Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ Chineke Nke Ogologo Ntachi Obi

Jehova Bụ Chineke Nke Ogologo Ntachi Obi

Jehova Bụ Chineke Nke Ogologo Ntachi Obi

“Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere.”—ỌPỤPỤ 34:6.

1, 2. (a) Olee ndị ritere uru site n’ogologo ntachi obi Jehova n’oge gara aga? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ogologo ntachi obi” pụtara?

NDỊ oge Noa, ụmụ Israel ha na Mosis so ji ụkwụ na-agabiga ọzara, ndị Juu biri ndụ mgbe Jisọs jegharịrị n’ụwa—ndị a nile biri ndụ n’ọnọdụ ndị dịrịtara iche. Ma ha nile ritere uru site n’otu àgwà obiọma nke Jehova—ogologo ntachi obi. Nye ụfọdụ, ọ bụ ya bụ na ha dị ndụ. Ogologo ntachi obi Jehova pụkwara ịpụtara anyị ndụ.

2 Gịnị bụ ogologo ntachi obi? Olee mgbe Jehova na-egosi ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? A kọwawo “ogologo ntachi obi” dị ka “iji ndidi na-atachi obi ná mmejọ ma ọ bụ ná mkpasu iwe, ya na ịghara ịkwụsị inwe olileanya na a pụrụ imezi mmekọrịta mebiri emebi.” N’ihi ya, àgwà a nwere nzube. Ọ na-eleba anya karịsịa n’ọdịmma nke onye ahụ na-akpata esemokwu. Otú ọ dị, inwe ogologo ntachi obi apụtaghị ịnabata ihe ọjọọ. Mgbe e mezuru nzube e ji na-enwe ogologo ntachi obi ma ọ bụ mgbe ọ na-abaghịzi uru ịnọgide na-anagide ọnọdụ ahụ, a na-akwụsị inwe ogologo ntachi obi.

3. Gịnị bụ nzube Jehova jiworo na-enwe ogologo ntachi obi, oleekwa ebe ọ ga-ejedebe?

3 Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ pụrụ inwe ogologo ntachi obi, Jehova bụ onye nlereanya kasịnụ n’àgwà a. N’ime afọ ndị gafeworonụ kemgbe mmehie mebisịrị mmekọrịta dị n’etiti Jehova na ihe o kere eke bụ́ mmadụ, Onye Okike anyị ejiwo ndidi na-atachi obi, o nyewokwa ihe ụmụ mmadụ nwere nchegharị pụrụ ịdabere na ya mezie mmekọrịta ha na ya. (2 Pita 3:9; 1 Jọn 4:10) Ma mgbe e mezuru nzube Chineke ji na-enwe ogologo ntachi obi, ọ ga-eme ihe megide ndị ma ụma na-eme mmehie, na-eweta ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe.—2 Pita 3:7.

Ya na Àgwà Ndị Bụ́ Isi nke Chineke Kwekọrọ

4. (a) Olee otú e si gosipụta echiche nke ogologo ntachi obi n’Akwụkwọ Nsọ Hibru? (Leekwa ihe odide ala ala peeji.) (b) Olee otú Nehum onye amụma si kọwaa Jehova, gịnịkwa ka nke a na-ekpughe banyere ogologo ntachi obi Jehova?

4 N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e ji okwu Hibru abụọ pụtara n’ụzọ nkịtị “ogologo nke oghere imi” bụ́kwa ndị a sụgharịrị na New World Translation ịbụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,” gosipụta echiche nke ogologo ntachi obi. * N’ikwu banyere ogologo ntachi obi Chineke, Nehum onye amụma sịrị: “Jehova adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ dịkwa ukwuu n’ike, ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla Ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Nehum 1:3) N’ihi ya, ogologo ntachi obi Jehova abụghị ihe àmà nke adịghị ike, ọ bụghịkwa nke na-enweghị ókè. Eziokwu ahụ bụ́ na Chineke nke pụrụ ime ihe nile adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ ma n’otu oge ahụ nwee ike dị ukwuu na-egosi na ogologo ntachi obi ya bụ n’ihi njide onwe onye nwere nzube. O nwere ike nke inye ntaramahụhụ, ma ọ na-ama ụma ahapụ ime otú ahụ ozugbo iji nye onye ajọ omume ahụ ohere ịgbanwe. (Ezikiel 18:31, 32) N’ihi ya, ogologo ntachi obi Jehova bụ ngosipụta nke ịhụnanya ya, ọ na-egosipụtakwa amamihe Ya n’otú o si eji ike ya eme ihe.

