Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmiri Na-enye Ndụ Na-asọ n’Andes

Mmiri Na-enye Ndụ Na-asọ n’Andes

Mmiri Na-enye Ndụ Na-asọ n’Andes

Ugwu Andes si n’etiti Peru gafee, na-ekewa mba ahụ gaa n’ógbè ala ya kpọrọ nkụ nke dị n’ụsọ oké osimiri n’ebe ọdịda anyanwụ na oké ọhịa nke osisi ndụ juru nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. N’ebe a bụ́ ugwu ugwu ka ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ atọ nke nde mmadụ 27 bi na Peru bi. Ụfọdụ bi n’elu ugwu ndị elu ha dị larịị nakwa n’ebe ndị kpọdara akpọda nke ugwu Andes, ebe ndị ọzọ bi n’ọwara ndị dị nnọọ omimi nakwa na ndagwurugwu ndị na-eme nri nke ọma bụ́ ndị dị n’ugwu ndị ahụ.

OTÚ ugwu Andes si jupụta na nkume mere ka ọ ghara ịdị mfe isi ebe ọzọ banye na ya. N’ihi ya, ọtụtụ nde ndị bi n’ebe ahụ yitụrụ ndị nọpụrụ iche, karịsịa ha yiri ndị ihe omume na mmepe ndị a na-enwe n’ókèala ndị ọzọ na-agbasaghị.

E wuwo obodo nta dị iche iche n’akụkụ mmiri dị iche iche iji nweta mmiri bụ́ nke dị mkpa maka ihe ọkụkụ na ìgwè anụ llama, alpaca, vicuñas, na atụrụ. Otú ọ dị, e nwere ụdị mmiri ọzọ dị oké mkpa na-asọ n’Andes—mmiri ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ bụ́ nke si n’ebe Jehova, bụ́ “isi iyi nke mmiri na-enye ndụ,” nọ na-asọpụta. (Jeremaịa 2:13) Chineke ji Ndịàmà ya enyere ndị bi n’ógbè ndị dịgasị n’elu elu ugwu Andes aka inweta ezi ihe ọmụma banyere ya na nzube ya.—Aịsaịa 12:3; Jọn 17:3.

Ebe ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu,” ndị ozi a na-eme mgbalị nile ha pụrụ ime iji were ozi ahụ na-enye ndụ nke sitere na Bible gaa n’ógbè dị iche iche ọ na-esi ike iru na ha. (1 Timoti 2:4) Ozi a dabeere na Bible bụ nke na-enye ihe ọmụma ma dị elu. O mewo ka ndị nwere obi eziokwu bi n’ógbè ndị ahụ nwere onwe ha pụọ na nkwenkwe ụgha, omenala, na echiche ndị na-eme ka ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ, ndị mmụọ ọjọọ, na ikike dị iche iche sitere n’okike, egwu. Nke ka mkpa, ozi a na-eme ka ha nwee olileanya dị ebube nke ndụ agwụghị agwụ n’ụwa paradaịs.

Ime Mgbalị

Ndị nkwusa Alaeze na-aga n’ógbè ndị a dịpụrụ adịpụ aghaghị ime ọtụtụ mgbanwe. Iji ruo n’obi ndị mmadụ, ọ dị ndị ahụ na-akụzi Bible mkpa ịmatụ asụsụ Quechua ma ọ bụ nke Aymara, bụ́ asụsụ abụọ ógbè ndị ahụ na-asụ.

Iru n’ime obodo ndị dị n’Andes adịghị mfe. E nwere ụzọ okporo ígwè ole na ole gara n’ógbè ndị ahụ. Ime njem gaa ebe ndị ahụ bụ ihe dị ize ndụ na nke ihu igwe na-adịghị mma na ụzọ ọjọọ na-emetụta nke ukwuu. Oleezi otú Ndịàmà si ejekwuru ndị ahụ iji zie ha ozi Alaeze ahụ?

