Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyị Na-eme Ihe Kasị Mma Anyị Pụrụ Ime!

Anyị Na-eme Ihe Kasị Mma Anyị Pụrụ Ime!

Anyị Na-eme Ihe Kasị Mma Anyị Pụrụ Ime!

“MEE ihe kasị mma ị pụrụ ime.” Onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova nyere otu onye ozi ala ọzọ ndụmọdụ ahụ dị irè n’otu oge. Ma gịnị mere a ga-eji nye onye ozi ma nke a na-akọ ndụmọdụ bụ́ isi dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị ozi ala ọzọ abụghị ndị na-adịghị atụ ụjọ bụ́ ndị na-anagide chịnchị, agwọ, okpomọkụ, ọrịa, na ihe isi ike dị iche iche kwa ụbọchị?

N’ezie, ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova bụ ndị ikom na ndị inyom nkịtị, ndị Kraịst ịhụnanya miri emi ha nwere n’ebe Jehova na mmadụ ibe ha nọ kpaliworo ije ozi n’ala ọzọ. Ha na-agbalịsi ike ijere Jehova ozi ruo ókè ha nwere ike, na-elegara ya anya maka ike.—Ndị Efesọs 6:10.

Iji mụtakwuo banyere ọrụ ozi ala ọzọ, ka anyị were ya na taa, anyị na-aga ileta otu ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa.

Otu Ụbọchị n’Ozi Ala Ọzọ

Ọ fọrọ nke nta ka ọ kụọ elekere 7:00 nke ụtụtụ. Anyị erutela n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ahụ n’oge iji soro ha tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ dịịrị ụbọchị ahụ. Ndị ozi ala ọzọ iri ahụ ejiri obi ụtọ nabata anyị ma nye anyị ebe anyị ga-anọ na tebụl nri ụtụtụ. Ka anyị na-akọwarịta onwe anyị, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ, bụ́ onye nọrọla ọtụtụ afọ n’ebe e kenyere ya ọrụ, amalite ịkọ ahụmahụ na-atọ ọchị o nwetara n’ozi. Ma mkparịta ụka anyị ejiri nwayọọ kwụsị mgbe onye ga-eduzi ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ chetaara ìgwè ahụ obi dị ụtọ na oge eruola ka a tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị. A ga-atụle ya n’asụsụ French. Ọ bụ ezie na anyị adịghị asụ asụsụ ahụ, o doro anya site n’otú ha si asụ ya na ndị ozi ala ọzọ ahụ si mba ọzọ bịa na-eme nke ọma n’ịmụta asụsụ ahụ.

Mgbe e nwesịrị nkwurịta okwu ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, e kpee ekpere sitere n’ala ala obi, mgbe ahụ, oge eruo maka iri nri ụtụtụ. Ka anyị na-eri nnọọ nri ọka, onye ozi ala ọzọ nọdewere anyị agbaa anyị ume ikunye unere e berisịrị eberisị na ya. Anyị akọwaara ya na unere adịghị amasị anyị, ma ya ekwe nkwa na anyị ga-agbanwe obi anyị ozugbo anyị detụrụ unere ndị obodo a ọnụ. N’ihi ya, anyị ekunye ụfọdụ unere ná nri ọka anyị. Lee ka ihe o kwuru si bụrụ eziokwu! Unere ndị a dị nnọọ ụtọ—ha na-atọ ka ice cream! E mesikwara anyị obi ike na bred ahụ dị ka nke ndị France e butere bụ n’isi ụtụtụ a ka e mere ya n’obere ụlọ ahịa dị nnọọ ma e si n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ahụ gafee okporo ámá.

Anyị risịa nri ụtụtụ, anyị ga-eso di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ, bụ́ ndị anyị ga-akpọ Ben na Karen nọkọọ n’ụbọchị taa. Anyị anụwo banyere ókèala na-amị mkpụrụ dị ná mba a dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, ọ dịkwa anyị ọkụ n’obi ịchọpụta ma akụkọ ndị ahụ hà bụ eziokwu.

