Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chebe Obi Gị

Chebe Obi Gị

Chebe Obi Gị

“Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—ILU 4:23.

1, 2. Gịnị mere o ji dị anyị mkpa ichebe obi anyị?

OTU agadi nwoke bi n’otu àgwàetiti dị na Caribbean si n’ụlọ ya pụta mgbe otu oké ifufe fesịrị. Ka ọ na-ele ihe ndị mebirinụ gburugburu ya, ọ chọpụtara na otu nnukwu osisi dịwara n’ihu ọnụ ụzọ ámá ya eri ọtụtụ iri afọ adịghịzi ya. ‘Nke a si aṅaa mee,’ ka o chere n’echiche, ‘ebe ọ bụ na osisi ndị ka nta dị gburugburu ebe a adaghị?’ Anya o lere n’úkwù osisi ahụ dara ada mere ka ọ mara ihe kpatara ya. Osisi ahụ yiri a kwaa a kwụrụ erekasịala n’ime, ihe oké ifufe ahụ mekwara bụ nanị ikpughe mmebi ahụ anya na-ahụghị.

2 Lee ihe ọdachi ọ bụ mgbe onye na-efe ezi ofufe bụ́ onye yiri ka ọ gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ụzọ ndụ ndị Kraịst dara ule nke okwukwe. Bible kwuru n’ụzọ ziri ezi na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Nke a pụtara na ọ bụrụ na a nọgideghị na nche, ọbụna obi nke kasị mma pụrụ ịbụ nke a rabara n’ime ihe ọjọọ. Ebe ọ bụ na ọ dịghị obi mmadụ nke a na-apụghị imerụ emerụ, ọ dị anyị mkpa iji ndụmọdụ a kpọrọ ihe: “Karịa ihe ndebe gị nile chebe obi gị.” (Ilu 4:23) Ya mere, olee otú anyị pụrụ isi chebe obi ihe atụ anyị?

Imechi Nnyocha Anya —Ihe A Na-aghaghị Ime

3, 4. (a) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ banyere obi nkịtị? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka inyocha obi ihe atụ anyị?

3 Ọ bụrụ na ị gakwuru dibịa ka o lee gị ahụ, ma eleghị anya ọ ga-enyocha obi gị. Ahụ ike gị n’ozuzu ya, gụnyere obi gị, ọ̀ na-egosi na ahụ gị na-enweta ihe ndị na-edozi ahụ otú na-ezuru ya? Olee otú ọbara gị si erugharị? Obi gị ọ̀ na-akụ nke ọma? Ị̀ na-emega ahụ n’ụzọ zuru ezu? Ị̀ na-eme ka obi gị na-enwe nchekasị na-enweghị isi?

4 Ọ bụrụ na ọ dị mkpa inyocha obi nkịtị mgbe nile, gịnị banyere obi ihe atụ gị? Jehova na-enyocha ya. (1 Ihe E Mere 29:17) Anyị kwesịrị ime otu ihe ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịjụ ajụjụ ndị dị ka: Obi m ọ̀ na-enweta nri ime mmụọ na-ezuru ya site n’inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya na ịgachi nzukọ anya? (Abụ Ọma 1:1, 2; Ndị Hibru 10:24, 25) Ozi Jehova ọ̀ dị m n’obi ka “ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro n’ọkpụkpụ m nile,” na-akpali m ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ? (Jeremaịa 20:9; Matiu 28:19, 20; Ndị Rom 1:15, 16) À na-akpali m ịrụsi ọrụ ike, na-ekere òkè n’akụkụ ụfọdụ nke ozi oge nile mgbe o kwere mee? (Luk 13:24) Gburugburu ebe dị aṅaa ka m na-ekpughepụ obi ihe atụ m nye? M̀ na-achọ isoro ndị ọzọ bụ́ ndị obi mụ na ha bụ otu n’ezi ofufe na-akpakọrịta? (Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33) Ka anyị dị ngwa ịchọpụta emezighị emezi ọ bụla ma mee ihe ozugbo iji dozie ya.

