Gịnị Ka Ịbụ Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe Pụtara?
Gịnị Ka Ịbụ Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe Pụtara?
NDỊ Hasid nke Juu bụ́ ndị biri ndụ na narị afọ nke abụọ T.O.A. weere onwe ha dị ka ndị na-eguzosi ike n’ihe n’ezie. Aha ha sitere n’okwu bụ́ cha·sidhʹ, bụ́ okwu Hibru bụ́ isi maka “iguzosi ike n’ihe.” E si na mkpọaha bụ́ cheʹsedh nweta ya, bụ́ nke a na-asụgharị mgbe mgbe ịbụ “ebere ịhụnanya,” “ezi ịhụnanya,” “obiọma,” “ịdị mma,” “ebere.” Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Theological Dictionary of the Old Testament si kwuo, cheʹsedh “na-arụ ọrụ, na-ejikọ mmadụ na ibe ya, na-adịgidekwa adịgide, [ma] na-apụta, ọ bụghị nanị àgwà mmadụ, kamakwa ihe na-esi n’àgwà ahụ apụta. Ọ bụ omume nke na-echekwa ma ọ bụ na-akwalite ndụ. Ọ bụ ime ihe iji napụta onye na-ata ahụhụ n’ihi ajọ ihe ndabara ma ọ bụ nsogbu. Ọ bụ ngosipụta nke ọbụbụenyi.”
N’ụzọ doro anya, n’ọtụtụ asụsụ, ọ dịghị otu okwu a pụrụ iji kọwaa n’ụzọ zuru ezu ihe okwu Hibru a pụtara dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible. Otú o sina dị, n’echiche Bible, iguzosi ike n’ihe pụtara ihe karịrị mmadụ iji ikwesị ntụkwasị obi na-eme ihe o kwere nkwa ime. Ọ na-agụnye echiche nke iji ịhụnanya arapagidesi ike n’ihe tinyere ime ihe kpọmkwem iji baara ndị ọzọ uru. Iji ghọta ihe ezi iguzosi ike n’ihe pụtara, tụlee otú Jehova si gosipụta ya n’ebe Abraham, Mosis, Devid, mba Israel, na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu nọ.
Jehova Gosipụtara Iguzosi Ike n’Ihe
Jehova gwara enyi ya bụ́ Abraham, sị: “Mụ onwe m bụ ọta dịịrị gị.” (Jenesis 15:1; Aịsaịa 41:8) Ihe ndị a abụghị okwu ọnụ efu. Jehova chebere ma napụta Abraham na ezinụlọ ya n’aka Fero na Abimelek. O nyeere Abraham aka ịnapụta Lọt n’aka ndị eze anọ jikọrọ aka. Jehova weghachiri ikike ịmụ nwa nke Abraham dị 100 afọ na nke Sera dị afọ 90 ka Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa wee nwee ike isi n’eriri ha bịa. Jehova nyere Abraham ihe ọmụma n’ụzọ chiri anya site n’ọhụụ, nrọ, nakwa site n’aka ndị mmụọ ozi. N’ezie, Jehova gosipụtara iguzosi ike n’ihe nye Abraham mgbe ọ nọ ndụ nakwa ruo ogologo oge mgbe ọ nwụsịrị. Ruo ọtụtụ narị afọ, Jehova mezuru nkwa o kwere ụmụ Abraham, bụ́ mba Israel, n’agbanyeghị nnupụisi ha. Mmekọrịta Jehova na Abraham nwere bụ ngosipụta nke ihe ezi iguzosi ike n’ihe bụ—ịhụnanya e tinyere n’ọrụ.—Jenesis, isi 12 ruo nke 25.
E kwuru na ‘Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu, dị ka mmadụ na-agwa enyi ya okwu.’ (Ọpụpụ 33:11) Ee, Mosis so Jehova nwee mmekọrịta chiri anya karịa ka onye amụma ọ bụla ọzọ dịrị ndụ tupu Jisọs Kraịst so Jehova nwee. Olee otú Jehova si gosipụta iguzosi ike n’ihe n’ebe Mosis nọ?