Mgbe anyị rutere n’ebe a na-aba bọs, anyị ahụ ihe dị ka mmadụ iri na abụọ na-eche bọs. N’oge na-adịghị anya, ndị ozi ala ọzọ ahụ anyị na ha so esoro otu nwanyị na nwa ya nwoke na-enwe mkparịta ụka na-ekpo ọkụ n’otu isiokwu dabeere na Bible. Ebe ọ bụ na anyị amaghị asụsụ French, nanị ihe anyị pụrụ ime bụ iguzo ebe ahụ na-amụmụ ọnụ ọchị! Ozugbo nwanyị ahụ na-anara Ụlọ Nche na Teta!, bọs abịarute, mgbe ahụ onye ọ bụla azọwa ịbanye na ya n’otu mgbe! Ka anyị na-azọ ịbanye na bọs ahụ, ìgwè mmadụ esi n’azụ na-akwa anyị aka. Ọ bụụrụ anyị ihe ịma aka ịghara ịda ka anyị na-aga n’ebe azụ bọs ahụ. Ozugbo onye na-akwọ ya kwọpụrụ, anyị ejisie onwe anyị ike maka ndụ anyị. Site n’oge ruo n’oge, bọs ahụ na-akwụsị, ọbụna ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu ana-afanyekwa na ya. Anyị na-amụmụrụ ndị anyị na ha nọ na bọs ahụ ọnụ ọchị, ha ana-amụmụkwara anyị. Lee ka o si dị anyị ka ya bụrụ na anyị na ha pụrụ ikwurịta okwu!

Ka bọs anyị gbapụrụ ọsọ, anyị esi na windo na-ahụ ihe ndị a na-eme n’okporo ámá. Ndị inyom abụọ bu ibu dị arọ n’isi yịrị na-aga. Otu n’ime ha bu nnukwu ite mmiri. Otu nwoke na-ere ahịa gbasara ákwà n’ebe ndị mmadụ si agafe n’akụkụ ụzọ ma kpọsa ya ụmụ ngwa ahịa ole na ole ọ tụrụ anya ire. N’ebe ọ bụla, e nwere ndị na-azụ ma ọ bụ na-ere nnọọ ihe ọ bụla a pụrụ ịzụ azụ ma ọ bụ ree eree.

Na mberede, Ben, bụ́ onye guzo n’akụkụ m, achọpụta na ọ dị ihe na-atụ ya n’ụkwụ. Gịnị ka ọ ga-abụ? Mmadụ jupụtara na bọs ahụ, ma ihe ahụ atụọkwa ya ọzọ. Ya ejisie ike letuo anya ala. N’otu akpa dị n’ụkwụ ya, e nwere ọbọgwụ dị ndụ nke na-eme ya nọtụ ya esi n’ime akpa ahụ sepụta isi ma tụọ ya ọnụ! Ben akọwaa na ikekwe onye nwe ọbọgwụ ahụ bu ya aga ahịa ịga ree ya.

Mgbe anyị ruru n’ókèala anyị, obi tọrọ anyị ụtọ ịmara na anyị gaje ileta ógbè nwere ihe ndị e ji mara Africa. Mgbe anyị rutewere n’ụlọ mbụ, Ben akụsie aka ya ike iji mee ka onye nwe ụlọ mara. Otú ahụ ka ndị mmadụ si “akụ aka n’ọnụ ụzọ” n’akụkụ a nke ụwa. Otu nwa okorobịa apụta ma kọwaa na ya ji ọrụ n’aka ma rịọ anyị ka anyị bịaghachi n’ụtụtụ ahụ ma e mesịa.

