Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova

Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova

Akụkọ Ndụ

Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova

DỊ KA RUSSELL KURZEN SI KỌỌ

Apụtara m ụwa na September 22, 1907, afọ asaa tupu oge ahụ dị ịrịba ama nke ji ntiwapụ nke agha ụwa nke mbụ malite. Ezinụlọ anyị bara ọgaranya n’ụdị kasị mkpa. Echere m na ị ga-ekwere mgbe ị nụsịrị akụkọ ụfọdụ banyere anyị.

NNE m ochie bụ́ Kurzen malitererịị ịchọ eziokwu banyere Chineke mgbe ọ bụ nwa agbọghọ nta. Tupu ya eruo afọ iri na ụma, ọ gara chọọchị dị iche iche n’ọmarịcha obodo ya bụ́ Spiez, Switzerland. Na 1887, afọ ụfọdụ ka ọ lụsịrị di, ezinụlọ Kurzen sonyeere ìgwè ndị na-aga United States kwaga ná mba ahụ.

Ka e mesịrị, ezinụlọ ahụ bịara biri n’Ohio, bụ́ ebe, n’ihe dị ka n’afọ 1900, nne m ochie chọtara akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ọ nọworo na-achọ. Ọ chọtara ya n’akwụkwọ Charles Taze Russell bụ́ The Time Is at Hand, nke dị n’asụsụ German. Ọ ghọtara ngwa ngwa na ihe ọ gụtara n’ebe ahụ nwere ìhè nke eziokwu Bible. Ọ bụ ezie na nne m ochie amachaghị agụ Bekee, ọ tụrụ ụtụ magazin Ụlọ Nche Bekee. N’ụzọ dị otú a, ọ mụtakwuru eziokwu Bible, n’otu oge ahụkwa, mụtakwuo asụsụ Bekee. Nna m ochie adịghị mgbe o nwere mmasị dị otú ahụ nwunye ya nwere n’ihe ime mmụọ.

N’ime ụmụ 11 nne m ochie bụ́ Kurzen mụrụ, 2 n’ime ndị nke nwoke, bụ́ John na Adolph, ji akụ̀ ime mmụọ ahụ dị oké ọnụ ahịa ọ chọtaworo kpọrọ ihe. John bụ nna m, e mekwara ya baptism na 1904 ná mgbakọ Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, nke e mere ná St. Louis, Missouri. Ebe ọ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndị Mmụta Bible ahụ abaghị ọgaranya, e mere ndokwa inwe mgbakọ ahụ n’otu oge ahụ e mere Ihe Ngosi Ngwá Ahịa Ụwa Nile na St. Louis ka ha wee nwee ike iji ohere nke ego ụgbọ e gbubilatara egbubilata mee ihe. Mgbe e mesịrị, na 1907, e mere deede m Adolph baptism ná mgbakọ e mere na Niagara Falls, New York. Papa m na deede m ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ihe ha mụtaworo na Bible, ha abụọ mesịkwara ghọọ ndị ozi oge nile (ndị a na-akpọ ndị ọsụ ụzọ ugbu a).

N’ihi ya, ka ọ na-erule mgbe a mụrụ m na 1907, ezinụlọ anyị abaalarịị ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ. (Ilu 10:22) M ka bụ nnọọ nwa ọhụrụ na 1908 mgbe nne na nna m, bụ́ John na Ida, kpọọrọ m gaa mgbakọ “Ịga n’Ihu Ruo Mmeri” bụ́ nke e mere na Put-in-Bay, Ohio. N’ebe ahụ, Joseph F. Rutherford, onye bụ́ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’oge ahụ, bụ onyeisi oche nke mgbakọ ahụ. Izu ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ gawo Dalton, Ohio, bụ́ mgbe ọ bịara n’ụlọ anyị ma kwuoro Ndị Mmụta Bible nọ n’ógbè ahụ okwu ihu ọha.

N’ezie, anaghị m echeta ihe omume ndị ahụ n’onwe m, ma m na-echeta mgbakọ ahụ e mere n’Ogige Ntụrụndụ Mountain Lake, Maryland, na 1911. N’ebe ahụ, mụ na nwanne m nwanyị nke m tọrọ, bụ́ Esther, zutere Charles Taze Russell, bụ́ onye na-elekọta ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Ndị Mmụta Bible.