5. Uru dị aṅaa ka ule nke okwukwe pụrụ ịba?

5 Anyị na-enwetakarị ule nke okwukwe. Ha na-enye anyị ohere ịchọpụta ihe bụ́ ọnọdụ obi anyị. Mosis gwara ụmụ Israel bụ́ ndị na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, mere gị ka i jee [iri afọ anọ] ndị a n’ọzara, ka O wee weda gị n’ala, ịnwa gị, ka O wee mara ihe nke dị n’obi gị, ma ị̀ ga-edebe ihe nile O nyere n’iwu, ma ọ bụ na ị gaghị edebe.” (Deuterọnọmi 8:2) Ọ̀ bụ na mmetụta, ọchịchọ, ma ọ bụ mmeghachi omume anyị mgbe anyị chere ọnọdụ ma ọ bụ ọnwụnwa ndị anyị na-atụghị anya ha ihu adịghị eju anyị anya mgbe mgbe? Ọnwụnwa ndị Jehova na-ekwe ka ha bịakwasị anyị pụrụ n’ezie ikpughere anyị ntụpọ anyị, na-enye anyị ohere imeziwanye ihe. (Jemes 1:2-4) Ka ọ ghara ịdị mgbe anyị ga-akwụsị iji ekpere na-atụgharị uche n’otú anyị si emeghachi omume n’ebe ọnwụnwa dị!

Gịnị Ka Okwu Anyị Na-ekpughe?

6. Gịnị ka ihe ndị anyị na-enwe mmasị ikwu banyere ha pụrụ ikpughe banyere obi anyị?

6 Ànyị pụrụ isi aṅaa chọpụta ihe anyị bu n’obi? Jisọs kwuru, sị: “Ezi mmadụ site n’ezi akụ̀ nke obi ya na-ewepụta ezi ihe; ajọ mmadụ sitekwa n’ajọ akụ̀ nke obi ya na-ewepụta ajọ ihe: n’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè.” (Luk 6:45) Ihe anyị na-ekwukarị banyere ya bụ ezi ihe àmà na-egosi ihe obi anyị dị na ya. Ànyị na-ekwukarị banyere ihe onwunwe na ịchụso ihe nke ụwa? Ka mkparịta ụka anyị ọ̀ na-ehiwe isi mgbe nile n’ihe ime mmụọ na n’ihe mgbaru ọsọ metụtara ọchịchị Chineke? Kama ịdị na-akọsa ụzọ ndị ọzọ hiere, ànyị na-eji ịhụnanya enwe ọchịchọ ikpuchi ha? (Ilu 10:11, 12) Ànyị na-enwe ọchịchọ ikwukarị banyere ndị mmadụ na ihe ndị na-aga ná ndụ ha ma na-ekwu ihe dị nta banyere ụkpụrụ na echiche dị iche iche? Nke a ọ̀ pụrụ ịbụ ihe mgbaàmà na anyị na-enwe mmasị na-enweghị isi n’ihe dịịrị ndị ọzọ?—1 Pita 4:15.

7. Olee ihe anyị pụrụ ịmụta banyere ichebe obi anyị site n’ihe ndekọ banyere ụmụnne ndị ikom iri nke Josef?

7 Tụlee ihe mere n’otu ezinụlọ buru ibu. Ụmụ ndị ikom iri kasị okenye nke Jekọb ‘apụghị ịgwa nwanne ha nwoke ha tọrọ bụ́ Josef okwu n’udo.’ N’ihi gịnị? Ha na-enwere ya anyaụfụ n’ihi na ọ bụ ya ka nna ha kasị hụ n’anya. E mesịa, mgbe e ji nrọ ndị sitere n’aka Chineke gọzie Josef, na-egosi na o nwere ihu ọma Jehova, ha ‘kpọrọ ya asị ọzọ karị.’ (Jenesis 37:4, 5, 11) Ha ji obi ọjọọ ree nwanne ha nwoke ịbụ ohu. Mgbe ahụ, ná mgbalị ikpuchi ihe ọjọọ ha, ha ghọgburu nna ha site n’ime ka o chee na anụ ọhịa egbuola Josef. Mmadụ iri n’ime ụmụnne ndị ikom nke Josef echebeghị obi ha n’oge ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-adị ngwa ịkatọ ndị ọzọ, nke ahụ ọ̀ pụrụ ịbụ ihe àmà na-egosi na anyaụfụ ma ọ bụ ekworo dị anyị n’obi? Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche iji na-enyocha ihe si anyị n’ọnụ apụta ma dị ngwa iwepụ ọchịchọ ndị na-ekwesịghị ekwesị.

