Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ngọzi Jehova Ọ̀ Ga-eru Gị Ahụ?

Ngọzi Jehova Ọ̀ Ga-eru Gị Ahụ?

Ngọzi Jehova Ọ̀ Ga-eru Gị Ahụ?

“Ngọzi ndị a nile ga-abịakwasịkwa gị, wee ruo gị ahụ, [n’ihi na ị na-anọgide na-ege, NW] ntị olu Jehova, bụ́ Chineke gị.”—DEUTERỌNỌMI 28:2.

1. Gịnị gaje ikpebi ma ụmụ Israel ha ga-enweta ngọzi ma ọ bụ nkọcha?

KA NJEM ụmụ Israel ji ụkwụ gaa afọ 40 n’ọzara na-eru ọgwụgwụ ya, ha mara ụlọikwuu ha n’Ọzara Moab. Ala Nkwa ahụ dị ha n’ihu. Mgbe ahụ, Mosis dere akwụkwọ Deuterọnọmi, bụ́ nke na-agụnye ndepụta dị iche iche nke ngọzi na nkọcha, ma ọ bụ ọbụbụ ọnụ. Ọ bụrụ na ndị Israel ‘ga-anọgide na-ege ntị olu Jehova’ site n’irubere ya isi, ngọzi ‘ga-eru ha ahụ.’ Jehova hụrụ ha n’anya dị ka “ndị nke aka Ya” ma chọọ igosipụta ike ya maka ọdịmma ha. Ma, ọ bụrụ na ha anọgideghị na-ege ntị n’olu ya, nkọcha ga-erurịrị ha ahụ n’otu aka ahụ.—Deuterọnọmi 8:10-14; 26:18; 28:2, 15.

2. Gịnị ka ngwaa Hibru ndị a sụgharịrị ịbụ “na-anọgide na-ege ntị” na ‘iru ahụ’ na Deuterọnọmi 28:2 pụtara?

2 Ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ “na-anọgide na-ege ntị” na Deuterọnọmi 28:2 na-egosi ihe a na-eme n’esepụghị aka. Ndị Jehova agatụghị na-ege ya ntị nanị mgbe ohere dapụtaara ha; ha aghaghị ịnọgide na-ege ya ntị mgbe nile. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ngọzi Chineke ga-eru ha ahụ. E gosipụtawo ngwaa Hibru a sụgharịrị ịbụ ‘iru ahụ’ dị ka okwu e ji eme ihe n’ịchụ nta bụ́ nke na-apụtakarị “ijide” ma ọ bụ “irute.”

3. Ànyị pụrụ isi aṅaa dị ka Joshua, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji dị oké mkpa?

3 Onye ndú Israel bụ́ Joshua họọrọ ige Jehova ntị, n’ihi ya kwa, o nwetara ngọzi. Joshua kwuru, sị: “Họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe ofufe; . . . ma mụ onwe m na ụlọ m, anyị ga-efe Jehova ofufe.” Mgbe o kwuru nke ahụ, ndị ahụ zaghachiri, sị: “Ya bụrụ anyị ihe arụ ịhapụ Jehova, ife chi ọzọ ofufe.” (Joshua 24:15, 16) N’ihi àgwà ọma Joshua nwere, o so n’ime mmadụ ole na ole n’ọgbọ ya bụ́ ndị nwetara ihe ùgwù nke ịba n’Ala Nkwa ahụ. Taa, anyị guzo n’ọnụ ọnụ Ala Nkwa nke ka nnọọ ukwuu—ụwa paradaịs nke ngọzi ndị bara nnọọ ụba karịa ndị e nwere n’oge Joshua ga-adị na ya na-echere ndị nile nwere nnwapụta Chineke. Ngọzi ndị dị otú ahụ hà ga-eru gị ahụ? Ha ga-eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ị nọgide na-ege Jehova ntị. Iji mee ka mkpebi i mere ime otú ahụ sikwuo ike, tụlee akụkọ ihe mere eme nke mba Israel oge ochie n’ozuzu ya nakwa ihe atụ ndị na-ezi ihe bụ́ ndị metụtara mmadụ ụfọdụ.—Ndị Rom 15:4.

Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Nkọcha?

