime ndị anyị zutere bụ Ibrahim Shehadi, bụ́ onye m matarala tupu mgbe ahụ site n’iderịta akwụkwọ ozi. Ibrahim enwewo ọganihu n’ihe ọmụma Bible ruo n’ókè nke na mgbe anyị bịara, ọ malitere iso anyị kere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ.—Ọrụ 20:20.

Enwekwara m oké mmasị izute Prọfesọ Khalil Kobrossi, onye na-ekpesi Katọlik ike nke nọworo na-eso Ndịàmà Jehova amụ Bible site n’iderịta akwụkwọ ozi. Olee otú o siworo nweta adres Ndịàmà nọ na Lebanọn? N’otu ụlọ ahịa dị na Haifa, onye na-ere ahịa ahụ ji mpempe akwụkwọ e si ná mbipụta nke Ndịàmà Jehova dọkapụta kechiere Khalil ụfọdụ n’ime ihe ndị e ji esi nri ọ zụrụ. Adres anyị dị ná mpempe akwụkwọ ahụ. Nleta ahụ tọrọ anyị nile ụtọ, n’ikpeazụkwa, na 1939, ọ bịara Tripoli ka e mee ya baptism.

Na 1937, Petros Lagakos na nwunye ya bịarutere Tripoli. N’ime afọ ole na ole sochirinụ, anyị atọ jezuru ógbè ka ọtụtụ na Lebanọn nakwa Siria, na-eji ozi Alaeze ahụ agakwuru ndị mmadụ n’ebe obibi ha. Ka ọ na-erule oge Nwanna Lagakos nwụrụ na 1943, Ndịàmà ejirila ìhè ime mmụọ gaa n’ihe ka ọtụtụ n’obodo ukwu na obodo nta ndị dị na Lebanọn, Siria, na Palestine. Mgbe ụfọdụ, anyị mmadụ 30 na-eji ụgbọala nta ma ọ bụ bọs apụ n’elekere 3:00 nke ụtụtụ iji garuo n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ.

N’afọ ndị 1940, Ibrahim Atiyeh sụgharịrị Ụlọ Nche gaa n’asụsụ Arabic. Mgbe e mesịrị, ana m eji aka depụtagharịa magazin ahụ ụzọ anọ ma zigara ha Ndịàmà nọ na Palestine, Siria, na Ijipt. N’oge ahụ a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, e megidere ọrụ nkwusa anyị n’ụzọ dị ukwuu, ma anyị nọgidere na-akpọtụrụ ndị nile hụrụ eziokwu Bible n’anya n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Eji m aka m see map obodo ukwu na obodo nta ndị gbara anyị gburugburu, anyị jidekwara n’aka na anyị ji ozi ọma ahụ gakwuru ha.

Na 1944, ka Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-akpọtụ, alụrụ m Evelyn, bụ́ ada nke onye mụ na ya na-asụkọ ụzọ, bụ́ Michel Aboud. Anyị mesịrị mụta ụmụ atọ, otu nwanyị na ụmụ nwoke abụọ.

Iso Ndị Ozi Ala Ọzọ Arụkọ Ọrụ

N’oge na-adịghị anya mgbe agha ahụ bisịrị, ndị mbụ gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead maka ndị ozi ala ọzọ, bịarutere Lebanọn. N’ihi ya, e guzobere ọgbakọ mbụ e nwere na Lebanọn, a họpụtakwara m ịbụ ohu kọmpịnị. E mesịa, na 1947, Nathan H. Knorr na odeakwụkwọ ya, bụ́ Milton G. Henschel, bịara Lebanọn ma nye ụmụnna agbamume dị ukwuu. N’oge na-adịghị anya, e zitekwuru ndị ozi ala ọzọ, ha nyekwaara anyị aka nke ukwuu n’ịhazi ozi anyị nakwa n’iduzi nzukọ ọgbakọ.

N’otu n’ime njem ndị anyị mere gaa n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ na Siria, onye bishọp nọ n’ógbè ahụ megidere anyị. O boro anyị ebubo na anyị na-ekesa ihe ọ kpọrọ akwụkwọ Òtù Na-akwado Ndị Juu. N’ụzọ na-emegide onwe ya, tupu 1948, ụkọchukwu ahụ na-akpọkarị anyị “Ndị Kọmụnist.” N’oge a, e jidere anyị ma gbaa anyị ajụjụ ọnụ ruo awa abụọ, anyị jikwa oge a gbaa àmà dị mma.