Ndị nkwusa ozi ọma nwere obi ike anakwerewo ihe ịma aka ahụ ma jiri mmụọ yiri nke Aịsaịa onye amụma zaghachi, sị: “Lee m; ziga m.” (Aịsaịa 6:8) Ha ejiriwo ụlọ atọ ụgbọala na-adọkpụ gaa n’ógbè ndị dị n’ebe ugwu, n’ebe etiti, nakwa n’ebe ndịda. N’ibu ọtụtụ katọn ndị Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible jupụtara n’ime ha, ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị ozi oge nile ahụ na-anụ ọkụ n’obi akụwo mkpụrụ nke eziokwu Bible n’etiti ndị bi n’ebe ahụ bụ́ ndị nwere omume enyi, omume ile ọbịa, na obi eziokwu.

Otú okporo ụzọ ndị dị n’ugwu ndị ahụ si gbagọọ agbagọọ dị nnọọ ize ndụ. Iji gafee ụfọdụ n’ime ha, ụgbọala aghaghị isi okporo ụzọ ndị gbagọrọ agbagọ. N’otu n’ime njem ndị dị otú a, otu onye ozi ala ọzọ nọ n’azụ oche nke bọs lepụrụ anya na windo ma hụ na otu n’ime taya azụ nke ụgbọala ahụ nọ kpọmkwem n’ọnụ ọnụ ebe kpọdara akpọda nke ịdị omimi ya karịrị mita 190! O mechiri anya ya ruo mgbe bọs ahụ gafere.

Ụfọdụ okporo ụzọ ndị ahụ adịghị mma ma dịkwa warara nke ukwuu. Mgbe otu n’ime ụgbọala ndị ahụ na-adọkpụ ụlọ nọ na-agbada n’okporo ụzọ ahụ na-adịghị mma ma dị warara, o zutere otu gwongworo na-arịgo arịgo. A ghaghị iji azụ nyara ụgbọala ahụ na-adọkpụ ụlọ gbagokwuo ugwu ahụ ruo ebe ụgbọala abụọ ahụ pụrụ ịcharịtatụrụ onwe ha.

Otú o sina dị, ihe ndị si ná mgbalị ndị ahụ a nọgidere na-eme pụta dị ịrịba ama. Ọ̀ ga-amasị gị ịmarakwu banyere mgbalị ndị ahụ?

‘Ịgba Ọdọ Mmiri Titicaca Mmiri’

N’ịbụ nke dị n’ala ala Ugwu Andes nke ji mita 3,800 karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri, Ọdọ Mmiri Titicaca bụ ọdọ mmiri dị n’ime nke ụgbọ mmiri kasị aga na ya n’ụwa. Ihe ka ọtụtụ ná mmiri 25 na-asọbanye n’Ọdọ Mmiri Titicaca, si n’ugwu ndị ahụ snow kpuchiri elu ha, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha dị mita 6,400 n’ịdị elu, agbapụta. N’ihi oké ịdị elu ya, ebe ahụ na-ajụ nnọọ oyi, ndị na-abụghịkwa ndị ebe ahụ na-arịakarị ọrịa ibi n’ugwu dị nnọọ elu na-akpata.

N’otu oge gara aga, otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ na-asụ asụsụ Quechua na Aymara gara n’àgwàetiti Amantani na Taquile bụ́ ndị dị n’Ọdọ Mmiri Titicaca. Ha ji ihe nkiri slide nke isiokwu ya bụ “Ilerukwu Chọọchị Dị Iche Iche Anya,” nke bụ́ nnyocha e mere n’ezoghị ọnụ banyere ụgha nke Krisendọm. Ọtụtụ ndị meghachiri omume n’ụzọ dị mma. Otu nwoke nabatara ụmụnna ahụ ma nye ha otu ọnụ ụlọ sara mbara n’ụlọ ya bụ́ ebe ha pụrụ ịnọ na-akụzi Bible.

