Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ga-ekewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke?

Ònye Ga-ekewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke?

Ònye Ga-ekewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke?

“Anyị onwe anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na Ya onwe ya buru ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 JỌN 4:19.

1, 2. (a) N’ihi gịnị ka ịmara na a hụrụ anyị n’anya ji adị anyị mkpa? (b) Ònye ka ịhụnanya ya kasị dị anyị mkpa?

OLEE otú ọ dịruru gị mkpa ịmara na a hụrụ gị n’anya? Site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ ruo mgbe ha toruru ogo mmadụ, ụmụ mmadụ na-eto nke ọma ma ọ bụrụ na a hụrụ ha n’anya. Ị̀ hụtụwo nwata nne ya ji ịhụnanya kuru n’aka ya? Mgbe mgbe, n’agbanyeghị ihe na-eme gburugburu ya, ka nwata ahụ na-elegide anya n’anya nne ya ji mmụmụ ọnụ ọchị ele ya, ọ na-enwe ahụ iru ala ma na-anọ jụụ n’aka nne ya bụ́ onye hụrụ ya n’anya. Ma ọ bụ, ị̀ na-echeta otú ị dị mgbe ị nọ n’oge uto bụ́ nke a na-enwe nsogbu na ya mgbe ụfọdụ? (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụwo na ị maghị ihe ị chọrọ ma ọ bụ ọbụna otú ahụ dị gị, n’agbanyeghị nke ahụ, lee ka o si dị mkpa ịmara na nna gị na nne gị hụrụ gị n’anya! Ọ́ bụghị ihe enyemaka ịmara na ị pụrụ iji nsogbu ma ọ bụ ajụjụ ọ bụla i nwere gakwuru ha? N’ezie, n’oge nile ná ndụ, otu n’ime ihe ndị kasị akpa anyị bụ ịbụ ndị a hụrụ n’anya. Ịhụnanya dị otú ahụ na-emesi anyị obi ike na anyị bara uru.

2 N’ezie, ịhụnanya na-adịghị ada ada nke nne na nna mmadụ nwere n’ebe ọ nọ so eme ka o nwee ike ito nke ọma ma nwee ezi nguzo. Ma, inwe obi ike na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, hụrụ anyị n’anya dị nnọọ oké mkpa karị iji gbasie ike n’ụzọ ime mmụọ na nke mmetụta uche. Ọ pụrụ ịbụwo na ụfọdụ ndị na-agụ magazin a enweghị ndị nne na nna lekọtara ha anya n’ezie. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị, kara obi. Ọ bụrụgodị na nne gị na nna gị ahụghị gị n’anya ma ọ bụ ọ bụrụ na ịhụnanya ha ajụọla oyi, ị ga-enweta ezi ịhụnanya Chineke.

3. Olee otú Jehova siworo mesighachi ndị ya obi ike na ọ hụrụ ha n’anya?

3 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, Jehova mere ka ọ pụta ìhè na nne pụrụ ‘ichezọ’ nwa ya na-aṅụ ara, ma na ya agaghị echezọ ndị ya. (Aịsaịa 49:15) N’ụzọ yiri nke ahụ, Devid ji obi ike kwuo, sị: “N’ihi na nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Lee ihe na-emesighachi obi ike ọ bụ! Ihe ọ sọrọ ọnọdụ gị ya bụrụ, ọ bụrụ na gị na Jehova Chineke nwere mmekọrịta a raara nye, i kwesịrị icheta mgbe nile na ọ hụrụ gị n’anya karịa nnọọ ka mmadụ ọ bụla si hụ gị n’anya!

Debe Onwe Gị n’Ịhụnanya Chineke

4. Olee otú e si mesighachi ndị Kraịst narị afọ mbụ obi ike na Chineke hụrụ ha n’anya?

4 Olee oge mbụ ị matara banyere ịhụnanya Jehova? Ikekwe, ahụmahụ gị yitụrụ nke ndị Kraịst nọ na narị afọ mbụ. Isi nke 5 nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom kọwara n’ụzọ magburu onwe ya otú ndị mmehie, bụ́ ndị e kewapụburu n’ebe Chineke nọ, si ghọọ ndị maara ịhụnanya Jehova. N’amaokwu nke 5, anyị na-agụ, sị: “A wụsaworo ịhụnanya nke Chineke n’obi anyị site n’aka Mmụọ Nsọ Nke e nyere anyị.” N’amaokwu nke 8, Pọl na-agbakwụnye, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.”

