Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ngọzi Jehova, nke ahụ Na-eme Mmadụ Ọgaranya”

“Ngọzi Jehova, nke ahụ Na-eme Mmadụ Ọgaranya”

“Ngọzi Jehova, nke ahụ Na-eme Mmadụ Ọgaranya”

ANYỊ nile chọrọ ka a gọzie anyị. Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ The American Heritage College Dictionary na-ekwu na ngọzi na-akwalite “obi ụtọ, ọdịmma, ma ọ bụ ọganihu.” Ebe Jehova bụ Onye na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye,” ezi ngọzi ọ bụla nke na-adịgide adịgide si n’aka Onye Okike anyị na-ahụ n’anya abịa. (Jemes 1:17) Ọ na-awụkwasị ngọzi n’ahụ ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọbụna n’ahụ ndị na-amaghị ya. Jisọs kwuru banyere Nna ya, sị: “Ọ na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Otú ọ dị, Jehova na-elekọta ndị hụrụ ya n’anya, n’ụzọ pụrụ iche.—Deuterọnọmi 28:1-14; Job 1:1; 42:12.

Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “[Jehova agaghị] egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu okè nọ.” (Abụ Ọma 84:11) Ee, ndị na-ejere Jehova ozi na-ebi ndụ ka mma ma nwee nzube. Ha maara na “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” Bible na-ekwukwa, sị: “Ndị [Jehova] na-agọzi ga-enweta ala.” (Ilu 10:22; Abụ Ọma 37:22, 29) Lee ngọzi nke ahụ ga-abụ!

Ànyị pụrụ isi aṅaa nweta ngọzi Jehova? Nke mbụ, ọ dị anyị mkpa ịzụlite àgwà ndị na-amasị ya. (Deuterọnọmi 30:16, 19, 20; Maịka 6:8) Anyị na-ahụ nke a n’ihe atụ nke mmadụ atọ n’ime ndị ohu Jehova n’oge ochie.

Jehova Na-agọzi Ndị Ohu Ya

Noa bụ ohu Chineke a ma ama. Na Jenesis 6:8, anyị na-agụ, sị: “Noa hụtara amara n’ihu Jehova.” N’ihi gịnị? N’ihi na Noa rubere isi. Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “Noa na Chineke yịkọrọ na-ejegharị.” Noa gbasoro ụkpụrụ ezi omume nke Jehova ma rube isi n’iwu ya. N’oge ụwa mikpuru n’ime ihe ike na omume rụrụ arụ, a kpaliri Noa “[ime] dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” (Jenesis 6:9, 22) N’ihi ya, Jehova tụziiri ya iwu “ụgbọ ịzọpụta ezinụlọ [Noa].” (Ndị Hibru 11:7) N’ụzọ dị otú a, Noa na ezinụlọ ya—nakwa site n’aka ha, agbụrụ mmadụ—lanahụrụ mbibi nke ọgbọ ahụ. Noa nwụkwara na-enwe olileanya nke ịbụ onye a ga-akpọlite n’ọnwụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Lee ngọzi bara ụba o nwetara!

Abraham n’onwe ya nwekwara àgwà ndị mere Jehova obi ụtọ. Nke kasị pụta ìhè n’ime ha bụ okwukwe. (Ndị Hibru 11:8-10) Abraham hapụrụ ndụ dị ntụsara ahụ na Ua, nakwa mgbe e mesịrị, na Heran n’ihi na o nwere okwukwe ná nkwa Jehova bụ́ na mkpụrụ ya ga-aba ụba ma bụrụ ngọzi nye mba nile. (Jenesis 12:2, 3) N’agbanyeghị na e lere ya ule ruo ọtụtụ afọ, a kwụghachiri ya ụgwọ maka okwukwe ya mgbe ọ mụrụ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak. Site n’aka ya, Abraham ghọrọ nna nna nke mba Chineke họpụtara, bụ́ Israel, nakwa nke Mesaịa n’ikpeazụ. (Ndị Rom 4:19-21) Ọzọkwa, ọ bụ “nna nke ndị nile [nwere okwukwe],” a bịakwara kpọọ ya “enyi nke Chineke.” (Ndị Rom 4:11; Jemes 2:23; Ndị Galetia 3:7, 29) Lee ndụ nwere nzube o biri, leekwa ka e si gọzie ya n’ụba!