5. N’ụzọ dị aṅaa ka ogologo ntachi obi Jehova na ikpe ziri ezi ya si kwekọọ?

5 Ogologo ntachi obi Jehova kwekọkwara n’ikpe ziri ezi na ezi omume ya. O kpugheere Mosis onwe ya dị ka “Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ [“onye nwere ogologo ntachi obi,” King James Version], Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6) Ọtụtụ afọ ka e mesịrị, Mosis bụkuru Jehova abụ otuto, sị: “Ụzọ Ya nile bụ ikpe ziri ezi: Chineke Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke na-enweghị ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ.” (Deuterọnọmi 32:4) Ee, ebere, ogologo ntachi obi, ikpe ziri ezi, na izi ezi Jehova na-arụkọ ọrụ ọnụ.

Ogologo Ntachi Obi Jehova Tupu Iju Mmiri Ahụ

6. Ihe àmà dị aṅaa dị ịrịba ama nke ogologo ntachi obi ka Jehova gosipụtaworo n’ebe ụmụ Adam na Iv nọ?

6 Nnupụisi nke Adam na Iv n’Iden mebiri mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke ha na Onye Okike ha na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, n’ụzọ na-adịgide adịgide. (Jenesis 3:8-13, 23, 24) Nkewapụ a metụtara ụmụ ha, bụ́ ndị ketara mmehie, ezughị okè, na ọnwụ. (Ndị Rom 5:17-19) Ọ bụ ezie na di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ ma ụma mee mmehie, Jehova kwere ka ha mụọ ụmụ. Ka e mesịrị, o ji ịhụnanya nye ihe a pụrụ ịdabere na ya mee ka ya na ụmụ Adam na Iv dịghachi n’otu. (Jọn 3:16, 36) Pọl onyeozi kọwara, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị. Ya mere nke karịrị hie nne, ebe a gụsịrị anyị ná ndị ezi omume ugbu a n’ime ọbara Ya, a ga-azọpụta anyị n’iwe Chineke site n’aka Ya. N’ihi na a sị na, mgbe anyị bụ ndị iro, e sitere n’ọnwụ Ọkpara Ya mee ka anyị na Chineke dị n’otu: nke karịrị hie nne bụ, ebe e mesịrị ka anyị na Chineke dị n’otu, na a ga-azọpụta anyị n’ime ndụ Ya.”—Ndị Rom 5:8-10.

7. Olee otú Jehova si gosipụta ogologo ntachi obi tupu Iju Mmiri ahụ, n’ihi gịnịkwa ka mbibi e bibiri ọgbọ ahụ dịrị ndụ tupu Iju Mmiri ahụ ji zie ezie?

7 A hụrụ ogologo ntachi obi Jehova n’ụbọchị Noa. Ihe karịrị otu narị afọ tupu Iju Mmiri ahụ, “Chineke [hụrụ] ụwa, ma, lee, e bibiri ya; n’ihi na anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, bibiri ụzọ ya n’elu ụwa.” (Jenesis 6:12) Otú ọ dị, ruo oge a kpaara ókè, Jehova gosipụtara ogologo ntachi obi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Ọ sịrị: “Mmụọ m agaghị achị achị n’ime mmadụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na ya onwe ya bụkwa anụ ahụ: ma ụbọchị ya nile ga-abụ [otu narị afọ na iri afọ abụọ].” (Jenesis 6:3) Afọ 120 ahụ nyere Noa kwesịrị ntụkwasị obi ohere inwe ezinụlọ na—mgbe a gwara ya banyere ihe Chineke kpebiri ime—iwu ụgbọ na ịdọ ndị ya na ha dịkọrọ ndụ aka ná ntị banyere Iju Mmiri nke na-abịanụ. Pita onyeozi dere, sị: “Ogologo ntachi obi Chineke na-echesi ike n’ụbọchị Noa, mgbe a na-edozi ụgbọ, nke e weere mmiri zọpụta mmadụ ole na ole, ya bụ mmadụ asatọ, n’ime ya.” (1 Pita 3:20) N’eziokwu, ndị na-esoghị n’ezinụlọ Noa ‘amaghị’ banyere nkwusa ya. (Matiu 24:38, 39) Ma site n’ime ka Noa wuo ụgbọ ma jee ozi ikekwe ruo ọtụtụ iri afọ dị ka “onye na-ekwusa ezi omume,” Jehova nyere ndị ha na Noa dịkọrọ ndụ ohere zuru ezu ichegharị site n’ụzọ ime ihe ike ha ma bịa jewere Ya ozi. (2 Pita 2:5; Ndị Hibru 11:7) Mbibi e bibiri ọgbọ ọjọọ ahụ n’ikpeazụ ziri nnọọ ezi.

