Chebe Akọ na Uche Gị
Chebe Akọ na Uche Gị
ECHICHE nke ife n’ụgbọelu usoro ihe omume kọmputa ya na-adịghị mma bụ ihe na-atụ egwu. Ọ ka njọ ma ọ bụrụ na ọ dị onye kpaworo usoro nduzi nke ụgbọelu ahụ aka ọjọọ ma ọ bụ kpachara anya dehie ihe ndekọ ya! N’ụzọ ihe atụ, nke ahụ bụ kpọmkwem ihe otu onye na-anwa ime akọ na uche gị. O kpebisiri ike imebi usoro nduzi nke omume gị. Nzube ya bụ ime ka i tinye isi n’ụzọ ga-eme ka gị na Chineke nọrọ n’iro!—Job 2:2-5; Jọn 8:44.
Ònye bụ ajọ onye sabo a? Na Bible, a kpọrọ ya “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọ kpara ike n’ogige Iden mgbe, site n’iji akọ mee ihe, o mere ka Iv kwenye ileghara ihe ọ maara na o ziri ezi anya na inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-6, 16-19) Kemgbe ahụ, Setan emeela ka e nwee nnọọ òtù aghụghọ dị iche iche iji duba ndị mmadụ n’ozuzu ha n’ibuso Chineke iro. Nke ụta kasị dịrị n’etiti òtù ndị a bụ okpukpe ụgha.—2 Ndị Kọrint 11:14, 15.
Okpukpe Ụgha Na-emerụ Akọ na Uche
N’akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe, a na-ahụ okpukpe ụgha dị ka nwanyị akwụna ihe atụ nke a kpọrọ Babilọn Ukwu ahụ. Ozizi ya emebiwo echiche nke ọtụtụ ndị banyere omume ma mee ka ha kpọọ ndị nwere nkwenkwe dị iche asị ọbụna na-emeso ha ihe ike. N’ezie, dị ka Mkpughe si kwuo, ọ bụ okpukpe ụgha ka Chineke ga-ajụ ajụjụ n’ụzọ bụ́ isi maka ọbara “nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa,” gụnyere ndị na-efe Chineke n’onwe ya ofufe.—Mkpughe 17:1-6; 18:3, 24.
Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ókè okpukpe ụgha ga-emebiru ụkpụrụ omume nke ụfọdụ ndị mgbe o kwuru, sị: “Oge awa na-abịa, ka ọ ga-abụ na onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ọ na-ejere Chineke ozi.” Lee ka ndị dị otú ahụ na-eme ihe ike si bụrụ ndị kpuru ìsì n’omume! Jisọs kwuru, sị: “Ha amaghị Nna m, ha amaghịkwa Mụ.” (Jọn 16:2, 3, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Oge na-adịghị anya Jisọs kwusịrị okwu ndị ahụ, ụfọdụ ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị akọ na uche ha na-adịghị ama ikpe banyere mpụ ha, nyere iwu ka e gbuo ya onwe ya. (Jọn 11:47-50) N’ụzọ dị iche, Jisọs kwuru na a na-eji ịhụnanya ezi ụmụazụ ya nwere n’etiti onwe ha amata ha. Ma ịhụnanya ha sara mbara karị, n’ihi na ha na-ahụ ọbụna ndị iro ha n’anya.—Matiu 5:44-48; Jọn 13:35.
