Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Kọlọsi 1:16 na-ekwu banyere Ọkpara Chineke na “e sitewo n’aka Ya kee ihe nile, e kewokwaara Ya ihe nile.” N’echiche dị aṅaa ka ‘e keere’ Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs, ihe nile?

Jehova ji Ọkpara ọ mụrụ nanị ya mee ihe dị ka onye ọkà n’ike ihe nile ọzọ, ya bụ, ihe nile ma e wezụga Jisọs n’onwe ya. (Ilu 8:27-30; Jọn 1:3) N’ụzọ ziri ezi, ọrụ ndị a nyere Ọkpara ahụ ọṅụ, n’echiche a kwa, ‘e keere’ ya ha.

Anyị maara na ndị nne na nna bụ́ mmadụ na-atụ anya inweta ọṅụ dị ukwuu site n’ihe ha na-arụpụta—ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom—ha na-enwetakwa ya mgbe mgbe. Ya mere, ilu Bible na-ekwu banyere ‘nwa nke ihe ya na-atọ nna ya ụtọ.’ (Ilu 3:12; 29:17) N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova Chineke nwetara ọṅụ site n’ebe Israel nọ mgbe ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi. (Abụ Ọma 44:3; 119:108; 147:11) Ọ na-enwetakwa ọṅụ site n’ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ya na-eguzosi ike n’ihe ruo n’oge anyị.—Ilu 12:22; Ndị Hibru 10:38.

N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na Chineke ga-ekwe ka onye ya na ya so arụ ọrụ, bụ́ Jisọs, nweta ọṅụ site n’ihe ọ rụzuru. N’ezie, Ilu 8:31 na-ekwu na Ọkpara ahụ ‘na-egwuri egwu n’elu ụwa dum mmadụ bi n’ụwa Ya; ihe na-atọ ya ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ.’ Ọ bụ n’echiche a ka Ndị Kọlọsi 1:16 ji na-ekwu, sị: “E sitewo n’aka Ya kee ihe nile, e kewokwaara Ya ihe nile.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.)