Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”

“Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”

“Chọọ Udo, Gbasookwa Ya”

“A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.”—NDỊ ROM 12:18.

1, 2. Gịnị bụ ihe ụfọdụ mere na ọ dịghị udo ọ bụla si n’aka mmadụ nke ga-adịgide adịgide?

WERE anya nke uche lee otu ụlọ ntọala ya na-esighị ike, osisi ya erekasịala, elu ya ana-ehikwa mmiri. Ị̀ ga-achọ ịkwaba na ya gaa biri? Eleghị anya ị gaghị achọ. Ọbụna ite ụlọ ahụ ágbá ọhụrụ agaghị agbanwe eziokwu ahụ bụ́ na ọ kwụsighị ike. N’oge na-adịghị anya, o yiri ka ọ ga-ada.

2 Udo ọ bụla dị n’ụwa a dị ka ụlọ ahụ. E wukwasịrị ya na ntọala na-esighị ike—nkwa na atụmatụ dị iche iche nke mmadụ, bụ́ “onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” (Abụ Ọma 146:3) Ọgba aghara dị n’etiti mba na mba, agbụrụ na agbụrụ, na ebo na ebo, bụ ihe juru n’akụkọ ihe mere eme. N’eziokwu, ọ dịwo oge ndị e nwere udo ruo nwa oge, ma ụdị udo dị aṅaa ka ọ bụ? Ọ bụrụ na mba abụọ na-alụ agha, ha emesịa mee udo n’ihi na e meriri otu mba ma ọ bụ n’ihi na mba abụọ ahụ ahụghịzi uru dị n’agha ha na-alụ, ụdị udo dị aṅaa ka nke ahụ bụ? Ịkpọasị, inyo mmadụ enyo, na ekworo bụ́ ihe ndị kpatara agha ahụ, ka dị. Udo nke bụ́ nanị nzu e tere n’ili, dị ka ‘ágbá e ji techie’ ibu iro, abụghị udo na-adịgide adịgide.—Ezikiel 13:10.

3. N’ihi gịnị ka udo nke ndị Chineke ji dị iche n’udo ọ bụla nke mmadụ guzobere?

3 Otú o sina dị, e nwere ezi udo n’ụwa a agha tisasịworo. N’ebee? Ọ bụ n’etiti ndị na-eso nzọụkwụ Jisọs Kraịst, bụ́ ezi ndị Kraịst, ndị na-aṅa ntị n’okwu Jisọs ma na-agbalịsi ike iṅomi ụzọ ndụ ya. (1 Ndị Kọrint 11:1; 1 Pita 2:21) Udo nke dị n’etiti ezi ndị Kraịst sitere n’agbụrụ, ọkwá, na mba dị iche iche bụ nke ezigbo ya n’ihi na o sitere ná mmekọrịta udo ha na Chineke nwere, bụ́ nke hiwere isi n’okwukwe ha nwere n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. Udo ha bụ onyinye sitere n’aka Chineke, ọ bụghị nke mmadụ guzobere. (Ndị Rom 15:33; Ndị Efesọs 6:23, 24) Ọ bụ ihe si n’ido onwe ha n’okpuru “Onyeisi Udo,” bụ́ Jisọs Kraịst, nakwa ofufe ha na-efe Jehova, bụ́ “Chineke nke ịhụnanya na udo,” pụta.—Aịsaịa 9:6; 2 Ndị Kọrint 13:11.

4. Olee otú onye Kraịst si ‘agbaso’ udo?

4 Udo adịghị abịara ụmụ mmadụ na-ezughị okè ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe iji nweta ya. N’ihi ya, Pita kwuru na onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ‘ịchọ udo, gbasookwa ya.’ (1 Pita 3:11) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Otu amụma oge ochie nyere azịza ya. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova sịrị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13; Ndị Filipaị 4:9) Ee, ezi udo na-abịara ndị na-aṅa ntị n’ozizi Jehova. Ọzọkwa, udo, na “ịhụnanya, ọṅụ, . . . ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè,” bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23) Onye na-adịghị enwe ịhụnanya, ọṅụ, ndidi, obiọma, onye ajọ omume, onye na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi, onye dị ka anụ ọhịa, ma ọ bụ onye na-adịghị ejide onwe ya, apụghị inweta ya.

