Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Dị Mma

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Dị Mma

Otú Ị Pụrụ Isi Mee Mkpebi Ndị Dị Mma

NNWERE onwe ime nhọrọ bụ onyinye si n’aka Chineke. E wezụga ya, anyị gaara adịcha nnọọ ka ígwè ọrụ e ji kọmputa achịkwa, bụrụ ndị na-adịghị achịkwali ihe anyị na-eme. Otú ọ dị, anyị na-eji ya eche ihe ịma aka ihu. Ebe anyị nweere onwe anyị ime nhọrọ, anyị aghaghị ime mkpebi ka anyị na-adị ndụ.

N’ezie, ọtụtụ mkpebi dị nnọọ mfe omume. Ndị ọzọ, dị ka ọrụ anyị ga-ahọrọ, ma ọ bụ ma ànyị ga-alụ di ma ọ bụ nwunye, pụrụ imetụta ọdịnihu anyị dum. Ma mkpebi ndị ọzọ anyị na-eme na-emetụta ndị mmadụ ọzọ. Ụfọdụ mkpebi ndị nne na nna na-eme na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ ụmụ ha. Ọzọkwa, anyị aghaghị ịza ajụjụ n’ihu Chineke maka ọtụtụ mkpebi anyị na-eme.—Ndị Rom 14:12.

Mkpa Maka Enyemaka

Ụmụ mmadụ enweghị ihe ndekọ dị mma ma a bịa n’ime mkpebi. Otu n’ime mkpebi ndị mbụ e deturu edetu mmadụ mere, wetara ọdachi. Iv kpebiri iri mkpụrụ osisi ahụ Chineke machibidoro iwu kpam kpam. Nhọrọ ya, bụ́ nke dabeere n’ọchịchọ onwe onye nanị, dugara di ya n’isonyere ya n’inupụrụ Chineke isi, ọ kpatakwaara ihe a kpọrọ mmadụ nhụjuanya dị ukwuu. N’ọtụtụ ọnọdụ, ụmụ mmadụ ka na-eme ka mkpebi ha dabere n’ọchịchọ onwe onye nanị karịa n’ụkpụrụ ndị ziri ezi. (Jenesis 3:6-19; Jeremaịa 17:9) Mgbe anyị chekwara mkpebi ndị siri ike ihu, anyị na-amatakarị banyere erughị eru anyị.

Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ọtụtụ mmadụ na-eme mkpebi ndị dị mkpa, ha na-achọ enyemaka n’ebe karịrị ike mmadụ. Bible nwere ihe ndekọ banyere otu oge mgbe Nebukadneza nwere mkpebi ọ ga-eme ka ọ nọ na-alụ agha. N’agbanyeghị na ọ bụ eze, o chere na ọ dị ya mkpa “ịjụ ase,” ịgakwuru ndị mmụọ. N’ihi ya, ihe ndekọ ahụ na-asị: “O fegharịrị akụ́ ya nile, jụọ ase n’aka terafim ya, lekwasị imeju anya.” (Ezikiel 21:21) N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ ndị na-agakwuru ndị dibịa afa na ndị na-agụ kpakpando ma si n’ụzọ ndị ọzọ na-achọ enyemaka nke ndị mmụọ. Ma, ihe ndị a na-eduhie eduhie.—Levitikọs 19:31.

E nwere Onye a pụrụ ịdabere na ya kpam kpam, onye nyewokwaara ụmụ mmadụ aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha n’akụkọ ihe mere eme nile. Ọ dịghị onye ọzọ ọ bụ karịa Jehova Chineke. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, Chineke nyere mba ya, bụ́ Isreal, Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ—ikekwe, nzà ndị dị nsọ e fere mgbe mba ahụ chere ọnọdụ ndị dị oké mkpa ihu. Site n’Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ, Jehova zara ajụjụ dị iche iche ma nyere ndị okenye Israel aka ijide n’aka na mkpebi ha kwekọrọ n’uche ya.—Ọpụpụ 28:30; Levitikọs 8:8; Ọnụ Ọgụgụ 27:21.