Ụzọ ọzọ okpukpe ụgha siworo mebie akọ na 2 Timoti 4:3.
uche ọtụtụ ndị bụ site n’ịnabata omume ọ bụla na-ewu ewu. N’ibu amụma banyere nke a, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Oge ga-adị mgbe ha agaghị anagide ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ; kama, ebe ha nwere ntị na-akọ ọkọ, ha ga-ekpokwasị ndị ozizi nye onwe ha dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị.”—N’oge ndị a, ndị ndú okpukpe na-eme ka ntị ndị mmadụ na-akọ ha ọkọ site n’ịsị na Chineke pụrụ ịnakwere mmadụ iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ. Ndị ọzọ na-anabata ndina ụdị onwe. N’ezie, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-edina ụdị onwe ha. Otu isiokwu gbara n’akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Times kwuru na a họpụtawo “ndị ụkọchukwu iri na atọ ọha na eze maara dị ka ndị na-edina ụdị onwe ha,” iso ná Nzukọ Bụ́ Isi nke Ndị Isi Chọọchị England. Mgbe ndị ndú chọọchị gbahapụrụ ụkpụrụ omume nke Bible, ọ dịchaghịkwa ihe chọọchị ha mere banyere ya, olee ụkpụrụ a chọrọ ka ndị parish ha gbasowe? Ọ bụchaghị ihe ijuanya na ọtụtụ nde mmadụ amatụghị ebe ha kwụ akwụ.
Lee ka o si kara mma ịbụ ndị eziokwu ime mmụọ na nke omume dị na Bible, bụ́ ndị yiri ogidi ọkụ, na-eduzi! (Abụ Ọma 43:3; Jọn 17:17) Dị ka ihe atụ, Bible na-akụzi na ndị nile na-akwa iko “agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ na-agwa anyị na ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị ‘weere ihe ha bụ site n’ọmụmụ gbanwere ihe na-emegide ka e si mụọ ha’ “na-arụpụta ihe na-adịghị mma” n’anya Chineke. (Ndị Rom 1:26, 27, 32) Eziokwu ndị a metụtara omume abụghị ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè chepụtara; ha bụ ụkpụrụ Chineke ndị sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ndị ọ na-akagbubeghị ma ọlị. (Ndị Galetia 1:8; 2 Timoti 3:16) Ma Setan nwere ụzọ ndị ọzọ o si emebi akọ na uche.
Na-eme Nhọrọ ná Ntụrụndụ
Ọ bụ otu ihe ịmanye mmadụ ime ihe ọjọọ, ma, ọ bụ ihe ọzọ ime ka ọ chọọ ime omume dị otú ahụ. Nke a bụ ihe mgbaru ọsọ nke “onyeisi nke ụwa nke a,” bụ́ Setan. Iji kụnye echiche ọjọọ ya n’uche na n’obi nke ndị nzuzu ma ọ bụ ndị na-adịghị nke ha ma—karịsịa ndị na-eto eto, bụ́ ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ—ọ na-eji ihe ndị dị ka akwụkwọ ọgụgụ, ihe nkiri sịnịma, egwú, egwuregwu kọmpụta ndị a na-enyo enyo, na ógbè a na-egosi ihe na-akpali agụụ mmekọahụ na ha n’Internet, eme ihe.—Jọn 14:30; Ndị Efesọs 2:2.
“Ndị na-eto eto [nọ na United States] na-ekiri ihe omume ime ihe ike e mere atụmatụ na ha dị 10,000 kwa afọ,” ka otu akụkọ si n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Pediatrics kwuru, “ihe omume ndị a na-emere ụmụaka bụkwa ndị ihe ike kasị adị na ha.” Akụkọ ahụ na-ekpughekwa na “kwa afọ, ndị nọ n’afọ iri na ụma na-ekiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe omume 15,000 ndị metụtara mmekọahụ, ebubo ụgha, na ihe ọchị.” Ọbụna ihe ndị a na-egosi na telivishọn n’oge ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu na-ekiri ya, ka o kwuru, “na-enwe ihe karịrị omume mmekọahụ 8 kwa awa, bụ́ ihe ji okpukpu anọ karịa ka ọ dị na 1976.” Ọ bụghị ihe ijuanya na a chọpụtakwara n’Ilu 4:23, bụ́ nke na-asị: “Chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.”—Aịsaịa 48:17.