5. Olee otú i si bịa ghọta otú ịhụnanya Chineke haruru?

5 N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe e gosiri gị eziokwu sitere n’Okwu Chineke, ị malitekwa igosipụta okwukwe, mmụọ nsọ Jehova malitere ịrụ ọrụ n’obi gị. N’ụzọ dị otú a, ị malitere ịghọta ókè ihe Jehova mere n’izite Ọkpara ọ hụrụ n’anya ịnwụ n’ihi gị, haruru. Jehova si otú a nyere gị aka ịmara kpọmkwem otú ọ hụruru ihe a kpọrọ mmadụ n’anya. Ó metụghị gị n’obi mgbe ị ghọtara na, n’agbanyeghị na a mụrụ gị dị ka onye mmehie e kewapụrụ n’ebe Jehova nọ, na o megheworo ụmụ mmadụ ụzọ nke ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume, na-enwe atụmanya nke ndụ na-enweghị ngwụsị? Ọ̀ bụ na ị bịaghị hụ Jehova n’anya?—Ndị Rom 5:10.

6. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji dị anyị mgbe ụfọdụ ka Jehova ọ nọ anyị n’ebe dịtụ anya?

6 N’ịbụ onye ịhụnanya nke Nna gị nke eluigwe dọtaworo, n’ịgbanwekwa ndụ gị ka o wee nakwere gị nke ọma, ị raara ndụ gị nye Chineke. Ugbu a, gị na Chineke dị n’udo. Ma, ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ị nọ Jehova n’ebe dịtụ anya? Nke ahụ pụrụ ime onye ọ bụla n’ime anyị. Ma na-echeta mgbe nile na Chineke adịghị agbanwe agbanwe. Ịhụnanya ya na-adịgide n’esepụghị aka dị ka anyanwụ, bụ́ nke na-akwụsịtụbeghị inye ìhè ya na-ekpo ọkụ n’ụwa. (Malakaị 3:6; Jemes 1:17) N’aka nke ọzọ, anyị pụrụ ịgbanwe—ọ bụrụgodị ruo nwa oge. Ka ụwa na-agba gburugburu, ọchịchịrị na-ekpuchi ọkara nke mbara ala. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị agbakụta Chineke azụ, ọbụna ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè, ọ pụrụ ịdị anyị ka mmekọrịta anyị na ya ọ̀ jụọla oyi. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji dozie ọnọdụ ahụ?

7. Olee otú nnyocha onwe onye pụrụ isi nyere anyị aka ịnọgide n’ịhụnanya Chineke?

7 Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka a na-ekewapụtụ anyị n’ịhụnanya Chineke, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Èjirila m ịhụnanya Chineke gwuriwe egwu? Èjirila m nke nta nke nta gbakụtatụ Chineke dị ndụ ma na-ahụ n’anya azụ, na-egosi n’ụzọ dị iche iche na okwukwe m esighịzi ike? Àtụkwasịwo m uche m “n’ihe nke anụ ahụ,” kama ịbụ “n’ihe nke Mmụọ Nsọ”?’ (Ndị Rom 8:5-8; Ndị Hibru 3:12) Ọ bụrụ na anyị anọrọwo Jehova n’ebe dị anya, anyị pụrụ ime ihe iji dozie ọnọdụ ahụ, iji soro ya nweghachi mmekọrịta chiri anya na nke na-ekpo ọkụ. Jemes na-agba anyị ume, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jemes 4:8) Ṅaa ntị n’okwu Jud, bụ́: “Ndị m hụrụ n’anya, n’iwuli onwe unu elu dị ka ụlọ n’elu okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ, n’ikpekwa ekpere n’ime Mmụọ Nsọ, debe onwe unu n’ịhụnanya Chineke.”—Jud 20, 21.

