Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Gịnị Na-akpọtụ na France?”

“Gịnị Na-akpọtụ na France?”

“Gịnị Na-akpọtụ na France?”

“Nnwere onwe, nnwere onwe anyị ji kpọrọ ihe,” bụ okwu ndị dị na “La Marseillaise,” bụ́ ukwe e ji eto mba France. Obi abụọ adịghị ya na nnwere onwe bụ ihe a ga-eji akpọrọ ihe. Ma, ihe ndị na-eme na France na nso nso a na-eme ka ndị mmadụ na-enwe nchegbu na a na-emebi nnwere onwe ndị bụ́ isi. Ọ bụ ya mere na Friday, November 3, 2000, ọtụtụ iri puku Ndịàmà Jehova kesara ngụkọta nke nde 12 nke traktị pụrụ iche isiokwu ya bụ “Gịnị Na-akpọtụ na France? Nnwere Onwe Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ihe Na-adịghịkwa Adị?”

RUO ọtụtụ afọ ugbu a, ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ìgwè na-emegide okpukpe awakpowo Ndịàmà Jehova nọ na France. Nke a ewetaworo Ndịàmà ihe isi ike n’otu n’otu, dị ka ọgbakọ, nakwa ná mba ahụ nile. Otú ọ dị, na June 23, 2000, Conseil d’État, bụ́ ụlọikpe kasị elu okwu ọchịchị dị n’aka na France, mere mkpebi dị ịrịba ama bụ́ nke kwadoro ihe ụlọikpe 31 ndị ka nta kpebiri n’okwu ikpe dị 1,100. Ụlọikpe ahụ dị elu mesiri ya ike na ofufe Ndịàmà Jehova kwekọrọ kpam kpam n’iwu France nakwa na Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ruru ka a gụpụ ha n’ịtụ ụtụ isi dị ka a gụpụrụ okpukpe ndị ọzọ.

Otú ọ dị, n’ileghara mkpebi a anya kpam kpam, Ministrị Na-ahụ Maka Ego na France nọgidere na-ajụ ịgụpụ Ndịàmà Jehova n’ịtụ ụtụ isi bụ́ nke iwu kwuru na ọ bụ ihe ruuru òtù okpukpe. Ministrị ahụ ekwuwo na Ndịàmà ga na-atụ ụtụ isi pasent 60 site n’onyinye afọ ofufo ha na ndị enyi ha bụ́ ndị so ọgbakọ 1,500 dị na France akpakọ, na-enye. Okwu a dị n’ụlọikpe ugbu a.

Ihe e bu n’obi mee mkpọsa ahụ e kwuru na mbụ bụ iji kpughee eziokwu a yiri ụgha na iji mee ka ọ pụta ìhè bụ́ ihe ize ndụ dị n’iji aka ike otú ahụ anata ụtụ isi nakwa n’iwu ndị a tụpụtara bụ́ ndị ga-anapụ mmadụ nile nnwere onwe okpukpe. *

Ụbọchị Toro Ogologo

N’elekere abụọ nke ụtụtụ, Ndịàmà nọ n’ọgbakọ ụfọdụ malitere ikesa traktị ahụ ná mpụga ọdụ ụgbọ okporo ígwè na ụlọ ọrụ dị iche iche, e mesịakwa n’ọdụ ụgbọelu. N’elekere isii, ndị mmadụ gawara ihe dịịrị ha na Paris. E dewere ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 6,000 n’ebe ndị dị iche iche izute ndị na-agba ụgbọ aga ọrụ. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: “Ihe unu na-eme maka nnwere onwe okpukpe amaka. Ọ bụghị nanị Ndịàmà Jehova ka o metụtara.” Na Marseilles, ihe karịrị Ndịàmà 350 nyefere ndị mmadụ traktị ahụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè okpuru ala nakwa n’okporo ámá. N’ime otu awa, ụlọ ọrụ redio nke mba ahụ kọrọ banyere mkpọsa ahụ, na-agwa ndị na-ege ntị ka ọ ghara iju ha anya ma Ndịàmà Jehova bịakwute ha. Na Strasbourg, bụ́ ebe Ụlọikpe Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Europe dị, ndị njem nọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè bụ́ isi ná mba ahụ, ji ndidi kwụrụ n’ahịrị iji nata traktị nke ha. Otu ọkàiwu kwuru na, ọ bụ ezie na ya ekweghị n’ihe anyị kweere, na ya ji mmasị na-eso okwu ikpe anyị, ebe ọ bụ na ihe anyị na-azọ dị mkpa, ziekwa ezie.

