Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụbọchị Ikwe Okpukpe Nọrọ”

“Ụbọchị Ikwe Okpukpe Nọrọ”

“Ụbọchị Ikwe Okpukpe Nọrọ”

N’ỊBỤ onye mkparịta ụka ya na Ndịàmà Jehova nwere kpaliri mmasị ya, nwanyị bụ́ onyeisi nke otu ụlọ akwụkwọ dị na Poland wepụtaara ụlọ akwụkwọ ya “Ụbọchị Ikwe Okpukpe Nọrọ.” Ọ tụrụ aro ka ndị ga-ewepụta onwe ha n’afọ ofufo n’etiti ụmụ akwụkwọ ya—ndị Katọlik, ndị Buddha, na Ndịàmà Jehova—kwadebe okwu dị mkpirikpi ha ga-ekwu iji mee ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ mara banyere nkwenkwe na ihe omume ha. Ndịàmà Jehova atọ dị afọ iri na ụma wepụtara onwe ha ozugbo.

Mgbe ụbọchị ahụ ruru, onye mbụ kwuru okwu bụ Malwina dị afọ 15. Ụfọdụ n’ime ihe ndị o kwuru bụ́: “Ọtụtụ n’ime unu maara anyị tupu anyị amalite ịbịa ụlọ akwụkwọ a n’ihi na anyị achọtawo unu n’ebe obibi unu. Ikekwe unu na-eche ihe mere anyị ji nọgide na-achọta unu. Ọ bụ n’ihi na anyị na-agbaso ihe nlereanya Jisọs Kraịst, bụ́ Onye guzobere Iso Ụzọ Kraịst. O kwusara ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ. Ndị ozi na ndị Kraịst oge gboo ndị ọzọ mere otu ihe ahụ. N’ọtụtụ ebe, Ndịàmà Jehova na-atachi obi n’ọnwụnwa ndị tara akpụ n’ihi okwukwe ha, ma obi dị anyị ụtọ na anyị nwere udo n’ụlọ akwụkwọ anyị bụ́ nke unu nile keere òkè ịhụ na e nwere ya. Anyị na-ekele unu maka nke ahụ!”

Ná mmechi nke okwu ya, Malwina kwuru, sị: “E nwere ihe ọzọ mere anyị ji akpọtụrụ unu n’ebe obibi unu. Anyị na-echebara unu echiche. Bible na-ekwu na n’oge na-adịghị anya, ihe a kpọrọ mmadụ ga-ahụ ihe ndị ga-eme ka ụwa mee mkpọtụ. Ya mere, oge ọzọ anyị kụrụ aka n’ọnụ ụzọ unu, biko wepụtanụ oge iji gee ntị. Ọ ga-amasị anyị ịgwa unu otú anyị pụrụ isi bikọọ ọnụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime paradaịs n’elu ala.”

Onye ọzọ kwuru okwu bụ Mateusz, onye dịkwa afọ 15. Mateusz gwara ndị na-ege ya ntị na eri afọ ndị gafeworonụ, Ndịàmà Jehova ejiriwo ụzọ dị iche iche mee ihe iji gbasaa ozi ọma ahụ. Dị ka ihe atụ, na 1914—n’oge a na-eme ihe nkiri sịnịma a na-adịghị ekwu okwu na ya—Ndịàmà nọ na-egosi “Photo-Drama of Creation,” ihe nkiri a na-emegharị ahụ na ya nakwa slide ndị ha na okwu ndị e kwunyere na teepu na-agakọ.

Mateusz kwuru banyere òkè redio keere n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ ma kọwazie ihe omume kọmputa pụrụ iche bụ́ usoro ígwè ọrụ eletrik nke na-ahazi mkpụrụ okwu n’ọtụtụ asụsụ (MEPS) bụ́ nke Ndịàmà Jehova mepụtara. Ọ kọkwara otú Ndịàmà Jehova siworo nye aka n’ime ka ndị dọkịta mara banyere usoro ịgwọ ọrịa n’ejighị ọbara. “Ugbu a, ndị dọkịta a ma ama na Poland na-ekwu okwu ọma banyere nguzo anyị ma na-emesi ya ike na, kwa afọ, a na-awa ọtụtụ ndị ọrịa na-abụghị Ndịàmà ahụ n’ejighị ọbara,” ka o kwuru.

Mateusz mechiri site n’ikwu banyere owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ma kwuo, sị: “Ọ̀ ga-amasị unu ịbịa na nke anyị? A na-anabata mmadụ n’efu, a dịghịkwa anakọta ego.” Ka Mateusz na-ekwu banyere ebe a na-anọ enwe mgbakọ dị na Sosnowiec, ọ sịrị: “Unu kwesịrị ịga hụ nnukwu ụlọ a bara uru. Gịnị ma anyị yịkọọ jee ebe ahụ? Ọ dị aro anyị ga-atụrụ unu, enyi anyị Katarzyna gajekwa ịgwa unu banyere ya.”

Mgbe nke ahụ gasịrị, Katarzyna dị afọ 15 ji ịnụ ọkụ n’obi kwuo, sị: “A na-anabata unu na Sosnowiec maka mgbakọ distrikti nke Ndịàmà Jehova. A ga-atụle isiokwu ndị metụtara ndị na-eto eto.” Katarzyna kwukwara banyere ememe bụ́ isi nke ndị Kraịst—Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs Kraịst. Ọ gbara ndị na-ege ya ntị ume, sị: “N’afọ gara aga, ihe karịrị nde mmadụ 14 gburugburu ụwa gara ememe ahụ. Gịnị ma unu sonyere anyị n’oge ọzọ?”

Mgbe Malwina, Mateusz, na Katarzyna kwusịrị okwu ha, ha nyere ndị nkụzi ha akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom, tinyere kaseti vidio abụọ ndị tụlere nkwenkwe na ọrụ Ndịàmà Jehova. * Ndị nkụzi ahụ ji ekele nara ha ma kwe nkwa iji ha mee ihe n’ihe ọmụmụ akụkọ ihe mere eme.

Mgbe ihe ndị ahụ gasịrị, Martyna dị afọ 12 ji ngwá egwu bụọrọ ndị nile gbakọtaranụ abụ nke isiokwu ya bụ “Anyị Na-ekele Gị, Jehova.” Ndịàmà a na-eto eto ‘kwuwara okwu n’ime Chineke ha’ ma gbaa àmà dị mma. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:2) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya ha bụụrụ Ndịàmà na-eto eto n’ebe nile!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ndị Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ka Malwina na-akwadebe okwu ya ụbọchị ole na ole tupu ya ekwuo ya n’ụlọ akwụkwọ

[Foto dị na peeji nke 26]

Ka Katarzyna na-ahọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọ ga-eji mee ihe n’okwu ya