Ọnọdụ Gbanwere Agbanwe Adịghị Emetụta Ịhụnanya Chineke

8. Olee mgbanwe ndị anyị pụrụ inwe ná ndụ na mberede?

8 Ndụ anyị n’usoro ihe a pụrụ ịgbanwe n’ọtụtụ ụzọ. Eze Solomọn chọpụtara na “mgbe na ihe ndapụta na-adabara [anyị] nile.” (Eklisiastis 9:11) Ndụ anyị pụrụ ịgbanwe kpam kpam na mberede. Otu ụbọchị, ahụ siri anyị ike, echi ya anyị pụrụ ịda ọrịa dị oké njọ. Otu ụbọchị ọrụ ego anyị yiri ihe kwụsiri ike, echi ya anyị aghọọ ndị na-enweghịzi ọrụ. Onye anyị hụrụ n’anya pụrụ ịnwụ na mberede. Ndị Kraịst nọ n’ala ụfọdụ pụrụ inwe udo ruo oge ụfọdụ, mgbe ahụ, na mberede, ajọ mkpagbu etiwapụ. Ikekwe e boro anyị ebubo ụgha, n’ihi nke a kwa, a na-ekpetụ anyị ikpe na-ezighị ezi. Ee, ọnọdụ ndụ na-agbanwe agbanwe ma ọ bụ bụrụ nke a na-ejighị nnọọ n’aka.—Jemes 4:13-15.

9. N’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị mma ịtụle otu akụkụ nke Ndị Rom isi 8?

9 Mgbe ihe ndị dị mwute mere anyị, anyị pụrụ ịmalite iche na a gbahapụla anyị, ọbụna na-eche na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ ebelatala. Ebe ọ bụ na ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ime anyị nile, anyị ga-eme nke ọma iji nlezianya tụlee kpọmkwem okwu ngụgụ obi nke Pọl onyeozi bụ́ ndị e dekọrọ ná Ndị Rom isi 8. Ọ bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka e degaara okwu ndị ahụ. Ma, ụkpụrụ ndị dị na ya metụtakwara ndị so n’atụrụ ọzọ ahụ, bụ́ ndị a gụrụla ná ndị ezi omume dị ka ndị enyi Chineke, dị ka a gụrụ Abraham tupu oge ndị Kraịst.—Ndị Rom 4:20-22; Jemes 2:21-23.

10, 11. (a) Ebubo ndị dị aṅaa ka ndị iro na-ebo ndị Chineke mgbe ụfọdụ? (b) Gịnị mere ndị Kraịst adịghị eji ebubo ndị dị otú ahụ akpọrọ ihe n’ezie?

10 Gụọ Ndị Rom 8:31-34. Pọl na-ajụ, sị: “Ọ bụrụ na Chineke dịịrị anyị, ònye na-emegide anyị?” N’eziokwu, Setan na ajọ ụwa ya na-emegide anyị. Ndị iro pụrụ ibo anyị ebubo ụgha, ọbụna n’ụlọikpe ndị dị n’ala anyị. E bowo ụfọdụ ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ebubo na ha kpọrọ ụmụ ha asị n’ihi na ha adịghị ekwe ka ha nara usoro ọgwụgwọ ndị megidere iwu Chineke ma ọ bụ kwe ka ha kere òkè n’ememe ndị ọgọ mmụọ. (Ọrụ 15:28, 29; 2 Ndị Kọrint 6:14-16) E bowo ndị Kraịst ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi ebubo ụgha na ha na-agba ọchịchị mgba okpuru n’ihi na ha agaghị egbu mmadụ ibe ha n’agha ma ọ bụ tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16) Ụfọdụ ndị mmegide agbasawo ụgha nkwutọ n’usoro mgbasa ozi, ọbụna na-ebo Ndịàmà Jehova ebubo ụgha na ha bụ òtù nzuzo dị ize ndụ.

11 Ma echefula na n’oge ndị ozi, e kwuru, sị: “Banyere ịrọ òtù a, anyị mazuuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Ọ̀ dị ihe ebubo ụgha bụ n’ezie? Ọ bụ Chineke na-agụ ezi ndị Kraịst ná ndị ezi omume, na-adabere n’okwukwe ha nwere n’àjà Kraịst. N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji kwụsị ịhụ ndị na-efe ya ofufe n’anya mgbe o nyesịrịla ha onyinye kasị oké ọnụ ahịa ọ pụrụ inye ha—Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya? (1 Jọn 4:10) Ugbu a e merela ka Kraịst si n’ọnwụ bilie, meekwa ka ọ nọdụ n’aka nri Chineke, ọ na-agbachitere ndị Kraịst n’ụzọ siri ike. Ònye pụrụ ịgbagha, n’ụzọ ziri ezi, mgbachite Kraịst na-agbachitere ụmụazụ ya ma ọ bụ nwee ihe ịga nke ọma n’ịma ihu ọma Chineke nwere n’ebe ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi nọ aka? Ọ dịghị onye ọ bụ!—Aịsaịa 50:8, 9; Ndị Hibru 4:15, 16.