Ogologo Ntachi Obi Kwesịrị Nṅomi n’Ebe Israel Nọ

8. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si gosipụta ogologo ntachi obi n’ebe mba Israel nọ?

8 Ogologo ntachi obi Jehova nwere n’ebe Israel nọ dịruru ihe karịrị nnọọ afọ 120. N’ime ihe karịrị afọ 1,500 nile nke akụkọ ihe mere eme nke ụmụ Israel dị ka ndị Chineke họpụtara, ọ bụ nanị ugboro ole na ole ka ha na-anwaghị ogologo ntachi obi Chineke ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu. Nanị izu ole na ole a gbapụtasịrị ha n’Ijipt n’ụzọ ọrụ ebube, ha malitere ife arụsị, na-egosi oké enweghị nkwanye ùgwù n’ebe Onye Nzọpụta ha nọ. (Ọpụpụ 32:4; Abụ Ọma 106:21) N’ime iri afọ ndị sochirinụ, ụmụ Israel mere mkpesa banyere ihe oriri Jehova nyere ha n’ọzara n’ụzọ ọrụ ebube, tamuo ntamu megide Mosis na Erọn, kwuo okwu megide Jehova, ma soro ndị na-ekpere arụsị kwaa iko, ọbụna na-ekere òkè n’ofufe Beal. (Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6; 14:2-4; 21:5; 25:1-3; 1 Ndị Kọrint 10:6-11 ) Jehova pụrụ izi ezi n’ikpochapụwo ndị ya, ma kama nke ahụ, o gosipụtara ogologo ntachi obi.—Ọnụ Ọgụgụ 14:11-21.

9. N’oge Ndị Ikpe na n’oge ọchịchị ndị eze, olee otú Jehova si gosipụta na ya bụ Chineke nke ogologo ntachi obi?

9 N’oge Ndị Ikpe, ụmụ Israel dabara n’ikpere arụsị ugboro ugboro. Mgbe ha mere otú ahụ, Jehova na-agbahapụ ha n’aka ndị iro ha. Ma mgbe ha chegharịrị, ma kpọkuo ya maka enyemaka, ọ na-egosipụta ogologo ntachi obi ma kpọlite ndị ikpe ịnapụta ha. (Ndị Ikpe 2:17, 18) N’ogologo oge nke ọchịchị ndị eze, ọ bụ ndị eze ole na ole ji obi ha dum fee Jehova. Ọbụnadị n’okpuru ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ahụ gwakọtara ezi ofufe na ofufe ụgha. Mgbe Jehova kpọlitere ndị amụma ya ịdọ ha aka ná ntị banyere ekwesịghị ntụkwasị obi ha, ha na-ahọrọkarị ige ndị nchụàjà rụrụ arụ na ndị amụma ụgha ntị. (Jeremaịa 5:31; 25:4-7) N’ezie, ụmụ Israel kpagburu ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke Jehova ọbụnadị gbuo ụfọdụ n’ime ha. (2 Ihe E Mere 24:20, 21; Ọrụ 7:51, 52) Otú o sina dị, Jehova nọgidere na-egosipụta ogologo ntachi obi.—2 Ihe E Mere 36:15.