N’ikpeazụ, ọkàikpe gere okwu ikpe ahụ kwupụtara, sị: “Ọ bụ ezie na m na-akatọ onye boro unu ebubo a, aghaghị m ikele ya maka inye m ohere a iji zute unu ma mụta banyere ozizi unu.” Ọ rịọziri anyị mgbaghara maka ahụhụ anyị tara.

Ka anyị ji bọs na-aga Beirut afọ iri mgbe nke a gasịrị, amalitere m ịgwa otu nwoke mụ na ya nọketere n’oche okwu, ọ bụ ọkachamara n’ọrụ ugbo. Mgbe o gesịrị anyị ntị ruo minit ole na ole ka anyị na-akọwa ihe anyị kweere, o kwuru na ya anụla okwu yiri nke ahụ n’ọnụ enyi ya nọ na Siria. Ònye bụ enyi ya a? Ọ bụ ọkàikpe ahụ gere okwu ikpe anyị afọ iri tupu mgbe ahụ!

N’ime afọ ndị 1950, eletara m Ndịàmà nọ n’Iraq ma soro ha kere òkè n’ịgba àmà site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Agakwara m Jọdan na West Bank ọtụtụ ugboro. Na 1951, eso m n’otu ìgwè nke Ndịàmà anọ gara Bethlehem. Anyị nọ ebe ahụ mee ememe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. Ná mmalite ụbọchị ahụ, ndị nile bịara ihe omume ahụ ji bọs gaa Osimiri Jọdan, bụ́ ebe e mere mmadụ 22 baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Jehova. Mgbe ọ bụla anyị chere mmegide ihu n’ógbè ahụ, anyị na-asị: “Anyị bịara ịgwa unu na otu n’ime ụmụ unu ga-aghọ Eze ga-achị ụwa nile! Gịnị mere iwe ji ewe unu? Unu kwesịrị ịṅụrị ọṅụ!”

Ime Nkwusa n’Ọnọdụ Siri Ike

N’ozuzu, ndị nọ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa bụ ndị nwere ezi obi, dị umeala n’obi, ma na-ele ọbịa nke ọma. Ọtụtụ ndị na-eji mmasị ege ozi Alaeze Chineke. N’ezie, ọ dịghị ihe pụrụ inye ume ọhụrụ karịa ịmara na, n’oge na-adịghị anya, a ga-emezu nkwa Bible a: “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara [ndị ya], bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:3, 4.

Achọpụtawo m na ihe ka ọtụtụ ná ndị na-emegide ọrụ anyị aghọtaghị ọrụ anyị na ozi anyị na-ezi n’ezie. Ndị ụkọchukwu Krisendọm emewo ihe dị ukwuu iji kọwahie anyị! N’ihi ya, n’oge agha obodo ahụ malitere na Lebanọn na 1975 ma dịgide ruo ihe karịrị afọ 15, Ndịàmà chere ọtụtụ ọnọdụ siri ike ihu.

N’otu oge, anọ m na-eduziri otu ezinụlọ nọworo na-anụ ọkụ n’obi n’ịga chọọchị ọmụmụ Bible. Ezi ọganihu ha na-enwe n’ịmụta eziokwu Bible kpasuru ndị ụkọchukwu iwe. N’ihi ya, otu abalị, otu òtù okpukpe dị n’ógbè ahụ kpaliri ndị na-ekpe ya ịwaba n’ụlọ ahịa ezinụlọ ahụ, ma gbaa ngwá ahịa ruru, ma ọ dịkarịa ala, $10,000, U.S. ọkụ. N’otu abalị ahụ, ha bịara kpụrụ m. Otú ọ dị, eso m onye ndú ha tụgharịa uche, na-akọwa na ọ bụrụ na ha bụ ndị Kraịst n’ezie, ha agaghị akpa àgwà dị ka ndị na-amaghị Chineke. Mgbe m kwuru nke ahụ, o nyere iwu ka ụgbọala ahụ kwụsị, nyekwa m iwu ka m rịtuo.

