Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Pụrụ Ime Ka Ụwa Bụrụ Ebe Ka Mma?

Ị̀ Pụrụ Ime Ka Ụwa Bụrụ Ebe Ka Mma?

Ị̀ Pụrụ Ime Ka Ụwa Bụrụ Ebe Ka Mma?

“Ọchịchị enweghị ike iwekọtaghachi ihe jikọrọ ọha mmadụ ọnụ. O nweghị ngwá ọrụ zuru ezu iji mezigharịa ụkpụrụ omume ọma ndị dịwara kemgbe ụwa. Ụkpụrụ ime ihe bụ́ ndị kasị mma apụghị iweghachi ụkpụrụ ndị e nwere mbụ maka ime mbedo na alụmdi na nwunye, ime ka ndị bụ́ nna bụrụ ndị ga-aza ajụjụ maka ụmụ ha, ime ka ihe ịwụ akpata oyi na ihe ihere dịghachi otú ha dịbu . . . Iwu apụghị ikpochapụ ihe ka ọtụtụ ná nsogbu ndị anyị na-enwe n’ihe banyere omume.”

Ị̀ GA-EKWERE ihe ahụ onye bụbu onye inyeaka n’ọchịchị United States kwuru? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị bụ ihe ngwọta nke ọtụtụ nsogbu dị taa, bụ́ ndị ihe ndị na-akpata ha bụ anyaukwu, enweghị mmetụta ebumpụta ụwa n’ezinụlọ, omume rụrụ arụ, amaghị nke a na-akọ, na ihe ndị ọzọ na-ebibi ihe bụ́ ndị na-ala ihe ndị e ji mara ọha mmadụ n’iyi? Ụfọdụ ndị na-eche na e nweghị ihe ngwọta, n’ihi ya, ha na-eme ihe ndị dịịrị ha n’ụbọchị otú kasị mma ha pụrụ isi mee ha. Ndị ọzọ na-enwe olileanya na otu ụbọchị, otu onye ndú nwere ikike na-adọrọ adọrọ nke ụbụrụ na-aghọ nkọ, ikekwe ọbụna onye ndú okpukpe, ga-abanye n’ọkwá ọchịchị ma duzie ha n’ụzọ ziri ezi.

N’ezie, puku afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ chọrọ ime Jisọs Kraịst eze ha n’ihi na ha ghọtara na ọ bụ Chineke zitere ya nakwa na ọ ga-abụ onye ọchịchị kasị ruo eruo. Otú o sina dị, mgbe Jisọs ghọtara ihe ha na-ezube ime, o si ebe ahụ pụọ ngwa ngwa. (Jọn 6:14, 15) “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a,” ka o mesịrị kọwaara otu onye ọchịchị Rom. (Jọn 18:36) Otú ọ dị, n’ụbọchị ndị a, ọ bụ mmadụ ole na ole na-ewere nguzo ahụ Jisọs weere—ọbụna ndị ndú okpukpe bụ́ ndị na-asị na ha bụ ụmụazụ ya. Ụfọdụ n’ime ha agbalịwo ime ka ụwa a bụrụ ebe ka mma, ma ọ́ bụghị site n’ịgbalị ịkwali ndị ọchịchị ụwa ime ya, ya abụrụ site n’ịnọ n’ọkwá ọchịchị n’onwe ha. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’ileghachi anya azụ n’afọ ndị 1960 na 1970.

Mgbalị Okpukpe Ime Ka Ụwa Ka Mma

Ná ngwụsị afọ ndị 1960, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe nọ ná mba ndị dị na Latin America gbara mbọ maka ọdịmma ndị ogbenye na ndị a na-emegbu emegbu. Iji mezuo nke a, ha hiwere nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe, bụ́ nke a kọwara Kraịst na ya, ọ bụghịzi dị ka onye nzọpụta nanị n’echiche Bible kamakwa, n’ụzọ ọchịchị na nke akụ̀ na ụba. Na United States, ọtụtụ ndị ndú chọọchị bụ́ ndị nwere nchegbu dị ukwuu banyere mbelata nke ụkpụrụ omume ọma, guzobere otu òtù a kpọrọ Ìgwè Ndị Mgbazi. Ebumnobi ya bụ itinye ndị ga-atụpụta ụkpụrụ ndị dị mma maka ezinụlọ n’ọchịchị. N’otu aka ahụ, n’ọtụtụ ala ndị Alakụba, ìgwè dị iche iche agbalịwo ịkwụsị nrụrụ aka na imebiga ihe ókè site n’ịgba ume ịgbasokwu ihe e dere na Koran.

Ì kweere na ụwa abụrụwo ebe ka mma n’ihi mgbalị ndị ahụ? Ihe ndị mere eme na-egosi na, n’ozuzu ya, ụkpụrụ omume ọma nọgidere na-ebelata nakwa na oghere dị n’agbata ndị ọgaranya na ndị ogbenye nọgidere na-asa mbara, gụnyere ná mba ebe ndị a ma nkà mmụta okpukpe maka nnwere onwe ama.

Ebe Ìgwè Ndị Mgbazi dara n’imezu ebumnobi ya na United States, onye hiwere ya, bụ́ Jerry Falwell, kposara òtù ahụ na 1989. Òtù ndị ọzọ anọchiela ya. Otú o sina dị, Paul Weyrich, bụ́ onye chepụtara aha ahụ bụ́ “ìgwè ndị mgbazi,” dere na magazin bụ́ Christianity Today, sị: “Ọbụna mgbe anyị meriri na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, mmeri anyị adịghị eweta ụdị ụkpụrụ ime ihe ndị anyị kweere na ha dị mkpa.” O dekwara sị: “Ọdịbendị na-aghọ ọwa mmiri ruru unyi nke na-asawanye nnọọ mbara. Ọdịda ọdịbendị na-ada bụ́ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ya dị nnọọ egwu na-emetụta anyị n’ụzọ dị ukwuu, bụ́ ọdịda dị nnọọ ukwuu ruo n’ókè nke na ọ karịrị ọchịchị ike.”

Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ ma bụrụkwa onye edemede, bụ́ Cal Thomas, kpughere ihe o weere dị ka ihie ụzọ bụ́ isi a na-enwe n’ịgbalị iji ọchịchị mee ka ọha mmadụ ka mma, sị: “Mgbanwe bụ́ ezie na-abịa site n’aka ndị mmadụ n’otu n’otu, ọ bụghị site n’ịzọtagharị ọkwá ọchịchị, n’ihi na nsogbu anyị bụ́ isi abụghị nke akụ̀ na ụba na nke ọchịchị kama ọ bụ nke omume na nke ime mmụọ.”

Ma olee otú ị ga-esi dozie nsogbu nke omume na nke ime mmụọ n’ụwa nke a na-enweghị ụkpụrụ na ya, bụ́ ebe ndị mmadụ na-ekpebiri onwe ha ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi? Ọ bụrụ na ndị a na-akwanyere ùgwù na ndị bu ezi ihe n’obi—ma hà bụ ndị okpukpe ma ha abụghị—enweghị ike ime ka ụwa a bụrụ ebe ka mma n’ezie, ònye pụrụ ime ya? Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, azịza ya dị. N’ezie, ọ dabeere kpọmkwem n’isi ihe mere Jisọs ji sị na Alaeze ya esiteghị n’ụwa nke a.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]

IHU AKWỤKWỌ: Mmiri ruru unyi: Foto WHO/⁠UNICEF; ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụmụaka: Foto UN; ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.