Otu narị mmadụ bịara nzukọ mbụ e nwere n’Amantani; mmadụ 140 bịara nke e nwere na Taquile. E gosiri ihe nkiri ahụ n’asụsụ Quechua. Otu di na nwunye bụ́ ndị bibu n’obodo mepere emepe, sịrị: “O ruola mgbe unu bụ́ Ndịàmà Jehova ga-echeta anyị. Anyị anọwo na-ekpe ekpere ka unu bịa.”

E wezụga àgwàetiti abụọ a ka ibu, e jiriwokwa ozi ọma ahụ gaa n’ụfọdụ n’ime àgwàetiti ndị “na-ese n’elu mmiri” e mere atụmatụ na ha dị 40 n’Ọdọ Mmiri Titicaca. Ànyị sịrị àgwàetiti ndị na-ese n’elu mmiri? Ee, e ji totoras, bụ́ amị ndị na-eto n’ebe ụfọdụ na-emighị emi n’ọdọ mmiri ahụ, mee ha. Totoras na-esi ná mmiri ahụ topụta ma gbasaa n’elu mmiri ahụ. Iji mepụta àgwàetiti, ndị obodo ahụ na-arọji amị ndị ahụ, bụ́ ndị ka gbanyere mkpọrọgwụ n’ala ọdọ mmiri ahụ, ma kpaa ha akpaa iji mepụta ebe dị elu ma dị larịị. Mgbe ahụ, a na-awụkwasị ájá ụrọ n’ebe ahụ dịtụ elu ma dị larịị ma jiri amị ndị ọzọ e gbutere egbute mee ka o sikwuo ike. Ndị mmadụ na-ebi n’ụlọ nta ndị e ji amị wukwasị n’elu ebe ahụ dị elu ma dị larịị.

Ndịàmà Jehova nwetara ụgbọ mmiri maka iji gaa kwusaara ndị bi n’àgwàetiti ndị dị n’Ọdọ Mmiri Titicaca ozi ọma. Ụgbọ mmiri ahụ nwere ike ibu mmadụ 16. Mgbe Ndịàmà ahụ mesịrị kwụsị n’àgwàetiti ndị ahụ na-ese n’elu mmiri, ha na-eji ụkwụ si n’elu ebe ahụ dị elu ma dị larịị e ji amị mee na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ha na-asị na ọ na-adịkarị ha ka ebe ha zọdoro ụkwụ ọ na-aṅagharịtụ aṅagharị. Ndị na-atụ mmiri ụjọ nke ukwuu ekwesịghị ịga ebe a!

Ma banyere ndị na-asụ asụsụ Aymara, ha bi n’ọtụtụ ógbè na obodo nta ndị dị n’ụsọ ọdọ mmiri ahụ nakwa n’ala ndị dịịrị banye na ya. Ọ na-aka mfe iji ụgbọ mmiri aga ha karịa iji ụgbọala. N’ozuzu, e mere atụmatụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 400,000 bi n’ógbè ahụ e ji ụgbọ mmiri dị otú a aga ezi ndị bi na ya ozi Alaeze ahụ. Ụgbọ mmiri ahụ ka ga-anọ n’ọrụ ruo oge ụfọdụ ka dị n’ihu.

Imeju Akpịrị Ịkpọ Nkụ Ime Mmụọ

Flavio bi n’obodo Santa Lucía, nke dị nso na Juliaca, bụ́ nke dị n’Andes. A kụziiri ya ozizi ọkụ ala mmụọ na Chọọchị Evangelical ọ na-ekpe. Ruo ọtụtụ afọ, ọ tụrụ egwu n’ihi ntaramahụhụ ebighị ebi dị otú ahụ n’ime ọkụ. Ọ na-echekarị otú Chineke nke ịhụnanya pụrụ isi na-ata ụmụ mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe Tito, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, gara n’obodo ahụ, o jere na nke Flavio.