ná nnyocha ahụ na “okwu rere ure na-arịwanyekwa elu n’ụzọ dị ịrịba ama.” Otú ọ dị, ma Bible ma ọtụtụ ihe ọmụmụ sayensị na-adọ aka ná ntị na isi n’ihe ndị ahụ enweta ihe ọmụma na-agbanwe ndị mmadụ ịka njọ. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ime Chineke obi ụtọ ma baara onwe gị uru n’ezie, ṅaa ntịỌtụtụ egwú ndị na-ewu ewu na-emerụkwa akọ na uche. Otu onye na-eti egwu bụ́ onye egwú ya na-ewu nnọọ ewu n’ọtụtụ ala ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-eme “mgbalị pụrụ iche ịgụ ihe na-awụ akpata oyi,” ka otu akụkọ si n’akwụkwọ akụkọ Australia bụ́ The Sunday Mail na-adọ aka ná ntị. Isiokwu ahụ na-ekwu na “egwú ya na-ebuli ọgwụ ọjọọ, idina onye ikwu na ndina n’ike elu” nakwa na ọ “na-agụ banyere igbu nwunye ya na ịtụba ozu ya n’ọdọ mmiri.” Ihe ndị ọzọ ọ gụrụ n’egwú ya dị oké njọ ikwu ya n’ebe a. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwetara ihe nrite dị ùgwù n’ihi egwú ya. Ọ̀ ga-amasị gị iji echiche ndị jọgburu onwe ha dị ka ndị ahụ e kwuru n’elu mejuo uche na obi gị, ọbụna ma a sị na e ji egwú mee ka ha na-adọrọ adọrọ? O yiri ka ị gaghị eme otú ahụ, n’ihi na ndị na-eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ na-emerụ akọ na uche ha ma na-eme ka ha nwee “ajọ obi” n’ikpeazụ, bụ́ nke na-eme ka ha ghọọ ndị iro Chineke.—Ndị Hibru 3:12; Matiu 12:33-35.
Ya mere, jiri amamihe na-ahọrọ ntụrụndụ. Bible na-agba anyị ume, sị: “Ka ihe bụ́ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.
Mkpakọrịta Na-emetụta Akọ na Uche Gị
Mgbe Neil na Franz bụ ụmụaka, ha sooro ezi ndị Kraịst nwee mkpakọrịta dị mma. * Ma ka oge na-aga, ka Neil kwuru, “amalitere m iso ndị enyi ọjọọ na-akpakọrịta.” Ihe si na ya pụta n’ikpeazụ, bụ́ nke ọ kwara ụta na ya nke ukwuu, bụ mpụ na ịga nga. Franz kọkwara ihe yiri nke ahụ. “Echere m na aga m esoli ndị na-eto eto bụ́ ndị ụwa kpakọrịta ma gharakwa ịbụ onye omume ha metụtara,” ka ọ kwara n’arịrị. “Ma dị ka Ndị Galetia 6:7 si kwuo, ‘Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.’ Achọpụtara m n’ụzọ dị mwute na adara m ya ma Jehova ziri ezi. A tụọla m nga mkpụrụ ọka n’ihi ihe ọjọọ m meworo.”
Mmadụ ndị dị ka Neil na Franz adịghị etinye aka na mpụ na mberede; na mbụ, ha ga-echedị na ha apụghị ime ya. Mkpafu ahụ yiri ka ọ na-ewere ọnọdụ ná nkebi ná nkebi, nke mbụ na-abụkarị mkpakọrịta ọjọọ. (1 Ndị Kọrint 15:33) Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe ma ọ bụ ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè pụrụ isochi ya. N’ezie, a kọwawo akọ na uche n’ụzọ dabara adaba dị ka “akụkụ mmadụ nke ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na-emebi.” E mebihaala ya, ime mpụ ma ọ bụ omume rụrụ arụ na-adịzi nnọọ mfe.
