Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú Udo Nke Kraịst Pụrụ Isi Na-achịkwa Obi Anyị?

Olee Otú Udo Nke Kraịst Pụrụ Isi Na-achịkwa Obi Anyị?

Olee Otú Udo Nke Kraịst Pụrụ Isi Na-achịkwa Obi Anyị?

“Kwenụ ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi unu, n’ihi na, n’eziokwu, a kpọrọ unu n’ebe ọ dị n’otu ahụ́.”—NDỊ KỌLỌSI 3:15, NW.

1, 2. N’ụzọ dị aṅaa ka “udo nke Kraịst ahụ” si achịkwa obi onye Kraịst?

NCHỊKWA bụ okwu na-agba ọtụtụ ndị agba ná ntị, ebe ọ bụ na ọ na-eme ka e chewe banyere mmanye na nghọgbu. N’ihi ya, agbamume Pọl nyere ndị Kraịst ibe ya nọ na Kọlọsi bụ́, “Kwenụ ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi unu,” pụrụ iyi ụfọdụ ka ihe ezi uche na-adịghị na ya. (Ndị Kọlọsi 3:15) É nyeghị anyị nnwere onwe ime nhọrọ? N’ihi gịnị ka anyị ga-eji kwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla na-achịkwa obi anyị?

2 Pọl adịghị agwa ndị Kọlọsi ka ha gharazie inwere onwe ha ime nhọrọ. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘nchịkwa’ ná Ndị Kọlọsi 3:15 nwere ihe jikọrọ ya na okwu e ji mee ihe maka onye na-egbu pịọm n’egwuregwu bụ́ onye na-ekwu onye ruru eru inweta ihe nrita n’asọmpi egwuregwu nke oge ahụ. Ndị na-asọ mpi egwuregwu nwetụụrụ onwe ha ma ọ bụrụhaala na ha agbasoo ụkpụrụ egwuregwu ahụ, ma n’ikpeazụ, ọ bụ onye ahụ na-egbu pịọm n’egwuregwu ahụ na-ekpebi onye gbasoro ụkpụrụ ndị ahụ, n’ihi ya kwa, merie n’asọmpi ahụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, anyị nweere onwe anyị ime ọtụtụ mkpebi ná ndụ, ma ka anyị na-eme otú ahụ, udo nke Kraịst ahụ kwesịrị ịbụ mgbe nile “onye na-egbu pịọm”—ma ọ bụ dị ka onye nsụgharị bụ́ Edgar J. Goodspeed si sụgharịa ya, “ụkpụrụ na-achị” obi anyị.

3. Gịnị bụ “udo nke Kraịst ahụ”?

3 Gịnị bụ “udo nke Kraịst ahụ”? Ọ bụ ịdị jụụ, ahụ iru ala nke anyị na-enweta mgbe anyị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jisọs ma mata na Jehova Chineke na Ọkpara ya hụrụ anyị n’anya nakwa na anyị nwere ihu ọma ha. Mgbe Jisọs na-achọ ịhapụ ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha, sị: “Udo nke m ka M na-enye unu . . . Ka obi unu ghara ịlọ mmiri, ka ọ gharakwa ịtụ ụjọ.” (Jọn 14:27) Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000, ndị kwesịrị ntụkwasị obi e tere mmanụ bụ́ ndị so n’ahụ nke Kraịst, anọwo na-enweta udo ahụ, taakwa ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, so na-enweta ya. (Jọn 10:16) Udo ahụ kwesịrị ịbụ ihe na-achịkwa obi anyị. Mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa siri ike, ọ pụrụ inyere anyị aka izere ịbụ ndị ụjọ kụdara mmụọ ma ọ bụ ndị na-enwebiga nchegbu ókè. Ka anyị hụ otú nke a si bụrụ eziokwu mgbe a na-ekpe anyị ikpe na-ezighị ezi, mgbe anyị nwere nchegbu, na mgbe anyị chere na anyị erughị eru.

Mgbe A Na-ekpe Anyị Ikpe Na-ezighị Ezi

4. (a) Olee otú Jisọs si mara banyere ikpe na-ezighị ezi? (b) Olee otú ndị Kraịst siworo meghachi omume n’ikpe na-ezighị ezi a na-ekpe ha?