Tụlee ihe atụ ọzọ. Mgbe a kpọrọ Gideọn ka o duru usuu ndị agha Israel gaa lụsoo Midian agha, ọ ghaghị ikpebi ma ọ̀ ga-anakwere nnukwu ihe ùgwù dị otú ahụ. Ebe Gideọn chọrọ ka Jehova mesighachi ya obi ike na ọ ga-akwado ya, ọ rịọrọ ya ka o nye ya ihe ịrịba ama n’ụzọ ọrụ ebube. O kpere ekpere ka igirigi dee ajị anụ ọ hapụrụ n’ala ruo chi ọbụbọ ma ka ala ahụ ọ dị na ya kpọọ nkụ. N’abalị echi ya, ọ rịọrọ ka ajị anụ ahụ kpọọ nkụ ma ka igirigi dee ala ahụ ọ dị na ya. Jehova ji obiọma nye Gideọn ihe ịrịba ama ndị ahụ ọ rịọrọ maka ha. N’ihi ya, Gideọn mere mkpebi dị mma, sitekwa n’enyemaka Chineke, o meriri ndị iro Israel kpam kpam.—Ndị Ikpe 6:33-40; 7:21, 22.

Gịnị Banyere Oge A?

N’oge a, Jehova ka na-enyere ndị ohu ya aka mgbe ha nwere mkpebi ndị dị mkpa ime. N’ụzọ dị aṅaa? Dị ka Gideọn, ànyị kwesịrị ịrịọ maka ‘nnwale ajị anụ,’ ihe ịrịba ama sitere n’aka Jehova iji gosi anyị ụzọ anyị ga-agbaso? Otu di na nwunye nọ na-eche ma hà ga-aga ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Iji nyere ha aka ime mkpebi, ha mere ndokwa maka otu nnwale. Ha debere ụlọ ha maka orire ma kwuo ego ole ha ga-ere ya. Ọ bụrụ na n’ụbọchị ha kara aka, ha eree ụlọ ahụ ego ole ahụ ha kwuru ma ọ bụ karịa, ha ga-ewere ya dị ka ihe na-egosi na Chineke chọrọ ka ha gaa. Ọ bụrụ na ụlọ ahụ ekweghị orire, ha ga-ekwubi na Chineke achọghị ka ha gaa.

Ụlọ ahụ ekweghị orire. Nke ahụ ọ̀ bụ ihe na-egosi na Jehova achọghị ka di na nwunye a jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu? N’ezie, ọ ga-abụ mpako iji ịkapị okwu ọnụ kwuo ihe Jehova na-emere ndị ohu ya ma ọ bụ ihe ọ na-adịghị emere ha. Anyị apụghị ikwu na n’oge a, Jehova adịghị mgbe ọ na-eme ihe iji gosi anyị ihe bụ́ uche ya. (Aịsaịa 59:1) Otú ọ dị, ọ bụghị ihe ruuru anyị ịtụ anya na ọ ga-eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ ná mkpebi anyị ndị bụ́ isi, si otú a na-ahapụrụ Chineke mkpebi anyị ka o meere anyị ya. Leenụ, ọbụna Gideọn n’ihe ka ọtụtụ ná ndụ ya, aghaghị ime mkpebi n’enwetaghị ihe ịrịba ama ọrụ ebube site n’aka Jehova!

Ma, Bible na-ekwu na nduzi Chineke dị. Ọ na-ebu amụma banyere oge anyị, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Mgbe anyị nwere nhọrọ ndị dị mkpa ime, ọ bụ ihe kasị kwesị ekwesị ịchọ ijide n’aka na mkpebi anyị kwekọrọ n’uche Chineke ma na-egosipụta amamihe ya ka elu. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịga n’Okwu ya na ikwe ka ọ bụrụ ‘oriọna dịịrị ụkwụ anyị, na ìhè dịịrị okporo ụzọ anyị.’ (Abụ Ọma 119:105; Ilu 2:1-6) Iji mee nke a, ọ dị anyị mkpa ịzụlite àgwà nke inweta ezi ihe ọmụma sitere na Bible. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Mgbe anyị chere mkpebi ihu, ọ dị anyị mkpa iji nlezianya nyochaa ụkpụrụ nile nke Bible bụ́ ndị metụtara okwu ahụ. Nnyocha dị otú ahụ ga-eme ka anyị nwee ike ‘ijide ihe ndị ka mkpa n’aka.’—Ndị Filipaị 1:9, 10, NW.

Anyị kwesịkwara ịgwa Jehova okwu n’ekpere, na-enwe obi ike na ọ ga-ege anyị ntị. Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịkọwara Chineke anyị na-ahụ n’anya mkpebi anyị nwere ime na nhọrọ ndị anyị na-atụle! Mgbe ahụ, anyị pụrụ iji obi ike rịọ maka nduzi n’ime mkpebi ziri ezi. Mgbe mgbe, mmụọ nsọ ga-echetara anyị ụkpụrụ Bible ndị bara uru na nke a, ma ọ bụ ọ pụrụ inyere anyị aka ịghọta, n’ụzọ dokwuru anya, akụkụ Akwụkwọ Nsọ metụtara ọnọdụ anyị.—Jemes 1:5, 6.