N’ọnụ ụzọ ọzọ, anyị ezute otu nwanyị na-asụ olumba nke Ben na-adịghị aghọta. Ya akpọọ nwa ya nwoke ma gwa ya ka ọ na-asụgharị ihe Ben nwere ikwu. Mgbe Ben kwusịrị, nwanyị ahụ enweta broshuọ dabeere n’isiokwu Bible, nwa ya nwoke ekwekwa nkwa ịkọwara ya ya. N’ụlọ nke atọ, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto nọ ala n’ihu ụlọ ahụ. Abụọ n’ime ha esi n’oche ha bilie ngwa ngwa ka ndị ọbịa wee nwee ike ịnọdụ ala. Anyị amalite mkparịta ụka na-ekpo ọkụ nke dabeere n’iji obe eme ihe n’ofufe. E mee ndokwa maka inwekwu mkparịta ụka n’izu na-abịanụ. Oge eruola ugbu a ka anyị letaghachi nwoke ahụ ji ọrụ n’aka anyị zutere n’ụlọ nke mbụ. N’ụzọ ụfọdụ, ọ nụlarị banyere mkparịta ụka anyị na ndị ahụ na-eto eto nwere n’ebe ndịda okporo ámá ahụ. Ya ajụọ ọtụtụ ajụjụ dabeere na Bible ma rịọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Mgbe Ben tụlesịrị usoro ihe omume ya, ya ekweta ịlọghachi n’otu oge ahụ n’izu na-abịa abịa. Ka anyị na-alọghachi n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ahụ maka iri nri ehihie, Ben na Karen akọwaa na ha aghaghị iji nnọọ nlezianya dokwaa ọmụmụ Bible ha n’ihi na ọ pụrụ ịdịrị ha mfe ịmalite ọmụmụ Bible ga-akarị ole ha ga-eduzili.

Anyị ajaa ha mma maka otú ha si asụ French were were. Ben akọwaa na ya na Karen anọwo na-eje ozi ala ọzọ ruo afọ isii, nakwa na ahụ amalitewela iru ha ala n’ịsụ asụsụ French. Ha mere ka anyị kwenye na ọ dịghịrị ha mfe ịmụta asụsụ ọhụrụ, ma na nnọgidesi ike n’ihe ha arụpụtawo ihe dị mma.

N’elekere 12:30 nke ehihie, ndị ozi ala ọzọ nile ahụ agbakọta na tebụl maka nri ehihie. Anyị anụ na kwa ụbọchị, a na-ekenye onye ozi ala ọzọ dị iche isi nri ụtụtụ na nke ehihie na ịsa efere ma e mesịa. Taa, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ esiela nri na-atọ ụtọ bụ́ anụ ọkụkọ e ghere eghe na poteto e ghere n’ụdị nke ndị France, tinyere tomato e berisịrị eberisị—nri ọ ma ka e si esi nke ọma!

Gịnị ka Ben na Karen na-eme atụmatụ ime n’ehihie a? Ha na-akọwa na onye ọ bụla na-eze anwụ site n’elekere 1:00 ruo elekere 3:00 nke ehihie, ya mere ndị ozi ala ọzọ n’ozuzu ha na-eji ụfọdụ n’ime oge ahụ amụ ihe ma ọ bụ na-ehi ụra ehihie. O jughị anyị anya mgbe Karen gwara anyị na ọ dịghị ewe oge omenala a amara ndị ọhụrụ bụ́ ndị ozi ala ọzọ ahụ!

Mgbe anyị hisịrị ụra ehihie, anyị agaghachi n’ozi ubi. Otu nwoke nwere mmasị bụ́ onye Ben gbalịworo inweta ruo oge ụfọdụ anọghịkwa n’ụlọ, ma ụmụ okorobịa abụọ apụta n’ọnụ ụzọ mgbe Ben kụrụ aka. Ha agwa anyị na onye nwe ụlọ ahụ ekwuwo banyere ọbịbịa Ben ma tụsie aro ike ka ha nweta akwụkwọ ahụ e ji amụ Bible bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Obi dị anyị ụtọ ịhapụrụ ha akwụkwọ ahụ. E mesịa, anyị enweta bọs ga-ebuga anyị n’otu ógbè Karen gaje iduziri otu nwanyị nwere mmasị ọmụmụ Bible na ya.

Ka anyị si n’okporo ámá ndị ahụ mmadụ jupụtara na-agbafe, Karen agwa anyị na ya zutere nwanyị ahụ otu ụbọchị ka ha abụọ na ọtụtụ ndị ọzọ nọ na tagzi. Karen nyere nwanyị ahụ traktị ọ ga-agụ na njem ahụ. Nwanyị ahụ gụrụ traktị ahụ ma rịọzie ka e nye ya ọzọ. Ya ejiri ọbụna mmasị ka ukwuu gụọ nke ahụ. Mgbe ha ruru ebe ha na-aga, Karen mere ndokwa ileta nwanyị ahụ n’ebe obibi ya ma malitere ya ọmụmụ Bible na-amịpụta mkpụrụ na-eji broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Taa, Karen na-aga ịmụrụ ya ihe ọmụmụ nke ise na broshuọ ahụ.

