Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“N’ikpeazụ Amatala M Ihe Na-arịa M!”

“N’ikpeazụ Amatala M Ihe Na-arịa M!”

“N’ikpeazụ Amatala M Ihe Na-arịa M!”

NKE ahụ bụ mmetụta otu nwoke bi na Tokyo nwere mgbe ọ gụrụ akụkọ ndụ dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke December 1, 2000. Isiokwu ahụ bụ “Unu Bụ Ndị Na-amataghị Ihe Ga-eme Echi,” ọ kọkwara ahụmahụ nke otu onye bụbu onye ozi ala ọzọ bụ́ onye na-arịa ọrịa a maara n’ụzọ nkà mmụta ahụ ike dị ka ọrịa uche mkpaghasị nke na-akpata ịda mbà n’obi.

Nwoke ahụ si Tokyo kwuru n’akwụkwọ ozi o detaara ndị na-ebipụta magazin a, sị: “Mgbaàmà ndị a kọwara n’ebe ahụ bụ kpọmkwem otú nke m si eme m. N’ihi ya, ejere m n’ụlọ ọgwụ a na-agwọ ndị isi mgbaka ma mata na m na-arịa ọrịa uche mkpaghasị nke na-akpata ịda mbà n’obi. Ọ tụrụ dọkịta lere m ahụ n’anya. Ọ sịrị, ‘Ndị na-arịa ọrịa a adịkebeghị eche na ha na-arịa ọrịa.’ E nyeere m aka ịmata ọrịa ahụ tupu ya aka njọ.”

Ọtụtụ nde mmadụ gbaa ụwa gburugburu na-erite uru n’ụzọ dịgasị iche iche site n’ịgụ mbipụta nke ọ bụla nke Ụlọ Nche na magazin a na-ebipụtakọ ya na ya bụ́ Teta! Ha na-achọpụta na isiokwu ndị dị na ha na-enye ihe ọmụma na afọ ojuju. A na-ebipụta magazin Ụlọ Nche ugbu a n’asụsụ 141, a na-ebipụtakwa Teta! n’asụsụ 86. Ọ ga-atọkwa gị ụtọ ịgụchi Ụlọ Nche na Teta! anya.