Na June 28, 1914, bụ́ ụbọchị ụwa dabara n’agha site n’ogbugbu e gburu Archduke Ferdinand na nwunye ya na Sarajevo, eso m ezinụlọ m gaa mgbakọ udo e mere na Columbus, Ohio. Eri afọ ndị mbụ ahụ, enwewo m ihe ùgwù nke ịnọ n’ọtụtụ mgbakọ nke ndị Jehova. Ụfọdụ bụ mgbakọ ndị nanị otu narị mmadụ ma ọ bụ ihe dị ka ya nọ na ha. Ndị ọzọ bụ mgbakọ ndị buru ibu e mere n’ụfọdụ n’ime ámá egwuregwu ndị kasị ibu n’ụwa.

Ụlọ Anyị nke Nọ n’Ebe Dị Mkpa

Site n’ihe dị ka 1908 ruo 1918, ụlọ anyị dị na Dalton—nke dị n’etiti Pittsburgh, Pennsylvania, na Cleveland, Ohio—bụ ebe ntakịrị ọgbakọ nke Ndị Mmụta Bible nọ na-enwe nzukọ. Ụlọ anyị ghọrọ ebe a na-anọ ele ọtụtụ ndị ọkà okwu na-ejegharị ejegharị ọbịa. Ha na-ekenye ụgbọala ha ndị ịnyịnya na-adọkpụ n’azụ ọba anyị ma na-akọrọ ndị gbakọtaranụ ahụmahụ ndị na-akpali mmasị na akụkọ ndị ọzọ banyere ihe ime mmụọ. Lee ka oge ndị ahụ si bụrụ ndị na-agba ume!

Papa m bụ onye nkụzi ụlọ akwụkwọ, ma obi ya dị n’ọrụ nkụzi kasị ibe ya, bụ́ ozi ndị Kraịst. O jidere n’aka na ọ kụziiri ezinụlọ ya banyere Jehova, kwa uhuruchi kwa, anyị na-ekpekọ ekpere ọnụ dị ka ezinụlọ. N’oge opupu ihe ubi nke 1919, papa m rere ụgbọala anyị ịnyịnya na-adọkpụ, o jikwa $175 zụta ụgbọala Ford nke 1914 ka o wee nwee ike ijekwurukwu ndị mmadụ n’ọrụ nkwusa ahụ. Na 1919 na 1922, ụgbọala ahụ bu ezinụlọ anyị gaa mgbakọ ndị ahụ dị ịrịba ama nke Ndị Mmụta Bible bụ́ ndị e mere na Cedar Point, Ohio.

Ezinụlọ anyị dum—mama m; papa m; Esther; nwanne m nwoke nke m tọrọ, bụ́ John; na mụ onwe m—kerechaara òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha. Echetara m nke ọma mgbe mbụ onye nwe ụlọ jụrụ m ajụjụ dabeere na Bible. Adị m ihe dị ka afọ asaa mgbe ahụ. “Nnaa, gịnị bụ Amagedọn?” ka nwoke ahụ jụrụ. Site n’aka papa m nyetụụrụ m, enyere m ya azịza dabeere na Bible.

Ịbanye n’Ozi Oge Nile

Na 1931, ezinụlọ anyị gara mgbakọ ahụ e mere na Columbus, Ohio, bụ́ ebe obi dị anyị ụtọ iso nakwere aha ọhụrụ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. John nwere obi ụtọ nke ukwuu nke na o kpebiri ka mụ na ya banye ọrụ ọsụ ụzọ. * Anyị banyere, otú ahụkwa ka mama m, papa m, na Esther mere. Lee ihe dị oké ọnụ ahịa anyị nwere—otu ezinụlọ e jikọtara ọnụ n’ọrụ na-enye ọṅụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke! Ọ dịbeghị mgbe ike gwụrụ m ikele Jehova maka ngọzi a. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na anyị nwere obi ụtọ dị ukwuu, ọṅụ ka ukwuu na-echere anyị.