Dị ka nwoke dị afọ 40 nke nwere ike na ume, Mosis mere ihe na-erughịrị ya n’iweghara ibu Ọrụ 7:23-30) Otú ọ dị, Jehova agbahapụghị ya. Mgbe oge ruru, a kpọghachiri Mosis idupụta ụmụ Israel n’Ijipt.
ọrụ nke ịnapụta ndị ya. Ma oge erubeghị. Ọ ghaghị ịgbalaga maka ndụ ya. Ruo afọ 40, ọ zụrụ atụrụ na Midian. (N’otu aka ahụ, Jehova gosipụtara iguzosi ike n’ihe nye Devid, bụ́ eze nke abụọ a ma ama nke Israel. Mgbe Devid ka bụ nnọọ nwa okorobịa, Jehova gwara onye amụma ahụ bụ́ Samuel, sị: “Bilie, tee ya mmanụ: n’ihi na nke a bụ ya.” Site mgbe ahụ gaa n’ihu, Jehova ji iguzosi ike n’ihe chebe ma duzie Devid ka ọ na-etozu okè dị ka onye ga-abụ eze Israel dum n’ọdịnihu. Jehova napụtara ya “n’aka ọdụm, na n’aka bear” nakwa n’aka dike ndị Filistia bụ́ Gọlaịat. O mere ka Devid merie ndị iro Israel ọtụtụ ugboro, Jehova napụtakwara Devid mgbe Sọl nwere ekworo na ịkpọasị tụrụ ya ube.—1 Samuel 16:12; 17:37; 18:11; 19:10.
Otú ọ dị, Devid abụghị nwoke zuru okè. N’ezie, o mere mmehie dị oké njọ. N’agbanyeghị nke ahụ, kama ịgbahapụ ya, Jehova gosipụtara ezi ịhụnanya ya n’ebe Devid chegharịrịnụ site n’ala ala obi ya nọ. N’ogologo oge nile Devid dịrị ndụ, Jehova mere ihe ugboro ugboro iji chekwaa ma kwalite ndụ. O mere ihe maka ọdịmma nke onye na-ata ahụhụ. Nke ahụ bụ obi ebere n’ezie!—2 Samuel 11:1–12:25; 24:1-17.
Mba Israel n’ozuzu sooro Jehova banye ná mmekọrịta nraranye nke pụrụ iche mgbe ha nakweere ihe ndị e kwuru n’ọgbụgba ndụ Iwu Mosis n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 19:3-8) N’ihi ya, a kọwara Israel dị ka mba ya na Jehova nọ ná mmekọrịta alụmdi na nwunye. A gwara Israel, sị: “Jehova akpọwo gị dị ka nwanyị.” Jehova gwakwara ya, sị: “Ebere ebighị ebi ka M ga-eji nwee obi ebere n’ahụ gị.” (Aịsaịa 54:6, 8) Olee otú Jehova si gosipụta iguzosi ike n’ihe ná mmekọrịta a pụrụ iche?
Jehova butere ụzọ n’ime ihe iji gboo mkpa ụmụ Israel nakwa iji wusie nkekọ ya na ha ike. Ọ napụtara ha n’Ijipt, hazie ha ịbụ mba, ma duru ha banye ‘n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’ (Ọpụpụ 3:8) O nyere ha ntụziaka ime mmụọ n’ụzọ chiri anya site n’aka ndị nchụàjà, ndị Livaị, na ọtụtụ ndị amụma na ndị ozi ha nwere site n’oge ruo n’oge. (2 Ihe E Mere 17:7-9; Nehemaịa 8:7-9; Jeremaịa 7:25) Mgbe mba ahụ chigharịrị ma fee chi ọzọ dị iche iche, Jehova gbaziri ha. Mgbe ha chegharịrị, ọ gbaghaara ha. N’eziokwu, mba Israel bụ “nwanyị” isi ike. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova adịghị ngwa n’ịgbahapụ ya. N’ihi nkwa o kwere Abraham, O ji iguzosi ike n’ihe nọgide na-anakwere ụmụ Israel ruo mgbe e mezuru nzube Ya banyere ha. (Deuterọnọmi 7:7-9) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya nke ahụ bụụrụ ndị lụrụ di na nwunye!
