Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe

Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe

Ị Pụrụ Inwe Ezi Okwukwe

Mgbe Sarah Jayne dị afọ 19, ọ matara na ya bu ọrịa cancer nke akụkụ ahụ na-emepụta àkwá. Mgbe a wasịrị ya ahụ, ahụ bịara dị ya mma, ọ bịakwara nwee nchekwube maka ọdịnihu. N’ezie, o nwere nnọọ nchekwube nke na mgbe ọ dị afọ 20, o kwere otu nwoke nkwa ọlụlụ ma malite ime atụmatụ maka agbamakwụkwọ ya. N’afọ ahụ kpọmkwem, ọrịa cancer ahụ lọghachiri, ọ matakwara na ndụ ya fọdụrụ nanị izu ole na ole. Sarah Jayne nwụrụ na June 2000, mgbe ọ fọrọ obere ihe ka o ruo afọ 21.

IHE kpaliri mmasị ndị letara Sarah Jayne mgbe o dina n’ihe ndina n’ụlọ ọgwụ bụ nchegbu ọ na-adịghị echegbu onwe ya maka ọdịnihu, tinyere okwukwe miri emi o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’Okwu ya, bụ́ Bible. N’agbanyeghị ajọ ọdachi ọ nọ na-eche ihu, o ji olileanya mbilite n’ọnwụ n’aka—na ọ ga-ahụ ndị enyi ya nile ọzọ. (Jọn 5:28, 29) “Aga m ahụ unu nile n’ụwa ọhụrụ Chineke,” ka o kwuru.

Ụfọdụ na-ewere okwukwe dị otú ahụ dị ka nkwenkwe ụgha. “Olee ihe ọzọ bụ ịdị ndụ mgbe a nwụsịrị ma ọ́ bụghị nkwenkwe ndị na-enweghị nchebe nwere,” ka Ludovic Kennedy na-ajụ, “na mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ, a ga-enwe ihe omume ndị pụrụ iche na opi a ga na-afụrụ ha, nakwa na ha na ndị buru ha ụzọ nwụọ na ndị ha ga-ebu ụzọ anwụ ga-anọ n’Iden osisi jupụtara na-ekpori ndụ?” Anyị aghaghị ịjụ ajụjụ iji gbaghaa okwu ahụ. Olee nke ezi uche ka dịrị na ya—ọ̀ bụ ikwere na “ọ bụ ndụ a nanị ka anyị nwere ịdị, n’ihi ya ọ kaara anyị mma inweta ihe nile anyị pụrụ inweta na ya,” dị ka Kennedy na-enye echiche ya, ka ọ̀ bụ ikwere na Chineke nakwa ná nkwa ya nke mbilite n’ọnwụ? Sarah Jayne họọrọ nke abụọ ahụ. Olee otú o si zụlite okwukwe dị otú ahụ?

“Chọọ Chineke . . . Wee Chọta Ya”

Iji zụlite okwukwe na ntụkwasị obi n’ebe mmadụ nọ, ọ dị gị mkpa ịmara ya na ịmata otú o si eche echiche ma na-eme omume. Nke a bụ ihe e ji obi na uche eme. N’ezie, ọ bụ otu ihe ahụ ma a bịa n’ịzụlite ezi okwukwe n’ebe Chineke nọ. Ọ dị gị mkpa ịmara ya, ịmara banyere àgwà ya na ụdị onye ọ bụ, ịchọpụta otú ọ bụruworo onye a pụrụ ịtụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere na ya n’ihe nile o kwuworo ma mee.—Abụ Ọma 9:10; 145:1-21.

Ụfọdụ na-eche na nke a agaghị ekwe omume. Ha na-ekwu na Chineke nọ n’ebe dị nnọọ anya, na ọ dị nnọọ omimi—ma ọ bụrụdịrịị na ọ dị adị n’ezie. “Ọ bụrụ na Chineke dị adị n’ezie dị ka o yiri ka ọ dị nye ndị Kraịst dị ka Sarah Jayne,” ka ndị na-arụ eziokwu ụka na-ajụ, “gịnị mere na ọ dịghị eme ka ndị fọdụrụ n’ime anyị mara ya?” Ma Chineke ọ̀ nọ n’ebe dị nnọọ anya ma bụrụ onye a na-apụghị ịchọta achọta n’ezie? N’okwu Pọl onyeozi gwara ndị ọkà ihe ọmụma na ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ n’Atens, o kwuru na “Chineke Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya” enyewokwa ihe nile dị mkpa iji “chọọ [ya] . . . wee chọta Ya.” N’ezie, Pọl kwuru, sị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.”—Ọrụ 17:24-27.