Na February nke 1934, amalitere m ije ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova (nke a na-akpọ Betel) dị na Brooklyn, New York. John sonyeere m n’ebe ahụ ka izu ole na ole gasịrị. Anyị abụọ bi n’otu ọnụ ụlọ ruo mgbe ọ lụrụ ezigbo nwunye ya, bụ́ Jessie, na 1953.

Mgbe mụ na John gasịrị Betel, ndị mụrụ anyị nakweere ọrụ ọsụ ụzọ n’akụkụ dị iche iche nke mba a, Esther na di ya, bụ́ George Read, sonyekwaara ha. Ndị mụrụ anyị nọgidere na-asụ ụzọ ruo mgbe ha jesịrị ozi elu ala ha na 1963. Esther na di ya zụlitere ezigbo ezinụlọ, e jikwa ụmụ nwanne ndị nwoke na ndị nwanyị gọzie m, bụ́ ndị m hụrụ n’anya nke ukwuu.

Ọrụ na Mkpakọrịta na Betel

John ji ihe ọmụma nkà na ụzụ ya rụọ ọrụ na Betel ma soro ndị Betel ndị ọzọ rụkọọ ọrụ n’ọrụ ndị dị ka imepụta obere ígwè phonograph. Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ji ha mee ihe n’ozi ụlọ n’ụlọ ha. John nyekwara aka see ma mepụta ígwè na-afụchi ma na-ede aha na magazin ndị a na-ezigara ndị tụrụ ụtụ.

Amalitere m ozi Betel m n’ebe a na-adụkọta akwụkwọ. Ụmụ okorobịa ndị ọzọ, bụ́ ndị ka ji ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi na Betel, so na-arụ ọrụ n’ụlọ obibi akwụkwọ n’oge ahụ. Ha gụnyere Carey Barber na Robert Hatzfeld. Ndị ọzọ so n’ime ha, bụ́ ndị m na-eji mmasị echeta, ma ọ dịla anya ha nwụrụ, bụ Nathan Knorr, Karl Klein, Lyman Swingle, Klaus Jensen, Grant Suiter, George Gangas, Orin Hibbard, John Sioras, Robert Payne, Charles Fekel, Benno Burczyk, na John Perry. Ha nọgidere n’ọrụ ahụ site n’afọ ruo n’afọ n’adịghị mgbe ọ bụla ha mere mkpesa ma ọ bụ tụọ anya “mbuli n’ọkwá.” Ma, ọtụtụ n’ime ndị Kraịst ndị a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ bụ́ ndị guzosiri ike n’ihe nwetara ibu ọrụ ndị ka ukwuu ka nzukọ a na-eto. Ọbụna ụfọdụ jere ozi n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

Iso ụmụnna ndị a nwere mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà na-arụkọ ọrụ kụziiri m ihe dị mkpa. N’ọrụ ego, a na-akwụ ndị ọrụ ụgwọ ọnwa maka ọrụ ha. Nke ahụ bụ ụgwọ ọrụ ha. Ije ozi na Betel na-eweta ngọzi ime mmụọ bara ụba, ọ bụkwa nanị ndị ikom na ndị inyom ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe na-enwe ekele maka ụgwọ ọrụ ndị dị otú ahụ.—1 Ndị Kọrint 2:6-16.

Nathan Knorr, bụ́ onye bịara Betel na 1923 mgbe ọ dị afọ iri na ụma, bụ onye nlekọta nke ebe obibi akwụkwọ n’afọ ndị 1930. Ọ na-agagharị n’ụlọ obibi akwụkwọ ahụ kwa ụbọchị na-ekele onye ọrụ ọ bụla. Anyị bụ́ ndị bịara ọhụrụ na Betel nwere ekele maka mmasị onwe onye dị otú ahụ. Na 1936, anyị nwetara ígwè obibi akwụkwọ ọhụrụ site na Germany, ijikọta ya rakwara ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị ahụ na-eto eto ahụ. N’ihi ya, Nwanna Knorr yiiri uwe ọrụ ma soro ha rụkọọ ọrụ ruo ihe karịrị otu ọnwa ruo mgbe ígwè ahụ malitere ịrụ ọrụ.