Jehova na-enyekwa ndị tozuru okè n’ọgbakọ bụ́ ndị anyị pụrụ iso kwurịta mkpebi anyị. (Ndị Efesọs 4:11, 12) Otú ọ dị, n’ịgakwuru ndị ọzọ, anyị ekwesịghị ịgbaso ụzọ nke ndị na-eme ha gakwuru onye a ha agakwuru onye ọzọ ruo mgbe ha mesịrị chọta onye ga-ekwu ihe ha chọrọ ịnụ. Mgbe ahụ, ha agbasoo ndụmọdụ ya. Anyị kwesịkwara icheta mgbe nile ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke Rehoboam. Mgbe o nwere mkpebi siri ike ime, o nwetara ndụmọdụ magburu onwe ya site n’aka ndị okenye bụ́ ndị soworo nna ya jee ozi. Otú ọ dị, kama ịgbaso ndụmọdụ ha, ọ gakwuuru ụmụ okorobịa ya na ha tokọrọ. N’ịgbaso ndụmọdụ ha, o mere mkpebi dị nnọọ njọ, n’ihi ya kwa, akụkụ ka ukwuu nke alaeze ya funahụrụ ya.—1 Ndị Eze 12:1-17.

Mgbe ị na-achọ ndụmọdụ, chọọ ya n’aka ndị nwere ahụmahụ ná ndụ, nwee ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ, ma nwee nkwanye ùgwù miri emi maka ụkpụrụ ndị ziri ezi. (Ilu 1:5; 11:14; 13:20) Mgbe o kwere mee, wepụta oge iji tụgharịa uche n’ụkpụrụ ndị o metụtara nakwa n’ihe ọmụma nile i nwetaworo. Ka ị na-ahụkwu ihe n’ụzọ kwekọrọ n’Okwu Jehova, o yiri ka mkpebi ziri ezi ọ ga-apụtakwu ìhè.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Mkpebi Ndị Anyị Na-eme

Mkpebi ụfọdụ na-adị mfe omume. Mgbe e nyere ndị ozi iwu ịkwụsị ịgba àmà, ha maara na ha aghaghị ịnọgide na-ekwusa banyere Jisọs, ha mekwara ozugbo ka Sanhedrin mara banyere mkpebi ha bụ́ irubere Chineke isi karịa mmadụ. (Ọrụ 5:28, 29) Mkpebi ndị ọzọ pụrụ ịdị mkpa ka e chebakwuoro ha echiche n’ihi na ọ dịghị ihe Bible kwuru kpọmkwem banyere ha. Ma, ụkpụrụ Bible ga-emekarị ka a mara mkpebi kasị mma ime. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na ọtụtụ ụdị ntụrụndụ e nwere taa adịghị n’oge Jisọs, e nwere ihe ndị doro anya Bible kwuru banyere ihe ndị na-amasị Jehova na ihe ndị na-adịghị amasị ya. N’ihi ya, onye Kraịst ọ bụla nke tinyere aka ná ntụrụndụ ndị na-akpalite ime ihe ike, omume rụrụ arụ, ma ọ bụ nnupụisi emeela mkpebi dị njọ.—Abụ Ọma 97:10; Jọn 3:19-21; Ndị Galetia 5:19-23; Ndị Efesọs 5:3-5.

Mgbe ụfọdụ, mkpebi abụọ pụrụ izicha ezi. Ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu bụ ihe ùgwù magburu onwe ya, ọ pụkwara iweta ngọzi dị ukwuu. Ma ọ bụrụ na mmadụ, n’ihi ihe ụfọdụ, ekpebie na ya agaghị eme otú ahụ, ọ ka pụrụ ịrụ ọrụ ọma n’ọgbakọ dị n’obodo ya. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ inwe mkpebi nke ga-enye anyị ohere igosipụta otú nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova miruru emi ma ọ bụ ihe kasị dị anyị mkpa ná ndụ, ime. N’ụzọ dị otú a, Jehova na-ekwe ka anyị jiri nnwere onwe anyị ime nhọrọ mee ihe iji gosi ihe bụ́ ọnọdụ obi anyị n’ezie.