Tụleekwa nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Mosis. Nke kasị pụta ìhè n’àgwà ya nile bụ ekele o nwere maka ihe ime mmụọ. Mosis gbakụtara akụ̀ nile nke Ijipt azụ ma ‘nọgidesie ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya.’ (Ndị Hibru 11:27) Mgbe ọ nọsịrị afọ 40 na Midian, ọ laghachiri Ijipt dị ka agadi nwoke ma kwụrụ n’ihu onye ọchịchị kasị ukwuu n’oge ahụ, bụ́ Fero, ịgwa ya ka ọ tọhapụ ụmụnne ya. (Ọpụpụ 7:1-7) Ọ hụrụ ihe otiti iri ahụ, nkewa e kewara Oké Osimiri Uhie ahụ, na mbibi e bibiri usuu ndị agha Fero. Jehova ji ya mee ihe n’inye Israel Iwu ahụ nakwa dị ka onye ogbugbo n’etiti ọgbụgba ndụ Ya na mba ọhụrụ ahụ. Ruo afọ 40, Mosis duru mba Israel n’ọzara. Ndụ ya nwere ezi nzube, o nwetakwara ngọzi bara ụba nke ije ozi n’ụzọ dị ebube.

Ngọzi Ndị nke Oge A

Ihe ndekọ ndị a na-egosi na ndụ nke ndị na-ejere Chineke ozi na-enwe nzube n’ezie. Ka ndị Jehova na-azụlite àgwà ndị dị ka nrubeisi, okwukwe, na ekele maka ihe ime mmụọ, a na-agọzi ha n’ụba.

Olee otú e si agọzi anyị? N’agbanyeghị na ọtụtụ nde ndị nọ na Krisendọm na-ahụsi anya n’ihi ụnwụ nri ime mmụọ, anyị pụrụ ‘iruba dị ka osimiri ruo ezi ihe nke Jehova.’ (Jeremaịa 31:12) Site n’aka Jisọs Kraịst na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” Jehova enyewo anyị nri ime mmụọ n’ụba bụ́ nke na-enyere anyị aka ịnọgide ‘n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ.’ (Matiu 7:13, 14; 24:45; Jọn 17:3) Iso òtù ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst na-akpakọrịta bụ ngọzi ọzọ bara ụba. Ná nzukọ nakwa n’oge ndị ọzọ, iso ndị anyị na ha na-efekọ ofufe bụ́ ndị na-egosipụta ịhụnanya, ndị na-agbalịsikwa ike iyikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ” na-anọkọrịta, bụ ihe na-enye obi ụtọ dị ukwuu. (Ndị Kọlọsi 3:8-10; Abụ Ọma 133:1) Otú ọ dị, ngọzi kasị ukwuu anyị nwere bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke iso Jehova Chineke na-enwe mmekọrịta na ịgbaso nzọụkwụ nke Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs.—Ndị Rom 5:1, 8; Ndị Filipaị 3:8.

N’ịtụgharị uche ná ngọzi ndị dị otú ahụ, anyị na-aghọta ókè ozi anyị na-ejere Chineke dịruru oké ọnụ ahịa n’ezie. Ikekwe anyị na-echeta ilu Jisọs banyere onye ahịa chọtara pearl dị oké ọnụ ahịa. Jisọs kwuru banyere nwoke a, sị: “Mgbe ọ hụrụ otu pearl dị oké ọnụ ahịa, o jee, ree ihe nile o nwere, ka ha hà, wee zụta ya.” (Matiu 13:46) N’ezie, nke ahụ bụ mmetụta anyị na-enwe banyere mmekọrịta anyị na Chineke, ihe ùgwù anyị nwere ijere ya ozi, mkpakọrịta anyị na ndị Kraịst ibe anyị, olileanya anyị dị ka ndị Kraịst, na ngọzi ndị ọzọ metụtara okwukwe anyị. Ọ dịghị ihe dị oké ọnụ ahịa ná ndụ anyị karịa ha.