Jehova na-egosipụtakwa iguzosi ike n’ihe ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu nọ n’ụdị na ọ na-enye mmadụ nile, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume, ihe ndị bụ́ isi na-akpa ha ná ndụ. (Matiu 5:45; Ọrụ 17:25) Ọ bụghị nanị nke ahụ, o nyewo Ọkpara ya dị ka àjà mgbapụta ka ihe nile a kpọrọ mmadụ wee nwee ike inwe ohere nke ịbụ ndị a gbapụtara n’agbụ nke mmehie na ọnwụ na inwe atụmanya dị ebube nke ibi ndụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi na Paradaịs. (Matiu 20:28; Jọn 3:16) Ihe mgbapụta ahụ bụ ihe kasị ukwuu e nyere iji chebe ma kwalite ndụ. N’ezie, ọ bụ “ime ihe iji napụta onye na-ata ahụhụ n’ihi ajọ ihe ndabara ma ọ bụ nsogbu.”
Jiri Omume Ziri Ezi Gosipụta Iguzosi Ike n’Ihe Gị
N’ịbụ nke ya na obi ebere pụtatụrụ otu ihe, iguzosi ike n’ihe nwere echiche gbara ọkpụrụkpụ nke inyerịta ihe. Ọ bụrụ na e gosiri gị obi ebere, mgbe ahụ, a pụkwara ịtụ anya otu ihe ahụ n’aka gị. A na-eji iguzosi ike n’ihe akwụghachi iguzosi ike n’ihe. Okwu Devid kwuru mere ka ọ pụta ìhè na ọ ghọtara ihe okwu ahụ bụ́ cheʹsedh pụtara: “M ga-akpọ isiala n’ebe ụlọukwu nsọ Gị dị, m ga-ekelekwa aha Gị.” N’ihi gịnị? “N’ihi ebere Gị na n’ihi eziokwu Gị.” (Abụ Ọma 138:2) Ebe Jehova gosiri Devid obi ebere, o doro anya na a kpaliri ya ife na ito Ya. N’ihi ya, ka anyị na-atụgharị uche n’obi ebere Jehova gosiri anyị, ọ̀ bụ na a dịghị akpali anyị ime otu ihe ahụ n’ebe ọ nọ? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a na-akọcha aha Jehova, nchegbu i nwere banyere aha ya ọ̀ na-akpali gị ịgbachitere ya?
Nke ahụ bụ ihe otu onye Kraịst ka bụ nnọọ onye ọhụrụ na nwunye ya mere mgbe ha gara ememe olili ozu nke onye ikwu ha nwụrụ n’ihe ọghọm ọgba tum tum. Ọ bụghị ihe omume okpukpe, e nyekwara ndị bịaranụ ohere ikwu ihe ụfọdụ banyere onye ahụ nwụrụ anwụ. Otu n’ime ndị kwuru okwu malitere ịta Chineke ụta maka nnwụchu ọnwụ nke nwa okorobịa ahụ site n’ịsị, ‘Chineke chọrọ ya n’eluigwe, ọ bụ ya mere o ji kpọrọ ya.’ O kweghị nwanna anyị bụ́ onye Kraịst omume ịgbachi nkịtị. Ọ rịgooro n’elu ikpo okwu ahụ, ọ bụ ezie na o jighị ma Bible ma ihe ọ bụla e dere ede. “Ùnu chere na ọnọdụ dị otú a na-amasị Chineke pụrụ ime ihe nile nke nwere obi ebere na ọmịiko?” ka ọ jụrụ. Ọ gaziri n’ihu ikwu okwu ọ na-akwadebeghị akwadebe bụ́ nke were minit iri, na-ehota akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akọwa ihe mere anyị ji anwụ anwụ, ihe Chineke meworo iji napụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ n’ọnwụ, na atụmanya magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ banye ná ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ihe karịrị 100 mmadụ nọ n’ebe ahụ malitere ịkụ aka ruo ogologo oge. Nwanna nwoke ahụ mesịrị cheta, sị: “Enwere m ọṅụ nke obi m na-enwetụbeghị mbụ. Ekelere m Jehova maka iji amamihe ya na-ezi m ihe nakwa maka inye m ohere nke ịgọpụrụ aha nsọ ya.”