4 Eze Solomọn kwuru, sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Jisọs maara na okwu ndị ahụ bụ eziokwu. Mgbe ọ nọ n’eluigwe, ọ hụrụ ọtụtụ ikpe na-ezighị ezi ndị mmadụ na-ekpe ibe ha. Mgbe ọ nọ n’ụwa, e kpere ya ikpe na-ezighị ezi kasịnụ mgbe e boro ya, bụ́ onye na-emeghị mmehie ọ bụla, ebubo ikwulu Chineke ma gbuo ya dị ka omempụ. (Matiu 26:63-66; Mak 15:27) Taa, ikpe na-ezighị ezi ka juru ebe nile, ezi ndị Kraịst atawo ahụhụ n’ụzọ gabigara ókè n’ihi ịbụ ndị ‘mba nile kpọrọ asị.’ (Matiu 24:9) Ma, n’agbanyeghị ahụmahụ ọjọọ ndị ha nwere n’ogige ọnwụ nke ndị Nazi na n’Ogige Ọrụ Mmanye nke ndị Soviet, n’agbanyeghịkwa ịbụ ndị ìgwè ndị na-eme ihe ike wakporo, ndị e boro ebubo, na ndị a ghagidere ụgha, udo nke Kraịst ahụ anọgidewo na-eme ka ha kwụrụ chịm. Ha eṅomiwo Jisọs, bụ́ onye anyị na-agụ banyere ya, sị: “Mgbe a na-ekwutọ Ya, Ọ dịghị ekwutọghachi ọzọ; mgbe Ọ na-ahụ ahụhụ, Ọ dịghị aba mba; kama Ọ raara Onwe ya nye n’aka Onye ahụ Nke na-ekpe ikpe ziri ezi.”—1 Pita 2:23.

5. Mgbe anyị nụrụ na ihe yiri ka ọ bụ ikpe na-ezighị ezi weere ọnọdụ n’ọgbakọ, gịnị ka anyị kwesịrị ibu ụzọ tụlee?

5 N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta karị, anyị pụrụ iche na e mesowo mmadụ ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ọgbakọ ndị Kraịst. N’ọnọdụ dị otú ahụ, anyị pụrụ inwe ụdị mmetụta Pọl nwere, bụ́ onye sịrị: “Ònye ka a na-eme ka ọ maa n’ọnyà, nke mụ onwe m na-ereghị ọkụ n’ihi ya?” (2 Ndị Kọrint 11:29) Gịnị ka anyị pụrụ ime? Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ọ̀ bụ ikpe na-ezighị ezi n’ezie?’ Ọtụtụ mgbe, anyị adịghị ama ihe nile kpatara ya. Anyị pụrụ iwewe iwe mgbe anyị nụchara ihe onye sị na ya maara ihe kpatara ya kwuru. Bible nwere ezi ihe mere o ji na-ekwu, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla.” (Ilu 14:15) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya.

6. Olee otú anyị pụrụ isi meghachi omume mgbe anyị chere na e mesoro anyị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi n’ọgbakọ?

6 Otú ọ dị, ka e were ya na anyị chere na e mesowo anyị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Olee otú onye nwere udo nke Kraịst ahụ n’obi ya ga-esi emeghachi omume? Anyị pụrụ ịhụ mkpa ọ dị isoro onye ahụ anyị chere na o mejọrọ anyị kwurịta ya. Mgbe nke ahụ gasịrị, kama isoro onye ọ bụla ga-ege gị ntị na-ekwurịta ya, gịnị ma ị gwa ya Jehova n’ekpere ma tụkwasị ya obi na ọ ga-ahụ na ikpe ziri ezi weere ọnọdụ? (Abụ Ọma 9:10; Ilu 3:5) Ọ pụrụ ịbụ na mgbe anyị meworo otú ahụ, obi ga-adị anyị mma ichefu okwu ahụ ma “dere duu.” (Abụ Ọma 4:4) N’ọnọdụ ka ukwuu, a pụrụ itinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta mgbe nile ná mmekọrịta anyị na ụmụnna anyị?

7 Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị ga-eme, ọ dị anyị mkpa icheta na ọ bụ ezie na anyị apụghị ịchịkwa ihe merela eme, anyị pụrụ ịchịkwa mmeghachi omume anyị. Ọ bụrụ na anyị emeghachi omume n’ụzọ na-adịghị mma mgbe anyị chere na e mesoro anyị ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, nke ahụ pụrụ imetụta udo anyị n’ụzọ dị njọ karịa ka ihe ahụ e mere anyị pụrụ ime. (Ilu 18:14) Anyị pụrụ ọbụna ịsụ ngọngọ ma kwụsị iso ọgbakọ na-akpakọrịta ruo mgbe anyị chere na e doziwo nsogbu ahụ. Ọbụ abụ ahụ dere na ‘ọ dịghị ihe ịsụ ngọngọ ndị na-ahụ iwu Jehova n’anya nwere.’ (Abụ Ọma 119:165) Nke bụ́ eziokwu bụ na a na-emejọ onye ọ bụla site n’oge ruo n’oge. Ekwela ma ọlị ka ahụmahụ ndị dị otú ahụ dị njọ metụta ozi ị na-ejere Jehova. Kama nke ahụ, kwee ka udo nke Kraịst na-achịkwa obi gị.