Nwanna Knorr bụ nnọọ onye na-arụsi ọrụ ike nke na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị anaghị ahụ azụ ya anya. Ma ọ makwaara otú e si atụrụ ndụ. Ọbụna mgbe ọ natasịrị ọrụ nke ilekọta ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova na January 1942, mgbe ụfọdụ, ọ na-eso ndị òtù ezinụlọ Betel na ụmụ akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead akụ baseball n’ogige ụlọ akwụkwọ ahụ dị nso na South Lansing, New York.

N’April 1950, ezinụlọ Betel kwabara n’akụkụ e wuru ọhụrụ dị okpukpu iri nke ụlọ obibi anyị dị na 124 Columbia Heights, Brooklyn, New York. Ebe iri ihe ọhụrụ na-aba anyị nile n’oge nri. N’ime afọ atọ o were iji wuo ebe obibi a, anyị anaghị enwe ike ife ofufe ụtụtụ anyị. Lee oge obi ụtọ ọ bụ mgbe anyị pụrụ ịmaliteghachi ihe omume ahụ! Nwanna Knorr kenyere m ịnọnyere ya na tebụl onyeisi oche ka m wee nwee ike inyere ya aka icheta aha ndị ka bịara ọhụrụ n’ezinụlọ anyị. Ruo afọ 50, anọrọ m n’otu oche ahụ maka ofufe ụtụtụ na nri ụtụtụ. E mesịa, n’August 4, 2000, e mechiri ebe iri ihe ahụ, a kpọfekwara m n’otu n’ime ebe iri ihe ndị a rụgharịrị arụgharị nke dị n’ebe bụbu Họtel Tower.

Ruo oge ụfọdụ n’afọ ndị 1950, arụrụ m ọrụ n’ebe obibi akwụkwọ n’ígwè Linotype, na-akwadebe mkpụrụ akwụkwọ ndị e ji ígwè mee bụ́ ndị e jikọtara gaa na peeji na peeji dị ka akụkụ nke usoro e ji emepụta plate e ji ebi akwụkwọ. Ọrụ ahụ abụghị otu n’ime ndị kasị amasị m, ma William Peterson, bụ́ onye na-elekọta ígwè ndị ahụ, nwere nnọọ mmasị n’ebe m nọ nke mere ka m nweekwarị obi ụtọ n’oge m nọrọ n’ebe ahụ. E mesịa, na 1960, a chọrọ ndị ọrụ afọ ofufo ite ebe obibi e wuru ọhụrụ na 107 Columbia Heights ágbá. Obi dị m ụtọ iso nye aka kwadebe ihe owuwu ọhụrụ ndị a maka ezinụlọ Betel anyị na-amụba amụba.

N’oge na-adịghị anya e tesịrị ụlọ ahụ dị na 107 Columbia Heights ágbá, ọ tụrụ m n’anya ma nye m obi ụtọ ịbụ onye e kenyere ọrụ ịnabata ndị ọbịa na Betel. Afọ 40 gara aga m jerela ozi dị ka onye na-anabata ndị ọbịa, magburu onwe ha dị ka afọ ọ bụla ọzọ m ji jee ozi na Betel. Ma ọ̀ bụ ndị ọbịa ma ọ bụ ndị ọhụrụ so n’ezinụlọ Betel batara, ọ bụ ihe na-akpali akpali ịtụgharị uche n’ihe ndị a rụpụtaworo ná mgbalị ndị anyị gbakọrọ aka na-eme iji na-arụ ọrụ maka ịba ụba nke Alaeze ahụ.

Ndị Na-amụchi Bible Anya

Ezinụlọ Betel anyị na-enwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ime mmụọ n’ihi na ndị nọ na ya hụrụ Bible n’anya. Mgbe mbụ m bịara Betel, ajụrụ m Emma Hamilton, bụ́ onye na-arụ ọrụ dị ka onye ngụgharị, ugboro ole ọ gụrụla Bible. “Ugboro iri atọ na ise,” ka ọ zara, “apụghịzi m ịgụta ndị ọzọ.” Anton Koerber, bụ́ onye Kraịst ọzọ kwụsiri ike nke jeworo ozi na Betel ruo ihe dị ka ogologo oge ha otú ahụ, na-ekwukarị, sị: “Ya adịla mgbe ị ga-ekwe ka Bible dịrị ebe aka gị na-agaghị eru ngwa ngwa.”