Ogologo Ntachi Obi Jehova Ejedebeghị

10. Olee mgbe ogologo ntachi obi Jehova ruru n’ókè ya?

10 Otú ọ dị, akụkọ ihe mere eme na-egosi na ogologo ntachi obi Chineke nwere ókè. Na 740 T.O.A., o kwere ka Asiria kwatuo alaeze ebo iri nke Israel ma dọrọ ndị bi na ya n’agha laa n’ala ọzọ. (2 Ndị Eze 17:5, 6) Ná ngwụsị nke narị afọ sochirinụ, o kwere ka Babilọn wakpoo alaeze ebo abụọ nke Juda ma bibie Jerusalem na ụlọ nsọ ya.—2 Ihe E Mere 36:16-19.

11. Olee otú Jehova si gosipụta ogologo ntachi obi ọbụna mgbe ọ na-emezu ihe o kpere n’ikpe?

11 Otú ọ dị, ọbụna mgbe Jehova na-emezu ihe o kpere n’ikpe megide Israel na Juda, o chefughị inwe ogologo ntachi obi. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Jeremaịa, Jehova buru amụma banyere mweghachi nke ndị ya ọ họpụtara ahọpụta. Ọ sịrị: “Mgbe [afọ iri asaa] ruzuru nye Babilọn, M ga-eleta unu, mee ka eziokwu m ahụ guzosiere unu ike, n’ime ka unu lọta n’ebe a. M ga-ekwekwa ka unu chọta m, . . . M ga-emekwa ka ndị unu a dọtara n’agha lọta, M ga-esikwa ná mba nile, na n’ebe nile M chụgaworo unu, chịkọta unu.”—Jeremaịa 29:10, 14.

12. Olee otú nlaghachi nke ndị fọdụrụnụ ná ndị Juu si bụrụ n’okpuru nduzi Chineke ma a bịa n’ihe banyere ọbịbịa nke Mesaịa ahụ?

12 N’ezie ihe fọdụrụnụ ná ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ laghachiri na Juda ma maliteghachi ife Jehova n’ụlọ nsọ ahụ e wughachiri ewughachi dị na Jerusalem. Ná mmezu nke nzube Jehova, ihe a fọdụrụnụ ga-adị ka “igirigi sitere n’ebe Jehova nọ,” bụ́ nke na-eweta ume ọhụrụ na ọganihu. Ha ga-enwekwa obi ike ma dị ike dị ka “ọdụm n’etiti anụmanụ nke oké ọhịa.” (Maịka 5:7, 8) Ọ pụrụ ịbụ na okwu nke ikpeazụ a mezuru n’oge ndị Maccabee bụ́ mgbe ndị Juu, n’okpuru nduzi nke ezinụlọ Maccabee, chụpụrụ ndị iro ha n’Ala Nkwa ahụ ma raraghachi ụlọ nsọ ahụ e merụworo nye. N’ụzọ dị otú a, e chebere ala ahụ na ụlọ nsọ ahụ ka ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi fọdụrụnụ wee nwee ike ịnabata Ọkpara Chineke mgbe ahụ ọ pụtara dị ka Mesaịa.—Daniel 9:25; Luk 1:13-17, 67-79; 3:15, 21, 22.

13. Ọbụna mgbe ndị Juu gbusịrị Ọkpara ya, olee otú Jehova si nọgide na-egosi ha ogologo ntachi obi?

13 Ọbụna mgbe ndị Juu gbusịrị Ọkpara ya, Jehova nọgidere na-egosi ha ogologo ntachi obi ruo afọ atọ ọzọ na ọkara, na-enye ha ohere nke ịbụ nanị ndị a kpọrọ ịghọ akụkụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham. (Daniel 9:27) * Tupu afọ 36 O.A., na mgbe ọ gasịrị, ụfọdụ ndị Juu zara òkù a, n’ụzọ dịkwa otú a, dị ka Pọl si mesịa kwuo ya, “ndị fọdụrụ apụtawokwa dị ka nhọpụta nke amara si dị.”—Ndị Rom 11:5.

