Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-ebibi Osisi

Ndị Na-ebibi Osisi

Ndị Na-ebibi Osisi

N’OGE Bible, e weere osisi dị ka ihe onwunwe bara uru. Dị ka ihe atụ, mgbe Abraham zụtara ebe ọ ga-eli nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Sera, osisi so n’ihe ndị e deturu dị ka ihe onwunwe ndị ga-abụzi nke ya.—Jenesis 23:15-18.

N’otu aka ahụ taa, e ji osisi kpọrọ ihe nke ukwuu, mba dị iche iche na-atụkwasịkwa uche nke ukwuu n’ichekwa ọhịa. Akwụkwọ bụ́ State of the World 1998 na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị bi ná mba ndị dị n’ebe ugwu na-enwe nchegbu banyere ọhịa ndị dị n’ebe etiti ụwa, e nwere ike ha agaghị ama na ọhịa ndị dị n’azụ ụlọ ha bụ ndị osisi kasị dịsasịa adịsasịa na ha na ndị a kasị emebi n’ime ụdị ọhịa nile.” Olee ihe ndị na-etinye ọhịa n’ihe ize ndụ ná mba ndị ahụ dị n’ebe ugwu Europe nakwa n’Ebe Ugwu America? Ọtụtụ mmadụ na-arụtụ aka n’igbukpọsị oké ọhịa, ma e nwere ihe ndị ọzọ ji nwayọọ nwayọọ ebibi osisi, na-ebibi ha otu otu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Olee ihe ndị ha bụ? Ha bụ mmetọ ikuku na mmiri ozuzo acid dị na ya. Ihe ndị a na-emetọ ihe pụrụ iji nke nta nke nta mee ka osisi ghara ịdị ike, na-eme ka ha ghara iguzogideli ọrịa na ụmụ ihe ndị na-egbu ha.

Ruo ọtụtụ iri afọ, ndị ọkà n’ihe banyere gburugburu ebe obibi na ụmụ amaala ndị ọzọ na-enwe nchegbu adọọla aka ná ntị banyere mkpa ọ dị ichebe usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa na gburugburu ha. N’afọ ndị 1980, mgbe ndị ọkà mmụta sayensị nọ na Germany mụsịrị banyere mmetụta mmetọ ikuku na mmiri ozuzo acid dị na ya na-enwe na gburugburu ebe obibi, ha kwubiri, sị: ‘Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere, ihe dị ka n’afọ 2000, ndị mmadụ ga na-ekiri ọhịa nanị na foto ochie nakwa n’ihe nkiri sịnịma.’ N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ụwa nwere ikike mmepụtaghachi siri ike ruo n’ókè nke na, ka ọ dị ugbu a, o guzogidewo ihe ka ukwuu n’ihe ndị ahụ e buru n’amụma na ha ga-emebi.

Otú ọ dị, e mee elu mee ala, ọ bụ Chineke ga-eme ihe kasịnụ iji chekwaa usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha. “[Ọ] bụ Onye na-esi n’ime ụlọ elu Ya nile dee ugwu nile mmiri” ma “na-eme ka ahịhịa puoro anụ ụlọ, na-emekwa ka ihe a kụrụ n’ala puoro ọrụ ubi mmadụ.” O kwewokwa nkwa “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” (Abụ Ọma 104:13, 14; Mkpughe 11:18) Lee ihe ebube ọ ga-abụ mgbe ndị bi n’ụwa ga-enwe ike ibi n’ụwa nke a na-emetọghị emetọ ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 37:9-11.