Nyeghachi Jehova Ihe

Ebe anyị matara Jehova dị ka Onye na-enye ezi onyinye ọ bụla, a na-akpali obi anyị igosipụta ekele maka ngọzi ndị anyị na-enweta. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Otu ụzọ bụ site n’inyere ndị ọzọ aka inweta ngọzi ndị a. (Matiu 28:19) N’ihe karịrị ala 230, Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ịgakwuru ndị agbata obi ha iji mee nke ahụ kpọmkwem. Ka ha na-eme nke ahụ, ha na-emefu ihe ndị ha nwere bụ́ nke a kpaara ókè—oge, ike, na ihe onwunwe—iji nyere ndị ọzọ aka ‘ịbịaru mmazu nke eziokwu.’—1 Timoti 2:4.

Tụlee ihe banyere ndị ọsụ ụzọ bi na Glendale, California, U.S.A. Kwa ụtụtụ Saturday, ha na-eme njem ruo ihe dị ka 100 kilomita, ụga na ụla, iji leta otu ụlọ mkpọrọ dị ná mba ahụ. Ha adịghị enwe nkụda mmụọ n’agbanyeghị na ha apụghị ịnọ ihe karịrị awa ole na ole ná nleta ọ bụla ha letara ndị mkpọrọ ahụ. Otu n’ime ha na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe na-akwụghachi nnọọ ụgwọ ije ozi n’ókèala a pụrụ iche. Anyị ji ọṅụ dị ukwuu na-eme ya. Anyị nwere nnọọ ọtụtụ ndị nwere mmasị nke na ọ na-esiri anyị ike iletacha ha. Ka ọ dị ugbu a, anyị na-amụrụ mmadụ ise ihe, mmadụ anọ ndị ọzọ arịọwokwa maka ọmụmụ Bible.”

Obi na-adị ndị ozi bụ́ ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi ụtọ ịrụ ọrụ a na-azọpụta ndụ n’efu. Ha na-egosipụta àgwà Jisọs, bụ́ onye kwuru, sị: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.” (Matiu 10:8) Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa na-eje ozi nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị yiri nke ahụ, n’ihi ya kwa, ìgwè ndị nwere obi eziokwu na-emeghachi omume n’ụzọ dị mma ma na-aghọ ndị na-eso ụzọ. N’afọ ise gara aga nanị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 1.7 ararawo ndụ ha nye Jehova. Igbo mkpa nke mmụba a na-aga n’ihu na-achọ imepụta Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible nakwa iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ na ebe ndị ọzọ a na-enwe nzukọ. Ebee ka e si enweta ego e ji egbo mkpa ndị a? Ọ bụ nanị site n’onyinye afọ ofufo.

N’ihi ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ọtụtụ ndị na-adọga igbo nanị mkpa ndị na-akpa ezinụlọ ha ná ndụ. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo, otu ijeri mmadụ na-emefu ma ọ dịkarịa ala pasent 70 nke ihe ezinụlọ ha na-akpata, n’ihe oriri. Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị Kraịst nọ n’ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ na ndị kwere ekwe ibe ha enyeghịrị ha aka, ha apụghị nnọọ inweta ihe ndị dị ka mbipụta ndị Kraịst ma ọ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị kwesịrị ekwesị.

N’ezie, nke ahụ apụtaghị na ndị dị otú ahụ na-enwe afọ ojuju ikwe ka ndị ọzọ buwere ha ibu. Ma enyemaka dị ha mkpa. Mgbe Mosis na-agba ụmụ Israel ume ime ka onyinye afọ ofufo bụrụ otu ụzọ ha ga-esi na-ekele Jehova maka ngọzi ya, o kwuru, sị: “Nwoke ọ bụla dị ka onyinye aka ya si dị, dị ka ngọzi Jehova, bụ́ Chineke gị, si dị, nke O nyeworo gị.” (Deuterọnọmi 16:17) N’ihi ya, mgbe Jisọs hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka o nyere “ego nta abụọ” n’ụlọ nsọ ahụ, ọ jara ya mma n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. Nwanyị ahụ mere ike ya. (Luk 21:2, 3) N’ụzọ yiri nke ahụ, ndị Kraịst dara ogbenye karị na-eme ike ha. Ọ bụrụkwa na ihe ha na-enye na-epe nnọọ mpe, onyinye afọ ofufo nke ndị Kraịst ibe ha bụ́ ndị na-adachaghị ogbenye pụrụ imeju ya.—2 Ndị Kọrint 8:13-15.