“Unu na Mmadụ Nile Na-adị n’Udo”

5, 6. (a) Gịnị ka ime udo pụtara n’ime Bible? (b) Ole ndị ka ndị Kraịst na-agbalịsi ike iso na-adị n’udo?

5 A kọwawo udo dị ka ọnọdụ nke ịnọ jụụ ma ọ bụ ịnọ nwayọọ. Nkọwa dị otú a ga-agụnyekọta ọtụtụ ọnọdụ ebe esemokwu na-adịghị. Leenụ, ọbụna onye nwụrụ anwụ nọ n’udo! Otú ọ dị, iji nweta ezi udo, ọ dị mmadụ mkpa ịdị na-akwalite udo. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs sịrị: “Ngọzi na-adịrị ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo: n’ihi na ndị ahụ ka a ga-akpọ ụmụ Chineke.” (Matiu 5:9) Ọ bụ ndị ga-emesị nwee ohere nke ịghọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke na inweta ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, ka Jisọs na-agwa okwu. (Jọn 1:12; Ndị Rom 8:14-17) N’ikpeazụkwa, ihe nile a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-enweghị olileanya ịga eluigwe ga-enweta ‘inwe onwe nke ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21) Ọ bụ nanị ndị na-eme udo pụrụ inwe olileanya dị otú ahụ. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo” pụtara n’ụzọ nkịtị “ndị na-eme udo.” Mgbe mgbe, a na-enwe ihe dị iche n’etiti ịbụ onye dị n’udo—nọ n’udo—na ịbụ onye na-eme udo. N’echiche Akwụkwọ Nsọ, ịbụ onye na-eme udo na-enye echiche nke ịbụ onye na-akwalitesi udo ike, mgbe ụfọdụ na-eme ka udo dị ebe udo na-adịbughị.

6 N’iburu nke a n’uche, tụlee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ndị Rom: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18, NW) Pọl adịghị agwa ndị Rom nanị ka ha na-eme nwayọọ nwayọọ, ọ bụ ezie na nke ahụ ga-enye aka. Ọ na-agba ha ume ka ha na-eme udo. Ha na olee ndị? Ha na “mmadụ nile”—ndị òtù ezinụlọ ha, ndị Kraịst ibe ha, ọbụna ndị na-ekweghị n’ihe ha kweere. Ọ gbara ndị Rom ume ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo ‘ma ọ bụrụhaala na ọ dị ha n’aka.’ Ee e, ọ chọghị ka ha hapụ ihe ha kweere ka udo wee dị. Kama ịdị na-ekwugide ndị ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi, ha kwesịrị ibu udo n’obi na-agakwuru ha. Ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-eme otú ahụ ma ọ bụ ndị nọ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị nọ n’èzí ka ha na ha na-emekọ ihe. (Ndị Galetia 6:10) N’ikwekọ na nke a, Pọl dere, sị: “Na-agbasonụ ezi ihe mgbe nile, n’ebe ibe unu nọ, na n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:15.

7, 8. Olee otú ndị Kraịst si eso ndị na-ekweghị ihe ha kweere na-adị n’udo, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

7 Olee otú anyị pụrụ isi soro ndị na-ekweghị n’ihe anyị kweere bụ́ ndị pụrụ ọbụna imegide anyị, na-adị n’udo? Otu ụzọ bụ na anyị ga-ezere ịdị na-eme ka anyị ka ndị ọzọ elu. Dị ka ihe atụ, anyị agatụghị abụ ndị na-eme udo ma ọ bụrụ na anyị ji okwu mkparị na-ekwu banyere mmadụ ụfọdụ. Jehova ekpughewo ikpe ya megide òtù dị iche iche, ma anyị enweghị ikike ọ bụla ikwu banyere onye ọ bụla dị ka a ga-asị na a mawo ya ikpe. N’ezie, anyị adịghị ekpe ndị ọzọ ikpe, ọbụna ndị na-emegide anyị. Mgbe Pọl gwasịrị Taịtọs ka ọ dụọ ndị Kraịst nọ na Krit ọdụ banyere otú ha si emeso ndị na-achị achị bụ́ ụmụ mmadụ ihe, ọ gwakwara ya ka o chetara ha “ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obiọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.”—Taịtọs 3:1, 2.