Anyị anụla nnọọ ụtọ ụbọchị taa n’ozi ubi, ma anyị nwere ajụjụ ụfọdụ anyị ka ga-ajụ banyere ọrụ ozi ala ọzọ. Ndị anyị nọ na nke ha emesie anyị obi ike na mgbe anyị laruru, ha ga-akwadebere anyị nri dị mfe ma zaa ajụjụ anyị.

Otú Ha Si Nọgide Na-eme Ya

Ka anyị na-ata àkwá e ghere eghe, bred ndị France, na cheese, anyị amụtakwuo banyere ndụ ozi ala ọzọ. N’ozuzu ya, Monday bụ ụbọchị ndị ozi ala ọzọ ji ezu ike ma ọ bụ na-ahụ maka ihe ndị dịịrị ha. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ozi ala ọzọ na-eji oge ụfọdụ n’ụbọchị ahụ edegara ezinụlọ na ndị enyi ha akwụkwọ ozi. Ozi si ụlọ na-adị ha mkpa nke ukwuu, ọ na-atọkwa ndị ozi ala ọzọ ụtọ izipụ na inweta akwụkwọ ozi.

Ebe ọ bụ na ndị ozi ala ọzọ na-ebi ma na-arụ ọrụ n’otu ebe, ọ dị oké mkpa ka ha nọgide na-enwe ezi nkwurịta okwu site n’iso ndị ozi ala ọzọ ibe ha na-anọkọrịta nakwa site n’ịdị na-ekwurịta ihe ime mmụọ. Iji mee nke ahụ, tinyere ịnọgide na-enwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya, kwa uhuruchi Monday, ndị ozi ala ọzọ na-amụ Bible tinyere magazin Ụlọ Nche. Ben emee ka ọ pụta ìhè na mgbe ndị ozi ala ọzọ a zụlitere n’ebe ndị dịgasị iche iche bikọtara ọnụ, echiche ha ga-adịtụrịrị iche, ma ndokwa ime mmụọ nke ọmụmụ ihe ezinụlọ na-enyere ha aka ịnọgide na-eme ka e nwee udo na ịdị n’otu. Ya emesiekwa ya ike na mmadụ ịghara iji onwe ya kpọrọbiga ihe ókè na-enye aka.

Obi umeala dịkwa oké mkpa. A na-ezipụ ndị ozi ala ọzọ ije ozi, ọ bụghị ka e jewere ha ozi. Ndị enyi anyị kwuru na otu n’ime ihe ndị kasị ara ahụ ikwu n’asụsụ ọ bụla bụ “O wutere m,” karịsịa mgbe mmadụ na-arịọ mgbaghara maka ihe o kwuru ma ọ bụ mee n’amaghị ama. Ben echetara anyị ihe atụ Bible banyere Abigail, bụ́ onye rịọrọ mgbaghara maka akparamàgwà ọjọọ nke di ya ma si otú ahụ dozie ọnọdụ nke pụrụ ịkpatawo ọdachi. (1 Samuel 25:23-28) Ikike nke ịbụ onye ‘na-adị n’udo’ bụ akụkụ dị mkpa nke ịbụ ezigbo onye ozi ala ọzọ.—2 Ndị Kọrint 13:11.

Otu ugboro n’ọnwa, ndị ozi ala ọzọ na-enwe nzukọ iji tụlee ihe ndị metụtara ezinụlọ ahụ, nakwa iji gbanwee usoro ihe omume ha. E mesịa, onye ọ bụla na-eri nri nricha ọnụ pụrụ iche. Nke a yiri anyị ndokwa dị nnọọ irè—ma dị ụtọ.