4. N’ịza ekpere Solomọn, gịnị ka Chineke nyere ya, oleekwa mmetụta anyị kwesịrị inwe banyere ngọzi ndị dị otú ahụ?

4 N’ihe ka ọtụtụ n’oge Eze Solomọn chịrị, ụmụ Israel nwetara ngọzi dị ukwuu site n’aka Jehova. Ha nwetara nchebe na ezi ihe n’ụba. (1 Ndị Eze 4:25) Akụ̀ na ụba Solomọn wuru ewu, n’agbanyeghị na ọ rịọghị Chineke maka akụ̀ na ụba. Kama nke ahụ, mgbe ọ ka bụ onye na-eto eto nke na-enwebeghị ahụmahụ, ọ rịọrọ maka obi na-anụ ihe—arịrịọ Jehova mezuru site n’iji amamihe na nghọta gọzie ya. Nke a nyeere Solomọn aka ikpe ndị ahụ ikpe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na-amata ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụ ezie na Chineke nyere ya akụ̀ na ụba na ebube, dị ka nwa okorobịa, Solomọn ji oké uru akụ̀ ime mmụọ bara kpọrọ ihe nke ukwuu. (1 Ndị Eze 3:9-13) Ma ànyị bara ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe ma anyị abaghị, lee ekele anyị pụrụ inwe ma ọ bụrụ na anyị nwere ngọzi Jehova ma baa ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ!

5. Gịnị mere mgbe ndị Israel na Juda jụrụ ịnọgide na-ege Jehova ntị?

5 Ụmụ Israel egosipụtaghị ekele maka ngọzi Jehova. Ebe ọ bụ na ha anọgideghị na-ege ya ntị, nkọcha ahụ e buru n’amụma ruru ha ahụ. Nke a dugara ná ndị iro ha imeri ha nakwa n’ịdọrọ ndị bi n’Israel na Juda n’agha. (Deuterọnọmi 28:36; 2 Ndị Eze 17:22, 23; 2 Ihe E Mere 36:17-20) Ndị Chineke hà si n’ahụhụ dị otú ahụ ha tara mụta na ọ bụ nanị ndị nọgidere na-ege Jehova ntị ka ngọzi ya na-eru ahụ? Ihe fọdụrụ ná ndị Juu bụ́ ndị lọtara n’ala nna ha na 537 T.O.A. nwere ohere nke igosipụta ma hà enwetawo “obi amamihe” ma hụzie mkpa ọ dị ịnọgide na-ege Chineke ntị.—Abụ Ọma 90:12.

6. (a) Gịnị mere Jehova ji zipụ Hagaị na Zekaraịa iburu ndị ya amụma? (b) Ụkpụrụ dị aṅaa ka ozi Chineke ziri site n’ọnụ Hagaị mere ka o doo anya?

6 Ndị Juu ahụ si ala ọzọ lọta wuru ebe ịchụàjà ma malite ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Ma mgbe mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ malitere, ịnụ ọkụ n’obi ha malitere ịjụ oyi, ha kwụsịkwara iwu ihe owuwu ahụ. (Ezra 3:1-3, 10; 4:1-4, 23, 24) Ha malitekwara ibute ihe ndị na-eme ka ndụ dị ntụsara ahụ ụzọ. N’ihi ya, Chineke zipụrụ ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa ime ka ndị ya maliteghachi ịnụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe. Jehova kwuru site n’ọnụ Hagaị, sị: “Ọ̀ bụ oge unu nwere, unu onwe unu, ibi n’ụlọ unu a machitere osisi, mgbe ụlọ [ofufe] a bụ mkpọmkpọ ebe? . . . Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu. Unu aghawo ọtụtụ mkpụrụ, ma nke nta ka unu webatara; unu na-eri ihe, ma ọ dịghị afọ juworo unu; . . . ọzọ, onye na-arụta ụgwọ ọrụ na-arụta ụgwọ ọrụ itinye n’akpa puru epu.” (Hagaị 1:4-6) Ịchụ ihe ime mmụọ n’àjà iji chụta ihe onwunwe adịghị eweta ngọzi Jehova.—Luk 12:15-21.