N’oge ọzọ, ndị agha anọ tọọrọ m. Mgbe ha menyesịrị m egwu ọtụtụ ugboro, onye ndú ha, bụ́ onye kwuru na ya gaje ịgbagbu m, gbanwere obi ya na mberede, a tọhapụkwara m. Mmadụ abụọ n’ime ndị ikom a nọzi n’ụlọ mkpọrọ maka igbu ọchụ na izu ohi, e gbuwokwa mmadụ abụọ ndị nke ọzọ.

Ohere Ndị Ọzọ M Nwere Iji Gbaa Àmà

Mgbe mgbe, enwewo m ohere iji ụgbọelu si n’otu mba fega mba ọzọ. N’otu oge, ka m ji ụgbọelu si Beirut na-aga United States, anọdụrụ m ala n’akụkụ Charles Malek, onye bụbu minista na-ahụ maka ihe ndị na-eme ná mba ọzọ na Lebanọn. O gere ntị nke ọma, na-enwe ekele maka amaokwu nile m gụọrọ ya site na Bible. N’ikpeazụ, o kwuru na ya gụrụ akwụkwọ na Tripoli, ebe onye nkuzi ya bụ Ibrahim Atiyeh, bụ́ nwoke ahụ nna nwunye m mere ka ọ mara eziokwu Bible! Maazị Malek kwuru na Ibrahim kụziiri ya ịkwanyere Bible ùgwù.

Ka m ji ụgbọelu na-eme njem n’otu oge ọzọ, anọdụrụ m n’akụkụ onye nnọchiteanya Palestine n’òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Enwere m ohere nke izi ya ozi ọma Alaeze Chineke. O mesịrị mee ka ezinụlọ nwanne ya nwoke nọ na New York mara m, eletakwara m ha n’ebe ahụ mgbe mgbe. Enwekwara m onye ikwu nke na-arụ n’ụlọ ọrụ òtù Mba Ndị Dị n’Otu na New York. Mgbe m gara n’ọfịs ya otu ụbọchị, anọruru m awa atọ, bụ́ mgbe m gbaara ya àmà banyere Alaeze Chineke.

Adị m afọ 88 ugbu a, aka m nwekwara ike ikerechi òkè anya n’ilekọta ibu ọrụ ọgbakọ. Nwunye m, bụ́ Evelyn, ka so m na-ejere Jehova ozi. Nwa anyị nwanyị lụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a dị ka okenye n’otu ọgbakọ dị na Beirut. Nwa ha nwanyị bụkwa Onyeàmà. Nwa anyị nwoke nke kasị nta na nwunye ya bụ Ndịàmà, nwa ha nwanyị nọkwa n’eziokwu ahụ. Banyere diọkpara anyị, anyị kụnyere nkwenkwe ndị Kraịst n’ime obi ya, enwekwara m olileanya na ka oge na-aga, ọ ga-abịa nakwere ya.

Na 1933, a họpụtara m ije ozi dị ka ọsụ ụzọ—onye mbụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Agaaraghị m achọta ihe ọzọ dị mma iji ndụ m mee karịa ijere Jehova ozi dị ka onye ọsụ ụzọ n’ime afọ 68 nile a gara aga. Ekpebisikwara m ike ịnọgide na-ejegharị n’ìhè ime mmụọ ọ na-enye.

[Foto dị na peeji nke 23]

Najib na 1935

[Foto dị na peeji nke 24]

Ka m nọ n’akụkụ ụgbọala e kenyere ígwè okwu na ya, n’Ugwu Lebanọn, 1940

[Foto ndị dị na peeji nke 25]

N’elu elu, malite n’elu aka ekpe gaa n’aka nri: Najib, Evelyn, nwa ha nwanyị, Nwanna Aboud na diọkpara Najib, 1952

N’okpuru (ahịrị nke ihu): Nwanna Shammas, Knorr, Aboud, na Henschel ka ha nọ n’ụlọ Najib, Tripoli, 1952

[Foto dị na peeji nke 26]

Najib na nwunye ya, bụ́ Evelyn