Otu n’ime ajụjụ mbụ Flavio jụrụ bụ “Okpukpe gị ọ̀ na-akụzi na a na-emekpa ndị mmadụ ahụ n’ọkụ ala mmụọ?” Tito zaghachiri na echiche dị otú ahụ na-agbaka Onye Okike ntị ma na-ewetere aha Jehova, bụ́ Chineke nke ịhụnanya, nkọcha. N’iji nsụgharị Bible nke Flavio nwere mee ihe, Tito gosiri ya na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị nakwa na ha na-echere mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala n’okpuru Alaeze Chineke. (Eklisiastis 9:5; Jọn 5:28, 29) Nke a meghere anya Flavio. O kweere ịmụ Bible ozugbo, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọrọ onye Kraịst e mere baptism.

Obodo nke Nwere Ekele

Cheedị banyere ihe na-akpali akpali ọ bụ iwegara ndị ime obodo na-ahụtụbeghị Bible na nke mbụ ha Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ ikwusa ozi ọma n’ime obodo ebe ndị mmadụ na-anụtụbeghị banyere Ndịàmà Jehova ma ọ bụ ozi ọma ha na-ekwusa! Nke ahụ bụ ahụmahụ ụmụnna nwanyị atọ bụ́ ndị ọsụ ụzọ—Rosa, Alicia, na Cecilia—nwere bụ́ ndị kwusara ozi ọma n’ime obodo ndị bụ́ Izcuchaca na Conayca, bụ́ ndị dị n’ugwu nke ịdị elu ya bụ mita 3,600 n’ebe etiti Peru.

Mgbe ha rutere n’obodo nke mbụ, ha enweghị ebe ha ga-anọ. Ha kọọrọ onyeisi ndị uwe ojii nọ n’obodo ahụ ihe mere ha ji bịa. Gịnị si na ya pụta? O kwere ka ha hie n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. N’echi ya, ndị ọsụ ụzọ ahụ chọtara ebe ha ga-ebi bụ́ nke ghọrọ ebe ha si eje ozi.

N’oge na-adịghị anya, oge Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst nke a na-eme kwa afọ ruru. Ndị ọsụ ụzọ ahụ agazuwo ụlọ nile dị n’obodo Izcuchaca, nyefee ọtụtụ Bible, ma malite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Tupu ụbọchị Ememe Ncheta, ha kesara akwụkwọ ịkpọ òkù maka ememe a, na-akọwa nzube nke ememe ahụ na ihe ihe nnọchianya ndị e ji mee ihe n’ememe ahụ pụtara. Ha akpọworị otu ìgwè ụmụnna nwoke ka ha bịa nye aka n’ememe ahụ, otu onye n’ime ha kwukwara okwu ememe ahụ. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịhụ ka mmadụ 50 sitere n’obodo nta ahụ bịara ememe a pụrụ iche! Na nke mbụ ya, ha ghọtara ihe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị pụtara n’ezie. Ọzọkwa, lee ihe dị oké ọnụ ahịa ọ bụụrụ ha inwe Okwu Chineke!

Nnwere Onwe Pụọ n’Ibu Ndị Dị Arọ

Iwegara ndị nọ n’agbụ nke okpukpe ụgha mmiri na-enye ume ọhụrụ nke eziokwu Bible bụ ihe na-enye ọṅụ mgbe nile. Pisac bụ obodo e wusiri ike nke Alaeze Ukwu Inca nke oge ochie. A kụziworo ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi n’ebe ahụ taa ozizi ọkụ ala mmụọ nke na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ. Ndị ụkọchukwu ha na-agwa ha na ha pụrụ ịga eluigwe nanị ma ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu arịọchitere ha arịrịọ.