7. Gịnị mere Jehova ji gwa ndị Juu, sị: “Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu”?

7 N’ịbụ ndị nchegbu a na-enwe kwa ụbọchị rikpuru, ndị Juu chefuru na ngọzi Chineke n’ụdị nke mmiri na oge iwe ihe ubi ga-eru ha ahụ nanị ma ọ bụrụ na ha atachie obi n’ụzọ nke nrubeisi nye Chineke, ọbụna mgbe a na-emegide ha. (Hagaị 1:9-11) Ya mere, lee ka agbamume a si daba adaba: “Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu”! (Hagaị 1:7) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Jehova na-agwa ha, sị: ‘Cheenụ echiche! Hụnụ njikọ dị n’etiti ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ n’efu n’ọrụ ubi na ntọgbọrọ ụlọ ofufe m tọgbọọrọ n’efu.’ Okwu sitere n’ike mmụọ nsọ nke ndị amụma Jehova kwuru mesịrị ruo n’obi ndị nụrụ ya, n’ihi na ndị ahụ maliteghachiri ọrụ n’ụlọ nsọ ahụ, rụchaa ya na 515 T.O.A.

8. Agbamume dị aṅaa ka Jehova nyere ndị Juu n’oge Malakaị, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

8 Mgbe e mesịrị, n’oge Malakaị onye amụma, ndị Juu maliteghachiri inwe obi abụọ n’ụzọ ime mmụọ, ọbụna na-achụrụ Chineke àjà ọ na-adịghị anakwere. (Malakaị 1:6-8) N’ihi ya, Jehova gbara ha ume iwebata n’ụlọ akụ̀ ya otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ha rụtara na ịnwa ya ma hụ ma ọ́ gaghị emeghere ha windo nile nke eluigwe ma wụsara ha ngọzi n’ezie ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya. (Malakaị 3:10) Lee ka ndị Juu si bụrụ ndị nzuzu ịdọgbu onwe ha n’ọrụ maka kpọmkwem ihe ndị ahụ Chineke ga-enye ha n’ụba ma ọ bụrụ nnọọ na ha anọgide na-ege ntị n’olu ya!—2 Ihe E Mere 31:10.

9. Mmadụ atọ dị aṅaa e dere banyere ha n’ime Bible ka anyị ga-atụle ndụ ha?

9 Tụkwasị n’idekọ akụkọ ihe mere eme nke mba Israel, Bible dekọrọ ihe banyere ndụ ọtụtụ mmadụ bụ́ ndị nwetara ngọzi Chineke ma ọ bụ nkọcha, na-adabere ma hà nọgidere na-ege Jehova ntị ma ọ bụ ghara ime otú ahụ. Ka anyị hụ ihe anyị pụrụ ịmụta site n’aka mmadụ atọ n’ime ha—Boaz, Nebal, na Hana. Na nke a, ọ pụrụ ịmasị gị ịgụ akwụkwọ Rut nakwa 1 Samuel 1:1–​2:21 na 1 Samuel 25:2-42.

Boaz Gere Chineke Ntị

10. Gịnị ka Boaz na Nebal nwekọrọ ọnụ?

10 Ọ bụ ezie na Boaz na Nebal ebighị ndụ n’otu oge, ọ dị ihe ndị ha nwekọrọ ọnụ. Dị ka ihe atụ, ha abụọ biri n’ala Juda. Ha bụ aka ji akụ̀ nwere ala, ha abụọ nwekwara ohere pụrụ iche iji gosipụta ebere ịhụnanya n’ebe onye nọ ná mkpa nọ. Ma ọ bụ nanị n’ebe ahụ ka ha yirịtara.

11. Olee otú Boaz si gosi na ọ nọgidere na-ege Jehova ntị?

11 Boaz biri ndụ n’oge e nwere ndị ikpe n’Israel. O ji nkwanye ùgwù mesoo ndị ọzọ ihe, ndị na-ewere ya ihe ubi sọpụkwaara ya nke ukwuu. (Rut 2:4) N’irube isi n’Iwu ahụ, Boaz jidere n’aka na a hapụụrụ ndị e wedara n’ala na ndị ogbenye ihe fọdụrụ n’ubi ya ka ha were. (Levitikọs 19:9, 10) Gịnị ka Boaz mere mgbe ọ matara banyere Rut na Naomi ma hụ uchu Rut dị n’igbo mkpa nne di ya n’ụzọ ihe onwunwe? O chebaara Rut echiche n’ụzọ pụrụ iche ma nye ndị ikom ya iwu ikwe ka o were ihe fọdụrụ n’ubi ya. Site n’okwu ya na omume ịhụnanya ya, Boaz gosipụtara na ya bụ nwoke ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nke na-ege Jehova ntị. N’ihi ya, o nwetara ihu ọma na ngọzi Chineke.—Levitikọs 19:18; Rut 2:5-16.