12, 13. (a) Olee ọnọdụ ndị na-apụghị ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke? (b) Gịnị ka Ekwensu bu n’obi wee na-akpatara anyị ihe isi ike? (ch) Gịnị mere ndị Kraịst ji emesị nwee nnọọ mmeri?

12 Gụọ Ndị Rom 8:35-37. E wezụga anyị onwe anyị n’otu n’otu, ọ̀ dị onye ma ọ bụ ihe ọ bụla pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya nke Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs? Setan pụrụ iji ndị ozi ya nọ n’ụwa na-akpatara ndị Kraịst ọtụtụ nsogbu. N’ime narị afọ gara aga, a kpagbuwo ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’ọtụtụ ala. N’ebe ụfọdụ taa, ụmụnna anyị na-enwe nsogbu akụ̀ na ụba kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-enwe ihe mgbu nke agụụ ma ọ bụ bụrụ ndị na-enweghị uwe na-ezuru ha. Gịnị ka Ekwensu bu n’obi wee na-akpata ọnọdụ ọjọọ ndị a? Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’otu akụkụ, nzube ya bụ iji kụda ndị mmadụ obi n’ebe ezi ofufe Jehova dị. Setan chọrọ ime ka anyị kwere na ịhụnanya Chineke ajụọla oyi. Otú ọ dị, ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị?

13 Dị ka Pọl, bụ́ onye hotara Abụ Ọma 44:22, anyị amụwo Okwu Chineke e dere ede. Anyị na-aghọta na ọ bụ n’ihi aha Chineke ka ihe a nile ji eme anyị, bụ́ “atụrụ” ya. O metụtara ido aha Chineke nsọ na iwepụ ọbụbụeze eluigwe na ala ya n’ụta. Ọ bụ n’ihi ihe iseokwu ndị ahụ bụ́ isi ka Chineke jiworo kwe ka ọnwụnwa dịrị, ọ bụghị n’ihi na ọ hụghịzi anyị n’anya. Ihe ọ sọrọ ọnọdụ ọjọọ ahụ ya bụrụ, a na-emesi anyị obi ike na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ya nọ, gụnyere onye nke ọ bụla n’ime anyị, agbanwebeghị. Ihe ọ bụla yiri ka ọ bụ mmeri a na-emeri anyị ga-emesị bụrụ mmeri anyị onwe anyị meriri ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Obi ike anyị nwere na Chineke nwere ịhụnanya na-adịghị ada ada n’ebe anyị nọ na-ewusi anyị ike ma na-akwagide anyị.

14. Gịnị mere Pọl ji kwenyesie ike na Chineke hụrụ ndị Kraịst n’anya n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ha pụrụ inweta?

14 Gụọ Ndị Rom 8:38, 39. Gịnị mere Pọl ji kwenyesie ike na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ ndị Kraịst n’ịhụnanya Chineke? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ahụmahụ ndị Pọl nwere n’onwe ya mgbe ọ nọ n’ozi mere ka nkwenye o kwenyere na ihe isi ike apụghị imetụta ịhụnanya Chineke nwere n’ebe anyị nọ, sikwuo ike. (2 Ndị Kọrint 11:23-27; Ndị Filipaị 4:13) Ọzọkwa, Pọl maara banyere nzube ebighị ebi nke Jehova na otú O si mesoo ndị Ya ihe n’oge gara aga. Ọnwụ n’onwe ya ọ̀ pụrụ imeri ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị jiworo iguzosi ike n’ihe jeere ya ozi nọ? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị dị otú ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụrụ anwụ ga-anọgide na-adị ndụ n’ikike ncheta zuru okè nke Chineke, ọ ga-akpọlitekwa ha n’ọnwụ mgbe oge ruru.—Luk 20:37, 38; 1 Ndị Kọrint 15:22-26.

15, 16. Kwuo ihe ụfọdụ na-apụghị ime ma ọlị ka Chineke kwụsị ịhụ ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi n’anya.

