Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe nke Ga-eweta Ụwa Obi Ụtọ

Isi Ihe nke Ga-eweta Ụwa Obi Ụtọ

Isi Ihe nke Ga-eweta Ụwa Obi Ụtọ

“OTU onye kasị ike—ọ bụghị nanị na puku afọ abụọ a kama n’akụkọ ihe mere eme nile nke mmadụ—abụwo Jisọs onye Nazaret,” ka magazin bụ́ Time kwuru. Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ọtụtụ puku ndị nwere obi eziokwu ghọtara, ọ bụghị nanị ịdị ukwuu ya kama, nchegbu o nwere banyere ndị ọzọ. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya na ha chọrọ ime ya eze. (Jọn 6:10, 14, 15) Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, Jisọs jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

MA Ọ dịghị ihe ọzọ, mmeghachi omume Jisọs dabeere n’ụzọ ihe atọ: otú Nna ya si ele ngosipụta nke mmadụ ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme anya, bụ́ nke gụnyere ịchịisi mmadụ; ọmụma Jisọs maara na e nwere ikike ndị dị ike a na-adịghị ahụ anya bụ́ ndị na-emegide mgbalị ndị kasị mma ụmụ mmadụ na-eme n’ịchịisi; nakwa nzube Chineke iguzobe ọchịchị eluigwe ịchị ụwa dum. Ka anyị na-enyochakwu isi ihe atọ a nke ọma, anyị ga-ahụ ihe mere mgbalị ndị ihe a kpọrọ mmadụ meworo iji mee ka ụwa bụrụ ebe ka mma jiworo kụọ afọ n’ala. Anyị ga-ahụkwa otú a ga-esi enwe ihe ịga nke ọma.

Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Ịchị Onwe Ha?

Mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o nyere ha ikike n’ahụ ụmụ anụmanụ. (Jenesis 1:26) Ma ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’okpuru ọbụbụeze Chineke. Nwoke na nwanyị mbụ ahụ gaje igosipụta na ha nọ n’okpuru Chineke site n’iji nrubeisi hapụ mkpụrụ nke otu osisi, bụ́ ‘osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Jenesis 2:17) N’ụzọ dị mwute, Adam na Iv ji nnwere onwe ime nhọrọ ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma nupụrụ Chineke isi. Iwere mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu abụghị nanị ohi. Ọ bụ nnupụisi megide ọbụbụeze Chineke. Ihe odide ala ala peeji nke Jenesis 2:17 na The New Jerusalem Bible na-ekwu na Adam na Iv zọọrọ “inwere onwe n’ụzọ zuru ezu n’ihe banyere omume bụ́ nke mere ka mmadụ ghara ịghọta ọnọdụ ya dị ka onye e kere eke . . . Mmehie mbụ ahụ bụ omume imegide ọbụbụeze Chineke.”

N’ihi okwu dị mkpa banyere omume nke a metụtara, Chineke kwere ka Adam na Iv na ụmụ ha họrọ ụzọ ndụ masịrị ha, ha jikwa aka ha guzobe ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 147:19, 20; Ndị Rom 2:14) N’ụzọ bụ́ isi, mgbe ahụ ka nnwale ụmụ mmadụ na-eme n’ikpebiri onwe ha ihe ha ga-eme malitere. Ọ̀ gawo nke ọma? N’ịdabere ná nghọta anyị nwere banyere ihe ndị meworo eme n’ime ọtụtụ puku afọ, anyị pụrụ ịsị ee e! Eklisiastis 8:9 na-asị: ‘Mmadụ enwewo ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ Ihe ndekọ a dị mwute banyere ọchịchị ụmụ mmadụ na-achị onwe ha nwapụtara ịbụ eziokwu nke Jeremaịa 10:23: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” Akụkọ ihe mere eme anwapụtawo na ụmụ mmadụ enweghị ikike ịchị onwe ha n’ụzọ na-aga nke ọma n’enweghị enyemaka nke Onye Okike ha.

Jisọs kwenyezuru nke ahụ. Nnwere onwe pụọ n’ebe Chineke nọ bụụrụ ya ihe arụ. “Ọ dịghịkwa ihe M na-eme n’Onwe m,” ka o kwuru. “Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ [Chineke] ụtọ mgbe nile.” (Jọn 4:34; 8:28, 29) N’ihi ya, ebe Chineke na-enyeghị ya ikike ịnara ọbụbụeze n’aka ụmụ mmadụ, Jisọs echeghịdị echiche ịnakwere ya. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọ chọghị inyere mmadụ ibe ya aka. N’ụzọ megidere nke ahụ, o mere ihe nile o nwere ike ime iji nyere ndị mmadụ aka ịchọta obi ụtọ kasị ukwuu mgbe ahụ nakwa n’ọdịnihu. Ọbụna o nyere ndụ ya maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 5:3-11; 7:24-27; Jọn 3:16) Ma Jisọs maara na “ihe ọ bụla nwere oge,” gụnyere oge Chineke maka igosipụta ọbụbụeze ya n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. (Eklisiastis 3:1; Matiu 24:14, 21, 22, 36-39) Otú ọ dị, cheta na n’Iden, nne na nna anyị mbụ nakweere uche nke otu ajọ mmụọ e kere eke bụ́ onye kwuru okwu site n’ọnụ otu agwọ a na-ahụ anya. Nke a na-eweta anyị n’ihe nke abụọ mere Jisọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Onye A Na-amaghị Ama nke Na-achị Ụwa