12, 13. (a) Olee otú Boaz si gosipụta na ya ji iwu Jehova banyere nzụtaghachi kpọrọ ihe nke ukwuu? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa sitere n’aka Chineke ruru Boaz ahụ?

12 Ihe àmà kasị pụta ìhè nke na-egosi na Boaz nọgidere na-ege Jehova ntị bụ ụzọ achọghị ọdịmma onwe ya nanị o ji mee ihe banyere iwu Chineke banyere nzụtaghachi. Boaz mere ihe nile ọ pụrụ ime iji jide n’aka na ihe nketa nke onye ikwu ya—di Naomi nwụrụ anwụ, bụ́ Elimelek—ga-anọgide n’ezinụlọ Elimelek. Site ‘n’ọrụ kwesịrị nwanne di,’ nwanyị di ya nwụrụ ga-alụ onye ya na di ya nwụrụ anwụ kasị bụrụ nwanne, ka nwa nwoke ha ga-amụta buru aha di ya gaa n’ihu. (Deuterọnọmi 25:5-10; Levitikọs 25:47-49) Rut wepụtara onwe ya ka a lụọ ya n’ọnọdụ Naomi, bụ́ onye gaferela afọ ndụ ịmụ nwa. Mgbe onye ya na Elimelek ka bụrụ nwanne jụrụ inyere Naomi aka, Boaz kpọọrọ Rut ịbụ nwunye ya. E weere nwa ha nwoke bụ́ Obed dị ka nwa Naomi na onye o ruuru iketa ihe Elimelek nwere.—Rut 2:19, 20; 4:1, 6, 9, 13-16.

13 Ngọzi bara ụba ruru Boaz ahụ n’ihi na o ji achọghị ọdịmma onwe ya nanị mee ihe kwekọrọ n’iwu Chineke. Site n’ọkpara ha bụ́ Obed, e ji ihe ùgwù nke ịghọ nne na nna ochie Jisọs Kraịst, gọzie ya na Rut. (Rut 2:12; 4:13, 21, 22; Matiu 1:1, 5, 6) Site n’ihe Boaz ji achọghị ọdịmma onwe ya nanị mee, anyị na-amụta na ngọzi na-eru ndị na-egosi ndị ọzọ ịhụnanya ma na-eme ihe kwekọrọ n’ihe Chineke na-achọ, ahụ.

Nebal Egeghị Ntị

14. Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Nebal bụ?

14 N’ụzọ dị iche n’ebe Boaz nọ, Nebal egeghị Jehova ntị. O mebiri iwu Chineke, bụ́: “Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.” (Levitikọs 19:18) Nebal abụghị onye ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe; o “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” Ọbụna ndị ikom ya lere ya anya dị ka “nwoke jọgburu onwe ya.” N’ụzọ dabara adaba, aha ya, bụ́ Nebal, pụtara “iberibe,” ma ọ bụ “nzuzu.” (1 Samuel 25:3, 17, 25) Ya mere, olee otú Nebal ga-esi meghachi omume mgbe o nwetara ohere nke igosi onye nọ ná mkpa—Devid, bụ́ onye Jehova tere mmanụ—obiọma?—1 Samuel 16:13.

15. Olee otú Nebal si mesoo Devid ihe, oleekwa otú Abigail si dị iche n’ebe di ya nọ n’akụkụ a?

15 Mgbe Devid na ndị ikom ya nọ nso n’ebe ìgwè atụrụ Nebal dị, n’ekwughị ka a kwụọ ha ụgwọ, ha chebere ha pụọ n’aka ndị mwakpo. “Ha bụụrụ anyị mgbidi ma abalị ma ehihie,” ka otu n’ime ndị na-azụrụ Nebal atụrụ kwuru. Otú ọ dị, mgbe ndị ozi Devid rịọrọ Nebal ihe oriri, ọ ‘makwasịrị ha’ ma zilaga ha n’enyeghị ha ihe ọ bụla. (1 Samuel 25:2-16) Nwunye Nebal, bụ́ Abigail, wegaara Devid ihe ngwa ngwa. N’ịbụ onye oké iwe ji, Devid nọ na-aga igbuchapụ Nebal na ndị ya. N’ụzọ dị otú a, ụzọ Abigail butere n’ime ihe zọpụtara ndụ ọtụtụ mmadụ ma gbochie Devid ịbụ onye ikpe ọbara mara. Ma anyaukwu na aka ike Nebal agafeela ókè. Ihe dị ka ụbọchị iri mgbe nke a gasịrị, “Jehova tigburu Nebal, o wee nwụọ.”—1 Samuel 25:18-38.

16. Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Boaz ma jụ ụzọ Nebal?

16 Lee ọdịiche e nwere n’etiti Boaz na Nebal! Ọ bụ ezie na anyị kwesịrị ịjụ omume aka ike na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke Nebal, ka anyị ṅomie obiọma na achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke Boaz. (Ndị Hibru 13:16) Anyị pụrụ ime nke ahụ site n’itinye ndụmọdụ Pọl onyeozi n’ọrụ: “Otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Taa, “atụrụ ọzọ” nke Jisọs, bụ́ ndị Kraịst nwere olileanya ibi n’ụwa, nwere ihe ùgwù nke imere ndị Jehova e tere mmanụ, ihe fọdụrụ n’ime 144,000, bụ́ ndị a ga-enye ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, ihe ọma. (Jọn 10:16; 1 Ndị Kọrint 15:50-53; Mkpughe 14:1, 4) Jisọs na-ewere ya ka a ga-asị na ọ bụ ya onwe ya ka a rụụrụ ọrụ ịhụnanya dị otú ahụ, ime ihe ọma ndị a na-emekwa ka e nweta ngọzi bara ụba nke Jehova.—Matiu 25:34-40; 1 Jọn 3:18.

Ọnwụnwa na Ngọzi Hana

17. Ọnwụnwa dị aṅaa ka Hana nwetara, àgwà dịkwa aṅaa ka o gosipụtara?

17 Ngọzi Jehova rukwara nwanyị ahụ na-asọpụrụ Chineke bụ́ Hana ahụ. Ya na di ya bụ́ Elkena, onye Livaị, biri n’ugwu Efraim. Dị ka Iwu ahụ nyere ohere ya ma kwuo, o nwere nwunye ọzọ—Penina. Hana nọgidere bụrụ nwanyị aga, ihe nkọcha nye nwanyị Israel, ebe Penina mụrụ ọtụtụ ụmụ. (1 Samuel 1:1-3; 1 Ihe E Mere 6:16, 33, 34) Otú ọ dị, kama ịkasi Hana obi, Penina mere ihe n’ụzọ ịhụnanya na-adịghị na ya bụ́ nke were Hana iwe ruo n’ókè nke anya mmiri ịgba ya na nri ịgbụ ya. Nke ka njọ bụ na nke a nọgidere na-eme “kwa afọ,” oge ọ bụla ezinụlọ ahụ gara n’ụlọ Jehova dị na Shaịlo. (1 Samuel 1:4-8) Lee ka Penina si nwee obi ịta mmiri, leekwa ọnwụnwa nke a bụụrụ Hana! N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe Hana tara Jehova ụta; ọ dịghịkwa anọ n’ụlọ ma di ya gaa Shaịlo. Ya mere, n’ikpeazụ, ngọzi bara ụba ruru ya ahụ.

18. Ihe nlereanya dị aṅaa ka Hana setịpụrụ?

18 Hana setịpụụrụ ndị Jehova taa ezi ihe nlereanya, karịsịa ndị okwu ọjọọ ndị ọzọ gwara ha pụrụ ịkpasuwo iwe. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ịnọpụ iche anaghị enye aka. (Ilu 18:1) Hana ekweghị ka ọnwụnwa ya mee ka ọchịchọ ya ịnọ ebe a na-akụzi Okwu Chineke na ebe ndị ya na-agbakọta maka ofufe, belata. N’ihi ya, ọ nọgidere na-agbasi ike n’ụzọ ime mmụọ. E kpughere otú o jiruru ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ọmarịcha ekpere ya e dekọrọ na 1 Samuel 2:1-10. *

19. Olee otú anyị pụrụ isi na-egosipụta ekele anyị nwere maka ihe ime mmụọ?

19 Dị ka ndị ohu Jehova n’oge a, anyị adịghị efe ofufe n’ụlọikwuu. Otú o sina dị, anyị pụrụ igosipụta ekele anyị na-enwe maka ihe ime mmụọ, ọbụna dị ka Hana mere. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ igosipụta ekele miri emi anyị na-enwe maka akụ̀ ime mmụọ site n’ịdị na-agachi nzukọ ndị Kraịst na mgbakọ dị iche iche anya. Ka anyị jiri ohere ndị a na-agbarịta ibe anyị ume n’ezi ofufe nke Jehova, bụ́ onye nyeworo anyị “ihe ùgwù nke ijere ya ozi dị nsọ n’atụghị egwu, n’iguzosi ike n’ihe na ezi omume.”—Luk 1:74, 75, NW; Ndị Hibru 10:24, 25.

