Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olee otú e si debe mkpanaka ndị e ji buo igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ebe ọ bụ na 1 Ndị Eze 8:8 na-egosi na a na-ahụ ha site n’Ebe Nsọ ahụ?
Mgbe Jehova nyere Mosis ụkpụrụ a ga-eji ewu ụlọikwuu ahụ n’ọzara, otu ihe bụ́ isi dị na ya bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ. E tinyere mbadamba nkume nke Iwu ahụ na ihe ndị ọzọ n’ime igbe a nwere akụkụ anọ nke e ji ọlaedo machite ahụ ya. A dọbara ya n’ọnụ ụlọ nke dị n’ime ime, bụ́ Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Ndị cherub abụọ gbasara nku ha agbasa bụ́ ndị e ji ọlaedo mee dị n’elu okwuchi Igbe ahụ. E nwere ihe yiri mgbaaka a rụnyere n’akụkụ nke ọ bụla nke Igbe ahụ ka e wee nwee ike iji mkpanaka abụọ e ji osisi acacia a machitere ọlaedo mee, na-ebu ya. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na e si n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka a rụnyere n’akụkụ Igbe ahụ mịfee mkpanaka ndị ahụ, ha sikwa n’otu isi Igbe ahụ ruo n’isi ya nke ọzọ. N’ihi ya, ebe ọ bụ na Igbe ahụ nọ n’ọnọdụ ya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọikwuu ahụ, bụ́ nke chere ihu n’ebe ọwụwa anyanwụ, mkpanaka ndị ahụ dị site n’ebe ugwu gaa n’ebe ndịda. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị mgbe Igbe ahụ mesịrị dịrị n’ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru.—Ọpụpụ 25:10-22; 37:4-9; 40:17-21. *
Ákwà mgbochi kewapụrụ Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile site n’Ebe Nsọ (ọnụ ụlọ nke ka dịrị ná mpụta). Ndị nchụàjà nọ n’Ebe Nsọ ahụ apụghị inyoba anya n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile iji kirie Igbe ahụ, bụ́ nke Chineke na-egosi onwe ya n’elu ya. (Ndị Hibru 9:1-7) Ya mere, ọ pụrụ iyi ka 1 Ndị Eze 8:8 ọ dị mgbagwoju anya: “Mkpanaka wee dị ogologo, e wee hụ isi mkpanaka site n’ebe nsọ n’ihu ime ime ụlọ ahụ; ma a dịghị ahụ ha n’èzí.” E kwukwara otu ihe ahụ ná 2 Ihe E Mere 5:9. Olee otú o si bụrụ na onye ọ bụla nọ n’Ebe Nsọ nke ụlọ nsọ ahụ na-ahụ mkpanaka ndị ahụ?
Ụfọdụ echewo na mkpanaka ndị ahụ metụrụ ákwà mgbochi ahụ, na-akwụpụta akpụ ndị a na-ahụ anya n’ahụ ákwà mgbochi ahụ. Ma nke ahụ agaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na mkpanaka ndị ahụ dị site n’ebe ugwu gaa n’ebe ndịda, bụ́ nke ga-eme ka akụkụ ha na-eche ákwà mgbochi ahụ ihu. (Ọnụ Ọgụgụ 3:38) E nwere nkọwa ezi uche dị na ya karị. A pụrụ ịhụwo mkpanaka ndị ahụ anya ma ọ bụrụ na e nwere ntakịrị oghere dị n’etiti ákwà mgbochi ahụ na ahụ ájá nke ụlọ nsọ ahụ ma ọ bụkwanụ mgbe onyeisi nchụàjà chọrọ ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Ákwà mgbochi ahụ gbochiri ịhụ Igbe ahụ n’onwe ya anya, ma a pụrụ isiwo n’oghere ahụ hụ mkpanaka ndị ahụ mịpụtara n’akụkụ nke ọ bụla nke igbe ahụ. Ọ bụ ezie na ezi uche dị na nkọwa a, anyị apụghị ikwesi olu ike banyere ya.
N’ụzọ doro anya, e nwere ọtụtụ nkọwa zuru ezu ndị anyị ka pụrụ ịmụtakwu. Pọl onyeozi kwuru ole na ole n’ime ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru. O kwuziri, sị: “Anyị [enweghị] ike ikwu okwu banyere ha n’otu n’otu ugbu a.” (Ndị Hibru 9:5) Mbilite n’ọnwụ nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ nke na-abịanụ ga-emeghe ohere na-akpali akpali ịmụta ihe site n’ọnụ ndị ikom dị ka Mosis, Erọn, Bezalel, na ndị ọzọ bụ́ ndị maara kpọmkwem banyere ụkpụrụ e ji wuo ụlọikwuu ahụ na otú e si jiri ya mee ihe.—Ọpụpụ 36:1.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A gaghị ewepụ mkpanaka ndị ahụ n’ihe ndị ahụ yiri mgbaaka a rụnyere n’akụkụ Igbe ahụ ọbụna mgbe Igbe ahụ dọsa n’ụlọikwuu ahụ. N’ihi ya, a pụghị iji mkpanaka ndị ahụ mee ihe ọ bụla ọzọ. Ọzọkwa, a gajeghị imetụ Igbe ahụ aka; a sị na a na-ewepụ mkpanaka ndị ahụ n’ebe ndị ahụ e tinyere ha, ọ ga-eme ka a na-emetụ Igbe ahụ dị nsọ aka iji tinyeghachi mkpanaka ndị ahụ mgbe ọ bụla a chọrọ iburu ya. Ihe e kwuru n’Ọnụ Ọgụgụ 4:6 banyere ‘itinye mkpanaka ndị ahụ’ pụrụ izo aka n’idozigharị ma ọ bụ ịhịgharị ha mgbe a na-akwadebe iburu igbe ahụ dị arọ gaa n’ebe ọzọ a ga-ama ụlọikwuu.