8 Iso ndị na-ekweghị ihe anyị kweere na-adị n’udo na-enye aka n’ime ka ha mara eziokwu ahụ. N’ezie, anyị adịghị emete ndị ‘ga-emebi omume ọma’ anyị enyi. (1 Ndị Kọrint 15:33) N’agbanyeghị nke ahụ, anyị pụrụ inwe àgwà dị mma, anyị kwesịkwara iji nkwanye ùgwù na obiọma na-emeso mmadụ nile ihe. Pita dere, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 2:12.

Ime Udo n’Ozi

9, 10. Ihe nlereanya dị aṅaa nke imeso ndị na-ekweghị ekwe ihe n’ụzọ udo ka Pọl onyeozi setịpụrụ?

9 E ji nkwuwa okwu mara ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ha emeghị ka ozi ha dị nro, mgbe ha zutekwara mmegide, ha kpebisiri ike irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ. (Ọrụ 4:29; 5:29) Otú o sina dị, ha ghọtara ọdịiche dị n’inwe nkwuwa okwu na inwe ọnụ ọjọọ. Tụlee otú Pọl si gọpụrụ okwukwe ya n’ihu Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ. Herọd Agrịpa so nwanne ya nwanyị, bụ́ Banaisi, na-enwe mmekọahụ. Otú ọ dị, Pọl agaghị kụziwere Agrịpa omume ọma. Kama nke ahụ, o mesiri isi ihe ndị ha abụọ kweere na ha ike, na-ekwu na Agrịpa bụ onye maara omenala ndị Juu nke ọma na onye kweere ná ndị amụma.—Ọrụ 26:2, 3, 27.

10 Pọl ọ̀ na-eto nwoke ahụ pụrụ ịtọhapụ ya otuto ọnụ efu? Ee e. Pọl gbasoro ndụmọdụ ya onwe ya nyere ma kwuo eziokwu. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọ gwara Herọd Agrịpa nke na-abụghị eziokwu. (Ndị Efesọs 4:15) Ma Pọl bụ onye na-eme udo, ọ makwaara otú e si aghọ “ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Kọrint 9:22) Ebumnobi ya bụ ịgọpụrụ ikike o nwere ikwusa banyere Jisọs. Dị ka ezi onye ozizi, ọ malitere site n’ikwu ihe ya na Agrịpa pụrụ ikwekọrịta na ya. N’ụzọ dị otú a, Pọl nyeere eze ahụ na-eme omume rụrụ arụ aka inwe echiche ka mma banyere Iso Ụzọ Kraịst.—Ọrụ 26:28-31.

11. Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo n’ozi anyị?

11 Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo n’ozi anyị? Dị ka Pọl, anyị kwesịrị izere arụmụka. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka anyị ‘kwuo okwu Chineke n’atụghị egwu,’ were anyaike na-agọpụrụ okwukwe anyị. (Ndị Filipaị 1:14) Ma n’ọnọdụ ka ukwuu, ebumnobi anyị bụ́ isi na-abụ ikwusa ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14) Ọ bụrụ na mmadụ aghọta eziokwu banyere nzube Chineke, mgbe ahụ ọ pụrụ ịmalite ịhapụ echiche okpukpe ụgha ma dị ọcha pụọ n’omume ndị na-adịghị ọcha. N’ihi ya, ruo n’ókè o kwere mee, ọ dị mma imesi ihe ndị ga-adọrọ mmasị ndị na-ege anyị ntị ike, na-amalite n’ihe ndị anyị na ha kwekọrịtara. Ọ gaghị arụpụta ihe dị mma ikwugide onye pụrụ ige ntị n’ozi anyị ma ọ bụrụ na e jiri akọ soo ya.—2 Ndị Kọrint 6:3.