Bible na-agwa anyị na Setan kwere nkwa inye Jisọs “alaeze nile nke ụwa, na ebube ha” ma ọ bụrụ na ọ kpọọ isiala nye ya. (Matiu 4:8-10) N’ụzọ bụ́ isi, e kwere nkwa inye Jisọs ịchịisi nke ụwa—ma ọ dabeere ma o mee ihe Ekwensu gwara ya. Jisọs adaghị n’ọnwụnwa a. Otú ọ dị, ọ̀ bụ ọnwụnwa n’ezie? Setan ọ̀ pụrụ n’ezie inye ihe buru ibu otú ahụ? Ee, n’ihi na Jisọs n’onwe ya kpọrọ Ekwensu “onyeisi nke ụwa nke a,” Pọl onyeozi kọwakwara ya dị ka “chi nke oge a.”—Jọn 14:30; 2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 6:12.

N’ezie, Jisọs maara na Ekwensu ebughị ọdịmma kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’obi. Ọ kọwara Setan dị ka “ogbu mmadụ” nakwa dị ka “nna nke okwu ụgha na nke ihe nile bụ́ ụgha.” (Jọn 8:44, The Amplified Bible) N’ụzọ doro anya, ụwa nke “na-atọgbọ n’aka” ajọ mmụọ dị otú ahụ apụghị inwe obi ụtọ ma ọlị. (1 Jọn 5:19) Ma Ekwensu agaghị enwe ikike a ruo mgbe ebighị ebi. Jisọs, onye bụ́ ugbu a mmụọ e kere eke dị ike, ga-ewepụ Setan n’oge na-adịghị anya ma bibie ikike ya kpam kpam.—Ndị Hibru 2:14; Mkpughe 20:1-3.

Setan n’onwe ya maara na oge ya dị ka onye na-achị ụwa ji ọsọ na-agwụ. N’ihi ya, o ji nnọọ isi ọnwụ na-eme mgbalị nile o nwere ike ime iji merụọ ụmụ mmadụ n’ụzọ na-agaghị ekwekwa mmekwata, dị nnọọ ka o mere tupu Iju Mmiri nke ụbọchị Noa. (Jenesis 6:1-5; Jud 6) “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri,” ka Mkpughe 12:12 na-ekwu, “n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” Amụma Bible na ihe ndị na-eme n’ụwa na-egosi na anyị na-ebi na nso ọgwụgwụ nke “nwa oge” a. (2 Timoti 3:1-5) Nnwere onwe dị nso ugbu a.

Ọchịchị nke Ga-eweta Obi Ụtọ

Ihe nke atọ mere Jisọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ n’ihi na ọ maara na n’otu oge e setịpụrụ n’ọdịnihu, Chineke ga-eguzobe ọchịchị eluigwe ya ịchị ụwa. Bible na-akpọ ọchịchị a Alaeze Chineke, ọ bụkwa isiokwu bụ́ isi nke ozizi Jisọs. (Luk 4:43; Mkpughe 11:15) Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ka Alaeze ahụ bịa, n’ihi na ọ bụ nanị n’okpuru ịchịisi Alaeze ahụ ka ‘a ga-eme uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe.’ (Matiu 6:9, 10) Ị pụrụ iche sị, ‘Ọ bụrụ na Alaeze a gaje ịchị ụwa dum, gịnị ga-eme ọchịchị nke ụmụ mmadụ guzobere?’

A na-achọta azịza ya na Daniel 2:44: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [na-achị n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [mmadụ guzobere] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’ihi gịnị ka Alaeze Chineke na-aghaghị iji ‘tipịa’ ịchịisi nke ụwa? Ọ bụ n’ihi na ha siri ọnwụ na-eme ka mmụọ nke mmadụ ikpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme dịgide, bụ́ nke na-emegide Chineke nakwa nke Setan kwalitere laa azụ n’ogige Iden. Tụkwasị n’imegide ọdịmma kasịnụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ndị na-agbalịsi ike ime ka mmụọ ahụ dịgide na-eche Onye Okike ha aka mgba n’ihu. (Abụ Ọma 2:6-12; Mkpughe 16:14, 16) N’ihi ya, anyị aghaghị ịjụ onwe anyị sị, ‘Ànyị na-akwado ọchịchị Chineke ka anyị na-emegide ya?’