N’elekere asatọ, n’agbanyeghị nnukwu mmiri ozuzo, Ndịàmà 507 nọ n’obodo Grenoble nke dị n’ugwu Alps gazuru okporo ámá ndị dị na ya ma ọ bụ tinye traktị ahụ n’igbe akwụkwọ ozi dị iche iche. Ka ndị ọkwọ ụgbọala hụrụ na ọ dị ihe na-aganụ, ha na-akwụsị ụgbọala ha ma rịọ ka e nye ha traktị. N’obodo Poitiers nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ, ndị ji ụgbọ okporo ígwè bịarute n’elekere itoolu enwetalarị traktị ahụ n’ebe ha nọ banye ụgbọ. Na Mulhouse, nke dị nso n’ókèala Germany, e kesaalarị mkpụrụ 40,000.

Ka ọ na-erule elekere iri, ọtụtụ ọgbakọ ekesaala ọkara nke traktị ha ji. Ka oge ụtụtụ ahụ nọ na-agwụ, ọ bụ nanị mmadụ ole na ole bụ ndị na-ekweghịzi anata traktị ahụ, e nwekwara ọtụtụ mkparịta ụka ndị na-akpali mmasị. Na Besançon, nke dị ihe karịtụrụ kilomita 80 site n’ókèala Switzerland, otu nwa okorobịa gosiri mmasị na Bible ma jụọ ihe mere Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị. Onyeàmà ahụ gwara ya ka ha gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso, bụ́ ebe ọ nọ jiri broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? malitere ya ọmụmụ Bible ozugbo.

N’elekere 12, ọtụtụ Ndịàmà ji oge nri ehihie ha mee nkwusa ruo otu awa ma ọ bụ abụọ. N’oge ehihie ahụ dum, a nọgidere na-ekesa traktị ahụ, ọtụtụ ọgbakọ mechakwara n’elekere atọ ma ọ bụ anọ n’ehihie ahụ. N’obodo Reims, bụ́ ebe bụ́ isi a na-eme mmanya champagne, ụfọdụ ndị soworo Ndịàmà Jehova mụọ ihe ma ọ bụ kpakọọ n’oge gara aga kwupụtara mmasị ha isoroghachi ọgbakọ na-emekọ ihe. Na Bordeaux, a malitere ọmụmụ Bible ebe obibi atọ. N’otu obodo ahụ, otu Onyeàmà banyere n’otu ụlọ ahịa ịzụ akwụkwọ akụkọ ma hụ ikpo traktị dị n’ebe a na-akpọsa ngwá ahịa. Onye ahụ na-ere ahịa, onye bụbu Onyeàmà, enwetawo traktị ahụ, n’ịghọtakwa mkpa ọ dị, o ji ígwè photocopier mepụtaghachi ya iji jiri aka ya kesawa ya.

Na Le Havre, Normandy, otu nwaada na-ekpe Protestant bụ́ onye nụrụ na redio na a na-ana Ndịàmà Jehova ụtụ isi n’onyinye afọ ofufo ha, kụjara. O ji oké mmasị nara traktị ahụ ma jaa Ndịàmà mma maka ikwuwa okwu megide ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ. N’elekere 7:20 nke uhuruchi, ụlọ ọrụ TV dị n’ógbè Lyons kọrọ banyere nkesa ahụ n’akụkọ ụwa, na-asị: “N’ụtụtụ taa, ọ dị mfe izo n’etiti mkpụrụ mmiri ozuzo karịa izere traktị Ndịàmà Jehova.” A gbara Ndịàmà abụọ ajụjụ ọnụ, ha kọwakwara ihe kpatara e ji mee mkpọsa ahụ.