8. Gịnị ga-enyere anyị aka inyocha obi anyị ma ọ bụrụ na anyị aghaa ụgha?

8 Ọ bụ ezie na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha,’ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ọchịchọ ịgha ụgha. (Ndị Hibru 6:18) “Mmadụ ọ bụla bụ onye na-ekwu okwu ụgha,” ka ọbụ abụ ahụ kwara n’arịrị. (Abụ Ọma 116:11) Ọbụna Pita onyeozi ji ụgha kwuo na ọ maghị Jisọs ugboro atọ. (Matiu 26:69-75) N’ụzọ doro anya, anyị aghaghị ịkpachara anya izere ịgha ụgha, n’ihi na Jehova kpọrọ “ire okwu ụgha” asị. (Ilu 6:16-19) Ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla anyị ga-agha ụgha, ọ ga-adị mma inyocha ihe kpatara ya. Ọ̀ bụ n’ihi ịtụ mmadụ egwu? Ọ̀ bụ ụjọ inweta ntaramahụhụ kpatara ya? Ihe kpatara nsogbu ahụ ọ̀ bụ ma eleghị anya ụjọ nke ịbụ onye a ga-akpọ aha ọjọọ ka ọ̀ bụ kpọmkwem ịchọ ọdịmma onwe onye nanị? Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, lee ka ọ ga-esi kwesị ekwesị ka anyị tụgharịa uche n’okwu ahụ, jiri obi umeala kweta emezighị emezi anyị, ma rịọ Jehova mgbaghara, na-achọ enyemaka ya n’imeri adịghị ike ahụ! “Ndị okenye nke nzukọ Kraịst” pụrụ ịnọ n’ọnọdụ kasị mma inye enyemaka ahụ.—Jemes 5:14.

9. Gịnị ka ekpere anyị pụrụ ikpughe banyere obi anyị?

9 N’ịza arịrịọ Eze Solomọn na-eto eto rịọrọ maka amamihe na ihe ọmụma, Jehova kwuru, sị: “N’ihi na nke a dị n’obi gị, ma ị rịọghị akụ̀ ma ọ bụ ihe mkpakọta, ma ọ bụ nsọpụrụ, . . . enyewo m gị amamihe na ihe ọmụma; M ga-enyekwa gị akụ̀, na ihe mkpakọta, na nsọpụrụ.” (2 Ihe E Mere 1:11, 12) Site n’ihe Solomọn rịọrọ na ihe ọ na-arịọghị, Jehova matara ihe dị Solomọn n’obi. Gịnị ka ekpere anyị na-ekpeku Chineke na-ekpughe banyere obi anyị? Ekpere anyị ọ̀ na-ekpughe na anyị na-enwe akpịrị ịkpọ nkụ maka ihe ọmụma, amamihe, na nghọta? (Ilu 2:1-6; Matiu 5:3) Ihe ndị metụtara Alaeze hà dị anyị n’obi? (Matiu 6:9, 10) Ọ bụrụ na ekpere anyị aghọọla ihe anyị bu n’isi na nke anyị na-ekpe iji mezuo iwu, nke a pụrụ ịbụ ihe na-egosi na ọ dị anyị mkpa iwepụta oge iji tụgharịa uche n’ọrụ nile nke Jehova. (Abụ Ọma 103:2) Ndị Kraịst nile kwesịrị ịmụrụ anya ịchọpụta ihe ekpere ha na-ekpughe.

Gịnị Ka Omume Anyị Na-ekwu?

10, 11. (a) Ebee ka ịkwa iko nile si amalite? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịghara ‘ịkwa iko n’obi anyị’?

10 E kwuwo na omume ka okwu ọnụ ike. N’ezie, omume anyị na-ekpughe nnọọ ihe anyị bụ n’ime. Dị ka ihe atụ, n’okwu metụtara omume ọma, ichebe obi na-agụnye ihe karịrị nanị izere ịkwa iko nile. N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Ànyị pụrụ isi aṅaa zere ịkwa iko ọbụna n’obi anyị?

11 Nna ochie ahụ bụ́ Job setịpụụrụ ndị Kraịst lụrụ di na nwunye ihe nlereanya. Obi abụọ adịghị ya na Job na ụmụ agbọghọ mekọrọ ihe, ọbụnakwa o ji obiọma nyere ha aka ma ọ bụrụ na enyemaka dị ha mkpa. Ma echiche nke inwe ndọrọ mmekọahụ n’ebe ha nọ abatatụghị nwoke a na-eguzosi ike n’ezi ihe n’obi. N’ihi gịnị? N’ihi na o kpebisiwo ike ịghara ile nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya. “Mụ na anya m abụọ gbara ndụ,” ka o kwuru. “M ga-esikwa aṅaa lekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya?” (Job 31:1) Ka anyị na anya anyị gbaa ndụ yiri nke ahụ ma chebe obi anyị.