14. (a) Na 36 O.A., ole ndị ka e nyere ihe ùgwù nke ịghọ akụkụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham? (b) Olee otú Pọl si gosipụta mmetụta o nwere banyere ụzọ Jehova si ahọrọ ndị ga-eso n’Israel ime mmụọ?

14 Na 36 O.A., na nke mbụ ya, e nyere ndị na-abụghị ma ndị Juu ma ndị na-eso ụzọ ndị Juu ihe ùgwù nke ịghọ akụkụ nke mkpụrụ ime mmụọ nke Abraham. Jehova gosipụtakwara obi ebere na ogologo ntachi obi n’ebe ndị nile nakweere ya nọ. (Ndị Galetia 3:26-29; Ndị Efesọs 2:4-7) Mgbe Pọl na-egosipụta obi ekele miri emi maka amamihe dị n’ogologo ntachi obi Jehova ji obi ebere na-enwe na nzube o ji na-enwe ya, bụ́ nke mere ka e nwee ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke ndị a kpọrọ imejupụta Israel ime mmụọ, o tiri mkpu, sị: “Aa! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe Ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ Ya nile!”—Ndị Rom 11:25, 26, 33; Ndị Galetia 6:15, 16.

Ogologo Ntachi Obi n’Ihi Aha Ya

15. Gịnị bụ isi ihe mere Chineke ji na-enwe ogologo ntachi obi, ihe iseokwu dịkwa aṅaa chọrọ oge iji dozie ya?

15 N’ihi gịnị ka Jehova ji enwe ogologo ntachi obi? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ iji bulie aha ya dị nsọ elu na iji wepụ ọbụbụeze ya n’ụta. (1 Samuel 12:20-22) Ihe iseokwu metụtara omume nke Setan welitere banyere ụzọ Jehova si eji ọbụbụeze Ya eme ihe chọrọ oge iji dozie ya n’ụzọ na-eju afọ n’ihu ihe nile e kere eke. (Job 1:9-11; 42:2, 5, 6) N’ihi ya, mgbe a na-akpagbu ndị ya n’Ijipt, Jehova gwara Fero, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka M guzoworo gị, ka M wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.”—Ọpụpụ 9:16.

16. (a) Olee otú ogologo ntachi obi Jehova si mee ka o kwe omume iwepụtara aha ya otu ndị? (b) Olee otú a ga-esi edo aha Jehova nsọ ma wepụ ọbụbụeze ya n’ụta?

16 Pọl onyeozi hotara okwu Jehova gwara Fero mgbe ọ kọwara òkè ogologo ntachi obi Chineke na-ekere n’ibuli aha nsọ Ya elu. Mgbe ahụ Pọl dere, sị: “Gịnịkwa, ma ọ bụrụ na Chineke, ọ bụ ezie na Ọ na-achọ igosi iwe Ya, na ime ka a mara ike Ya, ma O weere ogologo ntachi obi hie nne nagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi: ka O wee meekwa ka a mara akụ̀ nke ebube Ya n’ahụ ihe dịịrị ebere, nke O buru ụzọ dozie ka ha baa n’ebube, bụ́ anyị onwe anyị, ndị Ọ kpọkwara, ọ bụghị site na nanị ndị Juu, kama sitekwa ná ndị mba ọzọ? Dị ka Ọ na-ekwukwa n’akwụkwọ Hosea, sị, M ga-akpọ ndị ahụ ndị m, nke na-abụghị ndị m.” (Ndị Rom 9:17, 22-25) N’ihi na Jehova gosipụtara ogologo ntachi obi, o si ná mba dị iche iche wepụtara “aha Ya otu ndị.” (Ọrụ 15:14) N’okpuru Onyeisi ha, bụ́ Jisọs Kraịst, “ndị nsọ” a bụ ndị nketa nke Alaeze ahụ Jehova ga-eji edo aha ukwu Ya nsọ ma wepụ ọbụbụeze ya n’ụta.—Daniel 2:44; 7:13, 14, 27; Mkpughe 4:9-11; 5:9, 10.

Ogologo Ntachi Obi Jehova Na-arụpụta Nzọpụta

17, 18. (a) Site n’ime gịnị ka anyị pụrụ ịdị na-akatọ Jehova n’amaghị ama maka igosipụta ogologo ntachi obi? (b) Olee otú a gbara anyị ume isi na-ele ogologo ntachi obi Jehova anya?