Mgbe Anyị Nwere Nchegbu

8. Olee ihe ụfọdụ na-akpata nchegbu, gịnịkwa ka nchegbu pụrụ ịrụpụta?

8 Nchegbu bụ kpọmkwem akụkụ nke ndụ a na-adị na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1) N’eziokwu, Jisọs kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi.” (Luk 12:22) Ma, ọ bụghị iche banyere ihe onwunwe na-akpata nchegbu nile. Ịrụ arụ nke Sọdọm “na-ewute [Lọt] nke ukwuu.” (2 Pita 2:7) Pọl nwere ‘nchegbu banyere nzukọ Kraịst nile.’ (2 Ndị Kọrint 11:28) Jisọs nọ nnọọ n’oké ihe mgbu n’abalị ahụ bu ọnwụ ya ụzọ nke na ‘ọsụsọ Ya ghọrọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.’ (Luk 22:44) N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nchegbu nile bụ ihe àmà nke okwukwe na-esighị ike. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, ọ bụrụ na anyị enwee oké nchegbu ruo ogologo oge, ọ pụrụ ime ka anyị ghara inwekwa udo. Nchegbu erikpuwo ụfọdụ, na-eme ka ha chee na ha enweghị ike ịnọgide na-ebu ibu ọrụ ndị dị n’ijere Jehova ozi. Bible na-ekwu, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” (Ilu 12:25) Mgbe ahụ, gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị nwere nchegbu?

9. Gịnị bụ nzọụkwụ ụfọdụ dị irè a pụrụ iwere iji belata nchegbu, ma olee ihe ndị na-akpata nchegbu bụ́ ndị a na-apụghị iwepụ ewepụ?

9 N’ọnọdụ ụfọdụ, anyị pụrụ inwe ike iwere nzọụkwụ ndị dị irè. Ọ bụrụ na ọ bụ nsogbu ahụ ike bụ isi ihe na-akpatara anyị nchegbu, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ilebara ya anya, ọ bụ ezie na okwu dị otú ahụ bụ ihe mmadụ na-ekpebiri onwe ya. * (Matiu 9:12) Ọ bụrụ na ọtụtụ ibu ọrụ na-anyịgbu anyị, ọ pụrụ ikwe mee ikenye ndị ọzọ ụfọdụ n’ime ha. (Ọpụpụ 18:13-23) Otú ọ dị, gịnị banyere ndị—dị ka ndị mụrụ ụmụ—nwere ibu ọrụ ndị dị arọ bụ́ ndị a na-apụghị ikenye ndị ọzọ? Gịnị banyere onye Kraịst ya na onye òtù ọlụlụ na-emegide ya bi? Gịnị banyere ezinụlọ nọ n’oké ụkọ ego ma ọ bụ biri n’ógbè a na-alụ agha? N’ụzọ doro anya, anyị apụghị iwepụ ihe nile na-akpata nchegbu n’usoro ihe a. Ma, anyị pụrụ ichekwa udo nke Kraịst ahụ n’obi anyị. N’ụzọ dị aṅaa?

10. Olee ụzọ abụọ onye Kraịst pụrụ isi chọọ ibelata nchegbu?

10 Otu ụzọ bụ ịchọ nkasi obi n’Okwu Chineke. Eze Devid dere, sị: “Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 94:19) A pụrụ ịchọta “nkasi obi” Jehova n’ime Bible. Inyocha Akwụkwọ ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ mgbe nile ga-enye aka ichekwa udo nke Kraịst ahụ n’obi anyị. Bible na-ekwu, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 55:22) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl dere, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ikpesi ekpere ike na ikpechi ya anya ga-enyere anyị aka ichekwa udo anyị.

11. (a) Olee otú Jisọs si bụrụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere ekpere? (b) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ekpere anya?