12. Olee otú ị ga-esi etinye Luk 16:10 n’ọrụ n’ihe banyere ichebe obi gị?

12 “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe,” ka Ọkpara Chineke kwupụtara, “onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Ee, ọ dị anyị mkpa inyocha omume anyị n’ihe ndị yiri ihe nta anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị, ọbụna ndị anyị na-eme mgbe nanị anyị nọ n’ebe obibi anyị. (Abụ Ọma 101:2) Ka anyị nọdụrụ ala n’ụlọ anyị na-ekiri telivishọn, ma ọ bụ na-ekiri ihe ndị dị n’Internet, ànyị na-elezi anyị ịgbaso ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́: “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ ihe ihere, ma ọ bụ ikwu okwu nzuzu, ma ọ bụ okwu na-abaghị n’ihe, nke na-ekwesịghị”? (Ndị Efesọs 5:3, 4) Gịnịkwanụ banyere ime ihe ike nke a pụrụ igosi na telivishọn ma ọ bụ n’egwuregwu vidio? “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru, “onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.

13. Mkpachara anya dị aṅaa kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-echebara ihe si anyị n’obi apụta echiche?

13 “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa,” ka Jeremaịa dọrọ aka ná ntị. (Jeremaịa 17:9) Aghụghọ nke obi a pụrụ ịpụta ìhè mgbe anyị na-eme ngọpụ maka ihe ndị anyị mehiere, na-eme ka emezighị emezi anyị yie ihe dị nta, na-akọwa ajọ ntụpọ ndị anyị nwere n’àgwà anyị dị ka ndị ziri ezi, ma ọ bụ na-ekwu otú ihe anyị rụzuru hà n’ụzọ gabigara ókè. Obi na-adịghị nghọta nwekwara ike inwe ọnọdụ obi abụọ—ire ụtọ na-ekwu otu ihe, omume ana-ekwu ihe ọzọ. (Abụ Ọma 12:2; Ilu 23:7) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị jiri ụzọ eziokwu na-enyocha ihe si anyị n’obi apụta!

Anya Anyị Ọ̀ Na-ele Otu Ebe?

14, 15. (a) Gịnị bụ anya ‘na-ele otu ebe’? (b) Olee otú ilekwasị anya otu ebe si enyere anyị aka ichebe obi anyị?

14 “Oriọna nke ahụ bụ anya,” ka Jisọs kwuru. Ọ gbakwụnyere, sị: “Ya mere ọ bụrụ na anya gị elee otu ebe, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ìhè.” (Matiu 6:22) Anya na-ele otu ebe bụ nke e lekwasịrị n’otu ihe mgbaru ọsọ, ma ọ bụ nzube, nke a na-adịghị adọpụ uche ya n’ihe ọ na-ele. N’ezie, anya anyị kwesịrị ilekwasị ‘n’ịchọ alaeze Chineke, na ezi omume Ya.’ (Matiu 6:33) Gịnị pụrụ ime obi ihe atụ anyị ma ọ bụrụ na anya anyị adịghị ele otu ebe?

15 Tụlee ihe banyere ịkpata ihe e ji ebi ndụ. Igbo mkpa ezinụlọ anyị bụ ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst. (1 Timoti 5:8) Ma gịnị ma ọ bụrụ na a na-anwa anyị inwe ọchịchọ nke inweta ihe kasị bụrụ nke ọgbara ọhụrụ, nke kasị mma, na nke kasị ewu ewu ma a bịa n’ihe oriri, uwe, ụlọ, na ihe ndị ọzọ? Nke ahụ ọ́ pụghị n’ezie ime ka obi na uche anyị bụrụ ohu, na-eme ka anyị ghara iji obi anyị dum na-efe ofufe? (Abụ Ọma 119:113; Ndị Rom 16:18) Gịnị mere anyị ga-eji tinye nnọọ uche n’igbo mkpa anụ ahụ nke na nanị ihe ndị anyị ji akpọrọ ihe ná ndụ bụ ezinụlọ, achụmnta ego, na ihe onwunwe? Cheta ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà: n’ihi na otú a ka ọ ga-abịakwasị ndị nile bi n’elu ụwa nile.”—Luk 21:34, 35.

16. Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere anya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

16 Anya bụ otu ụzọ dị mkpa e si ezigara uche na obi ozi. Ihe ọ na-ele pụrụ imetụta echiche, mmetụta uche, na omume anyị n’ụzọ siri ike. N’iji okwu ihe atụ mee ihe, Jisọs zoro aka n’ike nke ọnwụnwa nke anya ma kwuo, sị: “Ma ọ bụrụ na anya aka nri gị emee gị ka ị maa n’ọnyà, ghụpụ ya, tụpụkwa ya n’ahụ gị: n’ihi na ọ baara gị uru ka otu n’ime ihe dị gị n’ahụ laa n’iyi, ka a gharakwa ịtụba ahụ gị dum [na Gehena, NW].” (Matiu 5:29) A ghaghị igbochi anya ka ọ ghara ile ihe na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, a gatụghị ekwe ka o lewe ihe e wepụtara iji kpalie agụụ ma ọ bụ ọchịchọ na-adịghị mma.

17. Olee otú itinye Ndị Kọlọsi 3:5 n’ọrụ si enyere anyị aka ichebe obi anyị?

17 N’ezie, ịhụ ụzọ abụghị nanị ikike anyị ji eso ihe ndị ọzọ dị n’ụwa emekọ ihe. Ikike ndị ọzọ, dị ka imetụ aka na ịnụ ihe, na-ekerekwa òkè nke ha, ọ dịkwa anyị mkpa ịkpachapụ anya n’ebe akụkụ ahụ ndị e ji eme ha dị. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

18. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime banyere echiche ndị na-ezighị ezi?

18 Ọchịchọ na-ekwesịghị ekwesị pụrụ isi n’ebe zoro ezo nke uche anyị malite. Ịdị na-eche banyere ihe dị otú ahụ na-emekarị ka ọchịchọ ọjọọ ahụ ka njọ, na-emetụta obi anyị. “Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụworo ime, o wee mụpụta mmehie.” (Jemes 1:14, 15) Ọtụtụ ndị na-ekweta na nke a bụ ụzọ mmadụ si emetọkarị onwe ya. Lee ka o si dị mkpa ka anyị nọgide na-eji ihe ime mmụọ emeju obi anyị! (Ndị Filipaị 4:8) Ọ bụrụkwanụ na echiche na-ekwesịghị ekwesị agbabata anyị n’uche, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike iwepụ ya.

‘Were Obi Zuru Okè Fee Jehova’

19, 20. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’iji obi zuru okè na-ejere Jehova ozi?

19 N’oge agadi ya, Eze Devid gwara nwa ya nwoke, sị: “Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, were obi zuru okè, werekwa mkpụrụ obi ọ na-atọ ụtọ, fee Ya ofufe: n’ihi na mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche.” (1 Ihe E Mere 28:9) Solomọn n’onwe ya kpere ekpere maka “obi na-anụ ihe.” (1 Ndị Eze 3:9) N’agbanyeghị nke ahụ, o chere ihe ịma aka nke ịnọgide na-enwe obi dị otú ahụ ná ndụ ya nile ihu.

20 Ọ bụrụ na anyị gaje inwe ihe ịga nke ọma n’akụkụ ahụ, ọ dị anyị mkpa ọ bụghị nanị inweta obi nke dị ka Jehova si chọọ kamakwa ichebe ya. Iji mezuo nke a, anyị aghaghị ime ka ihe ncheta nke Okwu Chineke dịrị n’obi anyị—‘n’etiti ya.’ (Ilu 4:20-22) Anyị kwesịkwara ime ka ọ bụrụ omume anyị inyocha obi anyị, jiri ekpere na-atụgharị uche n’ihe okwu na omume anyị na-ekpughe. Olee uru ntụgharị uche dị otú ahụ ga-aba ma ọ bụrụ na anyị ejighị ezi obi chọọ enyemaka Jehova iji dozie adịghị ike ọ bụla anyị chọpụtara? Leekwa ka o si dị oké mkpa ka anyị nọrọ na nche banyere ihe anyị na-ewebata n’uche anyị site n’ikike ndị anyị nwere! N’ime nke a, anyị na-enwe obi ike na “udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi [anyị] na echiche uche [anyị] nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ee, ka anyị kpebisie ike ichebe obi anyị karịa ihe ndebe anyị nile na iji obi zuru okè na-ejere Jehova ozi.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere o ji dị mkpa ichebe obi?

• Olee otú ịtụle ihe anyị na-ekwu si enyere anyị aka ichebe obi anyị?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ime ka anya anyị na-ele “otu ebe”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Gịnị ka anyị na-ekwukarị banyere ya n’ozi ubi, ná nzukọ, nakwa n’ebe obibi anyị?

[Foto dị na peeji nke 25]

Anya na-ele otu ebe abụghị nke a na-adọpụ uche ya