Ndị Na-eme Udo n’Ezinụlọ

12. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo n’ezinụlọ?

12 Pọl kwuru na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Ha ga-ezute ihe isi ike dị iche iche. Tinyere ihe ndị ọzọ, di na nwunye ụfọdụ ga na-enwe nghọtahie site n’oge ruo n’oge. Olee otú e kwesịrị isi dozie ihe ndị a? Ọ bụ n’ụzọ udo. Onye na-eme udo ga-agbalịsi ike ịkwụsị esemokwu ka ọ ghara ịka njọ. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, site n’ịkwa ire ya ngá. N’ezie, mgbe e ji akụkụ ahụ a dị ntakịrị gwa mmadụ okwu njakịrị na okwu mkparị, ọ pụrụ ịbụ “ihe ọjọọ nke na-adịghị eguzo otu ebe, . . . ihe jupụtara n’ire agwọ na-eweta ọnwụ.” (Jemes 3:8) Onye na-eme udo na-eji ire ya ewuli mmadụ elu ọ bụghị ịkụda mmụọ ya.—Ilu 12:18.

13, 14. Olee otú anyị pụrụ isi chekwaa udo mgbe anyị kwuhiere ọnụ ma ọ bụ mgbe oké iwe ji anyị?

13 N’ihi ịbụ ndị na-ezughị okè, mgbe mgbe, anyị nile na-ekwu ihe anyị na-emesị kwaa ụta maka ya. Mgbe nke a mere, dị ngwa imezi ihe—ime udo. (Ilu 19:11; Ndị Kọlọsi 3:13) Zere imikpu onwe gị ‘n’esemokwu n’ihi okwu efu’ na ‘n’ịrụ ụka.’ (1 Timoti 6:4, 5) Kama nke ahụ, lee anya gabiga ihe a na-ahụ anya ma gbalịa ịghọta mmetụta nke onye òtù ọlụlụ gị. Ọ bụrụ na ọ gwara gị okwu ọjọọ, agwagwarala ya. Cheta na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.

14 Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa iburu n’uche ndụmọdụ dị n’Ilu 17:14, bụ́: “Tupu ịlụ ọgụ esie ike hapụ ya.” Si ebe ahụ esemokwu chọrọ ịda pụọ. Mgbe e mesịrị, mgbe obi jụụrụ onye ọ bụla, eleghị anya unu ga-edozi nsogbu ahụ n’ụzọ udo. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ịkpọ onye Kraịst bụ́ onye nlekọta tozuru okè maka enyemaka. Ndị ikom dị otú ahụ nwere ahụmahụ na mmetụta ọmịiko pụrụ ịbụ ndị na-enye aka n’ụzọ na-enye ume ọhụrụ mgbe udo nke di na nwunye na-achọ itisasị.—Aịsaịa 32:1, 2.

Ndị Na-eme Udo n’Ọgbakọ

15. Dị ka Jemes si kwuo, mmụọ dị aṅaa dị njọ bilitere n’etiti ụfọdụ ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka àgwà ahụ ji bụrụ “nke ụwa,” “nke anụ ahụ,” na “nke ndị mmụọ ọjọọ”?

