Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Bụbu Anụ Ọhịa Wolf—Ugbu A Anyị Bụ Atụrụ!

Anyị Bụbu Anụ Ọhịa Wolf—Ugbu A Anyị Bụ Atụrụ!

Anyị Bụbu Anụ Ọhịa Wolf—Ugbu A Anyị Bụ Atụrụ!

Mụ na Sakina gbara agbata obi mgbe anyị bụ ụmụntakịrị nwanyị. Sakina buru ibu ma gbasie ike, ebe mụ onwe m nwere obere ahụ ma dị gịrịgịrị. Anyị na-esekarị okwu, ma otu ụbọchị, anyị lụrụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. Site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, anyị adịghịzi atụpụrụ ibe anyị ọnụ. Anyị abụọ mesịrị pụọ, ọ dịghịkwa onye ma ebe ibe ya bi.

Na 1994, amalitere m iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, àgwà m jikwa nwayọọ nwayọọ gbanwee. Afọ anọ ka e mesịrị, mgbe m gara ụbọchị mgbakọ pụrụ iche anyị mere na Bujumbura, Burundi, ọ tụrụ m n’anya izute Sakina. Obi dị m ụtọ na ọ bịara, ma ekele anyị jụtụrụ oyi. Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, apụghị m ikwere ihe anya m hụrụ mgbe m hụrụ ya ka o so ná ndị a gaje ime baptism! Ya onwe ya agbanweekwala n’ụzọ dị egwu. Ọ bụghịzi onye ọgụ na mgba ahụ mụ na ya sere okwu ọtụtụ mgbe. Lee ihe magburu onwe ya ọ bụ ịhụ ya ka o mere ngosipụta ihu ọha nke nrara ọ raara onwe ya nye Chineke site n’ikwe ka e mee ya baptism ime mmiri!

Mgbe o si na mmiri pụta, agbaara m ọsọ gaa makụọ ya ma takwụnyere ya, sị: “Ì chetara otú anyị si lụọ ọgụ?” “Ee,” ka ọ zara, “echetara m, ma nke ahụ bụ n’oge gara aga. Abụ m mmadụ ọhụrụ ugbu a.”

Anyị abụọ nwere obi ụtọ ịbụ ndị chọtaworo eziokwu Bible nke na-eme ka a dị n’otu nakwa ịbụ ndị gbanweworo àgwà anyị yiri nke anụ ọhịa wolf ịbụ nke yiri nke atụrụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, bụ́ Jehova Chineke. N’ezie, eziokwu Bible na-agbanwe ndụ.