11 Jisọs bụ ihe nlereanya magburu onwe ya na nke a. Mgbe ụfọdụ, o ji ekpere gwa Nna ya okwu ruo ọtụtụ awa n’otu oge. (Matiu 14:23; Luk 6:12) Ekpere nyeere ya aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị kasị njọ. N’abalị ahụ bu ọnwụ ya ụzọ, ihe mgbu ya kara njọ nke ukwuu. Gịnị bụ mmeghachi omume ya? O kpere ekpere “sie ike karị.” (Luk 22:44) Ee, Ọkpara Chineke zuru okè bụ nwoke ji ekpere kpọrọ ihe. Mgbe ahụ, lee otú o si kwesị ekwesị karị ka ụmụazụ ya na-ezughị okè zụlite àgwà nke ikpe ekpere! Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya “ikpe ekpere mgbe nile, na ịghara ikwe ka ike gwụ ha.” (Luk 18:1) Ekpere bụ ezigbo nkwurịta okwu dị oké mkpa nke anyị na Onye ahụ maara anyị nke ọma karịa ka anyị maara onwe anyị. (Abụ Ọma 103:14) Ọ bụrụ na anyị ga-echekwa udo nke Kraịst ahụ n’obi anyị, anyị ga ‘na-ekpe ekpere n’ewepụghị aka.’—1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

Imeri Erughị Eru Anyị

12. N’ihi ihe ndị dị aṅaa ka ụfọdụ pụrụ iji chee na ozi ha erughị eru?

12 Jehova na-ele onye ọ bụla n’ime ndị ohu ya anya dị ka onye dị oké ọnụ ahịa. (Hagaị 2:7) Otú o sina dị, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikwere nke ahụ. Ụfọdụ pụrụ inwe nkụda mmụọ n’ihi ime agadi, ibu ọrụ ezinụlọ na-amụbawanye amụbawanye, ma ọ bụ ahụ ike na-adịwanye njọ. Ndị ọzọ pụrụ iche na ọ dịghị ihe ha dị mma ya n’ihi ahụmahụ ndị na-adịghị mma ha nwere mgbe ha bụ ụmụaka. Ma, ndị ọzọ pụrụ ịbụ ndị ihe ndị ha mehiere n’oge gara aga na-enye nsogbu n’obi, na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ pụrụ ịgbaghara ha ma ọlị. (Abụ Ọma 51:3) Gịnị ka a pụrụ ime banyere mmetụta ndị dị otú ahụ?

13. Nkasi obi dị aṅaa sitere n’Akwụkwọ Nsọ ka e nwere maka ndị na-eche na ha erughị eru?

13 Udo nke Kraịst ahụ pụrụ ime ka anyị jide n’aka na Jehova hụrụ anyị n’anya. Anyị pụrụ iweghachi udo ahụ n’obi anyị site n’ịdị na-atụgharị uche n’eziokwu ahụ bụ́ na ọ dịtụghị mgbe Jisọs kwuru na a na-atụ uru anyị bara n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ site n’iji ihe anyị na-eme na-atụnyere nke ndị ọzọ. (Matiu 25:14, 15; Mak 12:41-44) Ihe o mesiri ike bụ iguzosi ike n’ihe. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ndị mmadụ ‘ledara Jisọs n’onwe ya anya,’ ma o nweghị obi abụọ ọ bụla na Nna ya hụrụ ya n’anya. (Aịsaịa 53:3; Jọn 10:17) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya na a hụkwara ha n’anya. (Jọn 14:21) Iji mesie nke a ike, Jisọs kwuru, sị: “Á dịghị ere egwele abụọ n’otu penny? ma otu n’ime ha agaghị ada n’ala ma Nna unu ekweghị: ma ọbụna agịrị isi nile nke isi unu ka a gụworo. Ya mere, unu atụla egwu; ọnụ ahịa unu onwe unu karịrị nke ọtụtụ egwele.” (Matiu 10:29-31) Lee ka nke ahụ si bụrụ ihe na-emesi nnọọ obi ike banyere ịhụnanya Jehova!