20, 21. Olee otú e si kwụghachi Hana ụgwọ maka nsọpụrụ Chineke ya?

20 Jehova rịbara nsọpụrụ Hana nwere n’ebe ọ nọ ama ma kwụghachi ya ụgwọ n’ụba. N’otu n’ime njem ha gara kwa afọ na Shaịlo, Hana anya mmiri juru anya ji ezi obi kpekuo Chineke ekpere ma kwe nkwa, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha, ọ bụrụ na I lekwasị anya n’ezie ná mweda n’ala nke ohu Gị nwanyị, ọ bụrụ na I cheta m, ghara ichezọ ohu Gị nwanyị, wee nye ohu Gị nwanyị nwa nwoke, m ga-enyekwa ya Jehova ụbọchị ndụ ya nile.” (1 Samuel 1:9-11) Chineke nụrụ arịrịọ Hana ma jiri nwa nwoke a gụrụ Samuel gọzie ya. Mgbe ọ napụrụ ya ara, ọ kpọgara ya Shaịlo ka o wee nwee ike ije ozi n’ụlọikwuu ahụ.—1 Samuel 1:20, 24-28.

21 Hana gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ ma mezuo nkwa o kwere ya banyere Samuel. Cheekwa banyere ngọzi bara ụba ya na Elkena nwetara n’ihi na nwa ha ha hụrụ n’anya jere ozi n’ụlọikwuu Jehova! Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-enwe ọṅụ na ngọzi yiri nke ahụ n’ihi na ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị na-eje ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile, ndị òtù ezinụlọ Betel, ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ na-ewetara Jehova nsọpụrụ.

Nọgide Na-ege Jehova Ntị!

22, 23. (a) Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ege ntị n’olu Jehova? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

22 Gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ege Jehova ntị? Anyị ga-aba ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri mkpụrụ obi anyị dum hụ Chineke n’anya ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye ya. Ọbụna mgbe ịgbaso ụzọ dị otú ahụ pụtara na anyị aghaghị ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị tara akpụ, ngọzi Jehova ga-erurịrị anyị ahụ—mgbe mgbe n’ụzọ karịrị ihe anyị pụrụ ichetụ n’echiche.—Abụ Ọma 37:4; Ndị Hibru 6:10.

23 A ga-awụkwasị ndị Chineke ọtụtụ ngọzi n’ọdịnihu. N’ihi iji nrube isi na-ege Jehova ntị, a ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” gabiga “oké mkpagbu” ahụ, ha ga-enwetakwa ọṅụ nke ibi ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke. (Mkpughe 7:9-14; 2 Pita 3:13) N’ebe ahụ, Jehova ga-egbo, n’ụzọ zuru ezu, ọchịchọ ziri ezi nke ndị ya nile. (Abụ Ọma 145:16) Otú ọ dị, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi, ọbụna ugbu a, a na-eji ‘ezi onyinye na ihe zuru okè nke e nyere enye bụ́ nke si n’elu bịa’ na-agọzi ndị nọgidere na-ege ntị n’olu Jehova.—Jemes 1:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Ihe Hana kwuru yitụrụ ihe nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, bụ́ Meri, kwuru n’oge na-adịghị anya ọ matara na ya gaje ịghọ nne Mesaịa ahụ.—Luk 1:46-55.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka akụkọ ihe mere eme nke Israel pụrụ ịkụziri anyị banyere ngọzi Chineke?

• Olee otú Boaz si dị iche n’ebe Nebal nọ?

• Olee otú anyị pụrụ isi ṅomie Hana?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-ege ntị n’olu Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 10]

Eze Solomọn kpere ekpere maka obi na-anụ ihe, Jehova jikwa amamihe gọzie ya

[Foto dị na peeji nke 12]

Boaz ji nkwanye ùgwù na obiọma mesoo ndị ọzọ ihe

[Foto dị na peeji nke 15]

A gọziri Hana n’ụba maka ịdabere n’ebe Jehova nọ