Ozugbo anyị risịrị nri abalị, anyị agagharịa nke nta n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ ahụ. Anyị arịba ama na, ọ bụ ezie na ebe obibi ahụ abụghị ụlọ ndị oké ozu, na ndị ozi ala ọzọ ahụ gbakọrọ aka na-edebe ya ọcha nke ọma. Ha nwere friji, ígwè na-asa ákwà, na stovu. Karen agwa anyị na ná mba okpomọkụ, dị ka nke a dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, a pụrụ inwe ntụoyi. Ebe obibi kwesịrị ekwesị, nri dị mma, na ime ihe ndị dị mfe iji lekọta ahụ ike na-enyere ndị ozi ala ọzọ aka ịnọgide na-agbasi ike ma na-arụpụta ihe.

Lekwasị Anya n’Ihe Ndị Dị Mma

Ihe nile anyị hụrụla akpaliwo mmasị anyị. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọrụ ozi ala ọzọ dịịrị anyị? Ànyị pụrụ isi aṅaa mara? Ndị anyị bịara na nke ha agwa anyị ihe ole na ole anyị ga-echebara echiche.

Nke mbụ, ha agwa anyị sị, Ndị ozi ala ọzọ nke ndị Kraịst adịghị apụ iji nweta ahụmahụ na-akpali akpali. Ha na-achọ ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị chọrọ ịmụta banyere nkwa ndị dị ebube nke Chineke. Ndị ozi ala ọzọ na-etinye ma ọ dịkarịa ala awa 140 n’ọnwa n’ozi ubi, n’ihi ya, ị ga-enwerịrị mmasị n’ozi ahụ.

‘Ma,’ ka anyị na-eche n’echiche, ‘gịnị banyere agwọ, ngwere, na chịnchị?’ Ben agwa anyị na ọ bụ ezie na a pụrụ ịhụ ihe ndị a n’ọtụtụ ebe e kenyere ndị ozi ala ọzọ ọrụ, ọ na-emesị mara ha ahụ. Ya agbakwụnye na ebe ọ bụla e kenyere mmadụ ozi ala ọzọ nwere ihe dị mma na ya n’ụzọ pụrụ iche, ka oge na-agakwa, ndị ozi ala ọzọ na-elekwasị anya n’akụkụ dị mma nke ọrụ e kenyere ha. Ọnọdụ ndị a gaara elewo anya na mbụ dị ka ndị “a na-adịghị ahụkebe” na-aghọ ndị a na-ahụkarị n’oge na-adịghị anya, n’ọnọdụ ụfọdụkwa, ha na-aghọ ọbụna ndị a na-enwe mmasị na ha. Otu onye ozi ala ọzọ bụ́ onye jere ozi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa ruo ọtụtụ afọ tupu ibu ọrụ onwe onye amanye ya ịlaghachi n’obodo ya kwuru na o siiri ya ike ịhapụ ọrụ e kenyere ya karịa ka o si siere ya ịhapụ mba ya ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. Ebe e kenyere ya ọrụ ozi ala ọzọ aghọọla ebe obibi ya.

Ị̀ Dị Njikere?

Ben na Karen agwawo anyị ọtụtụ ihe anyị ga-echebara echiche. Gịnị banyere gị? Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere echiche banyere ije ozi n’ala ọzọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na i ruwela ihe mgbaru ọsọ ahụ karịa ka i chere. Otu n’ime isi ihe ndị a chọrọ bụ inwe mmasị n’ozi oge nile na inwe ọṅụ n’ọrụ nke inyere ndị mmadụ aka. Cheta, ndị ozi ala ọzọ abụghị ndị dike kama ha bụ ndị ikom na ndị inyom nkịtị. Ha na-eme ihe kasị mma ha pụrụ ime iji rụzuo ọrụ dị nnọọ mkpa.

[Foto dị na peeji nke 27]

A na-eji nkwurịta okwu dabeere n’otu akụkụ Bible amalite ụbọchị ọ bụla

[Foto dị na peeji nke 28, 29]

Ndụ ozi ala ọzọ pụrụ ịbụ nnọọ ihe na-enye afọ ojuju

[Foto dị na peeji nke 29]

Ihe ndị a na-ahụ n’Africa