Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ̀ bụ na Ua ka ọ̀ bụ na Heran ka Jehova na Abraham nọ gbaa ndụ?
Ihe ndekọ mbụ nke ndụ Jehova na Abraham gbara dị na Jenesis 12:1-3, nke na-asị: “Jehova wee sị Abram, Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị ruo ala ahụ nke M ga-eme ka ị hụ ya anya: M ga-emekwa gị ka ị ghọọ mba ukwu, . . . a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.” * Ọ pụrụ ịbụ nnọọ na Jehova sooro Abraham banye n’ọgbụgba ndụ a mgbe Abraham nọ na Ua, ma kwughachi ya mgbe ọ nọ na Heran.
Na narị afọ mbụ, Stifen zoro aka n’iwu Jehova nyere Abraham ka ọ kwaga Kenean. Mgbe ọ na-agwa Sanhedrin okwu, ọ sịrị: “Chineke nke ebube mere ka nna anyị Abraham hụ Ya anya, mgbe ọ nọ na Mesọpotemia, mgbe ọ ka-ebighị na Heran, O wee sị ya, Si n’ala gị na n’etiti ikwu gị pụọ, bịa n’ala ahụ nke M ga-egosi gị.” (Ọrụ 7:2, 3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Abraham bi na Ua na mbụ, dịkwa ka Stifen gosiri, ebe ahụ bụ ebe mbụ a nọ nye ya iwu ịkwaga Kenean. (Jenesis 15:7; Nehemaịa 9:7) Stifen ekwughị banyere ndụ Chineke na Abraham gbara, ma, na Jenesis 12:1-3, e jikọrọ ọgbụgba ndụ ahụ na iwu nke ịkwaga Kenean. Ya mere ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ọ bụ na Ua ka Jehova na Abraham nọ gbaa ndụ.
Otú ọ dị, iji nlezianya gụọ ihe ndekọ Jenesis na-enye echiche na Jehova gwaghachiri Abraham okwu ọgbụgba ndụ ahụ na Heran, dị nnọọ ka o si kwughachi ma kọwakwuo akụkụ ya ụfọdụ n’oge dị iche iche na Kenean. (Jenesis 15:5; 17:1-5; 18:18; 22:16-18) Dị ka Jenesis 11:31, 32 si kwuo, Abraham, Sera, na Lọt sooro nna Abraham, bụ́ Tira, si Ua gawa Kenean. Ha garuru Heran ma nọrọ ebe ahụ ruo mgbe Tira nwụrụ. Abraham nọtere aka na Heran ruo n’ókè nke inweta akụ̀ na ụba dị ukwuu. (Jenesis 12:5) N’otu oge kwa, Nehoa, bụ́ nwanne nwoke Abraham, kwagakwara ebe ahụ.
Mgbe Bible kọsịrị banyere ọnwụ Tira, ọ kọrọ banyere okwu Jehova gwara Abraham ma gaa n’ihu, sị: “Abram wee jee, dị ka Jehova gwara ya okwu.” (Jenesis 12:4) N’ihi ya, Jenesis 11:31 –12:4 na-enyesi echiche ike na Jehova kwuru okwu ndị ahụ e dekọrọ na Jenesis 12:1-3 mgbe Tira nwụsịrị. Ọ bụrụ otú ahụ, Abraham si Heran kwaga n’ala ahụ Jehova gwara ya okwu ya n’ihi iwu e nyere ya mgbe ahụ nakwa nke e burula ụzọ nye ya na Ua ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ.
Dị ka Jenesis 12:1 si kwuo, Jehova nyere Abraham iwu, sị: “Si n’ala gị, sikwa n’ụmụnna gị, sikwa n’ụlọ nna gị, jee nke gị.” N’otu oge, ‘ala’ Abraham bụ Ua, “ụlọ” nna ya dịkwa n’ebe ahụ. Otú ọ dị, nna Abraham kpọọrọ ezinụlọ ya kwaga Heran, Abraham bịakwara kpọwa ebe ahụ ala ya. Ka ọ nọsịrị ọtụtụ afọ na Kenean wee ziga ohu ya ‘n’ala ya na ụmụnna ya’ ịchọtara Aịsak nwunye, ohu ahụ gara ‘n’obodo Nehoa’ (ma ọ́ bụghị Heran ọ bụrụ ebe dị ya nso). (Jenesis 24:4, 10) N’ebe ahụ, ohu ahụ hụrụ Rebeka n’etiti ndị ikwu Abraham, bụ́ nnukwu ezinụlọ Nehoa.—Jenesis 22:20-24; 24:15, 24, 29; 27:42, 43.
N’okwu Stifen gwara Sanhedrin, o kwuru banyere Abraham, sị: “Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke wee mee ka o site n’ebe ahụ bịa biri n’ala nke a, nke unu onwe unu bi n’ime ya ugbu a.” (Ọrụ 7:4) Nke a na-egosi na Jehova gwara Abraham okwu na Heran. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na n’oge ahụ, Jehova gwaghachiri Abraham okwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ka a kọrọ na Jenesis 12:1-3, ebe ọ bụ na ọgbụgba ndụ ahụ malitere ịdị irè mgbe Abraham kwagara Kenean. N’ihi ya, ntụle nke ihe nile bụ́ eziokwu na-eme ka e kwubie na ọ pụrụ ịbụ nnọọ na Ua ka Jehova sooro Abraham gbaa ndụ, ma kwughachi ya na Heran.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Jehova gbanwere aha Abram ịbụ Abraham na Kenean mgbe Abraham dị afọ 99.—Jenesis 17:1, 5.