15 N’agbanyeghị ụdị ọghọm anyị pụrụ inwe ná ndụ taa—ma ọ bụ ajọ ihe mberede, ọrịa na-egbu mmadụ, ma ọ bụ ọdachi akụ̀ na ụba—ọ dịghị ihe pụrụ imebi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ya nọ. Ndị mmụọ ozi dị ike, dị ka mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bụ́ onye ghọrọ Setan, apụghị ime ka Jehova kwụsị ịhụ ndị ya raara onwe ha nye ya n’anya. (Job 2:3) Ndị ọchịchị pụrụ ịmachibido ndị Chineke iwu, tụọ ha mkpọrọ, ma megbuo ha, ha pụkwara ịkpọ ha “ndị a jụrụ ajụ.” (1 Ndị Kọrint 4:13) Asị dị otú ahụ na-ezighị ezi nke mba dị iche iche kpọrọ anyị pụrụ ịrụgide ndị mmadụ imegide anyị, ma ọ dịghị eme ka Eze eluigwe na ala gbahapụ anyị.

16 Dị ka ndị Kraịst, ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị Pọl kpọrọ “ihe dị ugbu a”—ihe omume na ọnọdụ ndị e nwere n’usoro ihe a—ma ọ bụ “ihe gaje ịdị” n’ọdịnihu pụrụ ịdọbi nkekọ Chineke na ndị ya nwere. Ọ bụ ezie na ike ndị si n’ụwa na n’eluigwe na-alụso anyị agha, ezi ịhụnanya Chineke dị ya ịkwagide anyị. “Ihe dị elu, ma ọ bụ ihe dị omimi” adịghị nke na-egbochi ịhụnanya Chineke, dị ka Pọl mesiri ya ike. Ee, ọ dịghị ihe ọ bụla nke pụrụ ịchọ ịkwatu anyị, ma ọ bụ ihe ọ bụla nke na-achọ ịkarị anyị ike nke pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke; ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ e kere eke nke pụrụ imebi mmekọrịta nke Onye Okike na ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ịhụnanya Chineke adịghị ada mgbe ọ bụla; ọ na-adịru mgbe ebighị ebi.—1 Ndị Kọrint 13:8.

Jiri Ebere Chineke Kpọrọ Ihe Ruo Mgbe Ebighị Ebi

17. (a) N’ihi gịnị ka inweta ịhụnanya Chineke ji “dị mma karịa ndụ”? (b) Olee otú anyị si egosipụta na anyị ji ebere Chineke kpọrọ ihe?

17 Ókè hà aṅaa ka ịhụnanya Chineke dịruru gị mkpa? Ị̀ na-enwe mmetụta yiri nke Devid, bụ́ onye dere, sị: “N’ihi na ebere Gị dị mma karịa ndụ; egbugbere ọnụ m abụọ ga-aja Gị. Otú a ka m ga-agọzi Gị mgbe m na-adị ndụ: n’aha Gị ka m ga-achịli aka m elu”? (Abụ Ọma 63:3, 4) N’ezie, ọ̀ dị ihe ọ bụla a na-enweta ná ndụ a na-adị n’ụwa a nke dị mma karịa inweta ịhụnanya na ezi ọbụbụenyi Chineke? Dị ka ihe atụ, ịchụso ọrụ na-enye ego dị ukwuu ọ̀ dị mma karịa inwe ahụ iru ala na obi ụtọ ndị a na-enweta site n’iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya? (Luk 12:15) Ụfọdụ ndị Kraịst abanyewo n’ọnọdụ ịhọrọ ịgọnahụ Jehova ma ọ bụ ịnwụ anwụ. Nke ahụ mere ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. E wezụga nnọọ mmadụ ole na ole, ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst họọrọ ịnọgide n’ịhụnanya Chineke, dị njikere ịnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ndị ji iguzosi ike n’ihe nọgide n’ịhụnanya Chineke pụrụ ijide n’aka na ọ ga-enye ha ọdịnihu ebighị ebi, bụ́ ihe ụwa na-apụghị inye anyị. (Mak 8:34-36) Ma ọ na-agụnye ọbụna ihe karịrị ndụ ebighị ebi.