Ugboro ugboro, mkpebi anyị na-emetụta ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst narị afọ mbụ ṅụrịrị ọṅụ n’ihi inwere onwe ha pụọ n’ọtụtụ n’ime ihe mgbochi nke Iwu ahụ. Dị ka ihe atụ, nke a pụtara na ha pụrụ ịnakwere ma ọ bụ ịjụ nri ndị Iwu ahụ sị na ha adịghị ọcha. N’agbanyeghị nke ahụ, a gbara ha ume ịtụle akọ na uche nke ndị ọzọ mgbe ha na-ekpebi ma ha ga-eji nnwere onwe a mee ihe. Ihe Pọl kwuru n’okwu ahụ pụrụ ịba uru n’ọtụtụ n’ime mkpebi ndị anyị na-eme: ‘Unu aghọla ndị na-eme ka mmadụ sụọ ngọngọ.’ (1 Ndị Kọrint 10:32) Ọchịchọ nke ịghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ pụrụ inyere anyị aka ịmara ọtụtụ n’ime mkpebi ndị anyị ga-eme. E kwuwerị, ịhụ onye agbata obi n’anya bụ iwu nke abụọ kasịnụ.—Matiu 22:36, 39.

Ihe Na-esi ná Mkpebi Anyị Apụta

Mkpebi ndị e ji ezi akọ na uche mee na ndị dabeere n’ụkpụrụ Bible ga na-arụpụtakarị ihe dị mma n’ikpeazụ. N’ezie, ruo nwa oge ka e mesịrị ha, ha pụrụ ime ka a chụọ ihe onwe onye ụfọdụ n’àjà. Mgbe ndị ozi gwara Sanhedrin banyere mkpebi ha ịnọgide na-ekwusa banyere Jisọs, a pịara ha ụtarị tupu a tọhapụ ha. (Ọrụ 5:40) Mgbe ndị Hibru atọ ahụ—Shedrak, Mishak, na Abed-nego—kpebiri na ha agaghị akpọ isiala nye ihe oyiyi ọlaedo nke Nebukadneza, ha tinyere ndụ ha n’ihe ize ndụ. Ha dị njikere ịnakwere eziokwu ahụ bụ́ na mkpebi ha pụrụ ịkpatara ha ọnwụ. Ma ha maara na ha ga-enweta nnwapụta na ngọzi Chineke.—Daniel 3:16-19.

Ọ bụrụ na anyị enweta ihe isi ike mgbe anyị jisịrị akọ na uche mee mkpebi, nke ahụ abụghị ihe mere anyị ga-eji were ya na mkpebi ahụ ezighị ezi. “Mgbe na ihe ndapụta” pụrụ, n’ụzọ dị njọ, imetụta ihe ga-esi ọbụna ná mkpebi ndị e ji ebumnobi kasị mma mee. (Eklisiastis 9:11) Ọzọkwa, Jehova na-ekwe mgbe ụfọdụ ka nsogbu nwalee ókè nraranye anyị miruru emi. Jekọb aghaghị ịgbaso mmụọ ozi mgba abalị dum tupu ya anata ngọzi. (Jenesis 32:24-26) Ọ pụrụ ịbụ na anyị onwe anyị aghaghị ịgbaso nsogbu mgba, ọbụna mgbe anyị na-eme ihe ziri ezi. Ma, mgbe mkpebi anyị kwekọrọ n’uche Chineke, anyị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enyere anyị aka ịtachi obi nakwa na ọ ga-agọzi anyị n’ikpeazụ.—2 Ndị Kọrint 4:7.

N’ihi ya, mgbe ị na-eme mkpebi dị mkpa, adaberela n’amamihe nke aka gị. Chọọ ụkpụrụ Bible ndị metụtara ya. Gwa Jehova banyere ya. N’ebe o kwere mee, gakwuru ndị Kraịst ibe gị tozuru okè. Mgbe ahụ, nwee obi ike. Jiri nnwere onwe ime nhọrọ Chineke nyere gị mee ihe n’ụzọ dị mma. Mee mkpebi dị mma ma gosi Jehova na obi gị ziri ezi n’ebe ọ nọ.

[Foto dị na peeji nke 28]

Tụlee Okwu Chineke tupu ị na-eme mkpebi ndị dị mkpa

[Foto ndị dị na peeji nke 28, 29]

Gwa Jehova banyere mkpebi ndị ị na-aghaghị ime

[Foto dị na peeji nke 30]

Ị pụrụ iso ndị Kraịst tozuru okè kwurịta banyere mkpebi gị ndị bụ́ isi