Ọbụbụeze Ònye Ka Ị Ga-ahọrọ?

Iji nyere ndị mmadụ aka ime mkpebi dabeere n’ezi ihe ọmụma banyere ịchịisi, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa “ozi ọma . . . nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile” tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a abịa. (Matiu 24:14) Ole ndị taa ka e ji ikwusa Alaeze Chineke mara n’ụwa nile? Ọ bụ Ndịàmà Jehova. N’ezie, ọ dịwo anya magazin a buwere okwu bụ́ “Ikwupụta Alaeze Jehova,” n’ihu ya. Taa, ihe dị ka nde Ndịàmà isii n’ihe karịrị ala 230 na-enyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke Alaeze ahụ. *

Ngọzi Ndị Ga-abịara Ndị Alaeze ahụ Ga-achị

Jisọs mere ihe mgbe nile n’ụzọ nke Chineke. N’ihi ya, kama ịhọrọ ụzọ ndụ nke nnwere onwe na ịgbalị ịkwado ma ọ bụ ime ka usoro ihe dị ugbu a ka mma site na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ rụsiri ọrụ ike iji kwalite Alaeze Chineke, bụ́ nanị ihe ngwọta dịịrị nsogbu ụwa. N’ihi iguzosi ike n’ihe ya, a kwụghachiri ya ụgwọ site n’ime ka ọ nọkwasị n’ocheeze dị ebube n’eluigwe dị ka onye bụ́ kpọmkwem Eze nke Alaeze ahụ. Lee ụgwọ ọrụ dị ebube maka ido onwe ya n’okpuru Chineke nke ahụ bụ!—Daniel 7:13, 14.

Ọtụtụ nde mmadụ taa bụ́ ndị na-eṅomi Jisọs n’ibute Alaeze Chineke ụzọ na n’ido onwe ha n’okpuru uche Chineke ga-enwetakwa onyinye dị ebube—ihe ùgwù nke ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa. (Matiu 6:33) N’okpuru ọchịchị ịhụnanya ya, a ga-ebuli ha ruo izu okè, ha ga-enwekwa atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (Mkpughe 21:3, 4) Jọn nke Mbụ 2:17 na-ekwu, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ebe a ga-ekpochapụworị Setan na ụmụazụ ya, gbanweekwa ụwa ka ọ ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ bụ́ ebe ịhụ mba n’anya, azụmahịa rụrụ arụ, na okpukpe ụgha nke na-akpata nkewa na-adịghịkwa, lee ihe na-enye ezi ọṅụ ọ ga-abụ ịnọgide n’ebe a ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 37:29; 72:16.

Ee, Alaeze Chineke bụ kpọmkwem isi ihe ga-eweta ụwa obi ụtọ n’ezie, n’ụzọ dabakwara adaba, a kpọrọ ozi nke e ji akpọsa ya ozi ọma. Ọ bụrụ na ị nabatabeghị ozi ọma a a na-ewetara gị, gịnị ma i mee otú ahụ mgbe ọzọ otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ gị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 N’ịkwado Alaeze Chineke, Ndịàmà Jehova adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ na-akpata nnupụisi megide ọchịchị ụwa, ọbụna n’ala ebe ndị a machibidoro Ndịàmà iwu ma ọ bụ n’ebe ndị a na-akpagbu ha. (Taịtọs 3:1) Kama nke ahụ, ha na-agbalị ịtụnye ụtụ ime mmụọ bara uru na nke na-emetụtaghị ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụzọ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nke narị afọ mbụ si mee ya. Ndịàmà na-agbalịsi ike inyere ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị nọ n’ógbè ha dị iche iche aka ịnakwere ụkpụrụ ndị mara mma dị na Bible, dị ka ịhụnanya ezinụlọ, ịkwụwa aka ọtọ, ịdị ọcha nke omume, na àgwà ọma n’ihe banyere ọrụ. N’ụzọ bụ́ isi, ha na-agbalịsi ike ịkụziri ha otú ha pụrụ isi na-agbaso ụkpụrụ Bible ma na-elegara Alaeze Chineke anya dị ka ezi olileanya nke ihe a kpọrọ mmadụ.

[Foto dị na peeji nke 5]

Akụkọ ihe mere eme na-anwapụta na ụmụ mmadụ apụghị ịchị onwe ha n’ụzọ na-aga nke ọma n’enweghị enyemaka Chineke

[Foto dị na peeji nke 5]

Setan pụrụ inye Jisọs “alaeze nile nke ụwa” n’ihi na ọ bụ ya na-achị ‘n’oge a’

[Foto dị na peeji nke 7]

Jisọs kụziri na n’okpuru ndokwa Alaeze Chineke, ụwa ga-abụ ebe magburu onwe ya ná mma