Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ezi Okwukwe—À Ka Pụrụ Inwe Ya?

Ezi Okwukwe—À Ka Pụrụ Inwe Ya?

Ezi Okwukwe—À Ka Pụrụ Inwe Ya?

“Okwukwe bụ inwe obi ike kwụ chịm, nke na-adịghị atụ egwu n’amara Chineke, nke e ji nnọọ n’aka nke na onye ahụ kweere ya ga-anwụrụ ya otu puku ugboro.”—MARTIN LUTHER, 1522.

“Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na anyị abụrụlarị ọha mmadụ na-agbakụta okpukpe azụ nke na ihe banyere okwukwe na ihe omume ndị Kraịst na-apụzi nnọọ n’anya.”—LUDOVIC KENNEDY, 1999.

ECHICHE ndị e nwere banyere okwukwe dịgasị nnọọ iche iche. N’oge gara aga, inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ bụ ihe zuru ebe nile. N’oge a, n’ụwa nke ịrụ eziokwu ụka na nhụjuanya jupụtara, ezi okwukwe n’ebe Chineke na Bible nọ ji ọsọ na-emi ala.

Ezi Okwukwe

Nye ọtụtụ ndị, “okwukwe” pụtara nanị inwe nkwenkwe okpukpe ma ọ bụ ịgbaso ụdị ụfọdụ nke ofufe. Otú ọ dị, dị ka Bible si jiri ya mee ihe, “okwukwe” pụtara n’ụzọ bụ́ isi ntụkwasị obi zuru ezu—inwe obi ike zuru ezu ma kwụrụ chịm n’ebe Chineke na nkwa ya nọ. Ọ bụ àgwà e ji amata onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.

N’otu oge, Jisọs Kraịst kwuru banyere mkpa ọ dị ikpe ekpere na “ịghara ikwe ka ike gwụ” anyị. N’ime nke ahụ, ọ jụrụ ma ezi okwukwe ọ̀ ga-adị ma ọlị n’oge anyị. Ọ jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe [a] n’elu ụwa?” Gịnị mere o ji jụọ ajụjụ dị otú ahụ?—Luk 18:1, 8.

Okwukwe Furu Efu

Ọ dị ọtụtụ ihe pụrụ ime ka okwukwe ọ bụla mmadụ pụrụ inwe funahụ ya. Otu n’ime ha bụ mkpasasị uche na ọnwụnwa ndị a na-enweta ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, Prọfesọ Michael Goulder bụ ụkọchukwu nke otu parish dị na Manchester, England, n’oge e nwere ihe mberede ụgbọelu na Munich na 1958 bụ́ nke ọtụtụ ndị nọ n’òtù egwuregwu bọl ụkwụ bụ́ Manchester United nwụrụ na ya. N’otu ihe omume telivishọn BBC, onye mgbasa ozi bụ́ Joan Bakewell kọwara na Goulder “nwere mmetụta nke ịbụ onye na-enweghị enyemaka mgbe ọ hụrụ ọ̀tụ̀tụ̀ iru újú nke ndị mmadụ.” Otu ihe si na ya pụta bụ na “o nweghịzi okwukwe n’ebe Chineke nke na-etinye aka n’akara aka mmadụ nọ.” Goulder kwuru na ya kweere na “Bible abụghị . . . okwu na-adịghị ada ada nke Chineke,” kama nke ahụ, na ọ bụ “okwu na-ada ada nke mmadụ, nke ma eleghị anya nwere ihe ụfọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke n’akụkụ ya ụfọdụ.”

Mgbe ụfọdụ, okwukwe na-anwụ nnọọ. Nke ahụ bụ ihe mere n’ebe onye edemede na onye mgbasa ozi bụ́ Ludovic Kennedy nọ. Ọ na-ekwu na malite n’oge ya bụ nwata na ya “na-enwe obi abụọ [banyere Chineke] site n’oge ruo n’oge, nakwa na ekweghị ekwe [ya] mụbara.” O yiri ka ọ dịghị onye pụrụ ịza ya ajụjụ ya dị iche iche n’ụzọ ezi uche dị na ha. Ọnwụ nna ya nwụrụ n’oké osimiri bụ oké ihe mberede kpara okwukwe dịrịla mbụ bụrụ nke na-esitụghị ike, aka ọjọọ. Chineke azaghị ekpere e kpekuru ya ka o “chebe anyị pụọ n’ihe ize ndụ nke oké osimiri nakwa n’ihe ike nke ndị iro” ka ụgbọ mmiri agha nke ndị Germany wakporo ma bibie ụgbọ mmiri ahụ a rụgharịrị arụgharị bụ́ nke nna ya nọ n’ime ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ.—All in the Mind—A Farewell to God.

Ahụmahụ ndị dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ. “Ọ bụghị mmadụ nile,” ka Pọl onyeozi na-ekwu, “nwere okwukwe.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Gịnị ka i chere? Ọ̀ ka kwere omume inwe ezi okwukwe n’ebe Chineke na Okwu ya nọ n’ụwa nke ịrụ eziokwu ụka na-arịwanye elu na ya? Tụlee ihe isiokwu na-esonụ nwere ikwu n’okwu a.