Mgbe Nwanna Russell nwụsịrị na 1916, Joseph F. Rutherford nakweere ibu ọrụ nke ime nhazi bụ́ nke dịbu n’aka Russell. Rutherford bụ ezigbo ọkà n’ikwu okwu n’ihu ọha, bụ́ onye, dị ka ọkàiwu, kpechitere ọnụ Ndịàmà Jehova n’Ụlọikpe Kasị Elu nke United States. Mgbe Rutherford nwụsịrị na 1942, Nwanna Knorr weghaara ọnọdụ ya ma rụsie ọrụ ike iji zụlite nkà ya n’ikwu okwu n’ihu ọha. Ebe m bi n’ọnụ ụlọ dị nke ya nso, ana m anụkarị ka ọ na-amụgharị okwu ya ugboro ugboro. Ka oge na-aga, site ná mgbalị ndị dị otú ahụ o ji ịdị uchu mee, ọ ghọrọ ezigbo ọkà n’ikwu okwu n’ihu ọha.

Na February 1942, Nwanna Knorr nyere aka guzobe otu usoro ihe omume iji nyere anyị nile bụ́ ụmụnna nwoke nọ na Betel aka ime ka nkà izi ihe na ikwu okwu anyị ka mma. Ụlọ akwụkwọ ahụ lekwasịrị anya n’inyocha Bible na ikwu okwu n’ihu ọha. Ná mmalite, e kenyere onye ọ bụla n’ime anyị ikwu okwu dị mkpirikpi banyere ndị a kpọrọ aha na Bible. Okwu mbụ m kwuru bụ banyere nwoke ahụ bụ́ Mosis. Na 1943, a malitere ụlọ akwụkwọ yiri nke ahụ n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, ọ nọgidewokwa ruo taa. Ihe a na-emesi ike na Betel ka bụ inweta ihe ọmụma Bible na ịzụlite ụzọ izi ihe ndị dị irè.

Na February 1943, klas mbụ nke ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ nke Gilead malitere. Ugbu a, klas nke 111 nke Gilead ka gụsịrị akwụkwọ! N’ime afọ 58 ụlọ akwụkwọ a nọworo na-aga n’ihu, o nyewo ihe karịrị mmadụ 7,000 ọzụzụ ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ n’ụwa nile. N’ụzọ dị ịrịba ama, na 1943 bụ́ mgbe ụlọ akwụkwọ ahụ malitere, e nwere nanị ihe karịrị 100,000 Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ugbu a, e nwere ihe karịrị mmadụ 6,000,000 na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke!

Inwe Ekele Maka Ihe Nketa Ime Mmụọ M

Ntakịrị oge tupu e guzobe Gilead, e kenyere anyị mmadụ atọ si Betel ọrụ ileta ọgbakọ dị iche iche gburugburu United States. Anyị na-anọ otu ụbọchị, ụbọchị ole na ole, ma ọ bụ ọbụna otu izu ná mgbalị iji wusie ọgbakọ ndị a ike n’ụzọ ime mmụọ. A na-akpọ anyị ndị ohu nke ụmụnna, bụ́ aha e mesịrị gbanwee ịbụ ohu sekit ma ọ bụ onye nlekọta sekit. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya e guzobesịrị Ụlọ Akwụkwọ Gilead, a gwara m ka m lọghachi iji kụzie ihe ọmụmụ ụfọdụ. Ejere m ozi dị ka onye nkụzi maka klas nke 2 ruo na nke 5, anọchikwara m anya otu n’ime ndị nkụzi ma kụziere klas nke 14 ihe. Inwe ike iso ụmụ akwụkwọ a tụlee ihe ndị dị ịrịba ama mere ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke nzukọ Jehova n’oge a—ndị m pụrụ ịkọ ọtụtụ n’ime ha site n’ahụmahụ nke onwe m—mere ka m nwekwuo ekele dị ukwuu maka ihe nketa ime mmụọ m bara ụba.