Mgbe anyị na-enyeghachi Chineke ihe n’ụzọ dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị nwee ezi ebumnobi. (2 Ndị Kọrint 8:12) Pọl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 9:7) Site n’iji obi anyị nile na-enye ihe, anyị na-akwado mgbasa nke ọchịchị Chineke bụ́ nke na-aga n’ihu ugbu a ma na-amụba ọṅụ anyị.—Ọrụ 20:35.

Ikere òkè n’ọrụ nkwusa na inye onyinye afọ ofufo bụ ụzọ abụọ anyị pụrụ isi nye Jehova ihe n’ihi ngọzi ndị o nyeworo anyị. Leekwa ihe agbamume ọ bụ ịmara na Jehova na-achọ ịwụkwasị ngọzi ya n’ahụ ọtụtụ ndị ọzọ nwere ezi obi, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha amabeghị ya! (2 Pita 3:9) Ya mere, ka anyị nọgide na-eji ihe onwunwe anyị na-eme ihe n’ozi Chineke iji na-achọta ndị nwere obi eziokwu ma na-enyere ha aka ịzụlite àgwà ndị dị ka nrubeisi, okwukwe, na obi ekele. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị ga-enweta ọṅụ nke inyere ha aka ‘idetụ ire, hụ na Jehova dị mma.’—Abụ Ọma 34:8.

[Igbe dị na peeji nke 28, 29]

Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ahọrọ Inye Ihe

ONYINYE NDỊ A NA-ENYE MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ mawapụta, ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ e dere “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14.”

Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha. A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. A pụkwara inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọta onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.

ONYINYE NKE A PỤRỤ ỊNARAGHACHI

A pụrụ inye onyinye ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a pụrụ inyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

Tinyere inye onyinye ego kpọmkwem na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze uru n’ụwa nile. Ndị a gụnyere:

Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ bụrụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso.

Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam.

Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-edenye ala na ụlọ ọ bụla n’aha ya.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: A pụrụ idenyere Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Watch Tower Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego e mere ka ọ baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego n’ụtụ isi ọ ga-akwụ.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ inye aka n’ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova site n’ụdị ụfọdụ nke atụmatụ ọrụ ebere aka, Society akwadebewo otu broshuọ dị n’asụsụ Bekee na Spanish a kpọrọ Charitable Planning to Benefit Kingdom Service Worldwide. E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị a jụrụ banyere onyinye, ike ekpe, na atụmatụ ego. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi. A hazikwara ya iji nyere ndị bi na United States aka bụ́ ndị na-eme atụmatụ inye onyinye pụrụ iche ugbu a ma ọ bụ ikenye ihe onwunwe n’ekpe maka mgbe ha nwụrụ, ịhọrọ ụzọ ndị kasị baa uru na ndị kasị dị irè, na-eburu ọnọdụ ezinụlọ na nke onwe ha n’uche. A pụrụ inweta broshuọ a site n’ịrịọ maka ya kpọmkwem site n’aka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere.

Mgbe ha gụsịrị broshuọ ahụ ma soro ndị na-arụ ọrụ n’Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ma n’otu mgbe ahụ, mụbaa ihe a na-esepụrụ ha n’ụtụ isi n’ihi ime otú ahụ. E kwesịrị ime ka Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere mara banyere akwụkwọ ndị bara uru metụtara nke ọ bụla ná ndokwa ndị a ma nweta otu akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na i nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa atụmatụ ọrụ ebere ndị a, i kwesịrị ịkpọtụrụ Ọfịs Atụmatụ Ọrụ Ebere, n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ na telifon, n’adres e dere n’okpuru ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba gị.

CHARITABLE PLANNING OFFICE

Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania

100 Watchtower Drive,

Patterson, New York 12563-9204

Telephone: (845) 306-0707