Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inweta Ndị Na-esi Ike Nnweta

Inweta Ndị Na-esi Ike Nnweta

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Inweta Ndị Na-esi Ike Nnweta

NDỊÀMÀ JEHOVA na-agbalịsi ike ime ka ozi Alaeze ahụ ruo onye ọ bụla ha nwere ike inweta ntị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-achọ mgbalị pụrụ iche iji nweta ndị na-adịghị anọkebe n’ụlọ. (Mak 13:10) Banyere nke a, otu ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ n’otu mba dị na n’Ebe Ndịda America na-akọ ahụmahụ a na-esonụ.

“Otu ụbọchị amatara m na gọvanọ na-achị steeti anyị ga-abịa ileta ókèala e kenyere mụ na nwunye m ọrụ na ya. Ebe ọ bụ na o doro anya na o so ná ndị na-adịghị anọkebe n’ụlọ, edegaara m ya akwụkwọ ozi na-etinye ọtụtụ mbipụta ndị dabeere na Bible n’ime ya, gụnyere broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? na akwụkwọ ndị bụ́ Mankind’s Search for God na Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ozi m degaara ya kọwara nzube nke nke ọ bụla n’ime mbipụta ndị ahụ.

“Ebe ọ bụ na enwere m mmasị ịchọpụta ihe bụ́ mmeghachi omume ya n’ebe akwụkwọ ndị ahụ dị, arịọrọ m ka mụ na ya nwee nnọkọ. Izu ụfọdụ mgbe e mesịrị, e kwere ka mụ na ya nọkọọ, ejikwa m vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name gaa. Nzukọ ahụ were ihe dị ka awa abụọ. Mgbe mụ na gọvanọ ahụ kirisịrị vidio ahụ, ajụrụ m ya ihe o chere banyere ya. Ọ zara, sị: ‘Ọ dịghị òtù ọzọ dị n’ụwa dị ka nke unu. Ọ dị m ka ya bụrụ na m nwere ndị dị ka unu bụ́ ndị pụrụ inyere m aka ịrụzu ọrụ gọọmenti m mere atụmatụ ịrụ!’ E mesịa, ọ jụrụ m ma m gatụla n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke òtù anyị. Agwara m ya na ọ bụ ezie na ọ bụwo ihe mgbaru ọsọ m kemgbe m dị afọ 14, enwebeghị m ohere ileta isi ụlọ ọrụ ụwa nile anyị dị na Brooklyn, New York. Ọ bụ otu n’ime ihe mgbaru ọsọ ndị siiri m ike iru. O legidere m anya ruo nwa oge. Mgbe ahụ, o kwuru na ya chọrọ ka m nwee ohere ahụ. Ọ hụrụ maka inwetara anyị nkwado iwu ịga ma nye anyị tiketi ụgbọelu dị ka onyinye!

“Ugbu a, gọvanọ ahụ na-enwetachi magazin Ụlọ Nche na Teta! anya. Anyị nwere olileanya na n’oge na-adịghị anya, anyị ga-enwe ike ịmalitere ya ọmụmụ Bible.”