Ndịàmà chọrọ ikere òkè mgbe ha gbasara ọrụ kesara ụfọdụ traktị n’aka ndị ji ụgbọ alọta ọrụ ma tinye ndị ọzọ n’igbe akwụkwọ ozi. N’obodo ndị dị ka Brest na Limoges—nke a ma ama maka ụrọ porcelain ya—ndị si ikiri sinima alọta n’elekere 11:00 nke abalị so ná ndị ikpeazụ nwetara traktị ahụ n’ụbọchị ahụ. A chịkọtara traktị ndị fọdụrụnụ ma kesaa ha n’ụtụtụ echi ya.

Ihe Ndị Si na Ya Pụta

Otu Onyeàmà dere, sị: “Ndị iro anyị chere na ha na-eme ka ike gwụ anyị. N’ezie, ihe na-emenụ dị iche n’ihe ha tụrụ anya ya.” N’ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ ndị dị ná mba ahụ, ihe karịrị pasent 75 nke Ndịàmà keere òkè n’ụbọchị ahụ, ụfọdụ tinyere awa 10, 12, ma ọ bụ 14 n’ọrụ a. Na Hem, n’ebe ugwu France, mgbe otu Onyeàmà rụsịrị ọrụ abalị, o kesara traktị ahụ site n’elekere ise nke ụtụtụ ruo elekere atọ nke ehihie. N’obodo Denain dị nso, bụ́ ebe e nwere ọgbakọ kemgbe 1906, Ndịàmà 75 ji awa 200 kesaa traktị ahụ na Friday. Ndị ọzọ dịkwa njikere ikere òkè n’agbanyeghị ịka nká, nkwarụ, na ọnọdụ ihu igwe dị njọ. Dị ka ihe atụ, na Le Mans, mmadụ atọ dị afọ 80 na ụma ji awa abụọ tinye traktị ahụ n’ime igbe akwụkwọ ozi dị iche iche, otu Onyeàmà kwa bụ́ onye nọ n’oche nkwagharị nọ n’ihu ọdụ ụgbọ okporo ígwè na-enyefe ndị mmadụ traktị ahụ. Leekwa ihe agbamume ọ bụ ịhụ ọtụtụ Ndịàmà na-adịghị ejebu ozi ka ha na-ekere òkè n’ihe omume a pụrụ iche!

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe a e kesara gbara àmà dị ukwuu. Ndị nọ n’ọnọdụ ọrụ dị iche iche ná ndụ, bụ́ ndị a na-adịghị enwetakebe ọtụtụ n’ime ha n’ebe obibi ha, nwetara traktị ahụ. Ọ dị ọtụtụ ndị ka ihe omume a ọ̀ rụzuru ihe karịrị nnọọ ichebe ọdịmma nke Ndịàmà. Ọtụtụ lere ya anya dị ka ịgbachitere nnwere onwe nke akọ na uche na nke okpukpe nke ndị France nile. Dị ka ihe na-agba akaebe nke a, ndị mmadụ rịọrọ ka e nyekwuo ha traktị ka ha nye ndị enyi ha, ndị ọrụ ibe ha, ma ọ bụ ndị ikwu ha.

Ee, obi dị Ndịàmà Jehova nọ na France ụtọ ime ka a mara aha Jehova na ịgbachitere ihe ndị metụtara Alaeze. (1 Pita 3:15) Olileanya ha ji ezi obi na-enwe bụ ka ha “biri obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile” nakwa ka ọtụtụ puku ndị ọzọ sonyere ha n’ito Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova.—1 Timoti 2:2.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E mere mkpọsa yiri nke ahụ na January 1999 iji mee mkpesa banyere ịkpa ókè n’ihi okpukpe. Lee Ụlọ Nche, August 1, 1999, peeji nke 9, na 2000 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peeji nke 24-26.