Iguzosi ike n’ihe nye Jehova na-agụnye iguzosi ike n’ihe nye Okwu ya, bụ́ Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova ji Bible akụziri anyị otú e si ebi ndụ. Iwu na ụkpụrụ ndị e dekọrọ n’ime ya bụ n’ezie ndị kasị mma na ndị kasị aba uru ná ndụ. (Aịsaịa 48:17) Ekwela ka nrụgide sitere n’aka ndị ọzọ ma ọ bụ adịghị ike nke onwe gị mee ka i hie ụzọ n’idebe iwu Jehova. Nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Okwu Chineke.
Iguzosi ike n’ihe nye Chineke na-agụnyekwa iguzosi ike n’ihe nye nzukọ ya. N’ịbụ ihe dị mkpa, n’afọ ndị gafeworonụ, e nwewo mgbazi na mgbanwe dị iche iche ná nghọta anyị nwere banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị ndị na-eriju nri ime mmụọ afọ dị ka anyị. (Matiu 24:45-47) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Jehova ejiwo iguzosi ike n’ihe na-akwado nzukọ ya nke oge a. Ànyị pụrụ ime otu ihe ahụ? A. H. Macmillan mere ya. Obere oge tupu ya anwụọ, ọ sịrị: “Ahụwo m nzukọ Jehova ka o toro site ná mmalite dị nta, mgbe m raara onwe m nye Chineke mgbe m dị afọ iri abụọ na atọ na September 1900, ruo n’òtù zuru ụwa ọnụ nke ndị nwere obi ụtọ bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa eziokwu ahụ. . . . Ka m na-eru ọgwụgwụ nke ozi m na-ejere Chineke, ekwenyesiri m ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ na Jehova eduziwo ndị ya ma nye ha kpọmkwem ihe dị ha mkpa n’oge ya.” Nwanna Macmillan ji ikwesị ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ihe jee ozi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 66, ruo mgbe ọ nwụrụ n’August 26, 1966. Ọ bụ ezigbo ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ihe nye nzukọ a na-ahụ anya nke Chineke.