15 N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ gosipụtara ihe àmà nke mmụọ ekworo na nke ịkpa iche iche—kpọmkwem ihe ndị na-emegide udo. Jemes kwuru, sị: “Amamihe a abụghị amamihe nke na-esi n’elu rịdata, kama ọ bụ nke ụwa, bụrụkwa nke [anụ ahụ, NW], bụrụkwa ihe ndị mmụọ ọjọọ na-ezi. N’ihi na ebe ekworo na ịkpa iche iche dị, n’ebe ahụ ka ịgba aghara na omume nile ọ bụla nke na-adịghị mma dị.” (Jemes 3:14-16) Ụfọdụ ndị kweere na okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “ịkpa iche iche” nwere ihe jikọrọ ya na oké ọchịchọ nke ọdịmma onwe onye nanị kpaliri, ịzọ ọkwá. O nwere ezi ihe mere Jemes ji kpọọ ya ‘nke ụwa, nke anụ ahụ, nke ndị mmụọ ọjọọ.’ N’akụkọ ihe mere eme nile, ndị ọchịchị ụwa akpawo iche iche, dị ka ụmụ anụ ọhịa na-alụrịta ọgụ. N’ezie, ịkpa iche iche bụ ihe “nke ụwa” na “nke anụ ahụ.” Ọ bụkwa nke “ndị mmụọ ọjọọ.” Onye mbụ gosipụtara àgwà ọjọọ a na-eji nwayọọ nwayọọ amalite bụ mmụọ ozi ahụ nwere oké ọchịchọ maka ịchịisi, bụ́ onye megidere Jehova Chineke ma ghọọ Setan, onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.

16. Olee otú ụfọdụ ndị Kraịst narị afọ mbụ si gosipụta mmụọ yiri nke Setan?

16 Jemes gbara ndị Kraịst ume ka ha ghara ịzụlite mmụọ ịkpa iche iche n’ihi na ọ dịghị eweta udo. O dere, sị: “Olee ebe ibu agha si bịa, olee ebe kwa ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu? ọ́ bụghị n’ebe ahụ, bụ́ ihe ụtọ nile unu nke na-ebu agha n’ihe nile dị unu n’ahụ, ka ha si bịa?” (Jemes 4:1) N’ebe a, “ihe ụtọ nile” pụrụ izo aka n’ọchịchọ e ji anyaukwu achọ ihe onwunwe ma ọ bụ ọchịchọ ịbụ onye a ma ama, onye na-achị achị, ma ọ bụ onye ọnụ na-eru n’okwu. Ihe àmà na-egosi na, dị ka Setan, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ chọrọ ịbụ ndị a na-anụ aha ha karịa ịbụ ‘ndị dịkarị nta,’ bụ́ nke Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ. (Luk 9:48) Mmụọ dị otú ahụ pụrụ ime ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ.

17. Olee otú ndị Kraịst taa pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo n’ọgbakọ?

17 Taa, anyị aghaghịkwa iguzogide ọchịchọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ekworo, ma ọ bụ oké ọchịchọ na-enweghị isi. Ọ bụrụ na anyị bụ ndị na-eme udo n’ezie, anyị agaghị na-enwe ahụ erughị ala ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ nwere nkà n’ihe ụfọdụ karịa anyị, anyị agaghịkwa na-eweda ha ala n’anya ndị ọzọ site n’inyowe ebumnobi ha enyowe. Ọ bụrụ na anyị nwere nkà dị mma, anyị agaghị eji ya na-eme ka anyị yie ndị ka ndị ọzọ mma, dị ka a ga-asị na anyị na-enye echiche na ọgbakọ ga-enwe ọganihu nanị n’ihi nkà na amamihe anyị. Mmụọ dị otú ahụ ga-akpata nkewa; ọ gaghị eweta udo. Ndị na-eme udo adịghị eji nkà ha etu ọnụ, kama ha na-eji obi umeala eji ya ejere ụmụnna ha ozi ma na-ewetara Jehova nsọpụrụ. Ha na-aghọta na n’ikpeazụ, ọ bụ ịhụnanya—ọ bụghị nkà—ka e ji amata ezi ndị Kraịst.—Jọn 13:35; 1 Ndị Kọrint 13:1-3.

