Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị bụ ‘izu ike’ ahụ e zoro aka na ya ná Ndị Hibru 4:9-11, oleekwa otú mmadụ si ‘aba n’izu ike ahụ’?

Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru na narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke. N’ihi na onye bataworo n’izu ike ya, ya onwe ya ezuwokwa ike n’ọrụ ya nile, dị ka Chineke zuru ike n’ọrụ nke aka Ya. Ya mere ka anyị na-anụ ọkụ n’obi ịba n’izu ike ahụ.”—Ndị Hibru 4:9-11.

Mgbe Pọl kwuru banyere Chineke izu ike n’ọrụ Ya, o doro anya na ọ na-ezo aka n’ihe e kwuru na Jenesis 2:2, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Chineke wee jesịa ozi Ya n’ụbọchị nke asaa, bụ́ nke O jere; O wee [gaa n’ihu izu ike, NW] n’ụbọchị nke asaa ahụ n’ozi Ya nile nke O jere.” Gịnị mere Jehova ji gaa n’ihu “izu ike n’ụbọchị nke asaa ahụ”? N’ezie ọ bụghị n’ihi na ike gwụrụ ya “n’ozi Ya nile nke O jere.” Amaokwu na-esonụ tụpenyere anyị azụ, sị: “Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ahụ, dookwa ya nsọ: n’ihi na ọ bụ n’ime ya ka Ọ kwụsịrị n’ozi Ya nile nke Chineke kererịị eke n’ije ya.”—Jenesis 2:3; Aịsaịa 40:26, 28.

‘Ụbọchị nke asaa’ ahụ dị iche na nke ọ bụla n’ime ụbọchị isii ndị bu ya ụzọ n’echiche bụ́ na ọ bụ ụbọchị Chineke gọziri ma doo nsọ, ya bụ, ọ bụ ụbọchị o wepụtara iche, ma ọ bụ nke ọ raara nye, maka nzube pụrụ iche. Gịnị bụ nzube ahụ? Tupu mgbe ahụ, Chineke ekpughewo nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ nakwa ụwa. Chineke gwara nwoke mbụ ahụ na nwunye ya, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) Ọ bụ ezie na Chineke nyere ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa izu okè ná mmalite, ọ ga-ewe oge iji budaa ụwa nile n’okpuru mmadụ ma gbanwee ya ịghọ paradaịs nke ezinụlọ mmadụ zuru okè ga-ebijupụta, dị ka Chineke zubeworo. N’ihi ya, “n’ụbọchị nke asaa” ahụ, Chineke zuru ike, ma ọ bụ kwụsị, n’ike ihe okike ọzọ n’ụwa iji kwe ka ihe ndị o kerelarịị eke gaa nke ọma n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya. N’ọgwụgwụ nke “ụbọchị” ahụ, ihe nile Chineke zubere ga-emezuwo. Ogologo oge hà aṅaa ka izu ike ahụ ga-ewe?

N’ịlaghachi azụ n’ihe Pọl kwuru ná Ndị Hibru, anyị na-arịba ama na o mere ka ọ pụta ìhè na “idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke,” ọ gbakwara ndị Kraịst ibe ya ume ịnụ ọkụ n’obi “ịba n’izu ike ahụ.” Nke a na-egosi na mgbe Pọl dere okwu ndị ahụ, ‘ụbọchị nke asaa ahụ’ Chineke ji na-ezu ike, bụ́ nke maliterela ihe dị ka afọ 4,000 tupu mgbe ahụ, ka nọ na-aga n’ihu. Ọ gaghị agwụ ruo mgbe nzube Chineke banyere ihe a kpọrọ mmadụ na ụwa ga-emezucha n’ọgwụgwụ Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst, bụ́ “Onye nwe ụbọchị izu ike.”—Matiu 12:8; Mkpughe 20:1-6; 21:1-4.

N’iburu atụmanya ahụ dị ebube n’uche, Pọl kọwara otú mmadụ pụrụ isi banye n’izu ike nke Chineke. O dere, sị: “Onye bataworo n’izu ike ya, ya onwe ya ezuwokwa ike n’ọrụ ya nile.” Nke a na-agwa anyị na ọ bụ ezie na e zubere ná mmalite ka ha zuo okè, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu abanyebeghị n’izu ike Chineke. Nke a bụ n’ihi na Adam na Iv edebeghị izu ike Chineke “n’ụbọchị nke asaa ahụ” ruo ogologo oge site n’ịnakwere ndokwa o meere ha. Kama nke ahụ, ha nupụrụ isi ma chọọ inwere onwe ha pụọ n’aka Chineke. N’ezie, ha gbasoro atụmatụ Setan kama ịnakwere nduzi Chineke ji ịhụnanya nye ha. (Jenesis 2:15-17) N’ihi ya, atụmanya nke ibi n’ụwa paradaịs ruo mgbe ebighị ebi funahụrụ ha. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ihe nile a kpọrọ mmadụ ghọrọ ohu nke mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12, 14.

Nnupụisi nke ihe a kpọrọ mmadụ emeghị ka nzube Chineke kụọ afọ n’ala. Ụbọchị izu ike ya na-aga n’ihu. Otú ọ dị, Jehova ji ịhụnanya mee ndokwa—ihe mgbapụta—site n’aka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ka ndị nile ji okwukwe nakwere ya wee nwee ike ịtụ anya nnapụta na izu ike pụọ n’ibu nke mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 6:23) Ọ bụ ya mere Pọl ji gbaa ndị Kraịst ibe ya ume ‘izu ike n’ọrụ nke ha.’ Ọ dị ha mkpa ịnakwere ndokwa Chineke mere maka nzọpụta, ọ bụghị ịnwa iji aka ha kwuo ihe ọdịnihu ha ga-abụ, dị ka Adam na Iv meworo. Ọ dịkwa ha mkpa izere ịchụso ọrụ nke ime ka ihe omume ha yie nke ziri ezi.

Iwepụ aka ná nchụso ndị ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ ọchịchọ nke ụwa na-akpali, iji mee uche Chineke bụ n’ezie ihe na-enye ume ọhụrụ ma ọ bụ ahụ iru ala. Jisọs kpọrọ òkù a, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

Ihe Pọl kwuru banyere izu ike nke Chineke na otú mmadụ pụrụ isi banye na ya bụ ihe agbamume n’ezie nye ndị Kraịst ahụ bụ́ ndị Hibru nọ na Jerusalem, bụ́ ndị tachiworo obi n’oké mkpagbu na ịkwa emo n’ihi okwukwe ha. (Ọrụ 8:1; 12:1-5) N’ụzọ yiri nke ahụ, okwu Pọl pụrụ ịbụrụ ndị Kraịst taa ihe agbamume. N’ịghọta na mmezu nke nkwa Chineke iweta ụwa paradaịs n’okpuru Alaeze ezi omume ya dị nso, anyị onwe anyị kwesịkwara izu ike n’ọrụ nke anyị ma na-anụ ọkụ n’obi ịbanye n’izu ike ahụ.—Matiu 6:10, 33; 2 Pita 3:13.

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Chineke ga-emezu nkwa ya banyere ụwa paradaịs n’ọgwụgwụ nke ụbọchị izu ike ya