Ihe ùgwù ọzọ m nweworo n’ime afọ ndị gafeworonụ bụ nke ịga mgbakọ mba nile dị iche iche nke ndị Jehova. Na 1963, mụ na mmadụ 500 ndị ọzọ gara gburugburu ụwa iji gaa mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi.” Mgbakọ ndị ọzọ mere ihe akụkọ m gara bụ ndị e mere na Warsaw, Poland, na 1989; Berlin, Germany, na 1990; na Moscow, Russia, na 1993. Ná mgbakọ nke ọ bụla, enwere m ohere nke izute ụfọdụ n’ime ezigbo ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị tachiri obi n’ime ọtụtụ iri afọ nke mkpagbu n’okpuru ọchịchị Nazi, nke ọchịchị Kọmunist, ma ọ bụ ha abụọ. Lee ka ahụmahụ ndị ahụ si bụrụ ndị na-ewusi okwukwe ike!

N’ezie ndụ m n’ozi Jehova abụwo nke jupụtara n’ezi ihe! Ngọzi ime mmụọ adịghị agwụ agwụ ma ọlị. N’adịghịkwa ka akụ̀ na ụba nkịtị, ka anyị na-ekesa ihe ndị a dị oké ọnụ ahịa, otú ahụ ka akụ̀ na ụba anyị na-amụba. Mgbe mgbe, ana m anụ ka ụfọdụ na-ekwu na ọ dị ha ka ya bụrụ na a zụliteghị ha dị ka Ndịàmà Jehova. Ha na-asị na ha chere na ha gaara eji eziokwu Bible kpọrọ ihe karị ma ọ bụrụ na ha buru ụzọ bie ndụ dị ka ndị na-anọghị ná nzukọ Chineke.

Ọ na-enye m nsogbu n’obi mgbe m nụrụ ka ndị na-eto eto na-ekwu ihe dị otú ahụ n’ihi na ihe ha na-ekwu n’ezie bụ na ọ kasị mma ịghara ịbụ onye e ji ihe ọmụma nke ụzọ Jehova zụlite. Ma, chee echiche banyere àgwà ọjọọ na echiche rụrụ arụ nile ndị mmadụ na-aghaghị ịhapụ mgbe ha mesịrị chọta eziokwu Bible ná ndụ ha. Anọwo m na-enwe ekele dị ukwuu mgbe nile na ndị mụrụ m zụlitere ụmụ ha atọ n’ụzọ nke ezi omume. John nọgidere bụrụ ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ọ nwụrụ na July 1980, ruokwa taa, Esther nọgidere bụrụ Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi.

Ana m eji obi ụtọ eleghachi anya azụ n’ọtụtụ mkpakọrịta ndị dị mma m soworo ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwee. Ugbu a, ejewo m ozi na Betel ruo afọ 67 magburu onwe ha. Ọ bụ ezie na alụghị m nwanyị, enwere m ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ime mmụọ, tinyekwara ụmụ ụmụ ime mmụọ. Ana m enwekwa ọṅụ iche banyere ezigbo ndị ọhụrụ nile so n’ezinụlọ ime mmụọ anyị zuru ụwa ọnụ bụ́ ndị m zuteworo, nke ọ bụla n’ime ha dị oké ọnụ ahịa. Lee ka okwu ndị a si bụrụ eziokwu: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya”!—Ilu 10:22.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 16 E mere m baptism na March 8, 1932. Ya mere, e mere m baptism mgbe m kpebisịrịla na m ga-asụ ụzọ.

[Foto dị na peeji nke 20]

Site n’aka ekpe gaa n’aka nri: papa m ka o ku nwanne m nwoke, bụ́ John, n’apata ụkwụ ya, Esther, mụ, na mama m

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ka m na-akụziri ụmụ akwụkwọ Gilead ihe na 1945

N’elu aka nri: ndị nkụzi Gilead bụ́ Eduardo Keller, Fred Franz, mụ onwe m, na Albert Schroeder

[Foto dị na peeji nke 24]

Ka m na-atụgharị uche ná ndụ m nke jupụtara n’ezi ihe n’ozi Jehova