‘Ndị Nlekọta Gị Ga-aghọ Udo’

18. Olee otú ndị okenye si akwalite udo n’etiti onwe ha?

18 Ndị okenye ọgbakọ na-ebute ụzọ n’ịbụ ndị na-eme udo n’ọgbakọ. Jehova buru amụma banyere ndị ya, sị: “M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” (Aịsaịa 60:17) N’ikwekọ n’okwu amụma ndị a, ndị na-eje ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị Kraịst na-arụsị ọrụ ike n’ịkwalite udo n’etiti onwe ha nakwa n’etiti ìgwè atụrụ ahụ. Ndị okenye pụrụ ime ka udo dịgide n’etiti onwe ha site n’ịdị na-egosipụta “amamihe ahụ nke si n’elu bịa” bụ́ nke dị udo ma nwee obiọma. (Jemes 3:17) N’ihi nzụlite na ahụmahụ dịgasị iche iche ha nwere ná ndụ, ndị okenye nọ n’ọgbakọ ga-enwe echiche dịrịtara iche mgbe ụfọdụ. Nke a ọ̀ pụtara na ha enweghị udo? Ee e, ma ọ bụrụ na e mee ihe banyere ọnọdụ ahụ n’ụzọ dị mma. Ndị na-eme udo na-eji obi umeala ekwupụta echiche ha ma jirizie nkwanye ùgwù gee ntị na nke ndị ọzọ. Kama isi ọnwụ n’ụzọ nke ya, onye na-eme udo ga-eji ekpere tụlee echiche nke nwanna ya. Ọ bụrụ na ọ dịghị ụkpụrụ Bible o megidere, a na-enwekarị ohere maka echiche dịgasị iche iche. Mgbe ndị ọzọ na-ekwenyeghị n’ihe o kwuru, onye na-eme udo ga-ekwenyere ma kwado mkpebi ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mere. N’ụzọ dị otú a, ọ ga-egosi na ya nwere obiọma. (1 Timoti 3:2, 3) Ndị nlekọta nwere ahụmahụ maara na ichebe udo dị mkpa karịa mmadụ ime ihe o chere.

19. Olee otú ndị okenye si arụ ọrụ dị ka ndị na-eme udo n’ọgbakọ?

19 Ndị okenye na-eso ìgwè atụrụ ahụ adị n’udo site n’ịkwado ha nakwa site n’ịghara ịdị na-akatọgharị mgbalị ha n’ụzọ na-enweghị isi. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a gbazie ụfọdụ ndị. (Ndị Galetia 6:1) Ma ọrụ bụ́ isi nke onye Kraịst bụ́ onye nlekọta abụghị inye ịdọ aka ná ntị. Ọ na-ekwu okwu ịja mma mgbe mgbe. Ndị okenye na-ahụ n’anya na-agbalịsi ike ịhụ ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma. Ndị nlekọta na-enwe ekele n’ịrụsi ọrụ ike nke ndị Kraịst ibe ha, ha na-enwekwa obi ike na ndị kwere ekwe ibe ha na-eme ihe nile ha pụrụ ime.—2 Ndị Kọrint 2:3, 4.

20. N’ụzọ dị aṅaa ka ọgbakọ si erite uru ma ọ bụrụ na mmadụ nile bụ ndị na-eme udo?

20 N’ihi ya, n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, nakwa ná mmekọrịta nke anyị na ndị na-ekweghị ihe anyị kweere, anyị na-agbalịsi ike ime udo, ịrụ ọrụ iji mee ka udo dị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịdị uchu na-azụlite udo, anyị ga-atụnye ụtụ n’obi ụtọ nke ọgbakọ. N’otu oge ahụ, anyị ga-abụ ndị e chebere ma wusie ike n’ọtụtụ ụzọ, dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka ịbụ onye na-eme udo pụtara?

• Olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ndị na-eme udo mgbe anyị na-emeso ndị na-abụghị Ndịàmà ihe?

• Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi na-azụlite udo n’ezinụlọ?

• Olee otú ndị okenye pụrụ isi na-akwalite udo n’ọgbakọ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị na-eme udo na-ezere ịdị na-eme ka ha ka ndị ọzọ elu

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ndị Kraịst bụ ndị na-eme udo n’ozi, n’ebe obibi, nakwa n’ọgbakọ