Oleezi otú ị pụrụ isi “chọọ Chineke . . . wee chọta Ya”? Ụfọdụ emeela nke ahụ nanị site n’ikiri eluigwe na ala nke gbara ha gburugburu. Nye ọtụtụ ndị, nke ahụ n’onwe ya na-agba akaebe zuru ezu iji mee ka ha kwenye na a ghaghị inwe Onye Okike. * (Abụ Ọma 19:1; Aịsaịa 40:26; Ọrụ 14:16, 17) Ha na-eche, dị ka Pọl onyeozi, na “ihe [Chineke] anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya.”—Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 104:24.

Bible Dị Gị Mkpa

Otú ọ dị, iji wulite ezi okwukwe n’ebe Onye Okike nọ, ihe ọzọ o wepụtaworo dị gị mkpa. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ Bible—Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee nke o jiri kpughee uche na nzube ya. (2 Timoti 3:16, 17) “Cheregodị,” ka ụfọdụ ga-asị, “ọ̀ pụrụ isi aṅaa kwe gị omume ikwere ihe nile Bible na-ekwu mgbe ị na-ahụ arụ ndị na-ekwu na ha na-agbaso Bible na-eme?” N’eziokwu, Krisendọm nwere ihe ndekọ na-awụ akpata oyi n’ahụ nke ime ihu abụọ, inwe obi ọjọọ, na ime omume rụrụ arụ. Ma onye ọ bụla nwere ezi uche pụrụ ịhụ na Krisendọm na-eme nanị ka a ga-asị na ọ na-agbaso ụkpụrụ Bible.—Matiu 15:8.

Bible n’onwe ya dọrọ aka ná ntị na ọtụtụ mmadụ ga-azọrọ na ha na-efe Chineke ma, n’ezie, ha ga “na-agọnahụ ọbụna Onyenwe ha Onye gbara ha.” “Ndị,” ka Pita onyeozi kwuru, “a ga-ekwulu ụzọ nke eziokwu n’ihi ha.” (2 Pita 2:1, 2) Jisọs Kraịst kwuru na ndị a bụ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu” bụ́ ndị a ga-amata nke ọma site n’omume ọjọọ ha. (Matiu 7:15-23) Ịjụ Okwu Chineke na-adabere n’ihe ndekọ nke omume Krisendọm dị ka ịtụfu akwụkwọ ozi si n’aka enyi ị tụkwasịrị obi nanị n’ihi na onye wetaara gị ya nwere aha ọjọọ.

E wezụga Okwu Chineke, ọ gaghị ekwe omume ịzụlite ezi okwukwe. Ọ bụ nanị na Bible ka Jehova na-egosi ebe ọ kwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ọ na-aza ajụjụ ndị a jụwara kemgbe ụwa, dị ka ihe mere o jiworo kwere ka nhụjuanya na ihe mgbu dịrị na ihe ọ ga-eme banyere ọnọdụ ahụ. (Abụ Ọma 119:105; Ndị Rom 15:4) Sarah Jayne bịara kwere na Bible bụ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; 2 Pita 1:19-21) N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụghị nanị n’ihi na ndị mụrụ ya gwara ya otú ahụ, kama n’ihi na o wepụtara oge iji jiri obi ọcha tụlee ihe àmà nile na-egosi na Bible bụ mkpughe pụrụ iche sitere n’aka Chineke. (Ndị Rom 12:2) Dị ka ihe atụ, ọ chọpụtara mmetụta dị ike Bible nwere ná ndụ ndị na-agbaso ụkpụrụ ya. Site n’iji mbipụta ndị dị ka The Bible—God’s Word or Man’s? * mee ihe, o jikwa nlezianya nyochaa ọtụtụ ihe àmà dị n’ime Bible bụ́ ndị na-egosi na e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee ya.

“Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta”

Otú ọ dị, nanị inwe Bible ma ọ bụ ọbụna ikwere na e ji ike mmụọ nsọ dee ya ezughị ezu. “Okwukwe,” ka Pọl onyeozi na-ede, “si n’ọnụnụ pụta.” (Ndị Rom 10:17) Ihe na-ewulite okwukwe bụ ịnụ ihe Bible na-ekwu, ọ bụghị nanị inwe Bible. Ị “na-anụ” ihe Chineke nwere ikwu site n’ịgụ na ịmụ Okwu ya. Ọbụna ụmụaka pụrụ ime nke a. Pọl na-ekwu na site “n’oge [Timoti] dị na nwa ọhụrụ,” nne ya na nne ya ochie kụziiri ya “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ.” Nke a ọ̀ na-enye echiche na e duhiere ya n’ụzọ ụfọdụ? Ee e! E jighị aghụghọ chịkwaa Timoti ma ọ bụ ghọgbuo ya n’ụzọ ọ bụla. E ‘mere ka o kwere’ ihe ọ nụrụ ma gụọ.—2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

E mere ka Sarah Jayne kwere n’otu ụzọ ahụ. Dị ka ndị Beria nke narị afọ mbụ, o “weere obi dị ọkụ nile nara okwu [sitere n’aka ndị mụrụ ya na ndị ozizi ndị ọzọ] nke ọma.” Mgbe ọ bụ nwata, obi abụọ adịghị ya na ọ tụkwasịrị nnọọ obi n’ihe ndị mụrụ ya gwara ya. Mgbe e mesịrị, ka o tolitere, ọ nakwereghị ihe nile a kụziiri ya n’ajụghị ase ma ọ bụ n’ụzọ imezu iwu. O ‘ji nlezianya nyochaa ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a dị otú a.’—Ọrụ 17:11.