18. Gịnị mere ndụ ebighị ebi ji bụrụ ihe a na-achọsi nnọọ ike?

18 Ọ bụ ezie na ọ gaghị ekwe omume ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma e wezụga Jehova, gbalịa iche echiche ihe ibi ndụ ruo oge dị nnọọ ogologo ga-adị ka ya ma Onye Okike anyị anọghị ya. Ọ ga-atọgbọ chakoo, n’enweghị ezi nzube. Jehova enyewo ndị ya ọrụ na-enye afọ ojuju ịrụ na mgbe ikpeazụ ndị a. Ya mere, anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi na mgbe Jehova, bụ́ Onye Nzube Ukwu, ga-eweta ndụ ebighị ebi, ihe ndị na-akpali akpali ma dị mma bụ́ ndị anyị ga-amụta ma na-eme, ga-ejupụta na ya. (Eklisiastis 3:11) N’agbanyeghị ókè anyị pụrụ ịmụtaru ihe na puku afọ ndị na-abịanụ, anyị agaghị ma ọlị aghọtazu “omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke.”—Ndị Rom 11:33.

Nna M Na-ahụ Unu n’Anya

19. Okwu dị aṅaa na-emesighachi obi ike ka Jisọs Kraịst ji sị ndị na-eso ụzọ ya nọrọ nke ọma?

19 Na Nisan 14, 33 O.A., n’abalị ikpeazụ Jisọs na ndị ozi ya 11 kwesịrị ntụkwasị obi nọkọrịtara, o kwuru ọtụtụ ihe iji wusie ha ike maka ihe dị n’ihu. Ha nile esorowo Jisọs n’ọnwụnwa ya, ha nile n’otu n’otu enwetakwala ịhụnanya ya. (Luk 22:28, 30; Jọn 1:16; 13:1) Mgbe ahụ, Jisọs mesighachiri ha obi ike, sị: “Nna m onwe ya na-ahụ unu n’anya.” (Jọn 16:27) Lee ka okwu ndị ahụ na-aghaghị isiwo nyere ndị ahụ na-eso ụzọ aka ịghọta mmetụta ọmịiko Nna ha nke eluigwe nwere n’ebe ha nọ!

20. Gịnị ka ị kpebisiri ike ime, gịnịkwa ka ị pụrụ inwe obi ike na ya?

20 Ọtụtụ ndị nọ ndụ ugbu a ejeworo Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ iri afọ. Obi abụọ adịghị ya na tupu ajọ usoro ihe a agwụ, anyị ga-enwetakwu ọtụtụ ọnwụnwa. Ekwela ma ọlị ka ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu ndị dị otú ahụ mee ka i nwewe obi abụọ banyere ezi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ị nọ. Ọ ga-esi ike ikwubiga okwu ókè banyere eziokwu a bụ́: Jehova hụrụ gị n’anya. (Jemes 5:11) Ka onye ọ bụla n’ime anyị nọgide na-eme òkè ya, jiri iguzosi ike n’ihe na-edebe iwu Chineke. (Jọn 15:8-10) Ka anyị jiri ohere nile na-eto aha ya. Anyị kwesịrị ime ka mkpebi anyị ịnọgide na-abịaru Jehova nso n’ekpere na ịmụ Okwu ya sikwuo ike. N’agbanyeghị ihe echi pụrụ ịbụ, ọ bụrụ na anyị na-eme ike anyị nile iji na-eme Jehova obi ụtọ, anyị ga-anọgide na-enwe ahụ iru ala, na-enwe obi ike zuru ezu na o nwere ịhụnanya na-adịghị ada ada n’ebe anyị nọ.—2 Pita 3:14.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Ònye ka ịhụnanya ya dị anyị mkpa karịsịa iji nọgide na-enwe ezi nguzo ime mmụọ na nke mmetụta uche?

• Olee ihe ndị na-apụghị ma ọlị ime ka Jehova kwụsị ịhụ ndị ohu ya n’anya?

• N’ihi gịnị ka inweta ịhụnanya Jehova ji “dị mma karịa ndụ”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ọ bụrụ na ọ dị anyị ka e kewapụrụ anyị n’ịhụnanya Chineke, anyị pụrụ ịrụ ọrụ iji dozie ọnọdụ ahụ

[Foto dị na peeji nke 15]

Pọl ghọtara ihe mere e ji kpagbuo ya