14. Mmesi obi ike dị aṅaa ka anyị nwere na Jehova ji onye nke ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe?

14 Jisọs kwukwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” (Jọn 6:44) Ebe ọ bụ na Jehova adọwo anyị iso Jisọs, Ọ ghaghị ịchọ ka a zọpụta anyị. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụghị ihe a chọrọ n’ihu Nna unu Nke bi n’eluigwe, ka otu n’ime ndị nta ndị a laa n’iyi.” (Matiu 18:14) N’ihi ya, ọ bụrụ na i ji obi gị dum na-ejere ya ozi, ị pụrụ ịnya isi n’ọrụ ọma gị. (Ndị Galetia 6:4) Ọ bụrụ na ihe i mehiere n’oge gara aga na-enye gị nsogbu n’obi, nwee obi ike na Jehova ga-agbaghara ndị nwere nchegharị n’ezie mmehie ha “n’ụba.” (Aịsaịa 43:25; 55:7) Ọ bụrụ na o nwere ihe ọ bụla ọzọ mere i ji na-enwe nkụda mmụọ, cheta na “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

15. (a) Olee otú Setan si anwa ịnapụ anyị udo anyị? (b) Obi ike dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe n’ebe Jehova nọ?

15 Ọ dịghị ihe ọzọ ga-amasị Setan karịa ịnapụ gị udo. Ọ bụ ya kpatara mmehie e ketara eketa bụ́ nke anyị nile na-alụso ọgụ. (Ndị Rom 7:21-24) N’ezie, ọ ga-amasị ya ka i chee na ezughị okè gị na-eme ka Chineke ghara ịnakwere ozi ị na-ejere ya. Ekwela ma ọlị ka Ekwensu kụda gị mmụọ! Mara aghụghọ ya, kweekwa ka ọmụma ị maara ya mee ka i kpebisie ike ịtachi obi. (2 Ndị Kọrint 2:11; Ndị Efesọs 6:11-13) Cheta, “Chineke ka obi anyị ukwuu, Ọ makwaara ihe nile.” (1 Jọn 3:20) Ọ bụghị nanị erughị eru anyị ka Jehova na-ahụ. Ọ na-ahụkwa ebumnobi na ọchịchọ anyị. Mgbe ahụ, nweta nkasi obi n’okwu ọbụ abụ ahụ, bụ́: “Jehova agaghị aha ndị Ya aka, Ọ gaghị ahapụkwa ihe nketa Ya.”—Abụ Ọma 94:14.

Ndị Dị n’Otu n’Udo nke Kraịst Ahụ

16. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị si bụrụ ndị na-anọghị nanị ha ka anyị na-agbalịsi ike ịtachi obi?

16 Pọl dere na anyị kwesịrị ikwe ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi anyị n’ihi na ‘a kpọrọ anyị n’ebe ọ dị n’otu ahụ́.’ A kpọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi ahụ ịbụ akụkụ nke ahụ Kraịst, dịkwa ka a kpọrọ ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ taa. Ha na ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ dị n’otu dị ka “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru “otu Onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Jọn 10:16) N’ozuzu, “ìgwè atụrụ” nke ọtụtụ nde mmadụ mejupụtara, na-ekwe ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi ha. Ịmara na anyị anọghị nanị anyị na-enyere anyị aka ịtachi obi. Pita dere, sị: “Na-eguzogidenụ [Setan], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ́ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.”—1 Pita 5:9.

17. Ihe mkpali dị aṅaa ka anyị nwere iji kwere ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi anyị?

17 Mgbe ahụ, ka anyị nile nọgide na-azụlite udo, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke ahụ dị oké mkpa. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ikpeazụ, a ga-eji ndụ ebighị ebi n’ime ụwa paradaịs, bụ́ ebe ezi omume ga-ebi, gọzie ndị Jehova hụtara dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghị ịta ụta, na ndị nọ n’udo. (2 Pita 3:13, 14) Anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwe ka udo nke Kraịst ahụ na-achịkwa obi anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 N’ọnọdụ ụfọdụ, nsogbu ahụ ike, dị ka ọrịa ịda mbà n’obi, pụrụ ịkpata nchegbu ma ọ bụ mee ka ọ ka njọ.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị bụ udo nke Kraịst ahụ?

• Olee otú udo nke Kraịst ahụ pụrụ isi na-achịkwa obi anyị mgbe a na-ekpe anyị ikpe na-ezighị ezi?

• Olee otú udo nke Kraịst ahụ si enyere anyị aka ịnagide nchegbu?

• Olee otú udo nke Kraịst ahụ si akasi anyị obi mgbe anyị chere na anyị erughị eru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs raara onwe ya nyefee Jehova n’ihu ndị na-ebo ya ebubo

[Foto dị na peeji nke 16]

Dị ka mmakụ na-ekpo ọkụ nke nna na-ahụ n’anya, nkasi obi Jehova pụrụ ime ka nchegbu anyị belata

[Foto dị na peeji nke 18]

Chineke ji ntachi obi kpọrọ ihe nke ukwuu