Tụkwasị n’ịbụ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye nzukọ a, ànyị ga na-eguzosi ike n’ihe nye ibe
anyị? Mgbe e ji mkpagbu n’ụzọ obi ọjọọ yie anyị egwu, ànyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị? N’Agha Ụwa nke Abụọ, ụmụnna anyị ndị bi na Netherlands setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya nke iguzosi ike n’ihe. Ndị Gestapo nke Nazi ji obi ọjọọ gbaa otu okenye si n’Ọgbakọ Groningen, bụ́ Klaas de Vries, ajụjụ ọnụ n’emeghịrị ya ebere, ha tụbara ya n’ọnụ ụlọ mkpọrọ nanị ya nọ ruo ụbọchị 12, na-enye ya nanị achịcha na mmiri, mesịakwa gbaa ya ajụjụ ọnụ ọzọ. Mgbe a tụgidere ya égbè n’ihu ma yie ya egwu igbu ya, e nyere ya minit abụọ ikwu ebe ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ nọ nakwa inye ihe ọmụma ndị ọzọ dị oké mkpa. Nanị ihe Klaas kwuru bụ: “Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ unu ga-anụ m n’ọnụ. . . . Agaghị m aghọ sabo.” E ji égbè ahụ yie ya egwu ugboro atọ. N’ikpeazụ, ike gwụrụ ndị Gestapo, e zigakwara Klaas n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. Ọ dịghị mgbe ọ raara ụmụnna ya nye.Ànyị pụrụ iguzosi ike n’ihe nye onye ikwu kasị dịrị anyị nso—onye òtù ọlụlụ anyị? Ọbụna dị ka Jehova kwanyeere mmekọrịta ọgbụgba ndụ nke ya na mba Israel ùgwù, ànyị na-eguzosi ike n’ihe nye nkwa ọlụlụ anyị? Kama ịbụ nanị onye kwụsiri ike ná nkwa ahụ, gbalịsie ike ime ka gị na onye òtù ọlụlụ gị na-enwe mmekọrịta chiri anya. Bute ụzọ n’ime ka alụmdi na nwunye unu sie ike. Wepụtanụ oge iji na-anọkọ ọnụ, na-ekwuritanụ okwu site n’obi, n’ezoroghi ibe unu ihe ọ bụla, na-akwadonụ ma na-agbarịta ibe unu ume, na-egerịtanụ ibe unu ntị, na-achịkọnụ ọchị ọnụ, na-ebekọnụ ákwá ọnụ, na-egwukọnụ egwuregwu ọnụ, na-arụkọnụ ọrụ ọnụ iji ruo n’otu ihe mgbaru ọsọ, na-emenụ ihe na-amasị ibe unu, bụrụnụ enyi. Lezienụ anya karịsịa izere inwe ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ bụ ezie na o ziri ezi ma kwesị ekwesị ịmara ndị ọzọ na-abụghị onye òtù ọlụlụ gị nke ọma na ọbụna ịbụ ezigbo enyi ha, ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ kwesịrị ịbụ nanị n’ebe onye òtù ọlụlụ gị nọ. Ekwela ka onye ọ bụla ọzọ bata n’etiti gị na onye òtù ọlụlụ gị.—Ilu 5:15-20.
Na-eguzosi ike n’ihe nye ndị enyi na ndị ezinụlọ gị kwere ekwe. Ka afọ na-agafe, echefula ha. Nọgide na-akpọtụrụ ha, na-edere ha akwụkwọ ozi, na-akpọ ha na fon, na-eleta ha. N’agbanyeghị ọnọdụ ị pụrụ ịnọ na ya ná ndụ, gbalịa ka ị ghara imechu ha ihu. Mee ka ha na-enwe obi ụtọ ikwu na ha maara gị ma ọ bụ na ị bụ nwanne ha. Iguzosi ike n’ihe nye ha ga-eme ka i kpebisie ike ime ihe ziri ezi, ọ ga-abụkwara gị isi iyi nke agbamume.—Esta 4:6-16.
Ee, ezi iguzosi ike n’ihe na-agụnye ime ihe ndị ziri ezi iji chekwaa mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa anyị nwere. Mee ihe ị pụrụ ime iji kwụghachi obi ebere Jehova. Ṅomie iguzosi ike n’ihe Jehova n’otú i si emeso ọgbakọ ndị Kraịst, onye òtù ọlụlụ gị, ezinụlọ gị, na ndị enyi gị. Jiri iguzosi ike n’ihe na-akpọsara ndị agbata obi gị ịdị mma Jehova. Ọbụ abụ ahụ kwutere ya mgbe ọ sịrị: “Ebere nile nke Jehova ka m ga-abụ abụ ha ruo mgbe ebighị ebi: ọgbọ nile ka m ga-ewere ọnụ m mee ka ha mara ikwesị ntụkwasị obi Gị.” (Abụ Ọma 89:1) Ọ̀ bụ na a dịghị adọta anyị n’ebe Chineke dị otú ahụ nọ? N’ezie, “ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị.”—Abụ Ọma 100:5.
[Foto dị na peeji nke 23]
A. H. Macmillan