Nwee Ekele ma Nwee Obi Ụtọ
Nwee Ekele ma Nwee Obi Ụtọ
“MKPALI nke inwe ekele bụ ahụmahụ bụ́ isi ụmụ mmadụ nwere,” ka Calgary Herald, bụ́ akwụkwọ akụkọ Canada, kwuru. Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Herald hotara ụfọdụ ụmụ akwụkwọ elementrị dị afọ itoolu bụ́ ndị onye nkụzi ha gwara ka ha dee banyere ihe nile ha nwere ekele maka ha. Otu onye ntorobịa kwuru na ya nwere ekele maka ezinụlọ ya ‘n’ihi na ha lekọtara ya.’ Otu nwatakịrị nwanyị nwekwara ekele maka ezinụlọ ya, na-asị: “Ha na-ahụ na m nọ ná nchebe, na ahụ siri m ike, ha na-elekọta m, na-ahụ m n’anya, na-enye m nri, a sịkwa na ọ bụghị nne m na nna m, agaraghị m anọ n’ụwa a.”
Enweghị ekele na-akpata enweghị afọ ojuju na-adịghị akwụsị akwụsị. Dị ka ọkà ihe ọmụma na ọkà mmụta okpukpe bụ́ J. I. Packer si kwuo, “e kere anyị ịdabere n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’ebe ibe anyị nọ.” Nke a na-echetara anyị ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya Bible nyere ọtụtụ narị afọ gara aga, nke na-asị: “Bụrụnụ ndị na-ekele ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) Igosipụta ekele sitere n’obi n’ebe ndị ọzọ nọ na-enye aka ime ka anyị na ha na-enwe mmekọrịta dị mma.
Ọzọkwa, site n’inwerịta ekele n’ebe ibe anyị nọ na ijirịta ibe anyị kpọrọ ihe, anyị na-egosipụtakwa na anyị nwere ekele n’ebe Jehova nọ, ọ na-arịbakwa nke a ama. Bible na-ekwu, sị: “Anya [Jehova] na-ejegharị n’ụwa nile, igosi Onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe Ọ nọ.” (2 Ihe E Mere 16:9) Chineke na-emesi anyị obi ike na ya na-echeta ma na-eji ịhụnanya ụmụ mmadụ na-egosi n’ebe aha ya nọ akpọrọ ihe. (Ndị Hibru 6:10) Ee, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwe ekele n’ihi na omume a na-enye Chineke nsọpụrụ, ọ bụrụ na anyị na-egosipụta ya kwa ụbọchị, ọ na-eme Jehova obi ụtọ, na-emekwa ka obi dị anyị ụtọ. Ọ bụ dị ka Ilu 15:13 si kwuo ya: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma.”