O kwere nghọta na akpịrị na-akpọ ndị dị otú ahụ nkụ maka mmiri na-enye ume ọhụrụ nke eziokwu Bible. Ka Santiago, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, na-eme nkwusa site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ, o nwetara ohere nke ịkọwara otu nwoke na ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:11) Santiago ji Bible gosi ya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ nakwa na a ga-ezi ihe a kpọrọ mmadụ ihe n’ụzọ zuru okè nke Jehova, na-eburu mgbe ebighị ebi n’uche. (Aịsaịa 11:9) Ruo oge ahụ, nwoke ahụ abụwo onye Katọlik ji okpukpe ya kpọrọ ihe, o tinyewo aka ná mgbaasị, ma bụrụ onye aṅụrụma. Ugbu a, o nwere olileanya dabeere na Bible na ihe mgbaru ọsọ ná ndụ—ibi na Paradaịs. Ọ kpọrọ ihe nile o ji eme mgbaasị ọkụ ma kwụsị aṅụrụma. Ọ kpọkọtara ezinụlọ ya ma kwe ka a mụọrọ ha Bible. Ka oge na-aga, mmadụ nile nọ n’ezinụlọ ahụ raara onwe ha nye Jehova Chineke, e meekwa ha baptism.

A Nabata Omume Ile Ọbịa

Ndị bi n’ugwu ahụ nwere nnọọ omume ile ọbịa. Ọ bụ ezie na ụlọ ha dị ntakịrị, ha bụrụkwa ndị ogbenye, ha na-enye ndị ọbịa ihe ha nwere. Tupu ha amụta ụkpụrụ ndị dị elu nke Bible, onye a bịara na nke ya na-enye ndị ọbịa akwụkwọ coca ka ha na-ata ka mkparịta ụka na-aga n’ihu. Ma mgbe onye ahụ nwe ụlọ ghọrọ Onyeàmà, ọ pụrụ inye onye bịara na nke ya otu ngaji shuga, bụ́ nke ya na akwụkwọ coca hà nhata n’ógbè ndị ahụ dịpụrụ adịpụ.

Otu nwanna nwoke rịọrọ otu onye ozi ala ọzọ ka o duga ya nletaghachi. Ka ha rịgochara otu elu ugwu dị oké elu, ha kụrụ aka iji gwa ndị nwe ụlọ na ha abịala. A kpọbatara ha n’ụlọ e ji akịrịka wuo elu ya, bụ́ nke ha na-aghaghị ihuru ala iji banye n’ọnụ ụzọ ya dị ala. Ha ji nlezianya gaa gburugburu etiti ala ụlọ ahụ ruru unyi, bụ́ ebe nne nwe ụlọ gwuru olulu, fanyejuo ya blanket, ma kusa nwa ya n’ime ya. Ebe nwa ọhụrụ a na-agaghị apụtali, o nwere afọ ojuju ikwuru onwe ya okwu n’obi ụtọ ka ndị ahụ toworo eto nọ na-akparịta ụka. Mgbe ha nwesịrị mkparịta ụka na-ekpo ọkụ banyere ngọzi dị iche iche nke Alaeze ahụ, nwanyị ahụ bupụtara otu galọn nke ihe ọṅụṅụ obodo ahụ dị n’ime ya. N’oge na-adịghị anya, ụmụnna ahụ gawara ná mkpọda ugwu ahụ iji leta ndị ọzọ.

Owuwe Ihe Ubi nke Bara Ụba

Ugbu a, n’ógbè a, e nwere ihe dị ka otu narị ìgwè dịpụrụ adịpụ ndị ihe karịrị otu puku mmadụ bi na ha, ndị so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. A na-ezipụ ndị gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi na Lima ịga wulite ìgwè ndị ahụ ka ha ghọọ ọgbakọ. Ndị nwere obi eziokwu, bụ́ ndị nọbu n’agbụ nke okpukpe ụgha na nkwenkwe ụgha ruo nnọọ ogologo oge achọtawo nnwere onwe site n’ozi ọma nke Alaeze ahụ! (Jọn 8:32) A na-emeju akpịrị na-akpọ ha nkụ maka mmiri nke eziokwu.

[Foto dị na peeji nke 10]

Ịgba àmà n’àgwàetiti ndị “na-ese n’elu mmiri” nke Ọdọ Mmiri Titicaca