Ị Pụrụ Ịzụlite Ezi Okwukwe

Gị onwe gị pụkwara ịzụlite ezi okwukwe—ụdị okwukwe ahụ Pọl onyeozi kọwara n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst. O kwuru na okwukwe dị otú ahụ bụ “atụmanya e ji n’aka nke ihe ndị a na-ele anya ha, ngosipụta pụtara ìhè nke ihe ndị bụ ezie n’agbanyeghị na a dịghị ahụ ha anya.” (Ndị Hibru 11:1, NW) Ọ bụrụ na i nwere okwukwe dị otú ahụ, ị ga-ejide nnọọ n’aka na olileanya na atụmanya gị nile, gụnyere nkwa mbilite n’ọnwụ Chineke kwere, ga-emezu. Ị ga-ekwenyesi ike na olileanya dị otú ahụ dabeere n’ihe e ji n’aka, ọ bụghị n’echiche efu. Ị ga-ama na ọ dịtụbeghị mgbe Jehova dara n’imezu nkwa ya. (Joshua 21:45; 23:14; Aịsaịa 55:10, 11; Ndị Hibru 6:18) Nkwa Chineke banyere ụwa ọhụrụ ga-abụ nnọọ ihe i ji n’aka dị ka a ga-asị na ọ bịalarị. (2 Pita 3:13) Ị ga-ejikwa anya nke okwukwe hụ nke ọma na Jehova Chineke, Jisọs Kraịst, na Alaeze Chineke dịcha adị, na ha abụghị nkwenkwe ụgha.

A dịghị ahapụ gị ka i jiri aka gị zụlite ezi okwukwe. E wezụga ime ka Okwu ya na-eru onye ọ bụla aka, Jehova ewepụtawokwa ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraịst bụ́ nke na-arụsi ọrụ ike n’inyere ndị obi ha ziri ezi aka ịzụlite okwukwe n’ebe Chineke nọ. (Jọn 17:20; Ndị Rom 10:14, 15) Nakwere enyemaka nile Jehova na-enye site ná nzukọ ahụ. (Ọrụ 8:30, 31) Ebe okwukwe bụkwa mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, na-ekpe ekpere n’esepụghị aka ka mmụọ ahụ nyere gị aka ịzụlite ezi okwukwe.—Ndị Galetia 5:22.

Ekwela ka ndị na-arụ eziokwu ụka bụ́ ndị na-akwa onye ọ bụla nke na-asị na ya nwere okwukwe na Chineke na n’Okwu ya, emo kụdaa gị mmụọ. (1 Ndị Kọrint 1:18-21; 2 Pita 3:3, 4) N’ezie, inwe ezi okwukwe bara oké uru n’ime ka mkpebi gị iguzogide mwakpo ndị dị otú ahụ sikwuo ike. (Ndị Efesọs 6:16) Sarah Jayne chọpụtara na nke ahụ bụ eziokwu, ọ gbakwara ndị bịara leta ya n’ụlọ ọgwụ ume mgbe nile ịzụlite okwukwe nke ha. “Mee ka eziokwu ahụ bụrụ nke gị,” ka ọ na-asị. “Na-amụ Okwu Chineke. Nọrọ nzukọ Chineke nso. Na-ekpe ekpere n’esepụghị aka. Na-arụsị ọrụ ike n’ozi Jehova.”—Jemes 2:17, 26.

Mgbe otu n’ime ndị nọọsụ ya hụrụ okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ nakwa ná mbilite n’ọnwụ, o kwuru, sị: “Ahụla m na i kweere ihe a n’ezie.” Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji nwee nchekwube dị otú ahụ n’agbanyeghị ọnwụnwa ya, ọ zara, sị: “Ọ bụ inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ bụ ezigbo enyi m, ahụkwara m ya n’anya nke ukwuu.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Lee akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

^ par. 12 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 6]

‘Site n’oge Timoti bụ nwa ọhụrụ,’ nne ya na nne ya ochie kụziiri ya “ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ”

[Foto dị na peeji nke 6]

A jara ndị Beria mma maka inyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site na “Photo-Drama of Creation,” 1914

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe na-ewulite okwukwe bụ ịnụ ihe Bible na-ekwu na ime ya, ọ bụghị nanị inwe ya

[Foto dị na peeji nke 7]

“Aga m ahụ unu nile n’ụwa ọhụrụ Chineke”