Gịnịzi mere ị ga-eji were nzọụkwụ nke mbụ ahụ? Kama nke ahụ, soro ndị maara ihe bụ́ ndị hụrụ Chineke n’anya n’ezie na-akpakọrịta. Ha ga-enyere gị aka iwusi akọ na uche gị ike ka o wee duzie gị nke ọma, na-eme ka ị ghara inweta ọtụtụ ihe mgbu. (Ilu 13:20) Ọ bụ ezie na Neil na Franz ka nọ n’ụlọ nga, ha na-ahụzi akọ na uche ha dị ka onyinye si n’aka Chineke bụ́ nke a ga-azụ nke ọma, ee, nke a ga-eji kpọrọ ihe. Ọzọkwa, ha na-arụsi ọrụ ike iso Chineke ha, bụ́ Jehova, na-enwe ezi mmekọrịta. Mara ihe, ma mụta ihe site n’ihie ụzọ ha.—Ilu 22:3.
Lekọta Akọ na Uche Gị
Anyị na-egosi na anyị chọrọ ilekọta akọ na uche anyị mgbe anyị na-azụlite ịhụnanya na okwukwe n’ebe Chineke nọ, ma na-atụkwa ya egwu dị mma. (Ilu 8:13; 1 Jọn 5:3) Bible na-ekpughe na akọ na uche na-enweghị mmetụta ndị a, adịghị akwụsikarị ike n’omume ọma. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 14:1 na-ekwu banyere ndị na-ekwu n’obi ha, sị: “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” Olee otú enweghị okwukwe a si emetụta omume ha? Amaokwu ahụ gara n’ihu, sị: “Ha ebibiwo onwe ha, ha emewo ka omume ha bụrụ ihe arụ.”
Ndị na-enweghị ezi okwukwe n’ebe Chineke nọ enweghịkwa olileanya siri ike maka ọdịnihu ka mma. N’ihi ya, ha na-achọ ibi ndụ maka taa, na-emeju ọchịchọ anụ ahụ ha. Echiche ha bụ: “Ka anyị rie nụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) N’aka nke ọzọ, ihe ụtọ nke ụwa bụ́ nke na-apụ n’anya ngwa ngwa adịghị adọpụ uche nke ndị anya ha lekwasịrị n’ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi. Dị ka kọmputa dị mma nke na-eduzi ụgbọelu, akọ na uche ha na-eme ka ha nọrọ n’ezi ụzọ nke iji iguzosi ike n’ihe na-erubere Chineke isi.—Ndị Filipaị 3:8.
Ka akọ na uche gị wee nọgide na-adị ike ma na-ezi ezi, nduzi sitere n’Okwu Chineke dị ya mkpa mgbe nile. Bible na-agwa anyị na nduzi dị otú ahụ dị, mgbe o ji ụzọ ihe atụ na-ekwu, sị: “Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.” (Aịsaịa 30:21) Ya mere, wepụta oge maka ọgụgụ Bible kwa ụbọchị. Nke a ga-ewusi gị ike ma gbaa gị ume mgbe ị na-adọga ime ihe ziri ezi ma ọ bụ mgbe ị na-enwe oké nsogbu na nchegbu. Jide n’aka na Jehova ga-eduzi gị n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ ma ọ bụrụ na ị tụkwasị ya obi n’ụzọ zuru ezu. Ee, ṅomie ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “Edowo m Jehova n’ihu m mgbe nile: n’ihi na Ọ nọ n’aka nri m, a gaghị ewezụga m n’ọnọdụ m.”—Abụ Ọma 16:8; 55:22.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 A gbanwewo aha ndị ahụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 5]
Ọ bụ okpukpe ụgha, bụ́ nke a kọwara na Bible dị ka “Babilọn Ukwu ahụ,” mebiri akọ na uche ọtụtụ ndị
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ka ụkọchukwu na-agọzi ndị agha: Foto U.S. Army
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ikiri ihe ike na omume rụrụ arụ ga-emebi akọ na uche gị
[Foto dị na peeji nke 7]
Inweta nduzi mgbe nile site n’Okwu Chineke ga-echebe akọ na uche gị