17 Site n’oge mbụ ihe a kpọrọ mmadụ dabara ná mmehie na-eweta mbibi ruo ugbu a, Jehova egosipụtawo onwe ya ịbụ Chineke nke nwere ogologo ntachi obi. Ogologo ntachi obi o nwere tupu Iju Mmiri ahụ nyere ohere ka a dọọ aka ná ntị n’ụzọ zuru ezu nakwa ka e wuo ihe a ga-eji azọpụta ndị mmadụ. Ma ndidi ya ruru n’ókè ya, Iju Mmiri ahụ bịakwara. N’otu aka ahụ taa, Jehova na-egosipụta ogologo ntachi obi dị ukwuu, nke a adịtewekwala aka karịa ka ụfọdụ ndị pụrụ ịtụwo anya ya. Otú ọ dị, nke ahụ abụghị ihe mere a ga-eji daa mbà. Ime nke ahụ ga-abụ ịkatọ Chineke n’ihi inwe ogologo ntachi obi. Pọl jụrụ, sị: “Ị̀ na-elelị akụ̀ nke obiọma Ya na nke nnagide Ya na nke ogologo ntachi obi Ya, ebe ị na-amaghị na ọrụ obiọma Chineke na-eduba gị ná nchegharị?”—Ndị Rom 2:4.

18 Ọ dịghị onye n’ime anyị pụrụ ịma ókè ogologo ntachi obi Chineke dịruru anyị mkpa iji jide n’aka na anyị ga-enweta nnwapụta ya maka nzọpụta. Pọl na-adụ anyị ọdụ ‘iwere egwu na ịma jijiji na-arụpụta nzọpụta nke onwe anyị.’ (Ndị Filipaị 2:12) Pita onyeozi degaara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.”—2 Pita 3:9, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.

19. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi jiri ogologo ntachi obi Jehova mee ihe bara uru?

19 N’ihi ya, ka anyị ghara ịbụ ndị na-adịghị enwe ndidi n’ụzọ Jehova si eme ihe. Kama nke ahụ, ka anyị gbasoo ndụmọdụ ọzọ Pita nyere ma ‘na-agụ ogologo ntachi obi Onyenwe anyị na ọ bụ nzọpụta.’ Nzọpụta nke ònye? Nke anyị nakwa, a gbatịa ya, nke ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ bụ́ ndị ọ ka dị mkpa ịnụ ‘ozi ọma nke alaeze eluigwe.’ (2 Pita 3:15; Matiu 24:14) Nke a ga-enyere anyị aka inwe ekele maka otú Jehova siworo jiri mmesapụ aka na-egosipụta ogologo ntachi obi ma kpalie anyị ịdị na-enwe ogologo ntachi obi mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 N’asụsụ Hibru, a na-ejikarị okwu e ji eme ihe maka “imi” ma ọ bụ “oghere imi” (ʼaph) eme ihe n’ụzọ ihe atụ maka iwe. Nke a bụ n’ihi otú onye iwe ji si eku ume ike ike.

^ par. 13 Iji nwetakwuo nkọwa nke amụma a, lee akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, peeji nke 190-194, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “ogologo ntachi obi” pụtara na Bible?

• Olee otú Jehova si gosipụta ogologo ntachi obi tupu Iju Mmiri ahụ, mgbe ndọrọ n’agha gaa na Babilọn gasịrị, nakwa na narị afọ mbụ O.A.?

• N’ihi ihe ndị dị aṅaa dị mkpa ka Jehova jiworo gosipụta ogologo ntachi obi?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ogologo ntachi obi Jehova anya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ogologo ntachi obi Jehova gosipụtara tupu Iju Mmiri ahụ nyere ndị mmadụ ohere zuru ezu ichegharị

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbe Babilọn dasịrị, ndị Juu ritere uru site n’ogologo ntachi obi Jehova

[Foto dị na peeji nke 11]

Na narị afọ mbụ, ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu ritere uru site n’ogologo ntachi obi Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 12]

Ndị Kraịst taa na-eji ogologo ntachi obi Jehova eme ihe bara uru